Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otu Ụbọchị Anyị Nọrọ n’Ụsọ Oké Osimiri

Otu Ụbọchị Anyị Nọrọ n’Ụsọ Oké Osimiri

Akwụkwọ Ozi Si Grenada

Otu Ụbọchị Anyị Nọrọ n’Ụsọ Oké Osimiri

Ọ BỤRỤ na e kenye gị ọrụ ịga kwusaa ozi ọma ná mba ọzọ, ị ga-achọpụta na ọ na-enye ezigbo ọṅụ. Dị ka nwatakịrị ihe juru anya na-achọ ịmata ihe ọ na-amaghị, ị ga na-eche ụdị ndị bi n’ebe ahụ, otú ebe ahụ dị, na ihe ndị ị ga-ahụ n’ozi.

Mgbe e kenyere mụ na nwunye m ịga kwusaa ozi ọma na Grenada, bụ́ nke nwere nnukwu ụsọ oké osimiri nwere ihe dị ka ebe iri anọ na ise ndị mmadụ na-aga atụrụ ndụ, anyị nọ nnọọ na-eche otú ụsọ oké osimiri ndị ahụ ga-adị. N’oge na-adịghị anya, anyị nwere obi ụtọ ịnọ otu ụbọchị n’otu n’ime ha, ma ihe kacha mee anyị obi ụtọ bụ ndị mmadụ, ọ bụghị anyanwụ na-acha ebe ahụ na iji ụgbọ epeepe agba n’elu mmiri.

Nnukwu Ụsọ Oké Osimiri Anse adịghị nnọọ anya n’ụlọ anyị na Grenada ma i jiri ụgbọala—ma ịga ebe ahụ tọgburu anyị nnọọ atọgbu! Ụzọ ahụ dị rịgọ rịgọ, mee ka anyị hụ ụfọdụ n’ime ebe ndị kacha mma anyị hụtụrụla. Akwụkwọ ndụ jupụtara n’akụkụ ugwu ndị dị n’ebe ahụ. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ebe ọ bụla anyị lere anya, anyị na-ahụ nnukwu ugwu, oké ọhịa, nsụda mmiri, na oké osimiri ndị mara mma. Ka a sịkwa ihe mere ndị ọbịa si ebe niile n’ụwa ji abịa eleta ebe a! Ebe a mara nnọọ mma nke na ọkwọ ụgbọala aghaghị ịkpachara anya ka anya ghara ihie ya. Ụzọ ndị dị ebe a dị rịgọ rịgọ, n’ebe ụfọdụkwa, kpaa nnọọ akpaa nke na ị ga na-eche otú ụgbọala ga-esi chaara ibe ya.

Anyị rutere n’ebe a ga-eme mgbakọ ahụ nke a na-akpọ Grenada Trade Center, nke dị n’akụkụ otu okporo ụzọ dị nso ná Nnukwu Ụsọ Oké Osimiri Anse. N’oge na-adịghị anya otu ìgwè Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị fọrọ obere ka ha ruo narị mmadụ isii, gbakọtara maka nzukọ na ọmụmụ Baịbụl na-enye ọṅụ nke ga-ewe otu ụbọchị. Ụbọchị a kacha pụọrọ Lesley na Daphne iche, bụ́ di na nwunye dị afọ iri asaa na ụma. A na-aga ime Lesley baptizim. O teela Daphne tụwara nnọọ anya nke a, n’ihi na e mere ya baptizim dị ka Onyeàmà Jehova n’afọ 1958.

Nye Ndịàmà, baptizim—bụ́ nke a na-eme site n’imikpu mmadụ kpamkpam n’ime mmiri—nwere ihe dị mkpa ọ pụtara. Ọ bụ ihe mmadụ na-eme mgbe ọ mụtarala eziokwu Baịbụl nke ọma ma tinyewe ya n’ọrụ ná ndụ ya. Ọ bụ ihe mmadụ na-eme n’ihu ọha iji gosi mmadụ niile na ya ararala onwe ya nye Jehova Chineke.

