Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Onye Ndú Unu Bụ Otu Onye, Ya Bụ, Kraịst”

“Onye Ndú Unu Bụ Otu Onye, Ya Bụ, Kraịst”

“Onye Ndú Unu Bụ Otu Onye, Ya Bụ, Kraịst”

“Ka a gharakwa ịkpọ unu ‘ndị ndú,’ n’ihi na Onye Ndú unu bụ otu onye, ya bụ, Kraịst.”—MAT. 23:9, 10.

1. Ònye bụ Onye Ndú Ndịàmà Jehova, gịnịkwa mere ha ji nabata ya ka ọ bụrụ Onye Ndú ha?

CHỌỌCHỊ dị iche iche nke Krisendọm nwere ndị ndú bụ́ mmadụ, dị ka poopu Rom, ndị isi na ndị ndú nke chọọchị Ọtọdọks na nke okpukpe dị iche iche. Ndịàmà Jehova enweghị onye ndú bụ́ mmadụ. Ha abụghị ndị na-eso ụzọ ma ọ bụ ụmụazụ mmadụ ọ bụla. Nke a kwekọrọ n’ihe Jehova buru n’amụma banyere Ọkpara ya. Ọ sịrị: “Lee! Emewo m ya onye àmà nke mba dị iche iche, meekwa ya onye ndú na ọchịagha nke mba dị iche iche.” (Aịza. 55:4) Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị nọ n’ụwa niile na ndị enyi ha, bụ́ “atụrụ ọzọ,” achọghị onye ndú ọzọ ma e wezụga onye Jehova nyere ha. (Jọn 10:16) Ha kwetara ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Onye Ndú unu bụ otu onye, ya bụ, Kraịst.”—Mat. 23:10.

Mmụọ Ozi nke Duru Izrel

2, 3. Olee ọrụ dị mkpa Ọkpara Chineke rụụrụ Izrel?

2 Ọtụtụ narị afọ tupu ọgbakọ Ndị Kraịst amalite, Jehova ji otu mmụọ ozi edu ndị ya bụ́ Izrel. Mgbe Jehova si n’Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel, ọ gwara ha sị: “Lee, m na-ezipụ mmụọ ozi ka o butere gị ụzọ iji chebe gị n’ụzọ nakwa iji kpọbata gị n’ebe m kwadebeworo. Lezie anya n’ihi ya, rubekwa isi n’ihe o kwuru. Enupụrụla ya isi, n’ihi na ọ gaghị agbaghara unu mmebi iwu unu; n’ihi na aha m dị n’ime ya.” (Ọpụ. 23:20, 21) N’ihi ya, o ziri ezi ikwu na mmụọ ozi a, bụ́ onye ‘aha Jehova dị n’ime ya,’ bụ Ọkpara Chineke.

3 Tupu a mụọ Ọkpara Chineke n’ụwa, o yiri ka aha ya ọ̀ bụ Maịkel. N’akwụkwọ Daniel, a kpọrọ Maịkel “onyeisi [ndị obodo Daniel],” ya bụ, Izrel. (Dan. 10:21) Jud, bụ́ onye na-eso ụzọ Kraịst, kwuru na Maịkel nyeere ụmụ Izrel aka tupu oge Daniel. Mgbe Mozis nwụrụ, o yiri ka Setan ọ̀ chọrọ iji ozu ya mee ihe ga-abara onwe ya uru, ikekwe ọ chọrọ iji ya mee ka ụmụ Izrel kpeere arụsị. Maịkel ekweghị ya mee nke a. Jud sịrị: “Mgbe Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi na Ekwensu sere okwu ma na-arụrịta ụka banyere ozu Mozis, ọ nwaghị anwa iji okwu ọjọọ maa Ekwensu ikpe, kama ọ sịrị: ‘Ka Jehova baara gị mba.’” (Jud 9) Obere oge ka nke a mechara, tupu a nọchibido Jeriko, o doro anya na ọ bụ Maịkel, bụ́ “ọchịagha nke ụsụụ ndị agha Jehova,” mere ka obi sie Jọshụa ike na Chineke kwụ ha n’azụ. (Gụọ Jọshụa 5:13-15.) Mgbe otu mmụọ ọjọọ nwara igbochi mmụọ ozi nke na-aga izi Daniel onye amụma ozi dị mkpa, Maịkel, bụ́ onyeisi ndị mmụọ ozi, nyeere mmụọ ozi ahụ aka.—Dan. 10:5-7, 12-14.

