Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee ebe Ken si nweta nwunye ya?

Olee ebe Ken si nweta nwunye ya?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Olee ebe Ken si nweta nwunye ya?

▪ “Ọ bụrụ na Adam na Iv nwere ụmụ nwoke abụọ, bụ́ Ken na Ebel, olee ebe nwunye Ken si?” Ọ bụ ezie na ndị na-akatọ Baịbụl na-ajụkarị ajụjụ a iji megharịa ndị mmadụ anya, Baịbụl gwara anyị ihe ga-ezuru anyị iji zaa ajụjụ ahụ nke ọma.

Jenesis isi 3 na 4 kọwara ihe ndị na-esonụ: (1) Iv bụ “nne nke onye ọ bụla dị ndụ.” (2) Oge ụfọdụ gafere n’agbata mgbe a mụrụ Ken na mgbe ọ chụụrụ Chineke àjà ahụ Chineke na-anabataghị. (3) Mgbe a chụpụrụ Ken ịghọ “onye na-awagharị awagharị na onye gbara ọsọ,” ọ nọ na-echegbu onwe ya na ‘onye ọ bụla hụrụ ya’ nwere ike igbu ya. (4) Chineke dooro Ken ihe ịrịba ama iji chebe ya, nke gosiri na ụmụnne ya ma ọ bụ ndị ikwu ya ndị ọzọ nwere ike ịnwa igbu ya. (5) “E mesịa,” Ken na nwunye ya nwere mmekọahụ “n’ala Ndị Gbara Ọsọ.”—Jenesis 3:20; 4:3, 12, 14-17.

Site n’ihe ndị ahụ e kwuru n’elu, anyị nwere ike ikwubi na nwunye Ken bụ nwa Iv nke a na-agwaghị anyị mgbe a mụrụ ya. Jenesis 5:4 kwuru na n’ime narị afọ itoolu na iri atọ Adam dịrị ndụ, ọ “mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.” N’ezie, Baịbụl ekwughị kpọmkwem na nwunye Ken bụ nwa Iv. Na e kwuru banyere ya mgbe a chụpụchara Ken gosiri nnọọ na o nwedịrị ike ịbụ otu n’ime ụmụ ụmụ Adam na Iv n’ihi oge gaferelanụ. N’ihi ya, The Amplified Old Testament kpọrọ nnọọ nwunye Ken “otu n’ime ụmụ Adam.”

Adam Clarke bụ́ onye na-akọwa Baịbụl nke dịrị ndụ na narị afọ nke iri na itoolu kọrọ na ihe mere Chineke ji dooro Ken ihe ịrịba ama n’ihi egwu ọ nọ na-atụ bụ na e nweela ọtụtụ ọgbọ nke ụmụ Adam—nke na ha ruru “inwe obodo nta dị iche iche.”

Ụfọdụ obodo taa na-eche na ọ bụ arụ ikwu na Ken lụrụ nwanne ya nwaanyị ma ọ bụ nwa nwaanyị nwa Adam nke lụrụ di ma ọ bụ nwunye mechara mụta. Nke a na-abụkarị n’ihi na ọtụtụ obodo weere ya dị ka arụ ma ọ bụkwanụ n’ihi ụjọ a na-atụ na ọ ga-akpatara ụmụ ha nkwarụ. N’agbanyeghị nke ahụ, F. LaGard Smith kwuru n’akwụkwọ bụ́ The Narrated Bible in Chronological Order, sị: “O yiri nnọọ ka ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị mbụ ndị Adam na Iv mụrụ hà lụrụ ibe ha, n’agbanyeghị na a ga-ewere ya dị ka ihe na-ekwesịghị ekwesị ma ụdị ihe ahụ mee n’ọgbọ ndị sochirinụ.” Anyị kwesịkwara iburu n’uche na mgbe mbụ e kwuru kpọmkwem na ndị bụ́ ndị ikwu inwe mmekọahụ bụ arụ bụ mgbe Mozis natara iwu ndị Chineke nyere ụmụ Izrel n’afọ 1513 Tupu Oge Anyị.—Levitikọs 18:9, 17, 24.

Taa, ọtụtụ puku afọ agafeela kemgbe nne na nna anyị mbụ kwụsịrị ịbụ ndị zuru okè. O nwere ike ịbụ na nsogbu ndị anyị na-enwe mgbe ndị ikwu lụrụ ibe ha emetụtaghị ha mgbe ahụ. Ọzọ, nnyocha ndị e mere n’oge na-adịbeghị anya, dị ka nke e biri n’akwụkwọ bụ́ Journal of Genetic Counseling, gosiri na mmadụ ịlụ nwanne nne ma ọ bụ nwanne nna ya anaghị akpatachara ụmụ ha nkwarụ otú e cheburu. O doro anya na ụdị ihe ndị ahụ abụchaghị nsogbu n’oge ndụ Adam ma ọ bụdị tupu oge Noa. N’ihi ya, anyị nwere ike ikwubi na nwunye Ken bụ otu n’ime ndị ikwu ya.