Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Narị Afọ Ise Okpukpe Calvin Malitere Olee Ihe Ọ Rụpụtarala?

Narị Afọ Ise Okpukpe Calvin Malitere Olee Ihe Ọ Rụpụtarala?

Narị Afọ Ise Okpukpe Calvin Malitere Olee Ihe Ọ Rụpụtarala?

A MỤRỤ Jean Cauvin (John Calvin) n’obodo Noyon, Frans, n’afọ 1509. Ọ malitere òtù okpukpe metụtara nnọọ ndụ ọtụtụ ndị n’ebe dị iche iche na Yurop, Amerịka, Ndịda Afrịka na n’ebe ndị ọzọ. E weere ya dị ka otu n’ime Ndị Ndozigharị chọọchị a kacha mara amara n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa.

Taa, mgbe ihe dị ka narị afọ ise a mụrụ Calvin gaferela, echiche na nkụzi Calvin ka na-ewu ewu n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ na chọọchị Protestant ndị dị ka Reformed, Presbyterian, Congregational, Puritan, na ndị ọzọ. Na Septemba afọ gara aga, Òtù Jikọtara Chọọchị Ndị E Dozigharịrị Edozigharị n’Ụwa Niile kwuru na ndị òtù ha dị nde iri asaa na ise n’otu narị mba na asaa.

Esemokwu Ya na Chọọchị Katọlik

Nna Calvin bụ ọkàiwu na odeakwụkwọ nke chọọchị Katọlik dị na Noyon. O nwere ike ịbụ na ọrụ ya mere ka ọ hụ ọtụtụ àgwà ọjọọ ndị ụkọchukwu na-akpa n’ebe niile n’oge ahụ. Anyị enweghị ike ikwu ma nke a ọ̀ kpatara ime mkpesa ma ọ bụ nnupụisi, ma ka oge na-aga, chọọchị ahụ chụpụrụ nna John na nwanne John nke nwoke. Mgbe nna John nwụrụ, o siiri John ike ime ka Ndị Kraịst lie nna ya. Ọ dị ka ihe ahụ ò mere ka John kwụsịchaa ịtụkwasị Chọọchị Katọlik obi.

Ihe ka ọtụtụ n’akwụkwọ ndị e dere banyere Calvin enweghị ezigbo ihe ha kwuru banyere ya mgbe ọ na-eto eto ma ọ́ bụghị naanị na ọ na-anọrọ onwe ya nakwa na ọ bụghị onye oké okwu. Ọbụna mgbe ọ na-aga akwụkwọ na Paris, Oliọn, na Bọj, o yiri ka ò nwere naanị ndị enyi ole na ole. Ma Calvin nwere ụbụrụ na-aghọ nkọ. Ma nke a ma ịdị uchu ya n’ọrụ—ọ na-amụ ihe kwa ụbọchị malite n’elekere ise nke ụtụtụ ruo etiti abalị—nyeere ya aka ịghọ ọkachamara n’iwu tupu ya agbaa afọ iri abụọ na atọ. Ọ mụkwara asụsụ Hibru, Grik, na Latịn iji mụọ Baịbụl. Ma, ihe a kacha jiri mara Calvin bụ na ọ naghị eji ọrụ egwuri egwu, bụ́ àgwà ọtụtụ ndị ka ji mara ndị okpukpe Calvin ọbụna taa.

Ka nke a na-eme, na Jamanị ha na ha gbara agbata obi, Martin Luther nọ na-akatọ Chọọchị Katọlik n’ezoghị ọnụ n’ihi nrụrụaka ha na ozizi ndị na-esighị na Baịbụl ha na-ezi. Ọtụtụ ndị kwuru na n’afọ 1517, ọ mapawara akwụkwọ o dere mkpesa iri itoolu na ise n’ibo ụzọ otu chọọchị dị na Witinbọg, na-ekwu na e kwesịrị idozigharị ihe na chọọchị. Ọtụtụ kwetara ihe Luther kwuru, n’oge na-adịghịkwa anya, Ndozigharị okpukpe gbasara na Yurop dum. Ọ bụghị ihe ijuanya na nke a kpaliri mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ n’ọtụtụ ebe, a nọkwa na-akpagbu ndị ahụ na-eme mkpesa, ma ọ bụ ndị Protestant, maka ịkọsa echiche ha. Na 1533 na Paris, enyi Calvin bụ́ Nicholas Cop kwuru okwu ihu ọha kwadoro Luther, ebe ọ bụkwa na Calvin nyeere ya aka dee okwu ahụ, ma ya ma Cop gbara ọsọ ndụ. Ọ dịkwaghị mgbe Calvin lọghachiri ibi na Frans ọzọ.

