Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tụkwasị Jehova Obi Ọ Ga-enyere Gị Aka

Tụkwasị Jehova Obi Ọ Ga-enyere Gị Aka

Tụkwasị Jehova Obi Ọ Ga-enyere Gị Aka

Dị ka Edmund Schmidt si kọọ

Ka m na-akwado ịwụcha n’ihu otu ụlọikpe dị na Niu Yọk n’Ọktoba 1943, m chetara ndụmọdụ a dị n’elu. Mgbe m na-erula afọ iri abụọ na ise, m nọọla ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ anọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi ịnọpụ iche dị ka Onye Kraịst. Dị ka ndị na-eso ụzọ mbụ nke Jizọs, ekpebiri m “irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) Ma, tupu mụ akọọrọ gị banyere nke ahụ, ka m kọwaara gị otú m si malite inwe okwukwe siri ike na Chineke.

A MỤRỤ m n’Eprel 23, 1922, na Klivland, Ohayo, dị n’Amerịka, n’ụlọ anyị nke dị n’elu ebe nna m na-eme bred. Ọnwa anọ a mụchara m, nna m, bụ́ Edmund, gara mgbakọ Ndị Mmụta Baịbụl (bụ́ aha a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ) na Sida Pọịnt, nke dị nso na Sandọski, bụ́ ebe dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri isii site n’ụlọ anyị.

Ná mgbakọ ahụ, a gbara ndị na-ege ntị ume, sị, “Kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ Eze [Chineke] na alaeze ya.” Na Sọnde sochiri ya, nna m malitere ịrụ ọrụ ahụ. Ọ nọgidere na-arụ ya ruo iri afọ isii na isii sochirinụ, bụ́ mgbe ọ nwụrụ na Julaị 4, 1988. Nne m, bụ́ Mary, kwesịrị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ 1981.

Isonyere Nne na Nna M n’Ofufe

Ezinụlọ anyị gara ọmụmụ ihe n’ọgbakọ asụsụ Pọlish na Klivland. N’ehihie Satọdee ọ bụla, ọtụtụ n’ime anyị bụ́ ụmụaka na-esoro ndị dimkpa gaa kwusaa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. N’ụbọchị Sọnde, nne na nna anyị na-egere okwu Baịbụl n’ụlọ nzukọ nke mbụ nke ebe anyị na-anọ amụ ihe. N’otu mgbe ahụ, otu nwanna ma nke a na-akọ na Baịbụl na-eji akwụkwọ e ji amụ Baịbụl bụ́ The Harp of God * akụziri anyị bụ́ ụmụaka dị ihe dị ka iri atọ ihe. N’oge na-adịghị anya, m malitere ịkụziri ndị ọzọ Baịbụl, ọ rụpụtakwara ezi ihe.

Na Julaị 1931, ezinụlọ anyị, nke gụnyeziri nwanne m nta bụ́ Frank, gara mgbakọ ọzọ Ndị Mmụta Baịbụl nweziri na Kolọmbọs, nke dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri isii n’ebe ndịda. Ọ bụ mgbe ahụ ka Ndị Mmụta Baịbụl ji obi ha niile nabata aha ahụ si na Baịbụl bụ́ Ndịàmà Jehova. (Aịzaya 43:10-12) N’oge ahụ, m so kwusaa ozi ọma n’ihu ọha, kpọọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa nụrụ okwu a mara ọkwa na J.  F. Rutherford, bụ́ onye na-edu ndú n’ọrụ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, ga-ekwu. Ihe karịrị afọ iri asaa na itoolu agafeela kemgbe ahụ, ndụ m ka hiwere isi n’iso ndị Jehova Chineke na-efe ya.

Oge Ihe Isi Ike na Ozi Wetaara M Ngọzi

Ka ọ na-erula afọ 1933, Oké Ndakpọ Akụnụba ezuola ebe niile n’ụwa. N’Amerịka, ihe karịrị nde mmadụ iri na ise, ma ọ bụ otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị na-arụ ọrụ, enwekwaghị ọrụ. Obodo dị iche iche dara ogbenye, o nweghịkwa otú ha si enyere ụmụ amaala ha dara ogbenye aka. N’agbanyeghị nke ahụ, ụmụnna anyị Ndị Kraịst nyeere ibe ha aka. Kwa Sọnde, ezinụlọ anyị na-ewere achịcha na keki n’ebe anyị na-eme achịcha aga ebe anyị na-ezukọ iji nye ha ndị ọzọ. Nna m na-ezigara isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Bruklin, Niu Yọk, ego ọ bụla fọrọ ya n’aka mgbe ọ kwụchara ụgwọ anyị ji n’ọgwụgwụ ọnwa. Ọ maara na a ga-eji ego a nye aka n’ibipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl.