A gwara m ka m gwa ndị ahụ gbakọtaranụ okwu banyere ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru maka baptizim. Mgbe m kwuchara okwu ahụ, Lesley na mmadụ abụọ ndị ọzọ a na-agakwa ime baptizim guzoro ọtọ. O yi otu uwe ọcha e dere nke ọma, kpọọ taị, ọchị ejukwa ya ọnụ. Ajụrụ m ha, sị: “Ì chegharịala wee hapụ mmehie gị, rarakwa onwe gị nye Jehova ime uche ya?” Ị ga-ahụ nnọọ otú ya na ndị nke ọzọ si jiri obi ha niile zaa, sị, “Ee!”

Obi tọrọ m ezigbo ụtọ n’ihi na m maara Lesley nke ọma. Ruo ọtụtụ afọ, o kweghị amụ Baịbụl. Ya na nwunye ya letaziri àgwàetiti ọzọ. Ka ha nọ ebe ahụ, ha kpebiri na onye nke ọ bụla ga-aga okpukpe nke ya. Lesley gwara Daphne, sị: “Gaa chọọchị nke gị ka m gaa nke m.”

Lesley bugara Daphne n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma gawa na chọọchị Anglịkan dị nso n’ebe ahụ. Mgbe chọọchị gbasara, Lesley bịaghachiri n’Ụlọ Nzukọ Alaeze iburu nwunye ya. N’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, ndị dị obiọma na-amụmụ ọnụ ọchị gbara ya gburugburu ma nabata ya nke ọma, n’agbanyeghị na ha ahụtụbeghị ya mbụ. Nke ahụ metụrụ Lesley n’ahụ́. O nweghị onye tụpụụrụ ya ọnụ na chọọchị ya. Lesley gwara Daphne, sị: “Emekataghị m gaa chọọchị ahụ ọzọ. O nwedịghị onye mere anya ka ọ̀ hụrụ m, ma ụkọchukwu. O nweghị onye kelere m. Otú m si banye ka m si pụta.” Mgbe Lesley si ebe ahụ pụọ, ọ laghachighị ọzọ.

Mgbe nke ahụ gachara, Lesley malitere ịmụsi Okwu Chineke ike. Ugbu a, o ruokwala eruo ka e mee ya baptizim. Ndị ahụ a na-aga ime baptizim gawara n’ụsọ oké osimiri, anyị sochikwara ha. Ebe ọ bụ na oké osimiri dị nnọọ nso n’ebe a, ọ dịghị mkpa inwe ọdọ mmiri ebe a ga na-eme ndị bịara mgbakọ baptizim, dị ka a na-eme n’ihe ka ọtụtụ n’ebe Ndịàmà Jehova na-eme mgbakọ. Naanị ihe anyị na-eme ebe a bụ ịgafe okporo ụzọ gawa n’ụsọ oké osimiri.

Nnukwu Ụsọ Oké Osimiri Anse bụ ụsọ oké osimiri mara ezigbo mma nke nwere ájá ọcha ruru kilomita atọ n’ogologo, nke mmiri ya na-acha anụnụ anụnụ, na-ekpokwa ọkụ site n’afọ ruo n’afọ. O juru ndị njem bịara ebe ahụ anya mgbe anyị rutere n’ụsọ oké osimiri ahụ, ha ahụ ndị nwoke kpọrọ taị, na ndị nwaanyị yi uwe elu na sket. Lesley agbanweela uwe ya ma yirizie polo na drọọsụ e ji egwu mmiri. Cheedị otú obi dị Daphne ịhụ ka e mere di ya baptizim ihe dị ka iri afọ ise e mechara ya nke ya! Anwụ nọ na-achasi ike n’ehihie ahụ, ọnụ ọchị ekwekwaghị Daphne fụnwuo ọkụ. Ndị njem nọ ebe ahụ sodị anyị na-aṅụrị ọṅụ. Ha so na-akụ aka ka a na-eme onye nke ọ bụla baptizim.

Ụsọ oké osimiri a enyewelarị Onye Okike anyị otuto n’ihi ihu igwe ya na-acha anụnụ anụnụ, ájá ọcha ya, na ebili mmiri ya. O nyedịrị Chineke otuto karị ka mmadụ atọ ahụ e mere baptizim si na mmiri ya na-apụta. Obi ụtọ anyị nwere ịhụ ha karịrị obi ụtọ anwụ na-achasa anyị n’ahụ́ mere anyị. Ụbọchị a pụrụ nnọọ iche. Ụbọchị a anyị ji nọọ n’ụsọ oké osimiri bụụrụ Lesley na Daphne ụbọchị kacha mkpa ha hụtụrụla ná ndụ ha.