Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezigbo Ihe Si n’Ozi Ọma Pụrụ Iche E Ziri na Bọlgeria Pụta

Ezigbo Ihe Si n’Ozi Ọma Pụrụ Iche E Ziri na Bọlgeria Pụta

Ezigbo Ihe Si n’Ozi Ọma Pụrụ Iche E Ziri na Bọlgeria Pụta

“Ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.”—MAT. 9:37, 38.

IHE a Jizọs kwuru bụ nnọọ ihe mere na Bọlgeria, bụ́ mba mara mma nke dị na Bọlkan, nke dị na ndịda ebe ọwụwa anyanwụ Yurop! A chọkwuru nnọọ ndị ga-ekwusara ihe karịrị nde mmadụ asaa bi ná mba ahụ ozi ọma. E nwere ihe dị ka otu puku ndị nkwusa na narị asaa na Bọlgeria, ma, ha enweghị ike ịgazu ozi ọma n’ókèala niile dị ná mba ahụ. Nke a mere ka Òtù Na-achị Isi kwado n’afọ 2009 ka a gwa Ndịàmà na-asụ asụsụ Bọlgerian, bụ́ ndị bi ná mba dị iche iche na Yurop ka ha gaa ozi ọma pụrụ iche na Bọlgeria. A haziri ozi ọma ahụ ka ọ bụrụ n’oge okpomọkụ. Ọ ga-ewe izu asaa, a ga-agagidekwa ya ruo mgbe a ga-enwe Mgbakọ Distrikti “Na-echenụ Nche!” nke e nwere na Sọfia, malite n’Ọgọst 14-16, 2009.

Ọtụtụ Ụmụnna Kwere Ịga

Ụmụnna ndị nọ n’alaka ụlọ ọrụ dị na Sọfia nọ na-atụgharị n’uche ha mmadụ ole ga-esi Fransị, Jamanị, Gris, Ịtali, Pọland, na Spen abịa. Nke a pụtara na ha ga-eji ego ha gbara ụgbọ bịa Bọlgeria, jirikwa oge ezumike ha kwusaa ozi ọma. Obi dị onye ọ bụla ụtọ na kwa izu a na-enwekwu ndị chọrọ ịga nke mere ka ndị niile chọrọ ịga dị narị ndị nkwusa abụọ na iri itoolu na abụọ. Ebe ọ bụ na ndị chọrọ ịga dị ọtụtụ, a ga-enwe ike iziga ha n’obodo atọ dị na Bọlgeria. Ha bụ: Kazanlak, Sandanski, na Silistra. Ndị nlekọta Sekit nọ na Bọlgeria gwara ndị ọsụ ụzọ na ndị nkwusa nọ ná mba ahụ ka ha soro rụọ ọrụ a pụrụ iche. N’ikpeazụ, narị mmadụ atọ na iri asatọ na abụọ wepụtara onwe ha ma jiri ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma n’ebe ndị a na-anaghị agakarị ozi ọma.

A gwara ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ndị dị nso ka ha gaa chọtara ndị ga-esi esi bịa ụlọ. Ha nwetaara ha ụlọ ebe dị iche iche nakwa na họtel ndị na-adịghị oké ọnụ. Ụmụnna ndị a rụsiri ọrụ ike iji nyere ndị niile ga-esi esi bịa aka inweta ebe ha ga-anọ nakwa iji gbooro ha mkpa ha. E nwetara ebe ndị a ga-anọ nwee ọmụmụ ihe n’obodo atọ ahụ. E mere ndokwa ka ọ bụrụ ụmụnna ndị ahụ ga-esi esi bịa ga na-eduzi ọmụmụ ihe. Obi dị onye ọ bụla ụtọ ịhụ na iri ndị nkwusa ise na-ezukọ na-eto Jehova n’ebe a na-enwedịghị otu Onyeàmà.

Ndị si mba dị iche iche bịa ozi ọma ahụ ji ịnụ ọkụ n’obi dị egwu jee ya. Okpomọkụ nke na-adị na Bọlgaria n’oge okpomọkụ na-adị egwu. Ma, nke a emeghị ka ụmụnna ndị a daa mbà. N’ime izu atọ mbụ a malitere ikwusa ozi ọma n’obodo ahụ, a gbara àmà nke ọma na Silistra, bụ́ obodo dị nso n’Osimiri Danube, bụ́ ebe ihe karịrị puku mmadụ iri ise bi. N’ihi ya, ụmụnna ndị ahụ gara kwusaa ozi ọma n’obodo ndị dị Silistra nso, ha rudịrị Tutrakan, bụ́ nke dị kilomita iri ise na ise ma e si Silistra gawa n’ebe ọdịda anyanwụ. Ha na-amalitekarị ozi ọma mgbe o ji ọkara gaa elekere itoolu nke ụtụtụ. Ha richaa nri ehihie, ha na-ekwusa ozi ọma ruo elekere asaa nke mgbede ma ọ bụdị karịa. Ihe ọzọ bụ na ịnụ ọkụ n’obi ụmụnna ndị a ji jee ozi ọma na Kazanlak nakwa na Sandanski mere ka ha kwusaa ozi ọma n’ọtụtụ ime obodo na obodo ukwu ndị dị ha nso.