N’afọ ndị ahụ, redio rụrụ ọrụ dị mkpa n’ozi anyị. Ihe karịrị narị ụlọ ọrụ redio anọ na-akpọ okwu ndị dabeere na Baịbụl e kwuru ná mgbakọ anyị. N’agbata afọ 1930 na 1939, Ndịàmà mepụtakwara phonograph na rekọd dị iche iche n’ebe obibi akwụkwọ ha dị na Bruklin. Anyị na-eji ha aga ozi ọma ma na-ede ugboro ole anyị kpọọrọ ndị na-abụghị Ndịàmà okwu ndị dabeere na Baịbụl na mmadụ ole gere ha n’akụkọ ozi anyị.

N’afọ 1933, Adolf Hitler na òtù Nazi malitere ịchị Jamanị. A kpagburu Ndịàmà Jehova bi ná mba ahụ mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ n’ihi na ha nọpụrụ iche dị ka Ndị Kraịst. (Jọn 15:19; 17:14) A tụrụ ọtụtụ Ndịàmà nọ na Jamanị mkpọrọ ma ọ bụ ziga ha n’ogige ịta ahụhụ n’ihi na ha jụrụ itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ito Hitler. E gburu ọtụtụ n’ime ha; a manyere ndị ọzọ ịrụ ọrụ ruo mgbe ha nwụrụ. N’ihi otú e si chie ha ọnụ n’ala, ọtụtụ n’ime ha nwụrụ obere oge a tọhapụchara ha. Ọtụtụ ndị amaghị banyere ahụhụ Ndịàmà Jehova bi n’ebe ndị ọzọ tara, gụnyere ndị nke bi n’Amerịka.

N’afọ 1940, anyị gara otu mgbakọ na Ditroịt, Michigan. N’ebe ahụ, na Julaị 28, e mere m baptizim iji gosi na mụ ararala onwe m nye Jehova Chineke. N’ọnwa bu mgbakọ ahụ ụzọ, Ụlọikpe Kasị Elu nke Amerịka kwuru na onye jụrụ ikele ọkọlọtọ emebiela iwu mba ahụ dum, a ga-achụpụkwa ya n’ụlọ akwụkwọ. Olee ihe Ndịàmà mere maka mkpebi a? Ọtụtụ n’ime ha malitere ụlọ akwụkwọ nke ha iji kụziere ụmụ ha ihe. A kpọrọ ụlọ akwụkwọ ndị a Ụlọ Akwụkwọ Alaeze.

Agha Ụwa nke Abụọ malitere na Septemba 1939 na Yurop, ndị bi n’akụkụ niile nke Amerịka sonyekwara n’agha ahụ. Ndị na-eto eto na ndị dimkpa e megharịrị anya majara ma tie Ndịàmà na-eto eto ihe. A kọrọ na malite n’afọ 1940 ruo 1944, ìgwè ndị na-eme ihe wakporo Ndịàmà Jehova nọ n’Amerịka ugboro puku abụọ na narị ise. Mkpagbu ahụ rịrị elu mgbe ndị Japan wakporo Pel Habọ na Disemba 7, 1941. Izu ole na ole tupu mgbe ahụ, amalitere m ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ, bụ́ ihe a na-akpọ ndị ozi oge niile nke Ndịàmà Jehova. M chekwatara ego wee zụọ ụlọ ụgbọala na-adọkpụ dị mita asaa n’ogologo, ọtụtụ n’ime anyị kwagakwara Luwiziana iji jee ozi n’ebe ahụ.

Mkpagbu n’Ebe Ndịda

Anyị natara ndị bi n’ógbè ahụ ikike ịdọwa ụlọ anyị ụgbọala na-adọkpụ n’otu ọgbọ osisi pecan dị nso n’obodo Jeneret. Otu ụbọchị Satọdee, anyị kpebiri ikwusa ozi ọma ihu ọha n’okporo ámá, ma onyeisi ndị uwe ojii kpọrọ ndị ọrụ ya ma kpụrụ anyị dị ka ndị mkpọrọ gawa n’ụlọ ọrụ gọọmenti ime obodo ahụ. Ìgwè na-eme ihe ike dị ihe dị ka narị mmadụ abụọ gbakọtara n’èzí, ndị uwe ojii kwapụụrụ anyị ha n’echebeghị anyị. O juru anyị anya na ìgwè mmadụ ahụ nọpeere anyị n’ụzọ ka anyị gafee. N’echi ya, anyị gara Batịn Ruj, bụ́ otu nnukwu obodo dị nso n’ebe ahụ, ịgwa Ndịàmà ibe anyị ihe merenụ.

