Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye Ndú Anyị Nke Na-arụsi Ọrụ Ike Taa

Onye Ndú Anyị Nke Na-arụsi Ọrụ Ike Taa

Onye Ndú Anyị Nke Na-arụsi Ọrụ Ike Taa

“O wee gaa na-emeri, ka o wee nwezuo mmeri ya.”—MKPU. 6:2.

1, 2. (a) Olee otú Baịbụl si kọwaa ike Kraịst na-akpa kemgbe e chiri ya eze n’afọ 1914? (b) Olee ihe Kraịst merela kemgbe e chiri ya eze?

N’AFỌ 1914, e chiri Kraịst eze ka ọ bụrụ Mesaya na-achị Alaeze Jehova. Olee ihe anyị chere ọ na-eme ugbu a? Ànyị chere na ọ bụ eze nke nọ n’ocheeze ya na-eche echiche ihe ọ ga-eme, onye na-eme ya nọtụ ya elee anya n’ụwa iji mara otú ihe si aga n’ọgbakọ ya? Ọ bụrụ na ọ bụ ihe a ka anyị na-eche, anyị kwesịrị ịgbanwe echiche anyị. Akwụkwọ Abụ Ọma na Mkpughe mere ka anyị mara na ọ bụ eze dị ike nke na-agba ịnyịnya “na-emeri, ka o wee nwezuo mmeri ya.” Ọ na-enwekwa “ihe ịga nke ọma.”—Mkpu. 6:2; Ọma 2:6-9; 45:1-4.

2 Ike mbụ Kraịst kpara mgbe e chichara ya eze bụ imeri “dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya.” Kraịst, bụ́ Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi, du ndị mmụọ ozi ya si n’eluigwe dị nsọ chụda Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa. (Mkpu. 12:7-9) Ka oge na-aga, Jizọs rụrụ ọrụ o ji bụrụ “onye ozi nke ọgbụgba ndụ ahụ” site n’iso Nna ya bịa nyochaa ụlọ nsọ ime mmụọ. (Mal. 3:1) Ọ mara Krisendọm ikpe, bụ́ okpukpe ikpe kacha maa n’ime okpukpe ndị so na “Babịlọn Ukwu ahụ,” n’ihi ọbara ndị ọ kwafuru na n’ihi na ya na ndị ọchịchị nke ụwa na-akwa iko.—Mkpu. 18:2, 3, 24.

Kraịst Emee Ka Ndị Ohu Ya Nọ n’Ụwa Dị Ọcha

3, 4. (a) Olee ọrụ Kraịst rụrụ nke gosiri na ọ bụ “onye ozi” Jehova? (b) Olee ihe a chọpụtara mgbe e nyochara ụlọ nsọ ahụ, oleekwa ndị Jizọs, bụ́ Isi nke ọgbakọ, họpụtara?

3 Mgbe Jehova na “onye ozi” ya mere nnyocha ahụ, ha hụkwara ezi Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-esoghị na chọọchị dị iche iche nke Krisendọm, ka ha nọ n’ogige nke ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ, ya bụ, n’ụwa. Ma, e kwesịrị ime ka Ndị Kraịst a e tere mmanụ, ma ọ bụ “ụmụ Livaị,” dị ọcha. Malakaị onye amụma buru amụma banyere nke a, sị: “Ọ [ya bụ Jehova] ga-anọdụkwa dị ka onye na-anụcha ihe na onye na-eme ka ọlaọcha dị ọcha, ọ ga-emekwa ka ụmụ Livaị dị ọcha; ọ ga-anụcha ha dị ka ọlaedo, nụchaakwa ha dị ka ọlaọcha, ha ga-aghọkwara Jehova ndị na-eweta onyinye inweta ihu ọma n’ezi omume.” (Mal. 3:3) Jehova ji “onye ozi nke ọgbụgba ndụ ahụ,” ya bụ Kraịst Jizọs, mee ka Izrel ime mmụọ a dị ọcha.