Onye Ndú ahụ E Buru n’Amụma Abịa

4. Olee amụma e buru banyere ọbịbịa Mesaya ahụ?

4 Tupu ihe ahụ e kwuru ná ngwụcha paragraf nke atọ emee, Jehova zigara mmụọ ozi Gebriel ka ọ gaa gwa Daniel onye amụma amụma ọ ga-ebu banyere ọbịbịa nke “Mesaya bụ́ Onye Ndú.” (Dan. 9:21-25) * Jọn mere Jizọs baptizim kpọmkwem n’oge ahụ e kwuru na ọ ga-abịa, ya bụ, n’oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ 29 O.A. A wụkwasịrị Jizọs mmụọ nsọ, nke mere ka ọ ghọọ Onye E Tere Mmanụ, ya bụ, Kraịst ma ọ bụ Mesaya. (Mat. 3:13-17; Jọn 1:29-34; Gal. 4:4) Ọ bụ nke a mere na o nweghị onye ndú dị ka ya.

5. Mgbe Kraịst na-eje ozi n’ụwa, olee otú o si gosi na ya bụ Onye Ndú?

5 Mgbe Jizọs malitere ozi ya n’ụwa, o gosiri na ọ bụ ya bụ “Mesaya bụ́ Onye Ndú.” Obere oge ka ọ malitere ije ozi n’ụwa, o bidoro inweta ndị na-eso ụzọ, rụọkwa ọrụ ebube mbụ ya. (Jọn 1:35–2:11) Ndị na-eso ụzọ ya so ya gazuo obodo ahụ niile, na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Luk 8:1) Ọ kụziiri ha otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma. O setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma ma na-ezi ndị mmadụ ihe. (Luk 9:1-6) Ndị okenye ọgbakọ kwesịrị iṅomi ya na nke a.

6. Olee otú Kraịst si gosi na ya bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ na Onye Ndú?

6 Jizọs gosiri otú ọzọ o si bụrụ Onye Ndú site n’iji onwe ya tụnyere onye ọzụzụ atụrụ hụrụ atụrụ ya n’anya. Ndị na-azụ atụrụ n’ala Izrel nakwa ná mba ndị dị ya nso na-edu atụrụ ha otú e si edu mmadụ. N’akwụkwọ bụ́ The Land and the Book, W. M. Thomson dere, sị: “Ihe onye ọzụzụ atụrụ ji anọ ìgwè atụrụ ya n’ihu abụghị naanị ka o gosi ha ebe ha kwesịrị isi, kama ọ na-ebu ụzọ iji mara ebe ha ga-esi ka ha ghara imerụ ahụ́. . . . Ọ na-eji mkpara [ya] achịkọta ma na-edu atụrụ ya na-aga ebe ahịhịa ndụ dị, na-ejikwa ya achụpụ anụ ndị nwere ike igbu ha.” Iji gosi na ya bụ ezigbo Onye Ọzụzụ atụrụ na Onye Ndú, Jizọs sịrị: “Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma; onye ọzụzụ atụrụ ọma na-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi atụrụ ya.” “Atụrụ m na-ege ntị n’olu m, amakwaara m ha, ha na-esokwa m.” (Jọn 10:11, 27) Jizọs mere ihe o kwuru site n’ikwe ka e jiri ya chụọ àjà n’ihi atụrụ ya, ma, Jehova ‘weliri ya elu ịbụ Onye-ndú na Onye-nzọpụta.’—Ọrụ 5:31, Bible Nsọ nke Union Version; Hib. 13:20.