Mgbe anyị lọghachiri Jeneret, anyị hụrụ ozi a mapawara n’ibo ụzọ ụlọ anyị ụgbọala na-adọkpụ nke sịrị: “Biko chọtanụ m n’ogige ndị ọrụ mmanụ.” Onye tinyere aka na ya bụ “E. M. Vaughn.” Anyị hụrụ Maazị Vaughn, ọ kpọkwara anyị ka anyị na ya na nwunye ya rikọọ nri. O kwuru na ya na ndị òtù ya so n’ìgwè mmadụ ahụ anyị hụrụ na Satọdee, nakwa na a sị na ọ dị mkpa, na ya gaara echebe anyị n’aka ìgwè ahụ na-eme ihe ike. Anyị kelere ya maka agbamume na nkwado ya.

N’echi ya, ndị osote onyeisi ndị uwe ojii, bụ́ ndị bucha égbè, nwụchiri anyị ma bukọrọ akwụkwọ anyị. Ha weere mkpịsị ugodi nke ụlọ m ụgbọala na-adọkpụ ma tụọ m mkpọrọ abalị iri na asaa n’ebe m nọ naanị m, n’enwechaghị ihe m na-eri. Maazị Vaughn gbara mbọ inyere anyị aka, ma o nwechaghị isi. N’oge ahụ anyị nọ mkpọrọ, ìgwè ahụ na-eme ihe ike zukọọrọ ihe anyị ma gbaa ihe niile anyị nwere ọkụ, ma ụlọ m ụgbọala na-adọkpụ. N’oge ahụ, amaghị m na Jehova na-akwadebe m maka ihe ndị m ga-agabiga n’oge na-adịghị anya.

Ịga Mkpọrọ n’Ebe Ugwu

Otu ọnwa m laghachisịrị n’ebe ugwu, e kenyere mụ na Ndịàmà ndị ọzọ ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’obodo Olian, Niu Yọk. Mgbe m nọ ebe ahụ, ndị ọchịchị chọrọ ka m denye aha n’akwụkwọ ịga agha, a gụpụkwara m dị ka onye akọ na uche ya na-ekweghị ịga agha. Mgbe e lere m ahụ́ chọpụta na ahụ́ gbasiri m ike nakwa na isi zuru m okè, e suru okwu ndị a n’akwụkwọ m, “O Ruru Eru Ka A Zụọ Ya Ịbụ Onye Agha.”

Ejere m ozi dị ka ọsụ ụzọ ruo ihe dị ka otu afọ ọzọ. Mgbe ahụzi, n’afọ 1943, n’ihi na m jụrụ ịhapụ ozi m ma bịa maka ọzụzụ ndị agha, ndị agha nchebe mba anyị bụ́ FBI nwụchiri m ma gwa m ka m bịa n’ụlọ mkpọrọ gọọmenti etiti dị na Sirakus, Niu Yọk, n’izu na-eso ya ka e kpee m ikpe. E boro m ebubo na m dara iwu, yiekwa ikpe m na nwanne echi ya.

Ekpechitere m ọnụ m. Ná nzukọ Ndị Kraịst anyị, a na-akụziri anyị bụ́ Ndịàmà na-eto eto otú anyị ga-esi na-ekpere ọnụ anyị n’ihe ndị ruuru anyị n’iwu nakwa otú anyị ga-esi kpaa àgwà n’ụlọikpe. Echetara m nnọọ ndụmọdụ ahụ e kwuru ná mmalite isiokwu a. Ụfọdụ ndị ọkàiwu na-ekpegide anyị medịrị mkpesa na ụfọdụ Ndịàmà maara iwu karịa ha! N’agbanyeghị nke ahụ, ndị òtù ikpe kwuru na ikpe mara m. Mgbe ọkàikpe jụrụ m ma ọ̀ ka nwere ihe m chọrọ ikwu, naanị ihe m zara bụ, “Taa, a na-ekpe mba a ikpe n’ihu Chineke banyere otú o si emeso ndị na-ejere Chineke ozi ihe.”

A mara m ikpe ịnọ afọ anọ n’ụlọ mkpọrọ gọọmenti etiti dị na Chilikati, Ohayo. N’ebe ahụ, e kenyere m ọrụ ịbụ odeakwụkwọ nke onyeisi ngalaba na-edeta aha ndị ga-aga agha. Mgbe izu ole na ole gasịrị, onye ọrụ pụrụ iche na-eme nchọpụta si Wọshịntịn, D.C., bịara n’ọfịs anyị ma kwuo na ha na-eme nnyocha banyere Hayden Covington. Ọ bụ ọkàiwu na-ekpechite ọnụ Ndịàmà Jehova, a makwa ya ama dị ka otu n’ime ndị ọkàiwu kacha mara nke a na-akọ n’iwu Amerịka.