4 N’agbanyeghị nke a, Kraịst chọpụtara na Ndị Kraịst a kwesịrị ntụkwasị obi na-agbasi mbọ ike inye ndị ha na ha na-efekọ Jehova nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị. Site n’afọ 1879 gawa, ha na-ebipụta eziokwu dị na Baịbụl banyere Alaeze Chineke n’Ụlọ Nche, ma n’oge ihe siri ike ma n’oge ihe dị mma. Jizọs buru amụma na mgbe ya ‘ga-abịarute’ inyocha ezinụlọ ya ‘n’ọgwụgwụ usoro ihe a,’ na ya ga-ahụ ohu nke na-enye ezinụlọ ya “nri ha n’oge kwesịrị ekwesị.” O kwuru na ohu ahụ ga-enwe obi ụtọ nakwa na ya “ga-eme ya onye na-elekọta ihe niile o nwere” n’ụwa. (Mat. 24:3, 45-47) Kraịst, bụ́ Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst, ji “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” elekọta ihe ndị metụtara Alaeze ahụ n’ụwa. O si n’aka Òtù Na-achị Isi agwa “ezinụlọ” ya e tere mmanụ na ndị enyi ha, bụ́ “atụrụ ọzọ,” ihe ha ga na-eme.—Jọn 10:16.

Iwe Ihe Ubi nke Ụwa

5. Olee ọrụ eze ahụ ga-arụ nke Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ?

5 N’ọhụụ, Jọn onyeozi hụrụ ihe ọzọ Mesaya ahụ bụ́ eze ga-arụ “n’ụbọchị Onyenwe anyị,” mgbe e chichara ya eze n’afọ 1914. Jọn dere, sị: “M wee hụ, ma, lee! igwe ojii na-acha ọcha, na otu onye nke yiri nwa nke mmadụ nke nọ n’elu ígwé ojii ahụ, o kpukwa okpueze ọlaedo n’isi ya, mma owuwe ihe ubi nke dị nkọ dịkwa n’aka ya.” (Mkpu. 1:10; 14:14) Jọn nụrụ ka otu mmụọ ozi gwara Onye a na-ewe ihe ubi ka o tinye mma owuwe ihe ubi ya ghọrọ mkpụrụ n’ihi na “ihe ubi nke ụwa achawo acha nke ọma.”—Mkpu. 14:15, 16.

6. Olee ihe Jizọs kwuru ga-eme ka oge na-aga?

6 “Ihe ubi nke ụwa” e kwuru okwu ya ebe a na-echetara anyị ilu Jizọs tụrụ banyere ọka wit na ata. Jizọs ji onwe ya tụnyere nwoke kụrụ ọka wit n’ubi ya, nke bu n’obi ịghọrọ ọka wit dị mma, bụ́ nke na-anọchite anya “ụmụ nke alaeze,” ya bụ, ezi Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị ga-eso ya chịa n’Alaeze ya. Ma n’ime abalị, onye iro, ya bụ “Ekwensu,” kụrụ ata, nke bụ́ “ụmụ ajọ onye ahụ,” n’ubi ahụ. Onye ahụ ghara mkpụrụ gwara ndị na-arụrụ ya ọrụ ka ha hapụ ọka wit na ata ndị ahụ ka ha na-eto ruo mgbe a ga-ewe ihe ubi, ya bụ, ‘n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a.’ N’oge ahụ, ọ ga-edunye ndị mmụọ ozi ya ka ha chịkọta ọka wit iche, chịkọtakwa ata iche.—Mat. 13:24-30, 36-41.

7. Olee otú Kraịst si na-ewe “ihe ubi nke ụwa”?

7 Jizọs na-elekọta ọrụ owuwe ihe ubi zụrụ ụwa ọnụ nke na-emezu ihe ahụ Jọn hụrụ n’ọhụụ. A malitere iwe “ihe ubi nke ụwa” mgbe a chịkọtawara ndị fọdụrụ n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ “ụmụ nke alaeze,” ndị bụ́ “ọka wit” ahụ Jizọs kwuru okwu ya. Mgbe a lụchara Agha Ụwa nke Mbụ, a hụrụ nnukwu ihe dị iche n’etiti ezi Ndị Kraịst na Ndị Kraịst ụgha nke na a malitere agba nke abụọ nke iwe “ihe ubi nke ụwa,” ya bụ, ịchịkọta atụrụ ọzọ ahụ. Ndị a abụghị “ụmụ nke alaeze,” kama, ha bụ “oké ìgwè mmadụ,” ndị ji obi ha dum na-edo onwe ha n’okpuru Alaeze ahụ. E si ná “ndị dị iche iche, mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche” na-achịkọta ha. Ha na-edo onwe ha n’okpuru Alaeze Mesaya, nke Kraịst Jizọs na “ndị nsọ,” ya bụ, otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, ga-esi n’eluigwe na-achị.—Mkpu. 7:9, 10; Dan. 7:13, 14, 18.

