Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Òkù A Na-akpọ Mmadụ Niile!

Òkù A Na-akpọ Mmadụ Niile!

Òkù A Na-akpọ Mmadụ Niile!

À NA-AKPỌ ha ka ha gaa mee gịnị? Ọ bụ ka ha gaa leta otu n’ime alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, bụ́ nke a na-akpọ Betel. E nwere otu narị alaka ụlọ ọrụ na iri na asatọ n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ndị gara leta Betel na-ejikarị obi ụtọ ekwu otú obi dị ha maka ihe ha hụrụ ebe ahụ.

Mgbe otu onye ka malitere ịmụ Baịbụl ọhụrụ gara alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Meksiko wee hụ otú ọtụtụ ndị nọ ebe ahụ si jiri obi ụtọ na-arụsi ọrụ ike, nke a masịrị ya nke ukwuu nke mere ka ọ jụọ, sị: “Olee ihe m ga-eme ka m ruo eru ịrụ ọrụ ebe a?” A gwara ya, sị: “A ga-ebu ụzọ mee gị baptizim. E mechaa, ọ ga-adịkwa mma ma ị ghọọ ọsụ ụzọ, ya bụ, onye na-ekwusa ozi ọma oge niile.” Nwa okorobịa ahụ mere ihe a gwara ya nke mere ka a kpọọ ya ọrụ na Betel dị na Meksiko mgbe afọ abụọ gafere, bụ́ ebe ọ na-eje ozi kemgbe iri afọ abụọ.

Gịnị Ka Betel Pụtara?

“Betel” bụ okwu Hibru nke pụtara “Ụlọ Chineke.” (Jen. 28:19) A na-eji ngwá ọrụ ndị dị n’alaka ụlọ ọrụ dị iche iche ebi Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ma na-ebugara ha ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ Ndịàmà Jehova e nwere n’ụwa niile. Ndị na-arụ na Betel, bụ́ ndị fọrọ obere ka ha ruo puku iri abụọ, bụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị si ebe dị iche iche nakwa mba dị iche iche. Ha ji obi ha dum na-ejere Jehova na ụmụnna ha ozi oge niile. Ndị jerela ozi ọtụtụ afọ ebe ahụ na ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa ike ka juru n’ahụ́ na-arụkọ ọrụ. Ná mgbede nakwa ná ngwụcha izu, ndị na-eje ozi na Betel na-aga ọmụmụ ihe n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị ha nso, ha na-agakwa ozi ọma. Ha na-ejikwa oge ha na-anọghị n’ọrụ amụ Baịbụl, atụrụ ndụ, jirikwa ya eme ihe ndị ọzọ dị ha mkpa.

A na-enye ndị na-arụ na Betel obere ego mmachi akpa kwa ọnwa. Ha na-eri nri dị ụtọ nke na-edozi ahụ́. Ha bikwa n’ụlọ dị ọcha nke na-eme ka ahụ́ ruo ha ala. A rụghị ụlọ obibi ndị dị na Betel ka họtel ndị dị oké ọnụ. Ma, ha mara mma. Ndị gara ileta Betel na-enwekarị mmasị n’otú e si na-elezi ụlọ ndị dị na ya nakwa ihe ndị e ji chọọ gburugburu ya mma anya. Ha na-enwekwa mmasị n’otú ihe niile si aga n’usoro nakwa n’otú ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ si eji obiọma na-arụkọ ọrụ ọnụ. Onye ọ bụla n’ime ha na-arụsi ọrụ ike, ma, o nweghị onye ọrụ ya na-egbochi imesapụrụ onye ọzọ ihu. O nweghị onye ebe o si ma ọ bụ ọrụ ya na-eme ka o ledawa ndị ọzọ anya. O nweghị ọrụ na-adịghị mkpa, ya sọkwa ya ya bụrụ mkpocha na nhicha, ilekọta okooko, isi nri, ma ọ bụkwanụ ibi akwụkwọ ma ọ bụ ịrụ n’ọfịs. Ndị Betel na-arụkọ ọrụ ọnụ iji kwado ozi ọma Ndịàmà Jehova na-ezi.—Kọl. 3:23.