Onye nchọpụta ahụ kwuru na ya chọrọ ka e nye ya ihe niile e derela banyere ndị mkpọrọ abụọ—Danny Hurtado na Edmund Schmidt. Onyeisi m zara ya, sị: “Ị̀ hụkwara otú ihe si adaba? Lekwa Maazị Schmidt.” Onye nchọpụta ahụ bịara ọrụ nzuzo, ma ọ ghọtara ozugbo na anyị amarachaala ihe ọ bịara. N’oge na-adịghị anya, a gbanweere m ọrụ, mụ arụwazie n’ebe a na-esi nri.

Ọrụ Ịsụ Ụzọ, Ozi Betel na Ịlụ Nwaanyị

Na Septemba 26, 1946, a gbaghaara m ma hapụ m ka m laa, amaliteghachikwara m ọrụ ịsụ ụzọ, nke ugbu a bụzi n’Ọgbakọ Highland Park dị na Kalịfọnịa. Ka e mechara, na Septemba 1948, enwetara m ihe m nọ na-achụ kemgbe. A kpọrọ m ka m bịa mewe achịcha n’isi ụlọ ọrụ (Betel) dị na Bruklin, bụ́ ebe a na-ebipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl anyị ji ekwusa ozi ọma n’ụwa niile. Ozugbo ahụ, agbara m arụkwaghịm n’ebe m na-arụ ọrụ ime keki n’otu ụlọ nri dị na Glendel ma kwaga Betel.

Mgbe afọ asaa gasịrị, n’afọ 1955, e nwere mgbakọ mba niile n’ebe dị iche iche na Yurop. Ndị ezinụlọ m nyere m ego m ga-eji gaa. Mgbakọ ahụ m gara na Lọndọn, Paris, Rom tọrọ m ụtọ, karịsịa nke m gara na Nurembag, Jamanị, bụ́ ebe ihe karịrị puku otu narị na asaa bịara ná nnukwu ámá egwuregwu ahụ Hitler nọbu nyochaa ìgwè ndị agha ya o ji eme ọnụ. Ndịàmà Hitler ṅụrụ iyi na ya ga-ekpochapụ so ná ndị bịara mgbakọ ahụ. Ọ tọrọ m ezigbo ụtọ mụ na ha ịnọ!

Ná mgbakọ Nurembag ahụ, ahụrụ m otu nwa agbọghọ bụ́ Onyeàmà si Jamanị, bụ́ Brigitte Gerwien, mụ abịa hụ ya n’anya. Anyị lụrụ ihe na-erughị otu afọ nke ahụ gasịrị ma lọghachi Glendel iji biri ndị mụrụ m nso. A mụrụ nwa anyị nwoke nke mbụ, bụ́ Tom, n’afọ 1957, mụọ nke abụọ, bụ́ Don, n’afọ 1958, mụọkwa ada anyị, bụ́ Sabena, n’afọ 1960.

Ndụ Obi Ụtọ Juru M Afọ

Ụfọdụ ndị ajụọla m ma ọ̀ dị mgbe m kwara ụta maka ihe ndị e tiri m na mkpọrọ ndị a tụrụ m maka ijere Chineke ozi. Kama ịkwa ụta, ana m ekele Jehova na o nyere m ihe ùgwù nke iso ọtụtụ ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi jeere ya ozi. Enwekwara m olileanya na akụkọ ndụ m ga-enyere ndị ọzọ aka ịbịarukwu Chineke nso, gharakwa ịhapụ ya mgbe ọ bụla.

Ọtụtụ ndị ohu Chineke ataala nnukwu ahụhụ maka ijere ya ozi. Ma, nke ahụ ọ́ bụghị ihe a gwara anyị ka anyị tụọ anya ya? Baịbụl kwuru, sị: “A ga-akpagbukwa ndị niile na-achọ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.” (2 Timoti 3:12) N’agbanyeghị nke ahụ, ihe a Abụ Ọma 34:19 kwuru bụ eziokwu: “Ọdachi ndị na-adakwasị onye ezi omume dị ọtụtụ, ma Jehova na-anapụta ya na ha niile”!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya, ma a naghịzi ebipụta ya.

[Foto dị na peeji nke 27]

Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma na Luwiziana n’agbata afọ 1940 na 1944

[Foto dị na peeji nke 29]

Mgbe m na-emere ndị na-arụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ anyị achịcha

[Foto dị na peeji nke 29]

Mụ na nwunye m, bụ́ Brigitte