Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ọkwá Nkà”

“Ọkwá Nkà”

Otú Ndụ Dị n’Oge Ndị Kraịst Narị Afọ Mbụ

“Ọkwá Nkà”

“Onye a ọ́ bụghị nwa ọkwá nkà ahụ?”—MATIU 13:55.

A MAARA Jizọs ọ bụghị naanị dị ka “nwa ọkwá nkà” kamakwa dị ka “ọkwá nkà.” (Mak 6:3) O yiri ka ọ̀ bụ nna ya n’ụwa, bụ́ Josef, kụziiri ya ọrụ a.

Olee nkà ndị ọ dị Jizọs mkpa ịmụta, oleekwa ngwá ọrụ ndị ọ dị mkpa ka ọ mụta otú e si eji ha arụ ọrụ mgbe ọ na-arụ ọrụ ọkwá nkà? Olee ihe ndị ọ ga-abụ na ọ rụụrụ ndị bi na Nazaret? Olee otú ọrụ ịkwa nkà a kụziiri ya mgbe ọ dị obere nwere ike isi metụta ndụ ya mgbe o toro?

Ọrụ Ezinụlọ Ihe osise dị n’okpuru na-egosi ebe nna na-akụziri ọkpara ya otú e si eji ihe e ji agbapu osisi agbapu osisi n’emerụghị ahụ́. Nwa ya nke obere na-ege ya ntị ma na-ele nnọọ ihe ha na-eme.

Ụmụaka ndị nwoke na-amalitekarị ịmụ ọrụ mgbe ha nọ ihe dị ka n’agbata afọ iri na abụọ na iri na ise. Ha na-amụkarị ọrụ ahụ n’aka nna ha. Ọzụzụ ahụ na-ewe ọtụtụ afọ, ụmụaka ahụ ga-agbasikwa mbọ ike ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịghọ ndị ọkwá nkà maara nke a na-akọ. Chegodị echiche ọtụtụ awa Josef na Jizọs na-aghaghị iji nọrịa—na-arụkọ ọrụ, na-ekwurịta okwu, Josef ana-akụzikwara Jizọs nkà ahụ. Obi ga-atọrịrị nnọọ Josef ụtọ mgbe ọ hụrụ na Jizọs amụtawala ọrụ ahụ!

Ọ Chọrọ Ihe Ọmụma, Ume, na Nkà Ọ dị onye ọkwá nkà mkpa ịmata ọdịdị osisi o ji arụ ọrụ. O nwere ike isi n’osisi ndị a na-adọ n’ógbè ya, dị ka saịpres, ok, sida, sịkamọ, na oliv, họrọ nke ọ ga-eji arụ ọrụ. Ma, ọkwá nkà nke narị afọ mbụ enweghị ọgbọ osisi ma ọ bụ ebe a na-ere ihe ndị e ji ewu ụlọ ọ ga-aga họrọ osisi a warala otú ọ chọrọ. Kama nke ahụ, ọ ga-aga n’ọhịa, họrọ osisi nke ọ chọrọ, gbutuo ya, bulatazie nnukwu osisi ahụ n’ụlọ ọrụ ya.

Olee ihe ndị ọkwá nkà ga-eji osisi ahụ o gbutere rụpụta? O nwere ike ịnọ ọtụtụ awa n’èzí, na-arụrụ ndị mmadụ ụlọ. Ọ ga-awa osisi ntụhie ndị a ga-eji kụọ uko ụlọ, rụọ steepụ, rụọ ibo ụzọ, windo, nakwa frem.

Ọkwá nkà ga-ejikwa osisi ahụ rụpụta arịa ụlọ. Ihe osise dị ebe a na-egosi ụfọdụ n’ime ha—kọbọd nwere drọwa, shelf, ma ọ bụ ibo (1); obere oche (2), oche ndabere (3), na ụdị tebụl (4) dị iche iche; na àkwà e ji enyiwe nwa ọhụrụ. Iji chọọ arịa ụfọdụ mma, o nwere ike ịkụnye osisi ndị a tụrụ nke ọma na ha. Iji chekwaa ihe ndị ahụ ma mee ka ha na-egbuke egbuke, o nwere ike ite ha mgbá aṅụ, ihe na-eme ka osisi na-egbuke egbuke, ma ọ bụ mmanụ.

Ọkwá nkà rụkwaara ndị ọrụ ubi bi n’ógbè ya ngwá ọrụ dị iche iche—yok (5) ndị e ji nnukwu osisi rụọ na ndụdụ, rek, na shọvel (6). Ọ́gụ̀ (7) ndị ọ na-arụ aghaghị isi ezigbo ike, n’ihi na ọnụ ha bụ́ ígwè ga na-akọ ala nkume. Ọ rụkwara trọk osisi (8) na ụgbọ ịnyịnya, jirikwa osisi tụọ ụkwụ ha ndị e ji naanị osisi rụọ ma ọ bụ ndị nwere spok osisi. Ọrụ ya nwere ike ịgụnye ịrụzi arịa ụlọ, ngwá ọrụ, na ihe ndị dị ka trọk na ụgbọ ịnyịnya.