Gịnị Ka A Rụpụtara?

E ji izu asaa ahụ gbaa àmà dị ukwuu. Ndị bi n’obodo ndị ahụ ha gara ozi ọma kwuru ihe yiri ihe ndị mmadụ kwuru n’oge ndịozi, ya bụ, ‘unu emewo ka ozizi unu jupụta obodo anyị.’ (Ọrụ 5:28) Ndị gara ozi ọma ahụ nyere ihe dị ka iri puku magazin ise, ha malitekwara ịmụrụ narị mmadụ anọ na iri asatọ na abụọ Baịbụl. Obi dị anyị ụtọ na a malitere ọgbakọ na Silistra na Septemba 1, 2009, e nwekwara ndị na-ezukọ n’ìgwè n’ìgwè amụ ihe na Kazanlak nakwa na Sandanski. Ọ na-eme anyị obi ụtọ na ndị ọ bụ mgbe ahụ a gara ozi ọma ebe ahụ bụ mbụ ha na-anụ ozi ọma na-enwe ọganihu ugbu a.

N’izu nke mbụ ha gara ozi ọma n’ebe ahụ, otu nwanna nwaanyị nke si Spen, onye na-asụ Bọlgerian, bụrụkwa ọsụ ụzọ pụrụ iche, ziri Karina, bụ́ nwaanyị Silistra nke na-ere akwụkwọ akụkọ n’okporo ámá, ozi ọma. Karina nwere mmasị n’ihe ọ gwara ya wee bịa ọmụmụ ihe. O kwere ozugbo ka a mụwara ya Baịbụl. O kwuru ka a nọrọ n’otu ogige ntụrụndụ na-amụrụ ya Baịbụl n’ihi na di ya ekweghị na Chineke. A malitekwaara ụmụ ya nwaanyị abụọ ọmụmụ Baịbụl. Ada ya nwaanyị bụ́ Daniela nwere nnọọ mmasị n’eziokwu Baịbụl ọ na-amụta. O ji otu izu gụchaa akwụkwọ Bible Na-akụzi, malitekwa ime ihe Baịbụl kwuru, nke bụ́ ka a ghara iji ihe oyiyi efe Chineke. Ọ malitekwara ịkọrọ ndị enyi ya ihe ọ na-amụta na Baịbụl. Mgbe naanị izu atọ gafere ka ọ bịachara ọmụmụ ihe mbụ ya, ọ gwara nwanna nwaanyị na-amụrụ ya Baịbụl, sị: “Ọ dịzi m ka m bụ onye òtù unu. Gịnị ka m ga-eme ka mụnwa malitekwa ikwusa ozi ọma?” Daniela na mama ya na nwanne ya nwaanyị na-enwe ọganihu.

Na Kazanlak, ka otu nwanna nwoke onye Bọlgeria aha ya bụ Orlin, bụ́ onye si Ịtali bịa iso kwusaa ozi ọma ahụ, si ozi ọma na-ala, o ziri ụmụ okorobịa abụọ nọ ọdụ n’ogige ntụrụndụ ozi ọma. O nyere ha akwụkwọ Bible Na-akụzi ma kwuo na ya ga-alọghachi echi ya leta ha. Mgbe Orlin laghachiri, ọ malitere ịmụrụ Svetomir Baịbụl, ọ gaghachikwara na nke ya n’echi ya. N’ime abalị itoolu, ọ mụụrụ ya ihe ugboro asatọ. Svetomir kwuru, sị: “Abalị abụọ tupu gị abịa zie m ozi ọma, ekpekuru m Chineke ekpere ka o nyere m aka ka m mara onye ọ bụ. M kwekwara ya nkwa na m ga-arara ndụ m nye ya ma ọ bụrụ na o nyere m aka.” Mgbe Orlin laghachiri Ịtali, ụmụnna ndị Kazanlak malitere ịmụrụ Svetomir Baịbụl, ọ na-emekwa ihe ndị ọ na-amụta.