Ihe Ndị Betel Ụfọdụ Kwuru

Ka anyị tụlee ihe banyere ndị na-arụ na Betel. Gịnị mere ha ji na-arụ ọrụ n’ebe ahụ? Were Mario dị ka ihe atụ. Mgbe ọ batara n’ọgbakọ, ọ na-arụ ezigbo ọrụ n’otu ụlọ ọrụ na-arụ ụgbọ ala na Jamanị, o nwekwara olileanya inwe ego ma ya nọgide na-arụ ebe ahụ. Ọ dịghị anya e mere ya baptizim, ya agaa na Betel dị ná mba ha rụọ ọrụ otu izu. Ọ rụrụ ọrụ n’ebe a na-ebi akwụkwọ. Mario chọpụtara na e nwere ihe dị iche ná ndị ya na ha na-arụ ọrụ na Betel na ndị nke ya na ha na-arụbu ọrụ tupu ya abịa Betel. Nke a mere ka o dejupụta fọm a ga-eji kpọọ ya ọrụ oge niile na Betel. N’agbanyeghị na ihe ahụ o mere gbagwojuru ọtụtụ ndị ikwu ya na ndị ọrụ ha anya, ugbu a, Mario ji obi ụtọ na-arụ ọrụ na Betel dị na Jamanị.

Ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ na Betel agụghị oké akwụkwọ ma ọ bụ nwee aka ọrụ pụrụ iche. Ọ bụ otú a ka ọ dị Abel, bụ́ onye rụrụla ọrụ afọ iri na ise na Betel dị na Meksiko. Ọ sịrị: “Amụtala m ọtụtụ ihe na Betel. Amụtala m otú e si eji ọkpọka ígwè e ji ebi akwụkwọ arụ ọrụ. Ama m na m chọọ, m ga-eji nke a nwee nnukwu ego ma m pụọ Betel, ma, agaghị m enwe ihe ndị m na-enwe na Betel, dị ka ahụ́ iru ala na afọ ojuju, bụ́ nke na-eme ka m ghara ịna-echegbu onwe m ma ọ bụkwanụ soro na-azọ ọkwá ọtụtụ ndị na-azọ n’ebe ha na-arụ ọrụ. Amụtala m ezigbo ihe nke baara m uru ná ndụ, nke mere ka mụ na Jehova dị ná mma. E nweghị mahadum nke ga-eme ka mụ na Jehova dị ná mma otú a.”

Ịga Leta Betel Ga-agba Gị Ume

Ịga leta Betel nwere ike ime ka mmadụ nọsie ike n’ọgbakọ. Ọ bụ ihe mere Omar, onye bi na Meksiko. Mama ya kụziiri ya eziokwu dị na Baịbụl. Ma, mgbe ọ dị afọ iri na asaa, ọ kwụsịrị ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma. O mechara tinye aka n’omume rụrụ arụ, na-achụkwa ego ka à na-anwụ anwụ. Mgbe ọ na-arụrụ otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka ịgbasa ozi ọrụ, o so ná ndị e zigara ka ha gaa Betel dị na Meksiko kụziere ndị Betel otú e si eji ngwá ọrụ ụfọdụ arụ ọrụ. Omar kwuru, sị: “Mgbe anyị kụzichara, e dugharịrị anyị na Betel. Ihe m hụrụ nakwa otú e si jiri obiọma mesoo m mere ka m chebara ndụ ọjọọ m na-ebi echiche. Amaliteghachiri m ịga ọmụmụ ihe n’egbughị oge, malitekwa ịmụ Baịbụl. E mere m baptizim mgbe ọnwa isii m gara leta Betel gachara. Ana m ekele Jehova maka otú e si gbaa m ume mgbe ahụ m gara leta Betel.”