Otú E Si Edu Ndú n’Ọgbakọ

8, 9. (a) Gịnị na-egosi na Kraịst ma ihe na-eme n’ọgbakọ nakwa na ọ ma àgwà onye ọ bụla nọ n’ime ya na-akpa? (b) Dị ka e gosiri na peeji nke 26, olee “ihe ndị miri emi nke Setan” anyị kwesịrị izere?

8 N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị tụlere na Kraịst ma ihe niile na-eme n’ọgbakọ dị iche iche e nwere na narị afọ mbụ O.A. N’oge a, e nyela Kraịst, bụ́ Onye Ndú na Eze anyị “ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.” Ọ na-edu ọgbakọ dị iche iche dị n’ụwa niile na ndị na-elekọta ha. (Mat. 28:18; Kọl. 1:18) Jehova emeela “ya onyeisi nke ihe niile n’ihi ọgbakọ ya” nke ndị e tere mmanụ nọ na ya. (Efe. 1:22) Nke a pụtara na o nweghị ihe na-eme n’ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ụwa niile nke ọ na-amaghị.

9 Jizọs zigaara ọgbakọ dị na Tayataịra n’oge ochie ozi. Ọ sịrị: “Ihe ndị a ka Ọkpara Chineke kwuru, bụ́ onye anya ya dị ka ire ọkụ na-enwu enwu, . . . ‘Amaara m ihe ndị ị na-eme.’” (Mkpu. 2:18, 19) Ọ baara ndị nọ n’ọgbakọ ahụ mba maka na ha na-eme omume rụrụ arụ, na-achọkwa naanị ọdịmma onwe ha. Ọ gwara ha, sị: “Ọ bụ m na-enyocha akụrụ na obi, m ga-akwụkwa unu ụgwọ n’otu n’otu dị ka omume unu si dị.” (Mkpu. 2:23) Nke a na-egosi na Kraịst ma ihe na-eme n’ọgbakọ nke ọ bụla, marakwa otú onye ọ bụla nọ n’ime ya si akpa àgwà. Jizọs jara Ndị Kraịst nọ na Tayataịra mma, bụ́ ndị “na-amataghị ‘ihe ndị miri emi nke Setan.’” (Mkpu. 2:24) N’oge a, ọ na-anabatakwa ma ndị okenye ma ụmụaka, bụ́ ndị na-anaghị etinye aka ‘n’ihe ndị miri emi nke Setan,’ bụ́ ndị dị n’Ịntanet ma ọ bụ n’egwuregwu vidio ndị na-egosi ndị na-eme ihe ike, ha anaghịkwa eme ihe ka o si masị ha. Obi na-adị ya ụtọ nke ukwuu mgbe ọ na-ahụ ka ọtụtụ Ndị Kraịst na-agba mbọ ka ha rubere ya isi n’ihe niile, na-ahapụkwa ọtụtụ ihe na-amasị ha iji mee nke a.

10. Olee ihe e ji mee ihe atụ otú Kraịst si eduzi ndị okenye, ma, gịnị ka ha kwesịrị ịma?

10 Kraịst ji ndị okenye edu ọgbakọ ya dị iche iche dị n’ụwa. O jikwa ịhụnanya eme nke a. (Efe. 4:8, 11, 12) Ndị okenye niile nọ n’ọgbakọ na narị afọ mbụ bụ ndị e tere mmanụ. N’akwụkwọ mkpughe, a kpọrọ ha kpakpando Kraịst chị n’aka nri. (Mkpu. 1:16, 20) Taa, ọtụtụ n’ime ndị okenye so n’atụrụ ọzọ ahụ. Ọ bụ mmụọ nsọ na-eduzi ndị na-ahọpụta ha ma ha kpechaa ekpere; ọ bụ ya mere e nwere ike iji kwuo na ọ bụkwa Kraịst na-eduzi ha. (Ọrụ 20:28) Ha ma na Kraịst ji ndị ikom ole na ole e tere mmanụ, ya bụ, Òtù Na-achị Isi, eduzi ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụwa.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 15:6, 28-30.

