Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

4 Gịnị Ka E Kwesịrị Ikpe Maka Ya?

4 Gịnị Ka E Kwesịrị Ikpe Maka Ya?

Ekpere

4 Gịnị Ka E Kwesịrị Ikpe Maka Ya?

A KPỌỌLA ya ekpere Ndị Kraịst a kacha ekpeghachi ebe niile. Ma nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu ma ọ bụ na ọ bụghị, ekpere nlereanya Jizọs—nke a na-akpọ mgbe ụfọdụ Ekpere Onyenwe anyị ma ọ bụ ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe—bụ nnọọ otu n’ime ekpere ndị a kacha aghọtahie. Ọtụtụ nde mmadụ na-ekwughachi okwu ndị dị n’ekpere ahụ n’isi kwa ụbọchị, ikekwe ugboro ugboro. Ma, ọ dịghị mgbe Jizọs bu n’uche ka a na-ekpeghachi ekpere ahụ otú ahụ. Olee otú anyị si mara?

Obere oge tupu Jizọs akụzie ekpere ahụ, o kwuru, sị: “Mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro.” (Matiu 6:7) Jizọs ò kwuziri ihe megidere ihe a o kwuburu site n’ikwu okwu ndị a ga-eburu n’isi bụ́ ndị a ga na-ekwughachi n’ekpere? Mbanụ! Kama nke ahụ, Jizọs na-akụziri anyị ihe ndị anyị ga na-ekpe ekpere banyere ha, ọ na-akụzikwara anyị ihe ndị kacha mkpa anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe anyị na-ekpe ekpere. Ka anyị lerukwuo ihe ndị ahụ o kwuru anya. Ekpere ahụ dị na Matiu 6:9-13.

“Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.”

Jizọs si otú ahụ chetara ndị na-eso ụzọ ya na e kwesịrị ikpegara Nna ya, bụ́ Jehova, ekpere niile. Ma, ị̀ maara ihe mere aha Chineke ji dị mkpa otú ahụ na ihe mere o ji dị mkpa ka e doo ya nsọ?

Malite n’oge na-adịghị anya e kechara mmadụ, e jirila ụgha tetọọ aha nsọ Chineke. Onye iro Chineke, bụ́ Setan, kwuru na Jehova bụ Onye Ọchịchị na-agha ụgha, nke na-eche naanị banyere onwe ya, na onye na-ekwesịtụghị ịchị ihe ndị O kere eke. (Jenesis 3:1-6) Ọtụtụ adụnyerela Setan úkwù, na-akụzi na Chineke enweghị ịhụnanya, na ọ dị obi ọjọọ, na ọ naghị agbaghara mmehie ma ọ bụ na-ekwu na ọ bụdịghị ya bụ Onye Okike. Ndị ọzọ emegidela aha ya, wepụ aha ahụ bụ́ Jehova ná nsụgharị Baịbụl ha ma machibido ndị mmadụ ịkpọ ya akpọ.

Baịbụl na-egosi na Chineke ga-emezi ihe ndị ahụ niile. (Ezikiel 39:7) Mgbe o mere nke ahụ, ọ ga-egboro gị mkpa gị niile. Olee otú ọ ga-esi mee ya? Ihe ọzọ Jizọs kwuru n’ekpere ahụ zara ajụjụ ahụ.

“Ka alaeze gị bịa.”

Taa, ndị nkụzi okpukpe na-akụzi nnọọ ihe dị iche iche banyere Alaeze Chineke. Ma, dị ka ndị nọ na-ege Jizọs ntị maara, ndị amụma Chineke buru amụma ogologo oge gara aga na Mesaya, bụ́ Onye Nzọpụta Chineke họpụtara, ga-achị otu Alaeze nke ga-agbanwe ụwa. (Aịzaya 9:6, 7; Daniel 2:44) Ọ ga-edo aha Chineke nsọ site n’ịgba ụgha Setan n’anwụ, ma kwatuzie Setan na ọrụ ya niile. Alaeze Chineke ga-akwụsị agha, ọrịa, ụnwụ nri—ọbụna ọnwụ. (Abụ Ọma 46:9; 72:12-16; Aịzaya 25:8; 33:24) Mgbe ị na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa, ihe ị na-ekpe ekpere ya bụ ka nkwa niile ahụ mezuo.

“Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”

Okwu Jizọs na-egosi na uche Chineke ga-emerịrị n’ụwa dị ka ọ na-eme n’eluigwe, bụ́ ebe Chineke bi. Ọ dịbeghị onye nweliri ike ịkwụsị uche Chineke ime n’eluigwe; n’ebe ahụ, Ọkpara Chineke busoro Setan na ndị mmụọ ozi ya agha, ma chụda ha n’ụwa. (Mkpughe 12:9-12) Arịrịọ nke atọ a n’ekpere nlereanya ahụ, dị ka abụọ ndị bu ya ụzọ, na-enyere anyị aka ilekwasị anya n’ihe kacha mkpa—ọ bụghị uche anyị, kama uche Chineke. Ọ bụ uche ya na-akacha abara ihe niile o kere eke uru mgbe niile. N’ihi ya, nwoke ahụ zuru okè, bụ́ Jizọs, gwadịrị Nna ya, sị: “Ka uche gị mee, ọ bụghị nke m.”—Luk 22:42.

“Nye anyị nri taa.”

Ihe ọzọ Jizọs kwuziri gosiri na anyị nwekwara ike ikpe ekpere banyere mkpa anyị. O nweghị ihe dị njọ n’ikpegara Chineke ekpere ka o gbooro anyị mkpa ndị anyị na-enwe kwa ụbọchị. N’ezie, ime otú ahụ na-echetara anyị na Jehova bụ onye “na-enye mmadụ niile ndụ na ume na ihe niile.” (Ọrụ 17:25) Baịbụl mere ka anyị mara na ọ bụ nna hụrụ ụmụ ya n’anya nke ọ na-atọ ụtọ inye ụmụ ya ihe ndị dị ha mkpa. Ma, dị ka ezi nna, ọ gaghị emere ha ihe ndị ha rịọrọ ma ọ bụrụ na ha agaghị abara ha uru.

“Gbaghara anyị ụgwọ anyị ji.”

Ì ji Chineke ụgwọ n’ezie? Mgbaghara ya ọ̀ dị gị mkpa? Ọtụtụ ndị taa amakwaghị na e nwere ihe bụ́ mmehie na otú ọ jọruru ná njọ. Ma, Baịbụl na-akụzi na ọ bụ mmehie kpatara nsogbu ndị kacha njọ anyị na-enwe, n’ihi na ọ bụ ya bụ isi ihe mere ụmụ mmadụ ji anwụ anwụ. Ebe a mụrụ anyị ná mmehie, anyị niile na-emehie mgbe niile, ọ bụkwa naanị mgbaghara Chineke ga-eme ka anyị nwee olileanya ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. (Ndị Rom 3:23; 5:12; 6:23) Obi na-eru anyị ala ịmata na Baịbụl kwuru, sị: “Gị onwe gị, Jehova, dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie.”—Abụ Ọma 86:5.

“Napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.”

Ị̀ ghọtara na ọ dị gị oké mkpa ka Chineke chebe gị? Ọtụtụ ndị achọghị ikwere na “ajọ onye ahụ,” bụ́ Setan, dịtụdị adị. Ma, Jizọs kụziri na Setan dị adị, ọ kpọdịrị ya “onye na-achị ụwa a.” (Jọn 12:31; 16:11) Setan emebiela ụwa a ọ na-achị, ọ dịkwa nnọọ njikere imebi gị, ime ka gị na Nna gị, bụ́ Jehova, ghara inwe ezigbo mmekọrịta. (1 Pita 5:8) Ma, Jehova ka nnọọ Setan ike, ọ na-atọkwa Jehova ụtọ ichebe ndị hụrụ Ya n’anya.

Isi ihe ole na ole a dị n’ekpere nlereanya Jizọs anyị tụlere abụghị ihe niile anyị kwesịrị ikpe n’ekpere. Cheta na 1 Jọn 5:14 gwara anyị banyere Chineke, sị: “Ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.” N’ihi ya, echegbula onwe gị na nsogbu gị dị nnọọ obere ịkọrọ ya Chineke.—1 Pita 5:7.

Ma, oleekwanụ maka oge na ebe e kwesịrị ịnọ ekpe ekpere? Ò nwere ihe oge na ebe anyị nọ kpee ekpere mere?