Ndị Nlekọta nke Ọgbakọ Ndị Kraịst

7. Olee ihe Jizọs ji elekọta ọgbakọ Ndị Kraịst?

7 Obere oge tupu Jizọs, bụ́ onye a kpọlitere n’ọnwụ, alaghachi eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “E nyewo m ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.” (Mat. 28:18) Jehova mere ka Jizọs nye ndị na-eso ụzọ ya mmụọ nsọ ka okwukwe ha wee sie ike. (Jọn 15:26) Jizọs wụkwasịrị Ndị Kraịst oge ochie mmụọ nsọ na Pentikọst nke afọ 33 O.A. (Ọrụ 2:33) Mmụọ nsọ ahụ a wụkwasịrị ha gosiri na e hiwela ọgbakọ Ndị Kraịst. Jehova mere Ọkpara ya Onye Ndú n’eluigwe ka ọ nọrọ ebe ahụ na-elekọta ọgbakọ ya nọ n’ụwa. (Gụọ Ndị Efesọs 1:22; Ndị Kọlọsi 1:13, 18.) Jizọs ji mmụọ nsọ Jehova na-edu ọgbakọ Ndị Kraịst, o jikwa ndị mmụọ ozi e mere ka ha “nọrọ n’okpuru ya” na-edu ya.—1 Pita 3:22.

8. Ole ndị ka Kraịst ji duo ndị na-eso ụzọ ya na narị afọ mbụ, oleekwa ndị o ji na-edu ha n’oge a?

8 Kraịst jikwa mmụọ nsọ nye anyị ndị bụ́ “onyinye n’ụdị mmadụ,” ụfọdụ n’ime ha bụ “ndị ọzụzụ atụrụ na ndị ozizi” n’ọgbakọ. (Efe. 4:8, 11) Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta, sị: “Na-elezinụ onwe unu na ìgwè atụrụ ahụ dum anya, nke mmụọ nsọ họpụtara unu ka unu bụrụ ndị na-elekọta ya, ka unu na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ, nke o ji ọbara Ọkpara ya zụta.” (Ọrụ 20:28) Ndị nlekọta niile nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst mgbe a malitere ya bụ ndị ikom e tere mmanụ. Ndịozi na ndị okenye ọgbakọ dị na Jeruselem bụ òtù na-achị isi n’oge ahụ. Ọ bụ òtù na-achị isi a ka Kraịst ji duzie “ụmụnna” ya niile e tere mmanụ, bụ́ ndị nọ n’ụwa. (Hib. 2:11; Ọrụ 16:4, 5) N’oge ikpeazụ a, Kraịst enyela “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi” na Òtù Na-achị Isi nke na-anọchite anya ya, bụ́ ndị ikom ole na ole e tere mmanụ, “ihe niile o nwere,” ya bụ, ihe niile dị n’ụwa, ndị metụtara Alaeze Chineke. (Mat. 24:45-47) Ndị e tere mmanụ na ndị enyi ha, bụ́ atụrụ ọzọ, ma na ọ bụrụ na ha na-erubere Òtù Na-achị Isi isi ha na-erubere Onye Ndú ha, bụ́ Kraịst, isi.

Kraịst Amalite Ikwusa Ozi Ọma

9, 10. Gịnị ka Kraịst mere iji hụ na e kwusara ozi ọma Alaeze Chineke?

9 Kemgbe ọgbakọ Ndị Kraịst malitere, Jizọs na-eduzi ozi ọma a na-ekwusa na ihe a na-akụziri ndị mmadụ n’ụwa niile. O gosiri otú a ga-esi na-ekwusara ndị bi n’ụwa ozi ọma Alaeze Chineke. Mgbe ọ na-eje ozi n’ụwa, ọ gwara ndịozi ya, sị: “Unu abanyela n’okporo ụzọ ndị mba ọzọ, unu abanyekwala n’obodo ndị Sameria; kama nke ahụ, na-agakwurunụ atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel. Mgbe unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, ‘Alaeze eluigwe eruwo nso.’” (Mat. 10:5-7) Ha ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaara ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu ozi ọma, karịchaa, mgbe Pentikọst nke afọ 33 O.A. gafere.—Ọrụ 2:4, 5, 10, 11; 5:42; 6:7.