A Gọziri Ndị ahụ Gara Ozi Ọma

Olee otú obi dị ndị ahụ wepụtara oge ezumike ha ma gbaara onwe ha ụgbọ gaa ikwusa ozi ọma ná mba ọzọ? Otu okenye nọ na Spen dere, sị: “Ozi ọma ahụ mere ka ụmụnna anyị nọ na Spen, bụ́ ndị na-asụ Bọlgerian, dịkwuo n’otu. O mere ka okwukwe ụmụnna anyị ndị so gaa ozi ọma ahụ sikwuo ike.” Otu di na nwunye si Ịtali dere, sị: “Ọnwa ahụ bụ ọnwa kacha pụọ iche ná ndụ anyị!” Ha kwukwara, sị: “Ozi ọma ahụ anyị so gaa gbanwere ndụ anyị. Ndụ anyị akakwuola mma.” Di na nwunye ahụ malitere iche otú ha ga-esi kwaga Bọlgeria ka ha nwee ike ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. Carina bụ nwanna nwaanyị na-alụbeghị di nke bụ́ ọsụ ụzọ, onye si Spen bịa kwusaa ozi ọma na Silistra n’oge ahụ. Mgbe ọ laghachiri Spen, ọ gbara arụkwaghịm n’ọrụ ya ma kwaga Bọlgeria ka o nwee ike inyere ọgbakọ e hiwere ọhụrụ ná mba ahụ aka. O chekwara ego ga-ezuru ya ịnọ na Bọlgeria otu afọ. Carina kwuru banyere ihe ahụ o mere, sị: “Obi dị m ụtọ nke ukwuu na Jehova kwere ka m na-ejere ya ozi na Bọlgeria ebe a, m bukwa n’obi ịnọte aka ebe a. M na-amụrụ mmadụ ise Baịbụl ugbu a, atọ n’ime ha na-abịakwa ọmụmụ ihe.”

Otu nwanna nwaanyị bụ́ onye Ịtali chọrọ iso gaa, ma o nweghị oge ezumike n’ihi na ọ ka malitere ọrụ ọhụrụ. O kweghị ka nke a kụda ya mmụọ. Ọ gwara nna ya ukwu ka o nye ya ezumike otu ọnwa n’akwụghị ya ụgwọ, ọ dịkwa njikere ịgba arụkwaghịm ma ọ bụrụ na ọ jụ. Ọ tụrụ ya n’anya mgbe nna ya ukwu gwara ya, sị: “Nsogbu adịghị ma ọ bụrụ na ị ga-emere m otu ihe: Ị ga-ezitere m kaadị si Bọlgeria.” Nwanna nwaanyị ahụ ma na Jehova azaala ya ekpere ya.

Stanislava, bụ́ nwanna nwaanyị si obodo Vana nke dị na Bọlgeria ma na-arụ ọrụ oge niile nke a na-akwụ ya ezigbo ụgwọ, naara oge ezumike ka o wee nwee ike iso kwusaa ozi ọma n’oge ahụ na Silistra. Mgbe ọ hụrụ ụdị obi ụtọ ndị ọsụ ụzọ si obodo dị anya bịa ikwusa ozi ọma ná mba ya nwere, anya mmiri gbara ya. Ọ malitere iche ihe mere o ji jiri ndụ ya na-achụ ego. Mgbe ọ laghachiri Vana ka izu abụọ gachara, ọ gbara arụkwaghịm n’ọrụ ya ma ghọọ ọsụ ụzọ oge niile. Obi dị ya ezigbo ụtọ ugbu a n’ihi na ọ na-echeta Onye Okike ya n’oge ọ bụ agbọghọbịa.—Ekli. 12:1.

Ijere Jehova ozi na-eweta ngọzi dị ukwuu. O nweghị ihe karịrị iji oge gị na ume gị na-arụ ọrụ ahụ dị mkpa, ya bụ, ikwusa ozi ọma na ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl. È nwere otú i nwere ike isi wepụtakwuo oge na-arụ ọrụ ahụ e ji azọpụta ndị mmadụ? E nwere ike inwe ebe ndị e nwere mkpa ka ukwuu ná mba unu. Ì nwere ike ịkwaga ebe ndị ahụ? I nwekwara ike ịmụ asụsụ ọzọ ka i wee nyere ndị nọ ná mba unu aka, bụ́ ndị akpịrị nke eziokwu Baịbụl na-akpọ nkụ. Ọ bụrụ na i mee ihe ọ bụla i nwere ike ime iji wepụtakwuo oge na-ekwusa ozi ọma, Jehova ga-agọzi gị n’ụba.—Ilu 10:22.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 32]

Ụbọchị A Na-agaghị Echefu Echefu

Ọtụtụ ndị si n’obodo ndị ọzọ dị na Yurop gaa ikwusa ozi ọma na Bọlgeria kpebiri ịga Mgbakọ Distrikti “Na-echenụ Nche!” nke e nwere na Sọfia. Ihe kacha gbaa ụmụnna ndị ebe ahụ ume bụ otú ha na ụmụnna ndị si mba dị iche iche si kpakọrịta. Puku mmadụ abụọ na iri atọ na itoolu gara mgbakọ ahụ nwere obi ụtọ dị ukwuu mgbe Nwanna Geoffrey Jackson, onye so n’Òtù Na-achị Isi, wepụtara Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ Bọlgerian! Ndị niile bịara na Fraịdee e wepụtara ya kụrụ aka dara ụda ruo ogologo oge iji gosi na obi dị ha ụtọ. Anya mmiri gbadịrị ọtụtụ n’ime ha n’ihi ọṅụ. Baịbụl a a sụgharịrị nke ọma, nke na-ekwe nghọta, ga-enyere ndị Bọlgeria nwere ezi obi aka ịmara Jehova.

[Map dị na peeji nke 30, 31]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

BỌLGERIA

SỌFIA

Sandanski

Silistra

Kazanlak

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

E kwusara ozi ọma pụrụ iche n’ime izu asaa ahụ