E si na nwata kụziwere Masahiko, bụ́ onye Japan, Baịbụl. Ma, ọ malitere iche na ọgbakọ anaghị ekwe ya emegharị ahụ́. O tinyere onwe ya kpamkpam n’ihe niile a na-eme n’ụlọ akwụkwọ ha, kwụsịkwa ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Masahiko sịrị: “Otu ụbọchị, ezinụlọ anyị na ụfọdụ ndị enyi m nọ n’ọgbakọ chọrọ ịga leta Betel. Eso m ha gaa mgbe ndị ezinụlọ anyị siri ọnwụ na m ga-eso ha. Enwetụbeghị m ụdị obi ụtọ m nwere ka anyị na-agagharị na Betel. Kemgbe mụ na ndị enyi m na-abụghị ndị Jehova nọwara, enwetụbeghị m ụdị obi ụtọ m nwere mgbe m so ndị Jehova gaa leta Betel. Ọ gụwara m agụụ ịbụ ezigbo Onye Kraịst, ekpebikwara m ịmụ Baịbụl.” Masahiko na-eje ozi oge niile ugbu a n’ọgbakọ ya.

Otu Onyeàmà si Fransị kwaga Mọsko ịga rụọ ọrụ. Ọ hụghị Ndịàmà Jehova mgbe o ruru ebe ahụ, nke a kpakwara adịm ná mma ya na Jehova aka ọjọọ. O tinyere aka n’omume ọjọọ, mechaakwa lụọ onye na-abụghị Onyeàmà. Otu nwanna nwaanyị si Fransị gaa leta ya, ha abụọ gakwara leta Betel dị na Senti Pitasbọg, nke dị na Rọshịa. O dere, sị: “Otú e si nabata anyị nke ọma na Betel metụrụ m n’obi. Udo dị nnọọ ebe ahụ. Mmụọ Jehova dịkwa na ya. Gịnịdị mere m ji jụọ oyi n’ọgbakọ? Mgbe m gachara leta Betel, ekpekuru m Jehova ekpere ka o nyere m aka, amalitekwara m ịmụrụ ụmụ m ihe nke ọma.” E wezụga aka e nyeere nwanna a jụburu oyi ka ya na Chineke dịghachi ná mma, ihe ọzọ nyeere ya aka ma gbaa ya ume bụ nleta ọ gara leta Betel.

Oleekwanụ otú obi na-adị ndị na-amachaghị ndị Ndịàmà Jehova bụ, bụ́ ndị gara leta Betel? N’afọ 1988, Alberto, bụ́ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị a ma ama, gara leta Betel dị na Brazil. Otú ebe ahụ si dị ọcha, ihe niile adịrịkwa n’usoro, masịrị ya. Ọ masịkwara ya na e nweghị ihe a na-ezo ezo ebe ahụ. Tupu ya agaa leta Betel, ọ gara leta seminarị ebe nwanne nwunye ya bụ ụkọchukwu. Alberto chọpụtara na e nwere ihe dị iche na Betel na seminarị. O kwuru, sị: “A na-ezo ezo eme ihe ọ bụla a na-eme na seminarị. Mgbe ọ gachara leta Betel, ọ dịghị anya, ya ekwere ka a mụwara ya Baịbụl, kwụsịkwa itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụkwa okenye ugbu a.

Bịa Leta Betel!

Ọtụtụ ndị na-agbasi mbọ ike ịga leta alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke dị ná mba ha. Dị ka ihe atụ, na Brazil, Paulo na Eugenia chekwara ego afọ anọ ka ha wee nwee ike ịgba ụgbọ gaa Betel e nwere ná mba ahụ, bụ́ njem ga-ewe ha abalị abụọ nke dị puku kilomita atọ. Ha sịrị: “Mbọ niile ahụ anyị gbara iji gaa ya efughị ọhịa. Anyị aghọtakwuola ọgbakọ Jehova nke ọma. Mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ na anyị agwa ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ihe a na-arụ na Betel, ha na-ajụ anyị, sị, ‘Ùnu agatụla ebe ahụ?’ Ma, ugbu a anyị na-aza ha ee.”

È nwere alaka ụlọ ọrụ nakwa Betel ná mba unu ma ọ bụ mba dị unu nso? Gaa leta ya. A ga-anabata gị nke ọma, ọgịga ị ga-aga Betel ga-emekwa ka i jirikwuo ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi.

[Foto dị na peeji nke 18]

Mario

[Foto dị na peeji nke 18]

Abel

[Foto dị na peeji nke 18]

Jamanị

[Foto dị na peeji nke 18]

Japan

[Foto dị na peeji nke 18]

Brazil