N’afọ 1536, Calvin bipụtara nnukwu akwụkwọ ọgụgụ bụ́ Institutes of the Christian Religion banyere okpukpe Protestant. Onye o degaara akwụkwọ a bụ Eze Francis nke Mbụ iji gbachitere ndị Protestant bụ́ ndị Frans, ndị e mechara kpọwa ndị òtù Hugues. Calvin gbara ozizi ndị Katọlik ụkwụ ma kwado ihe okpukpe ya gbadoro ụkwụ na ya—ọbụbụeze Chineke. E wezụga otú akwụkwọ Calvin ahụ bụ́ Institutes si metụta okpukpe, a makwa ya ama maka otú o si metụta asụsụ French na otú e si ede ya. E toro Calvin dị ka otu n’ime Ndị Ndozigharị a kacha mara amara. O mechara biri na Jeniva, Swizaland, malitekwa n’afọ 1541 gawa, o mere obodo ahụ ebe bụ́ isi o si eme mgbanwe na chọọchị.

Ịmalite Ndozigharị Okpukpe na Jeniva

Calvin gbanwere nnọọ Jeniva. Akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of Religion kwuru na mmasị o nwere n’omume ọma na ezi omume mere ka ọ gbanwee Jeniva site “n’obodo nwere aha ọjọọ gaa na nke ndị niile bi na ya na-erube isi n’iwu.” E nwekwara ihe ndị ọzọ mere ka e nwee mgbanwe n’obodo ahụ. Ọkà mmụta bụ́ Sabine Witt, onye na-elekọta Ụlọ Ndebe Ihe Mgbe Ochie Ndị Jamanị dị na Belin, kọwara, sị: “N’ihi agha okpukpe ndị a lụrụ na Frans, ọnụ ọgụgụ ndị bi [na Jeniva] mụbara okpukpu abụọ n’ime afọ ole na ole n’ihi ọtụtụ puku ndị Protestant gbatara ọsọ ndụ na ya.” Ndị òtù Hugues, bụ́ ndị na-arụsi ọrụ ike ka Calvin, mere ka obodo ahụ baa ọgaranya, mee ka Jeniva ghọọ ebe bụ́ isi a na-ebi akwụkwọ ma na-emepụta klọọkụ.

Ndị si n’obodo ndị ọzọ gbatakwara ọsọ ndụ na Jeniva, ma ọtụtụ ndị si Ingland, bụ́ ebe Eze Nwaanyị Meri nke Mbụ na-eyi ndị Protestant egwu. Ebe ọ bụ na ihe ka ọtụtụ n’ime ndị okpukpe Calvin bụ ndị a chụpụrụ n’obodo ha maka na ha ekweghị ihe ọha na eze kweere, ha malitere ihe akwụkwọ okpukpe bụ́ Christ in der Gegenwart (Ndị Kraịst Ọgbara Ọhụrụ) kpọrọ “okpukpe ndị a na-akpagbu akpagbu.” Na 1560, ndị ahụ gbara ọsọ ndụ bipụtara Geneva Bible, bụ́ Baịbụl Bekee mbụ nwere nọmba n’amaokwu ya. N’ihi otú Baịbụl ahụ si pee mpe, o mere ka ọ dịrị ndị mmadụ mfe ịmụ Okwu Chineke n’onwe ha. O nwere ike ịbụ nsụgharị Baịbụl a ka ndị Puritan ji mgbe ha kwagara Kọntinent Ebe Ugwu Amerịka n’afọ 1620.