10 Ka oge na-aga, Jizọs jikwa mmụọ nsọ mee ka e kwusaara ndị Sameria na ndị ọzọ na-abụghị ndị Juu ozi ọma Alaeze Chineke. (Ọrụ 8:5, 6, 14-17; 10:19-22, 44, 45) Jizọs ji aka ya mee ka Sọl onye Tasọs ghọọ Onye Kraịst n’ihi na ọ chọrọ ka ndị mba ọzọ nụ ozi ọma. Jizọs gwara onye na-eso ụzọ ya bụ́ Ananayas, sị: “Bilie, gaa n’okporo ámá a na-akpọ Nke Kwụ Ọtọ, chọọkwa, n’ụlọ Judas, otu nwoke aha ya bụ Sọl, onye Tasọs. . . . Gawa, n’ihi na nwoke a bụ arịa m họọrọ ka o buru aha m gakwuru ndị mba ọzọ, gakwurukwa ndị eze na ụmụ Izrel.” (Ọrụ 9:3-6, 10, 11, 15) “Nwoke a” ghọrọ Pọl onyeozi.—1 Tim. 2:7.

11. Olee otú Kraịst si jiri mmụọ nsọ mee ka e kwusaa ozi ọma ọtụtụ ebe?

11 Mgbe oge ruru ka e mee ka ozi ọma rute ndị ọzọ na-abụghị ndị Juu, mmụọ nsọ duziri Pọl ka ọ gaa ozi ala ọzọ n’Eshia Maịnọ nakwa na Yurop. Luk dere n’Ọrụ Ndịozi, sị: “Ka ha [ya bụ, ndị amụma na ndị ozizi nọ n’ọgbakọ dị n’Antiọk nke Siria] nọ na-ejere Jehova ozi n’ihu ọha ma na-ebu ọnụ, mmụọ nsọ sịrị: ‘N’etiti mmadụ niile, dooro m Banabas na Sọl iche maka ọrụ m kpọrọ ha ka ha rụọ.’ Mgbe ahụ ha buru ọnụ ma kpee ekpere wee bikwasị ha aka n’isi wee hapụ ha ka ha gawa.” (Ọrụ 13:2, 3) Jizọs kpọrọ Sọl onye Tasọs ka ọ bụrụ ‘arịa ọ họọrọ’ ka o buru aha ya gakwuru ndị mba ọzọ. Ya mere, ọ bụ Kraịst bụ́ Onye Ndú nke ọgbakọ mere ka a malite ikwusara ndị mba ọzọ ozi ọma. Otú Jizọs si jiri mmụọ nsọ na-eme ka e kwusaa ozi ọma pụtara ìhè karịchaa mgbe Pọl gara ozi ala ọzọ nke abụọ. Baịbụl kwuru na “mmụọ Jizọs” duziri Pọl na ndị ya na ha so na-aga ozi ọma ịma ebe ha ga-aga na otú ha ga-esi gaa ya, ya bụ na Jizọs ji mmụọ nsọ duzie ha. A gwakwara ha n’ọhụụ ka ha gaa Yurop.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 16:6-10.

Otú Jizọs Si Edu Ọgbakọ Ya

12, 13. Olee otú akwụkwọ Mkpughe si gosi na Kraịst ma ihe na-eme n’ọgbakọ ọ bụla?

12 Jizọs ma ihe niile na-eme n’ọgbakọ ndị e tere mmanụ na narị afọ mbụ O.A. Ọ ma otú ihe si na-aga n’ọgbakọ nke ọ bụla. Anyị ga-achọpụta nke a ma anyị gụọ Mkpughe isi nke abụọ na isi nke atọ. N’ebe ahụ, ọ kpọrọ ọgbakọ asaa dị n’Eshia Maịnọ aha. (Mkpu. 1:11) N’ihi ya, o doro anya na ọ makwa ihe na-eme n’ọgbakọ ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụwa nọ na ha n’oge ahụ.—Gụọ Mkpughe 2:23.