“Bịa, Onyenwe Anyị Jizọs”

11. Gịnị mere anyị ji achọsi ike ka Onye Ndú anyị bịa ọsọ ọsọ?

11 Ná mkpughe Jizọs kpugheere Jọn onyeozi, ọ gwara ya ọtụtụ mgbe na ya na-abịa ọsọ ọsọ. (Mkpu. 2:16; 3:11; 22:7, 20) O doro anya na ọ na-ekwu banyere ọbịbịa ọ ga-abịa ime Babịlọn Ukwu ahụ na ndị ọzọ so n’ajọ usoro ihe Setan ihe e kpere n’ikpe. (2 Tesa. 1:7, 8) Jọn onyeozi merela agadi chọsiri ike ịhụ mgbe ihe ndị a niile magburu onwe ha e buru n’amụma ga-emezu, nke mere o ji sị: “Amen! Bịa, Onyenwe anyị Jizọs.” Anyịnwa ndị nọ ndụ n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a na-achọsikwa ike ịhụ mgbe Onye Ndú anyị, bụ́ Eze anyị, ga-abịa ido aha Nna ya nsọ ma mee ka a mata na ọ bụ Nna ya kwesịrị ịchị.

12. Olee ọrụ Kraịst ga-ebu ụzọ rụọ tupu a hapụ ifufe ihe atụ ahụ nke ga-akpatara ụwa Setan mbibi?

12 Tupu Jizọs abịa laa nzukọ Setan nke anyị na-ahụ anya n’iyi, a ga-aka ndị niile so n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ Izrel ime mmụọ, akara. Baịbụl mere ka o doo anya na ọ bụ mgbe a kachara ndị so n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ akara ka a ga-ahapụ ifufe ihe atụ ahụ nke ga-akpatara usoro ihe Setan mbibi.—Mkpu. 7:1-4.

13. Olee otú Kraịst ga-esi mee ka ọnụnụ ya pụta ìhè n’agba nke mbụ nke “oké mkpagbu” ahụ?

13 Ọtụtụ ndị bi n’ụwa a amaghị na oge “ọnụnọ” Kraịst malitere kemgbe afọ 1914. (2 Pita 3:3, 4) Ma, n’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ka a mara banyere ọnụnụ ya site n’ime akụkụ dị iche iche nke usoro ihe Setan ihe Jehova kpere n’ikpe. Mbibi a ga-ebibi “onye ahụ na-emebi iwu,” ya bụ, ndị ndú okpukpe Krisendọm, ga-egosi nnọọ na ‘ọnụnọ ya apụtala ìhè.’ (Gụọ 2 Ndị Tesalọnaịka 2:3, 8.) Ọ ga-egosi nnọọ na Kraịst na-arụ ọrụ o ji bụrụ Onyeikpe Jehova họpụtara. (Gụọ 2 Timoti 4:1.) A ga-ebibi okpukpe ụgha ndị ọzọ dị n’ụwa ma e bibichaa okpukpe ikpe kacha maa n’ime okpukpe ndị so na Babịlọn Ukwu ahụ. Jehova ga-etinye ya n’obi ndị ọchịchị ịla nwaanyị akwụna ahụ n’iyi. (Mkpu. 17:15-18) Nke a ga-abụ agba nke mbụ nke “oké mkpagbu” ahụ.—Mat. 24:21.

14. (a) Olee ihe mere a ga-eji mee ka agba nke mbụ nke oké mkpagbu ahụ dị mkpirikpi? (b) Olee ihe “ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ” ga-eme ka ndị Jehova mee?

14 Jizọs kwuru na a ga-eme ka ụbọchị mkpagbu ahụ dị mkpirikpi “n’ihi ndị a họọrọ,” ya bụ, ndị fọdụrụ ná Ndị Kraịst e tere mmanụ ka nọ n’ụwa. (Mat. 24:22) Jehova agaghị ekwe ka a kpaa Ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị enyi ha, bụ́ atụrụ ọzọ, aka mgbe a ga-ebibi okpukpe ụgha. Jizọs kwuru na mgbe “mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ gasịrị,” a ga-enwe ihe ịrịba ama dị iche iche n’anyanwụ, na n’ọnwa nakwa na kpakpando, “mgbe ahụ, ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ ga-apụta n’eluigwe.” Nke a ga-eme ka mba niile nke ụwa tie “aka n’obi, kwaa ákwá arịrị.” Ọ bụghị otú a ka ọ ga-adị ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị nwere olileanya ịga eluigwe, nakwa ndị enyi ha, bụ́ ndị nwere olileanya iketa ụwa. Ha ‘ga-eweli isi ha elu, n’ihi na nnapụta ha na-eru nso.’—Mat. 24:29, 30; Luk 21:25-28.