Ma, ọ bụghị mmadụ niile ka Jeniva chebere. Michael Servetus, bụ́ onye a mụrụ n’afọ 1511 na Spen, mụrụ Grik, Latịn, na Hibru, gụọkwa nkà mmụta ọgwụ na ahụ́ ike, ọ ga-abụkwa na ya na Calvin matara mgbe ha abụọ na-agụ akwụkwọ na Paris. Servetus mụtara na Baịbụl na ozizi Atọ n’Ime Otu esighị n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ gbalịrị idegara Calvin akwụkwọ n’isiokwu ahụ, ma Calvin lere Servetus anya dị ka onye iro ya. Ndị Katọlik kpagburu Servetus na Frans, ya agbakwuru Calvin n’obodo ya, bụ́ Jeniva. Kama ịnabata ya nke ọma, e jidere ya, kpee ya ikpe izi ozizi nduhie, ma kpọọ ya ọkụ n’elu osisi n’afọ 1553. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Friedrich Oehninger kwuru, sị: “Ogbugbu e gburu Servetus nọgidere na-ete ndụ na ọrụ onye ahụ gaara abụ nnukwu Onye Ndozigharị [Calvin] unyi.”

Calvin dere ọtụtụ akwụkwọ ka ọ na-agbalị idozigharị ihe na chọọchị. A sịrị na o dere ihe karịrị otu narị akwụkwọ e ji eme nnyocha na otu puku akwụkwọ ozi, kwuokwa ihe dị ka puku okwuchukwu anọ na Jeniva. N’oge niile ahụ, ọ bụghị naanị na Calvin kụziri echiche ya banyere otú okpukpe Ndị Kraịst kwesịrị ịdị, ọ gbalịkwara ime ka ndị mmadụ bie ndụ otú o chere Ndị Kraịst kwesịrị isi bie ndụ, karịchaa na Jeniva, bụ́ ebe o bu n’uche na ọ ga-aghọ obodo Chineke. *

Gịnị ka mbọ Calvin gbara idozigharị ihe na chọọchị na Jeniva rụpụtara? Ụlọ Ọrụ Mba Swizaland Na-ahụ Maka Ọnụ Ọgụgụ kwuru n’afọ 2000 na ọ bụ naanị mmadụ iri na isii n’ime otu narị mmadụ ọ bụla na Jeniva bụ ndị Chọọchị Reformed (nke Calvin), ndị Katọlik karịkwara ndị okpukpe Calvin n’obodo ahụ.

Adịghị n’Otu Okpukpe Eju Ebe Niile

Mgbe Ndozigharị ahụ malitere, obodo na steeti dị iche iche kwupụtara okpukpe nke ha dụnyeere úkwù, ma ọ̀ bụ Chọọchị Katọlik, nke Luther, ma ọ bụ nke Calvin, bụ́ nke mere ka e nwee nnọọ esemokwu okpukpe na Yurop. Ọ bụ ezie na Ndị Ndozigharị nwere otu olu n’ịkatọ Chọọchị Katọlik, ha ekwenyereghị ibe ha. Ọkà mmụta bụ́ Witt, bụ́ onye e kwuburu ihe o kwuru, kwuru, sị: “E nwedịghị nkwekọrịta n’ozizi okpukpe ndị Protestant.” Ọ bụ ezie na ha niile kwetara na okpukpe Ndị Kraịst kwesịrị ịgbakwasị ụkwụ na Baịbụl, e nwere ezigbo ọdịiche n’ozizi ha. Okwu a kpụ n’ọnụ mgbe ahụ bụ ihe Nri Anyasị Ikpeazụ na ọnụnọ Kraịst pụtara. Ka oge na-aga, okpukpe Calvin malitere ịkụzi otu n’ime ozizi ya ndị kacha ese okwu: ozizi akara aka.

E nwere ọtụtụ nrụrịta ụka banyere otú e kwesịrị isi kọwaa akara aka. Otu ìgwè ndị okpukpe Calvin kwuru na tupu ụmụ mmadụ emehie, Chineke ekpebiela na mmadụ ole na ole ọ họọrọ ga-enweta nzọpụta site n’aka Kraịst, ebe ndị nke ọzọ ga-ala n’iyi. N’ihi ya, ìgwè a kweere na ọ bụ onye Chineke kpebiri ka a ga-azọpụta nakwa na mmadụ niile ahaghị. Ìgwè ndị okpukpe Calvin ndị ọzọ chere na mmadụ niile nwere ohere inweta nzọpụta, nakwa na ọ dị n’aka onye ọ bụla ịhọrọ ma ọ̀ ga-enweta ya ma ọ bụ na ọ gaghị enweta. Nke a pụtara na nzọpụta bụ ihe mmadụ ga-eji aka ya họrọ. Ndị okpukpe Calvin rụrịtara ụka ruo ogologo oge Calvin nwụchara n’isiokwu ndị dị ka ihe ndị Chineke kara aka, mmadụ inwere onwe ya ime nhọrọ, na mmadụ niile inwe ohere hà nhata.

