Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-achọsi Ngọzi Jehova Ike

Na-achọsi Ngọzi Jehova Ike

Na-achọsi Ngọzi Jehova Ike

‘Chineke bụ onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.’—HIB. 11:6.

1, 2. (a) Olee otú ọtụtụ ndị si achọ ngọzi Chineke? (b) Gịnị mere anyị bụ́ ndị na-arụ ọrụ Jehova ji kwesị ịchọ ka anyị nweta ngọzi ya?

NDỊ mmadụ na-agwa onye meere ha ihe ọma ma ọ bụkwanụ onye ha chọrọ ka o nyere ha aka, sị: “Chineke gọzie gị.” Ndị ụkọchukwu nke chọọchị dị iche iche na-agọzi ndị mmadụ, anụmanụ, na ihe ndị ọzọ na-adịghị ndụ. Ọtụtụ ndị na-aga ebe ha chere na ọ bụ ala nsọ n’ihi na obi ha bụ na ha ga-anata ngọzi ma ha ruo ebe ahụ. Ndị ọchịchị na-arịọ Chineke mgbe niile ka ọ gọzie mba ha. Ì chere na ekpere ndị mmadụ na-ekpe ka a gọzie ha kwesịrị ekwesị? Chineke ọ̀ na-aza ụdị ekpere ahụ? Ònye n’ezie ka Chineke na-agọzi, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

2 Jehova buru amụma na n’oge ikpeazụ, ya ga-enwe ná mba niile ndị omume ha dị ọcha na ndị na-eme udo, bụ́ ndị ga-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ya ruo n’ebe ndị dị anya n’ụwa, n’agbanyeghị na a kpọrọ ha asị, na-akpagbukwa ha. (Aịza. 2:2-4; Mat. 24:14; Mkpu. 7:9, 14) Ngọzi Chineke dị anyị niile mkpa, bụ́ ndị kwetara iso na-arụ ọrụ ahụ, n’ihi na anyị agaghị arụli ya ma ọ bụrụ na ọ gọzighị anyị. (Ọma 127:1) Ma, olee otú anyị ga-esi enweta ngọzi Chineke?

Ngọzi Chineke Ga-achụkwute Ndị Na-erubere Ya Isi

3. A sị na ụmụ Izrel rubeere Jehova isi, olee uru ọ gaara abara ha?

3 Gụọ Ilu 10:6, 7. Mgbe ọ fọrọ obere ka ụmụ Izrel banye n’Ala Nkwa ahụ, Jehova gwara ha na ya ga-agọzi ha ma chebe ha ma ọ bụrụ na ha egee ntị n’olu ya. (Diut. 28:1, 2) Jehova ga-agọzi ndị ya, ngọzi ya ‘ga-achụkwutekwa’ ha. Ọ ga-agọzirịrị ndị na-erubere ya isi.

4. Olee ihe ndị anyị ga-eme iji gosi na anyị ji obi anyị niile na-erubere Chineke isi?

4 Olee ụdị obi ụmụ Izrel kwesịrị iji na-erubere Chineke isi? Iwu Chineke kwuru na obi agaghị adị Chineke mma ma ọ bụrụ na ndị ya ejighị “ọṅụ na obi ụtọ” na-ejere ya ozi. (Gụọ Diuterọnọmi 28:45-47.) Jehova chọrọ ihe karịrị ime ihe o kwuru, n’ihi na ụmụ anụmanụ na ndị mmụọ ọjọọ nwekwara ike ime ihe o kwuru. (Mak 1:27; Jems 3:3) Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-erubere Chineke isi, anyị na-egosi na anyị hụrụ ya n’anya. Nke a ga-eme ka anyị na-enwe ọṅụ n’ihi na anyị ma na ihe Jehova nyere n’iwu adịghị arọ nakwa na ‘ọ bụ onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.’—Hib. 11:6; 1 Jọn 5:3.

