Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

3 Olee Otú E Kwesịrị Isi Na-ekpe Ya?

3 Olee Otú E Kwesịrị Isi Na-ekpe Ya?

Ekpere

3 Olee Otú E Kwesịrị Isi Na-ekpe Ya?

A BỊA n’ekpere, ọtụtụ omenala okpukpe na-elekwasị anya n’ihe ndị a na-ahụ anya, dị ka otú mmadụ ga-anọ, ihe ọ ga-ekwu, na ihe ọ ga na-eme mgbe ọ na-ekpe ekpere. Ma, Baịbụl na-enyere anyị aka ịghara ilekwasị anya n’ihe ndị dị otú ahụ ma lekwasị anya n’ihe ndị ka mkpa n’ajụjụ ahụ bụ́, “Olee otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere?”

Baịbụl gosiri na ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’ebe na n’ọnọdụ dị iche iche kpee ekpere. Ha kpere ya n’ime obi ha ma ọ bụ n’olu dara ụda dabere n’ọnọdụ ha nọ. Ha legidere anya n’elu ma ọ bụ hulata ehulata kpee ekpere. Kama iji ihe oyiyi, chaplet, ma ọ bụ akwụkwọ ekpere dị ka ihe ga-enyere ha aka n’ekpere, naanị ihe ha na-eme bụ ikwu ihe dị ha n’obi n’okwu nke aka ha. Olee ihe mere Chineke ji nụ ekpere ha?

Dị ka isiokwu bu nke a ụzọ kwuru, ọ bụ naanị otu Chineke, bụ́ Jehova, ka ha kpegaara ekpere. O nwekwara ihe ọzọ dị mkpa. Jọn nke Mbụ 5:14 kwuru, sị: “Obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ bụ na ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.” Ọ dị mkpa ka ekpere anyị kwekọọ n’uche Chineke. Gịnị ka nke a pụtara?

Iji na-ekpe ekpere kwekọrọ n’uche Chineke, ọ dị anyị mkpa ịma uche ya. N’ihi ya, ịmụ Baịbụl dị ezigbo mkpa iji mee ka Chineke nụ ekpere anyị. Nke a ọ̀ pụtara na Chineke agaghị anụ ekpere anyị ọ gwụla ma anyị bụ ndị ọkà mmụta Baịbụl? Mba, ma Chineke na-atụ anya ka anyị mụọ uche ya, gbalịa ịghọta ya na ime ya eme. (Matiu 7:21-23) Ọ dị anyị mkpa ikpe ekpere kwekọrọ n’ihe anyị na-amụta.

Ka anyị na-amụta banyere Jehova na uche ya, anyị na-enwekwu okwukwe—bụ́ ihe ọzọ dị mkpa n’ekpere. Jizọs kwuru, sị: “Ihe niile unu na-arịọ n’ekpere ma nwee okwukwe, unu ga-enweta ha.” (Matiu 21:22) Okwukwe apụtaghị mmadụ ikwere ihe ọ bụla ọ nụrụ. Kama, ọ pụtara ikwere ihe nwere ezigbo ihe akaebe kwadoro ya n’agbanyeghị na a naghị ahụ ihe ahụ anya. (Ndị Hibru 11:1) E nwere ọtụtụ ihe akaebe na Baịbụl na-egosi na Jehova, onye anyị na-enweghị ike ịhụ anya, dị adị, bụrụ onye anyị nwere ike ịtụkwasị obi na onye dị njikere ịza ekpere nke ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ. Anyị nwekwara ike ịrịọ ya mgbe ọ bụla ka o nyekwuo anyị okwukwe, ọ na-atọkwa Jehova ụtọ inye anyị ihe dị anyị mkpa.—Luk 17:5; Jems 1:17.

Lekwa ihe ọzọ dị mkpa n’otú e kwesịrị isi na-ekpe ekpere. Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) Ya mere, Jizọs bụ ụzọ anyị nwere ike isi bịakwute Nna ya, bụ́ Jehova. N’ihi ya, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere n’aha ya. (Jọn 14:13; 15:16) Nke ahụ apụtaghị na anyị kwesịrị ikpegara Jizọs ekpere. Kama nke ahụ, anyị na-ekpe ekpere n’aha Jizọs, na-echeta na ọ bụ Jizọs mere ka anyị nwee ike ịbịakwute Nna anyị zuru okè, onye dịkwa nsọ.

E nwere mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs ya na ha kacha dịrị ná mma jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, kụziere anyị otú e si ekpe ekpere.” (Luk 11:1) O doro anya na ha anaghị ajụ maka ihe ndị ahụ dị mkpa anyị ka tụlechara. Ha chọrọ nnọọ ịmara ihe ha ga na-ekpe n’ekpere—e kwuo ya n’ụzọ ọzọ, ha na-ajụ, sị, ‘Olee ihe anyị kwesịrị ikpe ekpere maka ya?’

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Ekpere ndị Chineke na-anụ na-ekwekọ n’uche ya, a na-ekpe ha n’okwukwe, nakwa n’aha Jizọs