Ihe Ndị Si n’Okpukpe Calvin Pụta

Na narị afọ nke iri abụọ, okpukpe Calvin bụ́ Dutch Reformed Church gbakwasịrị ụkwụ n’ozizi akara aka kwuo na ịkpa ókè agbụrụ na Saụt Afrịka adịghị njọ. Nelson Mandela, bụ́ onye ghọrọ onye isi ojii mbụ chịrị mba Saụt Afrịka kwuru banyere otú gọọmenti si ebuli ndị ọcha elu karịa ndị ojii, sị: “Chọọchị Dutch Reformed Church kwadoro echiche ahụ, bụ́ nke mere ka ịkpa ókè agbụrụ yie ihe ziri ezi na chọọchị, site n’ikwu na ndị ọcha Saụt Afrịka bụ ndị Chineke họọrọ, ndị ojii abụrụ ndị na-abachaghị uru. N’anya ndị ọcha Saụt Afrịka, chọọchị kwadoro ịkpa ókè agbụrụ.”

Tupu afọ 2000, chọọchị Dutch Reformed Church rịọrọ mgbaghara n’ihu ọha maka ịkwado ịkpa ókè agbụrụ. N’ihe ha deere ọha na eze nke a kpọrọ Nkwupụta Rustenburg, ndị ndú chọọchị ahụ kwetara, sị: “Ụfọdụ n’ime anyị ji nnọọ Baịbụl kwadoo ịkpa ókè agbụrụ, mee ka ọtụtụ ndị kwere na ọ dị Chineke mma.” Ọ bụghị naanị na nkwado chọọchị kwadoro ịkpa ókè agbụrụ so mee ka ndị mmadụ taa ahụhụ ruo ọtụtụ afọ n’ihi ịkpọasị agbụrụ, kama o medịrị ka o yie ka ọ̀ bụ Chineke ka o si n’aka!

John Calvin nwụrụ na Jeniva n’afọ 1564. Tupu ya anwụọ, a sịrị na o kelere ndị chọọchị ya “maka ọtụtụ echichi ha chiri onye o doro anya na o rughị eru ka e chie ya ha” ma rịọ ka a gbaghara ya maka mmejọ ya ndị na-ekweghị ya nkwụsị bụ́ enweghị ndidi na iwe. N’agbanyeghị nke ahụ, o doro anya na otú ndị Protestant si arụ ọrụ—ịdị uchu ha, inwe njide onwe onye, na iji ọrụ akpọrọ ihe—yiri nnọọ àgwà na omume John Calvin.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ akwụkwọ bụ́ Mankind’s Search for God, peeji nke 321-325, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]

Mgbe Ndozigharị ahụ malitere, obodo na steeti dị iche iche kwupụtara okpukpe nke ha dụnyeere úkwù, ma ọ̀ bụ Chọọchị Katọlik, nke Luther, ma ọ bụ nke Calvin, bụ́ nke mere ka e nwee nnọọ esemokwu okpukpe na Yurop

[Map dị na peeji nke 18]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

SPEN

FRANS

PARIS

Noyon

Oliọn

Bọj

SWIZALAND

JENIVA

[Foto dị na peeji nke 19]

Okpukpe ndị Protestant gbakwasịrị ụkwụ n’akwụkwọ Calvin bụ́ “Institutes” (1536)

[Ebe E Si Nweta Foto]

© INTERFOTO/Alamy

[Foto dị na peeji nke 20]

Ogbugbu e gburu Servetus nọgidere na-ete ndụ na ọrụ Calvin unyi

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Mary Evans Picture Library

[Foto dị na peeji nke 21]

“Geneva Bible” (1560) bụ Baịbụl Bekee mbụ nwere nọmba n’amaokwu ya

[Ebe E Si Nweta Foto]

A natara American Bible Society ikike

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 18]

Obodo ndị Frans: © Mary Evans Picture Library