5. Olee otú ikwere na Jehova ga-emezu nkwa ya ga-esi nyere mmadụ aka ime ihe e kwuru na Diuterọnọmi 15:7, 8?

5 Ka anyị tụlee otú ụmụ Izrel gaara esi jiri obi ha niile rube isi site n’idebe iwu ahụ dị na Diuterọnọmi 15:7, 8. (Gụọ ya.) Ọ bụrụgodị na ụmụ Izrel ejighị obi ụtọ na-eme ihe iwu a kwuru, ha ka nwere ike ime ihe ga-eme ka ihe dịtụrụ ndị ogbenye mfe, ma, nke a ọ̀ ga-eme ka ha na ibe ha dịrị ná mma? Ihe ka mkpa bụ, ọ̀ gaara egosi na ha nwere okwukwe na Jehova ga-egboro ndị ohu ya mkpa ha, nakwa na ha nwere obi ụtọ imere ndị ọzọ ihe ọma ka yanwa? Mbanụ! Chineke ma ihe onye ji obi ya dum na-eme ihe ọma bu n’obi na-eme ya, o kwekwara nkwa ịgọzi ya n’ihe ọ bụla ọ na-eme nakwa n’ihe ọ bụla ọ na-arụ. (Diut. 15:10) Onye kweere ihe a Chineke kwuru ga-eji obi ya dum na-eme ihe ọma, bụ́ nke ga-eme ka o nweta ọtụtụ ngọzi.—Ilu 28:20.

6. Olee otú Ndị Hibru 11:6 si emesi anyị obi ike?

6 E wezụga inwe okwukwe na Chineke na-akwụ ndị na-efe ya ụgwọ, Ndị Hibru 11:6 kwuru ihe ọzọ anyị ga-eme iji nweta ngọzi Chineke. Cheta na ọ bụ ndị “na-achọsi ya ike” ka ọ na-akwụ ụgwọ. Okwu Grik e si sụgharịta okwu a na-egosi na onye ahụ kwesịrị ịgbasi mbọ ike. Nke a kwesịrị ime ka obi sie anyị ike na anyị ga-enwetarịrị ngọzi ahụ. Ọ bụ ezi Chineke, bụ́ “onye na-apụghị ịgha ụgha,” kwere nkwa ịgọzi anyị. (Taị. 1:2) O gosila kemgbe ọtụtụ puku afọ na ya na-eme ihe ọ bụla o kwere ná nkwa. Ihe o kwuru na-emezu; ọ na-emezu nkwa ya. (Aịza. 55:11) N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị nnọọ ike na Chineke ga-akwụ anyị ụgwọ ọrụ ma ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe siri ike n’ebe ọ nọ.

7. Olee otú anyị ga-esi site ná “mkpụrụ” Ebreham nweta ngọzi?

7 Jizọs Kraịst bụ onye bụ́ isi ná “mkpụrụ” Ebreham. Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ ndị ọzọ so ná “mkpụrụ” ahụ e buru n’amụma. A gwara ha ka ha “kwusaa n’ebe niile ịdị mma nke onye ahụ kpọpụtara [ha] n’ọchịchịrị wee kpọba [ha] n’ìhè ya dị ebube.” (Gal. 3:7-9, 14, 16, 26-29; 1 Pita 2:9) Anyị na Jehova agaghị adị ná mma ma ọ bụrụ na anyị anaghị erubere ndị Jizọs họpụtara ilekọta ihe onwunwe ya isi. A sị na ọ bụghị “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” anyị agaraghị na-aghọta ihe anyị na-agụ n’Okwu Chineke nke ọma, anyị agaghịkwa ama otú anyị ga-esi na-eme ha eme. (Mat. 24:45-47) Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe anyị mụtara n’Akwụkwọ Nsọ, anyị ga-enweta ngọzi Chineke.

Ịgba Mbọ Na-eme Uche Chineke

8, 9. Olee otú nna ochie ahụ bụ́ Jekọb si gbasie mbọ ike iji mee ihe kwekọrọ n’arịrịọ ya?

8 Onye mbụ nwere ike ịgbata anyị n’obi mgbe a na-ekwu banyere ịgbasi mbọ ike iji nweta ngọzi Chineke bụ nna ochie bụ́ Jekọb. Ọ maghị otú Chineke ga-esi emezu nkwa ahụ o kwere Ebreham, ma, o kweere na Jehova ga-eme ka ụmụ Ebreham bụ́ nna nna ya dị ọtụtụ, ya bụ na Chineke ga-eme ka ha ghọọ nnukwu mba. N’ihi ya, n’afọ 1781 T.O.A., Jekọb gara ịchọ nwaanyị na Heran. Obi ya abụghị naanị ịchọta ezigbo nwaanyị; kama, ọ bụ ịchọta nwaanyị ji ofufe Jehova kpọrọ ihe, bụ́ onye ga-azụ ụmụ ya nke ọma.