Ì nwere ike iche n’echiche otú ọrụ Jizọs dị ka ọkwá nkà si metụta ọdịdị ya? Chegodị otú anwụ na-acha n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa ga-esi gbachuo akpụkpọ ahụ́ Jizọs, ọrụ ike ọ rụrụ ọtụtụ afọ emee ka akpụ aka ya pụtasịa, iji osisi ndị kpọrọ nkụ na anyụike, hama, na mma nkwọ emeekwa ka aka ya sie ike.

Ebe O Si Nweta Ihe Atụ Jizọs bụ ọkà n’iji ihe atụ ndị dị mfe nghọta, bụ́ ndị ndị mmadụ ma ama, akụzi ihe ime mmụọ ndị gbara ọkpụrụkpụ. Ò ji ihe ụfọdụ ndị ọ maara dị ka ọkwá nkà mee ihe atụ? Tụlee ụfọdụ ihe atụ ndị o mere bụ́ ndị o nwere ike ịbụ na ha sitere n’ihe ndị ọ maara dị ka ọkwá nkà. Ọ gwara otu ìgwè mmadụ, sị: “Gịnịzi mere i ji ele irighiri ahịhịa nke dị n’anya nwanna gị, ma i chebaraghị ntụhie dị n’anya nke gị echiche?” Ọkwá nkà ga-ama otú ntụhie na-eburu ibu. (Matiu 7:3) Jizọs mechara gwa ìgwè mmadụ ọzọ, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla nke jidere aka n’ọ́gụ̀ ma na-ele anya n’ihe ndị dị n’azụ nke kwesịrị nnọọ ekwesị maka alaeze Chineke.” Ọ ga-abụkwa na ọ rụrụ ọtụtụ ọ́gụ̀. (Luk 9:62) Jizọs ji ihe ọkwá nkà na-arụpụta mee ihe atụ mgbe ọ na-akpọ ndị mmadụ otu n’ime òkù ndị kasị eru n’obi ọ kpọrọ. Jizọs kwuru, sị: “Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m. . . . Yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Matiu 11:29, 30) O doro anya na Jizọs maara otú e si arụ yok ‘na-adịghị egbu mgbu,’ ma ọ bụ nke na-adị nnọọ mfe obubu.

O nwere ike ịbụ na ndị na-emegide Jizọs bu n’uche ịkparị ya mgbe ha kpọrọ ya “nwa ọkwá nkà.” N’agbanyeghị nke ahụ, dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, Ndị Kraịst n’oge a na-ele ya anya dị ka ihe ùgwù iso onye a dị umeala n’obi nke bụ́bu ọkwá nkà.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 26]

Igbe Ọrụ Ọkwá Nkà

Ọkwá nkà nke narị afọ mbụ dị ka Jizọs ga-ama otú e si eji ngwá ọrụ ndị e sere ebe a arụ ọrụ. Mma nkwọ ya (1) bụ mma nwere ezé e ji osisi rụọ isi ya nke ọ ga na-eji akwọbi osisi. Ọ ga-eji ihe e ji atụ ebe e jikọtara osisi abụọ (2) atụ ihe ọ na-arụ, jirikwa plọm eriri (3) mee ka ọ kwụrụ chịm. N’igbe ya, ọ ga-enwekwa plọm nkịtị (4), okporo osisi e ji atụ ihe (5), mma e ji akpụcha osisi nke e nwere ike idozigharị ezé ya dị nkọ edozigharị iji kpụchaa osisi gbara akpụ ka ọ kwọwa mụrụmụrụ (6), nakwa anyụike (7) ọ ga na-eji egbutu osisi.

Ọkwá nkà na-eji ihe o ji ejide osisi (8) na ihe o ji akpọpu osisi (9) egbubi ma na-akpụcha osisi ndị e ji akpa ákwà. N’ọnụ ọnụ igbe ya, i nwere ike ịhụ hama osisi (10) e ji akụba ihe ndị yiri ntú iji jikọta osisi abụọ ma ọ bụ jiri ya na-akụba chịzụl. Ihe ndị ọzọ e gosiri ebe a bụ obere mma nkwọ nwere aka (11), mma e ji akọ osisi (12) bụ́ nke e ji akpụcha osisi, na ntú ụfọdụ (13). E nwere hama ígwè n’ihu igbe ọrụ ahụ (14) na àga (15) bụ́ nke e ji ebu ụzọ akpụcha nnukwu osisi. N’elu igbe ahụ, e nwere obere mma (16) nakwa ụdị chịzụl (17) dị iche iche. Ihe e ji agbapu osisi (18) gbabekwaara n’akụkụ igbe ọrụ ahụ.