Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú E Si Emeta Ndị Enyi Kwesịrị Ntụkwasị Obi

Otú E Si Emeta Ndị Enyi Kwesịrị Ntụkwasị Obi

Maka Ndị Na-eto Eto

Otú E Si Emeta Ndị Enyi Kwesịrị Ntụkwasị Obi

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ amaokwu ndị a, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri uche gị kirie ebe ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.

Ndị bụ́ isi n’akụkọ a: Jọnatan, Devid, na Sọl

Nchịkọta: Mgbe Devid gbuchara Golayat, Jọnatan ghọrọ ezigbo enyi Devid.

1 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ 1 SAMUEL 17:57–18:11; 19:1; 20:1-17, 41, 42.

Kọwaa otú i chere Sọl dị? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ 1 Samuel 10:20-23.)

․․․․․

Ọ ga-abụ na Devid dị afọ iri na ụma mgbe ya na Jọnatan matara. Olee otú ọ dị mgbe ahụ? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ 1 Samuel 16:12, 13.)

․․․․․

Olee otú i chere obi dị Devid na Jọnatan site n’ụda olu ha mgbe ha na-ahapụ ibe ha dị ka e dere ná ngwụcha 1 Samuel isi 20?

․․․․․

2 LEBAKWUO YA ANYA.

Akụkọ ahụ kwuru na “e kekọtara mkpụrụ obi Jọnatan na mkpụrụ obi Devid”—ma ọ bụ dị ka Baịbụl Contemporary English Version si sụgharịa ya, “Devid na Jọnatan ghọrọ ezigbo enyi.” (1 Samuel 18:1) Olee àgwà ndị Devid nwere bụ́ ndị ọ ga-abụ ha mere Jọnatan ji nwee mmasị n’ebe ọ nọ? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ 1 Samuel 17:45, 46.)

․․․․․

Jọnatan ji ihe dị ka iri afọ atọ tọọ Devid. Olee ihe ndị i chere nyeere ha aka ịghọ “ezigbo enyi” n’agbanyeghị na ha abụghị ọgbọ?

․․․․․

Olee ụfọdụ àgwà e ji ama ezigbo enyi, dị ka akụkọ ahụ na-emetụ n’ahụ́ gosiri? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ Ilu 17:17; 18:24.)

․․․․․

Olee ihe mere Jọnatan ji kwesị ntụkwasị obi n’ebe Devid nọ karịa n’ebe nna ya nọ?

․․․․․

3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .

Ọbụbụenyi.

․․․․․

Ikwesị ntụkwasị obi.

․․․․․

Mmadụ na ndị tọrọ ya ịbụ enyi.

․․․․․

Olee otú i nwere ike isi nweta ezigbo ndị enyi?

․․․․․

4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤ MAKA GỊNỊ?

․․․․․

Ọ BỤRỤ NA I NWEGHỊ BAỊBỤL, GWA NDỊÀMÀ JEHOVA KA HA NYE GỊ OTU, MA Ọ BỤ GỊ AMATAKWUO BANYERE YA NA www.watchtower.org NA www.pr418.com