9 Anyị ma na onye o nwetara ọ ga-alụ bụ onye ikwu ya bụ́ Rechel. Ọ bịara hụ Rechel n’anya nke ukwuu ma kwe ịrụrụ nna ya bụ́ Leban ọrụ afọ asaa ka o wee lụọ ya. Ihe a abụghị akụkọ ifo a kọrọ banyere mmadụ abụọ hụrụ nnọọ ibe ha n’anya. O doro anya na Jekọb ma banyere nkwa ahụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile kwere nna nna ya bụ́ Ebreham, bụ́ nke o mechakwara kwe nna ya bụ́ Aịzik. (Jen. 18:18; 22:17, 18; 26:3-5, 24, 25) Aịzik gwaziri nwa ya bụ́ Jekọb, sị: “Chineke bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-agọzi gị, ọ ga-eme ka ị mụọ ọmụmụ, meekwa ka ị mụbaa, ị ga-aghọkwa ìgwè ndị dị iche iche. Ọ ga-enyekwa gị onwe gị na mkpụrụ gị ngọzi Ebreham, ka i wee nweta ala dị iche iche i biri dị ka ọbịa, bụ́ ndị Chineke nyeworo Ebreham.” (Jen. 28:3, 4) Ya mere, mbọ niile Jekọb gbara iji nweta ezigbo nwaanyị ma nwee ezinụlọ gosiri na o nwere okwukwe n’ihe ahụ Jehova kwuru.

10. Gịnị mere obi ji dị Jehova ụtọ ịgọzi Jekọb?

10 Jekọb anọghị na-achụ akụnụba ọ ga-eji elekọta ezinụlọ ya. Obi ya dị ná nkwa Jehova kwere banyere ụmụ ya. Naanị ihe bụ́ mkpa ya bụ otú uche Jehova ga-esi emezu. Jekọb kpebiri ime ike ya niile iji nweta ngọzi Chineke n’agbanyeghị ihe ndị nwere ike igbochi ya inweta ya. Ọ nọgidere na-eme nke a ruo mgbe o mere agadi, Jehova gọzikwara ya n’ihi ya.—Gụọ Jenesis 32:24-29.

11. Olee mbọ anyị kwesịrị ịna-agba nke kwekọrọ n’uche Chineke?

11 Anyị amaghị ihe niile banyere otú nzube Jehova ga-esi emezu, otú ahụ Jekọb na-amaghị. Ma, ọ bụrụ na anyị na-amụ Baịbụl, anyị ga-aghọta ihe ụfọdụ banyere “ụbọchị Jehova.” (2 Pita 3:10, 17) Dị ka ihe atụ, anyị amaghị kpọmkwem mgbe ụbọchị ahụ ga-abịa, ma, anyị ma na ọ dịla nso. Anyị kweere ihe Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na anyị ejiri obere oge fọdụrụ na-agba àmà nke ọma, anyị ga-azọpụta onwe anyị, zọpụtakwa ndị na-ege anyị ntị.—1 Tim. 4:16.

12. Olee ihe obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-eme?

12 Anyị ma na ọgwụgwụ ga-abịa mgbe anyị na-atụghị anya ya; Jehova agaghị echere ka mmadụ niile nọ n’ụwa nụchaa ozi ọma tupu ọgwụgwụ abịa. (Mat. 10:23) A na-akụzikwara anyị otú anyị ga-esi na-ezisa ozi ọma nke ọma. Anyị ji okwukwe na-arụ ọrụ a otú anyị nwere ike, jirikwa ngwá ọrụ ọ bụla ruru anyị aka na-arụ ya. Ọtụtụ ndị nọ n’ókèala anyị hà ga-anabata ozi ọma anyị na-ezi ha? Oleekwanụ otú anyị ga-esi mara ma anyị ekwusaghị ya? (Gụọ Ekliziastis 11:5, 6.) Ihe bụ́ ọrụ anyị bụ ikwusa ozi ọma ma tụkwasị Jehova obi na ọ ga-agọzi mbọ anyị na-agba. (1 Kọr. 3:6, 7) Ka obi sie anyị ike na ọ ma mbọ anyị na-agba, nakwa na ọ ga-eji mmụọ nsọ ya gwa anyị ihe anyị ga-eme.—Ọma 32:8.

