Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

2 Ònye Ka E Kwesịrị Ikpegara Ya?

2 Ònye Ka E Kwesịrị Ikpegara Ya?

Ekpere

2 Ònye Ka E Kwesịrị Ikpegara Ya?

EKPERE niile hà na-aga otu ebe, n’agbanyeghị onye e kpegaara ha? N’ụwa taa, ndị mmadụ na-echekarị otú ahụ. Echiche a na-amasị ọtụtụ ndị na-akwado òtù ngwakọta ofufe, bụ́kwa ndị chọrọ ka okpukpe niile dị mma, n’agbanyeghị otú ozizi ha si dịgasịa iche. Ma, echiche ahụ ò nwere ike ịbụ ụgha?

N’ezie, Baịbụl na-akụzi na ọtụtụ ekpere ndị mmadụ na-ekpe na-agahie ụzọ. N’oge e dere Baịbụl, ndị mmadụ na-ekpegakarịrị ihe oyiyi a pịrị apị ekpere. Ma, Chineke dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị ugboro ugboro ka ha zere ime otú ahụ. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 115:4-6 kwuru banyere arụsị, sị: “Ha nwere ntị, ma ha apụghị ịnụ ihe.” Ihe ebe ahụ na-ekwu doro anya. Olee uru ọ bara ikpegara chi na-emekataghị nụ ihe ị na-ekwu ekpere?

Otu ihe doro anya a kọrọ na Baịbụl mekwuru ka nke a pụta ìhè. Ezi onye amụma Chineke bụ́ Ịlaịja mara ndị amụma Bel aka ka ha kpegara chi ha ekpere, e mechaakwa Ịlaịja ekpegara nke ya. Ịlaịja kwuru na ezi Chineke ga-aza ekpere ahụ ma chi ụgha agaghị aza. Ndị amụma Bel nabatara aka ahụ a mara ha ma kpesie ekpere ike ruo ogologo oge, jiridị oké olu kpọkusie chi ha ike—ma o nweghị isi! Akụkọ ahụ kwuru, sị: “Ọ dịghịkwa onye na-azaghachi, ọ dịghịkwa onye na-aṅa ntị.” (1 Ndị Eze 18:29) Oleekwanụ maka Ịlaịja?

Mgbe Ịlaịja kpechara ekpere nke ya, Chineke ya zara ya ozugbo, si n’eluigwe zite ọkụ nke repịara àjà Ịlaịja chụrụ. Olee ihe mere ekpere ya ji dị iche? Ọ dị otu ihe dị mkpa anyị ga-ahụ n’ekpere Ịlaịja nke e dere ná 1 Ndị Eze 18:36, 37 ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ahụ. Ọ bụ ekpere dị nnọọ nkenke—o nwere naanị okwu iri atọ n’asụsụ Hibru e ji dee Baịbụl. N’agbanyeghị nke ahụ, n’okwu ole na ole ahụ Ịlaịja kwuru, ọ kpọrọ Chineke aha ya, bụ́ Jehova, ugboro atọ.

Bel, nke pụtara “onye nwe” ma ọ bụ “nna ukwu,” bụ chi ndị Kenan, ọtụtụ obodo nwekwara Bel nke ha. Ma, Jehova bụ aha pụrụ iche, nke naanị otu Onye na-aza n’eluigwe na ụwa. Chineke a gwara ndị ya, sị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m; agaghị m enye onye ọzọ nsọpụrụ m.”—Aịzaya 42:8.

Ekpere Ịlaịja na ekpere ndị amụma Bel ahụ hà gara otu ebe? Ofufe Bel nke gụnyere ịkwa iko na ọbụna iji mmadụ achụ àjà na-eweda mmadụ ala. Ma, ife Jehova mere ka ndị Jehova, bụ́ ndị Izrel, nwee ùgwù, mee ka ha zere omume ndị na-eweda mmadụ ala. N’ihi ya, chebagodịrị ya echiche: Ọ bụrụ na i degaara otu enyi gị ị na-akwanyere nnọọ ùgwù akwụkwọ ozi, ị̀ ga-atụ anya ka e nye ya onye aha ya na aha enyi gị na-abụghị otu, onye àgwà ya na nke enyi gị na-eyitụghị? Mbanụ!

Ọ bụrụ na i kpegara Jehova ekpere, onye ị na-ekpegara ya bụ Onye Okike, bụ́ Nna nke mmadụ niile. * Aịzaya onye amụma kwuru n’ekpere, sị: “Gị onwe gị, Jehova, bụ Nna anyị.” (Aịzaya 63:16) N’ihi ya, ọ bụ nnọọ Onye a ka Jizọs Kraịst na-ekwu banyere ya mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ana m arịgokwuru Nna m na Nna unu nakwa Chineke m na Chineke unu.” (Jọn 20:17) Ọ bụ Jehova bụ Nna Jizọs. Ọ bụ ya bụ Chineke nke Jizọs kpegaara ekpere na nke ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpegara ekpere.—Matiu 6:9.

Baịbụl ọ̀ gwara anyị ka anyị na-ekpegara Jizọs, Meri, ndị senti, ma ọ bụ ndị mmụọ ozi, ekpere? Ee e—ọ bụ naanị Jehova ka ọ gwara anyị ka anyị na-ekpegara ekpere. Ka anyị tụlee ihe abụọ mere o ji dị otú ahụ. Nke mbụ, ekpere bụ ofufe, Baịbụl kwukwara na ọ bụ naanị Jehova ka e kwesịrị ife ofufe. (Ọpụpụ 20:5) Nke abụọ, Baịbụl gosiri na Chineke bụ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Ọ bụ ezie na Jehova enyefeela ọtụtụ ihe n’aka ndị ọzọ, nke a bụ ọrụ ọ na-enyefetụbeghị onye ọzọ. Ọ bụ Chineke nke kwere nkwa ịnụrụ ekpere anyị n’onwe ya.

Ya mere, ọ bụrụ na ị chọrọ ka Chineke nụ ekpere gị, cheta ndụmọdụ a Akwụkwọ Nsọ nyere: “Onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.” (Ọrụ 2:21) Ma, Jehova ọ̀ na-anụ ekpere niile n’agbanyeghị otú e si kpee ha? Ka ọ̀ dị ihe ọzọ ọ dị mkpa ka anyị mara ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova nụ ekpere anyị?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Omenala okpukpe ụfọdụ na-ekwu na ọ dị njọ ịkpọ aha Chineke, ma n’ekpere. Ma, aha ahụ pụtara ihe dị ka puku ugboro asaa n’asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl, ọtụtụ n’ime ebe ndị ha pụtakwara bụ n’ekpere na abụ ọma nke ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi.

[Foto dị na peeji nke 5]

Aka Ịlaịja mara ndị amụma Bel gosiri na ekpere niile anaghị aga otu ebe