15. Olee ọrụ Kraịst ga-arụ mgbe ọ ga-abịa?

15 Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ụzọ ọzọ tupu ya enwezuo mmeri. O buru amụma, sị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, ya na ndị mmụọ ozi ya niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọkwasị n’ocheeze ya dị ebube. A ga-emekwa ka mba niile zukọta n’ihu ya, ọ ga-ekewapụkwa ndị mmadụ n’ebe ibe ha nọ, dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ. Ọ ga-edebe atụrụ n’aka nri ya, ma debe ewu n’aka ekpe ya.” (Mat. 25:31-33) Ihe amaokwu a na-ekwu bụ ọbịbịa Kraịst ga-abịa ịrụ ọrụ Onyeikpe wee kewaa ndị “mba niile” ụzọ abụọ: ya bụ, “atụrụ” na “ewu.” Atụrụ bụ ndị kwadoro ụmụnna Jizọs, ya bụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’ụwa, ebe ewu bụ “ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.” (2 Tesa. 1:7, 8) Atụrụ, bụ́ ndị a kpọrọ “ndị ezi omume,” ga-enweta “ndụ ebighị ebi” n’ụwa, ebe ndị bụ́ ewu “ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi.”—Mat. 25:34, 40, 41, 45, 46.

Jizọs Enwezuo Mmeri

16. Olee otú Kraịst, bụ́ Onye Ndú anyị, ga-esi enwezu mmeri ya?

16 Kraịst ‘ga-enwezu mmeri ya’ mgbe ọ kachara ndị ga-eso ya bụrụ ndị eze na ndị nchụàjà akara, ya ahọpụtakwa ndị bụ́ atụrụ debe ha n’aka nri ya ka e wee zọpụta ha. (Mkpu. 5:9, 10; 6:2) Ọ ga-eduruzi ndị mmụọ ozi ya dị ike nakwa ụmụnna ya a kpọlitere n’ọnwụ bibie usoro ihe Setan, ya bụ, ndị ọchịchị, ndị agha, na ndị azụmahịa nọ n’ụwa. (Mkpu. 2:26, 27; 19:11-21) Kraịst ga-enwezu mmeri mgbe ọ ga-ebibi ajọ usoro ihe Setan. Ọ ga-atụbazi Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis ruo otu puku afọ.—Mkpu. 20:1-3.

17. N’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, olee ihe ọ ga-eduga atụrụ ọzọ ya inweta, oleekwa ihe anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

17 Jọn onyeozi buru amụma banyere “oké ìgwè mmadụ” nke atụrụ ọzọ ahụ, bụ́ ndị ga-alanahụ oké mkpagbu ahụ. O kwuru na “Nwa Atụrụ ahụ, onye nọ n’etiti ocheeze ahụ, ga-azụ ha dị ka atụrụ, ọ ga-edugakwa ha n’isi iyi nke mmiri nke ndụ.” (Mkpu. 7:9, 17) N’eziokwu, n’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, ọ ga na-edu atụrụ ọzọ ahụ, bụ́ ndị na-ege ntị n’olu ya, ọ ga-edugakwa ha inweta ndụ ebighị ebi. (Gụọ Jọn 10:16, 26-28.) Ka anyị kpebisie ike na anyị ga-anọgide na-eso eze anyị, onye bụ́ Onye Ndú anyị, banye n’ụwa ọhụrụ Jehova kwere anyị ná nkwa!

Ntụleghachi

• Gịnị ka Kraịst mere mgbe e chichara ya eze?

• N’ụwa, ole ndị ka Kraịst ji edu ọgbakọ dị iche iche?

• Olee otú o si bụrụ na Kraịst, bụ́ Onye Ndú anyị, ka ga-abịa?

• Olee otú Kraịst ga-esi na-edu anyị n’ụwa ọhụrụ?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 29]

Mbibi a ga-ebibi ajọ usoro ihe Setan ga-eme ka a mara banyere ọnụnọ Kraịst