Ịrịọ Maka Mmụọ Nsọ

13, 14. Olee otú mmụọ nsọ si eme ka ndị ohu Chineke ruo eruo ịrụ ọrụ e nyere ha?

13 Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ dị anyị ka anyị erughị eru ịrụ ọrụ e nyere anyị, ma ọ bụkwanụ na anyị erughị eru ikwusa ozi ọma? Anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ nsọ ya ka o nyere anyị aka ije ozi ya otú ka mma. (Gụọ Luk 11:13.) Mmụọ nsọ nwere ike ime ka mmadụ ruo eruo ịrụ ọrụ ọ bụla e nyere ya n’ọgbakọ ma ọ bụkwanụ inweta ihe ùgwù ije ozi n’agbanyeghị ihe bụbu ọnọdụ onye ahụ ma ọ bụ ihe ọ hụrụla ná ndụ. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị Chineke si n’Ijipt pụọ, mmụọ Chineke mere ka ụmụ Izrel, bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ na ndị ohu, merie ndị iro ha n’agbanyeghị na ha abụghị aka ochie n’ịlụ agha. (Ọpụ. 17:8-13) Obere oge ka nke a gachara, otu mmụọ ahụ nyeere Bezalel na Oholiab aka iji ụkpụrụ ahụ dị egwu Chineke tụrụ rụọ ụlọikwuu ahụ.—Ọpụ. 31:2-6; 35:30-35.

14 Ọ bụkwa mmụọ ahụ dị ike kwadebere ndị ohu Chineke n’oge a mgbe ha chọrọ ịmalite ibiwe akwụkwọ ha n’onwe ha. Nwanna R. J. Martin, bụ́ onye na-elekọta ebe a na-ebi akwụkwọ n’oge ahụ, ji akwụkwọ ozi o dere kọwaa ihe a rụrụ n’afọ 1927. Ọ sịrị: “Mgbe oge ruru, Onyenwe anyị meghere ụzọ; anyị zụtara nnukwu njin e ji ebi akwụkwọ, n’agbanyeghị na anyị amaghị otú e si rụọ ya nakwa otú e si eji ya arụ ọrụ. Ma, Onyenwe anyị ma otú o si enyere ndị ji obi ha niile na-ejere ya ozi aka. . . . N’izu ole na ole, anyị malitere iji njin ahụ e ji ebi akwụkwọ na-arụ ọrụ; anyị ka jikwa ya na-arụ ọbụna ọrụ ndị mere ya na-amaghị na ọ ga-arụli.” Kemgbe ahụ, Jehova ka na-agọzi mbọ ụmụnna ndị ahụ gbasiri ike.

15. Olee otú Ndị Rom 8:11 nwere ike isi gbaa ndị ọnwụnwa bịaara ume?

15 Mmụọ Jehova na-arụ ọrụ n’ụzọ dị iche iche. A na-enye ndị ohu Chineke niile mmụọ ahụ, ọ na-enyekwara ha aka imeri ihe ndị nwere ike igbochi ha ime uche Chineke. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ọnwụnwa ezuo anyị ahụ́? Ihe Pọl kwuru ná Ndị Rom 7:21, 25 nakwa 8:11 nwere ike ịgba anyị ume. N’eziokwu, “mmụọ nke onye ahụ nke si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Jizọs” nwere ike inyere anyị aka mee ka anyị merie n’ọgụ anyị na-alụso ọchịchọ anụ ahụ́. Ọ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ka e degaara akwụkwọ ozi ahụ, ma ihe e kwuru na ya metụtara ndị ohu Chineke niile. Anyị niile ga-enweta ndụ ebighị ebi ma ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe na Kraịst, gbalịa jụ ọchịchọ anụ ahụ́, ma na-eme ihe mmụọ nsọ chọrọ n’aka anyị.