13 Jizọs jara ụfọdụ n’ime ọgbakọ ndị ahụ mma n’ihi otú ha si atachi obi, otú ha si ekwesị ntụkwasị obi mgbe a na-anwa ha ọnwụnwa, otú ha si eme ihe ọ gwara ha, nakwa otú ha si ezere ndị si n’ezi ofufe dapụ. (Mkpu. 2:2, 9, 13, 19; 3:8) Ma, ọ baara ọgbakọ ole na ole mba n’ihi na ha ahụghị ya n’anya otú ha hụburu ya, ha gbachiri ndị na-ekpere arụsị, ndị na-akwa iko, na ndị na-akpata nkewa nkịtị ka ha nọrọ n’ọgbakọ. (Mkpu. 2:4, 14, 15, 20; 3:15, 16) Ebe ọ bụ na Jizọs hụrụ ọgbakọ niile ọ na-elekọta n’anya, gụnyere ndị nke ọ baara mba, o kwuru, sị: “Ndị niile m hụrụ n’anya nke ukwuu ka m na-abara mba, na-adọkwa aka ná ntị. Ya mere, na-anụ ọkụ n’obi, chegharịakwa.” (Mkpu. 3:19) N’agbanyeghị na Jizọs nọ n’eluigwe, o ji mmụọ nsọ na-eduzi ọgbakọ ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụwa. Mgbe Jizọs na-emechi okwu ya, ọ gwara ọgbakọ ndị ahụ, sị: “Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a.”—Mkpu. 3:22.

14-16. (a) Olee otú Jizọs si gosi na ya bụ Onye Ndú obi siri ike nke na-edu ndị Jehova nọ n’ụwa? (b) Olee ihe ndị na-eso ụzọ Jizọs rụpụtarala n’ihi na ọ “nọnyeere” ha “ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a”? (c) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-eso nke a?

14 Anyị ahụla na ọ bụ Maịkel (ya bụ, Jizọs) bụ mmụọ ozi ahụ dị ike nke bụ́ Onye Ndú ụmụ Izrel. Ka oge na-aga, Jizọs ghọrọ Onye Ọzụzụ Atụrụ nke ji obi ike na ịhụnanya duo ndị na-eso ụzọ ya n’oge ochie. Mgbe ọ na-eje ozi n’ụwa, o setịpụrụ ihe nlereanya n’ikwusa ozi ọma. Mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ, ọ hụkwara maka ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.

15 Jizọs ga-emecha jiri mmụọ nsọ mee ka e kwusaa ozi ọma ruo n’ebe kasị anya n’ụwa. Tupu Jizọs arịgoo eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ya, sị: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-abụkwa ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia dum nakwa na Sameria, ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8; gụọ 1 Pita 1:12.) E kwusara ozi ọma n’ọtụtụ ebe na narị afọ mbụ n’ihi otú Kraịst si duzie ndị na-eso ụzọ ya.—Kọl. 1:23.

16 Ma, Jizọs kwuru na a ga na-ekwusa ozi ọma a ruo n’oge ikpeazụ. Mgbe Jizọs nyechara ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-ekwusa ozi ọma ma na-eme ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya, o kwere ha nkwa, sị: “M nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Mat. 28:19, 20) Kemgbe afọ 1914 Kraịst ghọrọ eze, ọ nọgidewo ‘na-anọnyere’ ndị na-eso ụzọ ya ma na-edu ha n’ụzọ na-enweghị atụ. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-atụle ọrụ dị ukwuu ọ na-arụ kemgbe afọ 1914.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ị chọọ ịgụ ebe a kọwara amụma a, gụọ akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! isi nke iri na otu.

Ntụleghachi

• Olee otú Ọkpara Chineke si gosi na ya bụ Onye Ndú na-arụsi ọrụ ike nke duru ụmụ Izrel?

• Olee ihe Kraịst ji edu ọgbakọ ya dị n’ụwa?

• Olee otú Kraịst si eduzi ikwusa ozi ọma?

• Olee ihe na-egosi na Kraịst ma otú ihe si aga n’ọgbakọ ọ bụla?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 21]

“M na-ezipụ mmụọ ozi ka o butere gị ụzọ”

[Foto dị na peeji nke 23]

Kraịst ji “onyinye n’ụdị mmadụ” azụ atụrụ ya dị ka o mere n’oge ochie