Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

5 Ò Nwere Ihe Ebe na Mgbe E Kpere Ya Mere?

5 Ò Nwere Ihe Ebe na Mgbe E Kpere Ya Mere?

Ekpere

5 Ò Nwere Ihe Ebe na Mgbe E Kpere Ya Mere?

O DORO anya na ị chọpụtala na ihe na-adị ihe ka ọtụtụ n’òtù okpukpe mkpa bụ nnukwu ụlọ ekpere nakwa na ha na-ekwu kpọmkwem oge ndị e kwesịrị iji na-ekpe ekpere n’ụbọchị. Baịbụl ò kwuru na anyị kwesịrị ikpe ekpere naanị n’oge na n’ebe ụfọdụ?

Baịbụl gosiri na e nwere mgbe kwesịrị ekwesị ikpe ekpere. Dị ka ihe atụ, tupu Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya erie nri, o kpere ekpere iji kelee Chineke. (Luk 22:17) Mgbe ndị na-eso ụzọ ya zukọtakwara ife Chineke, ha kpekọrọ ekpere ọnụ. Ha si otú ahụ nọgide na-eme ihe a na-eme kemgbe n’ụlọ nzukọ ndị Juu na n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Chineke zubere ka ụlọ nsọ ahụ bụrụ “ụlọ ekpere dịịrị mba niile.”—Mak 11:17.

Mgbe ndị ohu Chineke zukọtara ma kpekọọ ekpere ọnụ, ekpere ha nwere ike ịdị irè. Ọ bụrụ na echiche ìgwè ahụ bụ otu, ekpere ha ekwekọọkwa n’ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ, ọ na-atọ Chineke ụtọ. Ekpere ahụ nwedịrị ike ịkpali ya ime ihe o nwere ike ịbụ na ọ garaghị eme. (Ndị Hibru 13:18, 19) Ndịàmà Jehova na-ekpe ekpere mgbe niile ná nzukọ ha. Anyị ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù ka ị bịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị gị nso ma jiri ntị gị nụrụ ekpere ndị dị otú ahụ.

Ma, Baịbụl ekwughị na ọ bụ naanị n’oge ma ọ bụ n’ebe ụfọdụ ka e kwesịrị ikpe ekpere. A kọrọ na Baịbụl banyere ndị ohu Chineke kpere ekpere n’oge ọ bụla, na n’ebe ọ bụla. Jizọs kwuru, sị: “Mgbe ị na-ekpe ekpere, banye n’ọnụ ụlọ gị, mgbe i mechisịrị ọnụ ụzọ gị, kpekuo Nna gị nke nọ na nzuzo ekpere; Nna gị nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-akwụ gị ụgwọ.”—Matiu 6:6.

Obi ọ́ gaghị adị gị ụtọ ime ihe ahụ e kwuru n’elu? I nwere nnọọ ike ịgakwuru Ọkaakaa eluigwe na ụwa n’ekpere mgbe ọ bụla, mgbe naanị gị nọ, obi esiekwa gị ike na ọ ga-ege gị ntị. Ka a sịkwanụ ihe mere Jizọs ji achọkarị ịnọ naanị ya iji kpee ekpere! Otu mgbe, Jizọs ji otu abalị dum kpegara Chineke ekpere, bụ́ mgbe o doro anya na ọ na-achọ ka Chineke duzie ya ná mkpebi dị oké mkpa ọ na-achọ ime.—Luk 6:12, 13.

Ndị ikom na ndị inyom ndị ọzọ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl kpere ekpere mgbe ha chọrọ ime mkpebi ndị dị oké mkpa ma ọ bụ mgbe nsogbu ndị tara akpụ chere ha aka mgba. Mgbe ụfọdụ, ha kpere ekpere n’olu dara ụda, mgbe ụfọdụkwa, ha ekpee ya n’obi ha; ha kpere ekpere mgbe ha nọ n’ìgwè na mgbe naanị ha nọ. Ihe dị mkpa bụ na ha kpere ekpere. Chineke gbadịrị ndị ohu ya ume, sị: “Na-ekpenụ ekpere n’akwụsịghị akwụsị.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:17) Ọ dị njikere ige ntị mgbe niile n’ekpere nke ndị na-eme uche ya. Agbamume ahụ ọ́ naghị egosi na ọ hụrụ anyị n’anya?

Ma, n’ụwa taa ndị mmadụ na-anaghị atụkwasị ibe ha obi, ọtụtụ na-eche ma ekpere ọ̀ bara uru n’ezie. I nwere ike ịjụ, sị, ‘Ọ̀ ga-enyere m aka n’ezie?’

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

Anyị nwere ike ikpe ekpere n’oge ọ bụla na n’ebe ọ bụla