16. Gịnị ka anyị kwesịrị ime iji nweta mmụọ nsọ Chineke?

16 Ànyị ga-atụ anya na Chineke ga-enye anyị mmụọ ya ma ọ bụrụ na anyị anaghị agba mbọ inweta ya? Mba. E wezụga na anyị ga-ekpe ekpere ka Chineke nye anyị mmụọ nsọ, anyị kwesịrị ịna-amụchi Okwu Chineke nke e ji ike mmụọ nsọ dee anya. (Ilu 2:1-6) Ihe ọzọ bụ na mmụọ Chineke na-edu ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na anyị na-agachi ọmụmụ ihe anya, anyị na-egosi na anyị chọrọ ‘ịna-anụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ dị iche iche.’ (Mkpu. 3:6) Anyị kwesịkwara iji obi umeala na-eme ihe anyị na-amụta. Ilu 1:23 gwara anyị, sị: “Lọghachinụ n’ihi ịdọ aka ná ntị m. Mgbe ahụ, m ga-eme ka mmụọ m baara unu ụba.” N’eziokwu, Chineke na-enye “ndị na-erubere ya isi dị ka onye na-achị achị” mmụọ nsọ ya.—Ọrụ 5:32.

17. Olee ihe anyị nwere ike iji tụnyere otú ngọzi Chineke si abara anyị uru?

17 N’agbanyeghị na anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike iji nweta ngọzi Chineke, anyị ekwesịghị ichefu na nke a abụghị naanị ihe anyị ga na-eme iji gosi na anyị na-ekele Jehova maka ọtụtụ ihe ọma ọ na-emere anyị. E nwere ike iji otú ngọzi ya si abara anyị uru tụnyere otú nri na-edozi ahụ́ si abara ahụ́ anyị uru. Chineke mere ahụ́ anyị otú anyị ga-enwe ike ịna-anụ ụtọ nri anyị na-eri, nri ahụ ana-edozikwa anyị ahụ́. Ọ bụkwa ya na-enye anyị nri ndị ahụ. Anyị amachaghị otú nri ndị anyị na-eri si nweta ihe ndị na-edozi ahụ́, ọtụtụ n’ime anyị amaghịkwa otú nri anyị na-eri si enye anyị ike. Naanị ihe anyị ma bụ na nri na-arụ ọrụ n’ahụ́ anyị, anyị ga-erikwa nri ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ọ na-arụ ọrụ. Ọ bụrụ na anyị na-eri nri na-edozi ahụ́, ọ ga-aka abara ahụ́ anyị uru. N’otu aka ahụ, Jehova agwala anyị ihe ndị anyị ga-eme ka anyị wee nweta ndụ ebighị ebi, ọ na-enyekwara anyị aka ka anyị wee na-eme ihe ndị ahụ. O doro anya na Jehova na-enyere anyị aka nke ukwuu, anyị kwesịkwara ịna-eto ya. Ma, anyị kwesịrị ịna-eme ihe ọ chọrọ n’aka anyị, ya bụ, ịna-eme uche ya, ka anyị wee nweta ngọzi ya.—Hag. 2:18, 19.

18. Gịnị ka i kpebisiri ike ime, n’ihi gịnịkwa?

18 Gbalịa jiri obi gị dum na-arụ ọrụ ọ bụla e nyere gị. Na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka ịrụ ya. (Mak 11:23, 24) Ka ị na-eme nke a, obi sie gị ike na ị ga-enweta ihe ị na-arịọ n’ihi na “onye ọ bụla nke na-arịọ na-arịọta.” (Mat. 7:8) A ga-enye ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ “okpueze bụ́ ndụ” n’eluigwe. (Jems 1:12) “Atụrụ ọzọ” Kraịst, bụ́ ndị na-agbasi mbọ ike ka a gọzie ha site ná mkpụrụ Ebreham, ga-enwe obi ụtọ mgbe ọ ga-agwa ha, sị: “Bịanụ, unu ndị Nna m gọziri agọzi, ketanụ alaeze ahụ a kwadebeere unu malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa.” (Jọn 10:16; Mat. 25:34) N’eziokwu, “ndị [Chineke] na-agọzi ga-enweta ụwa, . . . ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Ọma 37:22, 29.

Ì Nwere Ike Ịkọwa?

• Olee otú anyị si egosi na anyị ji obi anyị niile na-erubere Chineke isi?

• Gịnị ka anyị kwesịrị ime iji nweta ngọzi Chineke?

• Olee otú anyị nwere ike isi nweta mmụọ nsọ Chineke, oleekwa otú o nwere ike isi baara anyị uru?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Jekọb na mmụọ ozi gbara mgba ka Jehova wee gọzie ya.

Ị̀ na-agbasi mbọ ike ka ya?

[Foto dị na peeji nke 10]

Mmụọ nsọ Chineke kwadebere Bezalel na Oholiab ịrụ ọrụ Chineke