Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

1 Gịnị Mere E Ji Ekpe Ya?

1 Gịnị Mere E Ji Ekpe Ya?

Ekpere

1 Gịnị Mere E Ji Ekpe Ya?

EKPERE. E nweghị ọtụtụ isiokwu si na Baịbụl na-amasị ndị mmadụ ka ya. Ka anyị tụlee ajụjụ asaa ndị mmadụ na-ajụkarị banyere ekpere; anyị ga-ahụkwa otú Baịbụl si zaa ha. A kwadebere isiokwu ndị a iji nyere gị aka ikpe ekpere—ịmalite ikpe ekpere ma ọ bụ ime ka ekpere gị ka mma.

N’OMENALA na okpukpe niile dị n’ụwa, ndị mmadụ na-ekpe ekpere. Ha na-ekpe ya mgbe naanị ha nọ; ha na-ekpe ya n’ìgwè. Ha na-ekpe ekpere na chọọchị, n’ụlọ nsọ, n’ụlọ nzukọ ndị Juu, n’ụlọ okpukpe ndị Alakụba, nakwa n’ụlọ arụsị. Ha nwere ike iji ute ekpere, chaplet, wiil ekpere, ihe oyiyi, akwụkwọ ekpere, ma ọ bụ ekpere ndị e dere n’obere bọọdụ ha na-ekowe ekowe, na-ekpe ya.

N’ihe niile dị ndụ n’ụwa, ọ bụ naanị mmadụ na-ekpe ekpere. N’ezie, e nwere ọtụtụ ụzọ anyị na ụmụ anụmanụ si yie. Nri, ikuku, na mmiri dị anyị mkpa otú ọ dị ha. A na-amụ anyị otú a na-amụ ha, anyị adị ndụ ma nwụọ ka ha. (Ekliziastis 3:19) Ma, ọ bụ naanị mmadụ na-ekpe ekpere. N’ihi gịnị?

Ikekwe, azịza ya kacha mfe bụ na ọ dị anyị mkpa. A si ka e kwuwe, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ weere ekpere ka ụzọ isi gwa ihe ha weere dị ka ihe dị nsọ na ihe na-adịru mgbe ebighị ebi okwu. Baịbụl gosiri na e kere anyị inwe agụụ ime ihe ndị dị otú ahụ. (Ekliziastis 3:11) Ọ dị mgbe Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.”—Matiu 5:3.

Anyị nwere “mkpa ime mmụọ.” E wezụga ya, olee ihe mere ndị mmadụ ji ewu nnukwu ụlọ okpukpe, achịkọta ihe ochie ndị metụtara ofufe, na-ekpekwa ekpere ọtụtụ awa? N’ezie, ụfọdụ na-eche na ha ma ọ bụ ụmụ mmadụ ibe ha ga-egboli mkpa ime mmụọ ha. Ma, ị̀ chọpụtala na ụmụ mmadụ erughị nnọọ eru ime ya? Anyị adịghị nnọọ ike, ndụ anyị dị mkpụmkpụ, anyị amaghịkwa ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ọ bụ naanị onye ka anyị nnọọ mara ihe, onye ka anyị ike, na onye na-adị ogologo ndụ karịa anyị nwere ike inye anyị ihe dị anyị mkpa. Oleekwanụ ihe bụ́ mkpa ime mmụọ ndị a na-akpali anyị ikpe ekpere?

Tụlegodị ihe a: Ọ̀ dịtụla mgbe ọ gụrụ gị agụụ inweta nduzi, amamihe, ma ọ bụ azịza nke ajụjụ ndị karịrị echiche mmadụ? Ọ̀ dịtụla mgbe i chere na nkasi obi dị gị mkpa n’ihi ọnwụ onye ị hụrụ n’anya nke gbawara gị obi, mgbe nduzi dị gị mkpa n’ihi mkpebi ị na-amaghị otú ị ga-esi mee ya, ma ọ bụ mgbe mgbaghara dị gị mkpa n’ihi na obi gị na-apịa gị ụtarị maka ihe i mere?

Baịbụl mere ka anyị mara na anyị nwere ike ikpe ekpere maka ihe ndị ahụ. Ọ bụ Baịbụl bụ akwụkwọ ga-akacha enyere anyị aka n’ihe banyere ekpere, ekpere ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi kpere dịkwa na ya. Ha kpere ekpere maka nkasi obi, nduzi, mgbaghara mmehie, na maka azịza nke ajụjụ ndị kacha sie ike.—Abụ Ọma 23:3; 71:21; Daniel 9:4, 5, 19; Habakọk 1:3.

Ọ bụ ezie na ekpere ndị ahụ abụghị otu, e nwere ihe jikọrọ ha niile. Onye nke ọ bụla n’ime ndị kpere ha maara ihe dị mkpa ga-eme ka a zaa ekpere mmadụ, bụ́ ihe ọtụtụ ndị n’ụwa taa na-amaghị ma ọ bụ na-eleghara anya. Ha maara onye e kwesịrị ikpegara ekpere.