Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụka Mmadụ na Onye Agbata Obi Ya Kparịtara Gịnị Bụ Mmụọ Nsọ?

Ụka Mmadụ na Onye Agbata Obi Ya Kparịtara Gịnị Bụ Mmụọ Nsọ?

Ụka Mmadụ na Onye Agbata Obi Ya Kparịtara Gịnị Bụ Mmụọ Nsọ?

Ọ NA-ATỌ Ndịàmà Jehova ụtọ ha na ndị agbata obi ha iji Baịbụl kwurịta okwu. Ò nwere ajụjụ si na Baịbụl i cherela echiche banyere ya? Ò nwere ihe Ndịàmà Jehova kweere ma ọ bụ ihe ha na-eme na-agbagwoju gị anya? Ya bụrụ otú ahụ, alala azụ ikwulite ya mgbe ọzọ gị na Onyeàmà hụrụ. Obi ga-atọ ya ụtọ gị na ya ikwurịta ihe dị otú ahụ.

Ihe na-esonụ bụ mkparịta ụka Onyeàmà Jehova na onye agbata obi ya nwere ike inwe. Ka anyị were ya na otu Onyeàmà aha ya bụ Ikenna gara n’ụlọ otu nwoke aha ya bụ Chidi.

Mgbe I Kwuru Banyere “Mmụọ Nsọ,” Olee Ihe I Bu n’Obi?

Chidi: Anụrụ m na Ndịàmà Jehova abụghị Ndị Kraịst. Unu ekweghị na mmụọ nsọ.

Ikenna: Nke mbụ, obi ruo gị ala na anyị bụ Ndị Kraịst. Ọ bụ okwukwe m nwere na Jizọs Kraịst mere m ji bịa n’ụlọ gị n’ụtụtụ a. A sị ka e kwuwe, ọ bụ Ya nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ikwusa ozi ọma. Ma ka m jụgodị gị, mgbe i kwuru banyere “mmụọ nsọ,” olee ihe i bu n’obi?

Chidi: Ihe m bu n’obi bụ mmụọ nsọ, onye nke atọ n’Atọ n’Ime Otu, nke Jizọs kwere nkwa izite inyere anyị aka. Ejighị m ya egwuri egwu. Achọrọ m ka mmụọ nsọ na-arụ ọrụ ná ndụ m.

Ikenna: Ọ bụ otú ahụ ka ọtụtụ ndị si ghọta mmụọ nsọ. O nwere mgbe m nwere ohere inyocha ihe Baịbụl kụziri banyere isiokwu a. Ọ bụrụ na i nwere nkeji ole na ole, obi ga-adị m ụtọ igosi gị ihe m mụtara.

Chidi: Gaa n’ihu, m nwere nkeji ole na ole.

Ikenna: Biko, aha m bụ Ikenna. Gịnị bụkwanụ aha gị?

Chidi: Aha m bụ Chidi. Obi dị m ụtọ ịhụ gị.

Ikenna: Obi dịkwa m ụtọ ịhụ gị, Chidi. Ebe ọ bụ na i nweghị oge buru ibu, ka m lekwasị anya n’otu akụkụ nke isiokwu a. I kwuru na Jizọs kwere nkwa izite mmụọ nsọ inyere anyị aka. Ekweere m ihe i kwuru. Ma, ihe ị ghọtara ọ̀ bụ na mmụọ nsọ bụ onye, nakwa na ya na Chineke hà?

Chidi: Ee, ọ bụ ihe a kụziiri m.

Mmụọ Nsọ Ọ̀ Bụ Onye?

Ikenna: Ka anyị tụlee otu ebe na Baịbụl nke ga-enyere anyị aka ịmata ma mmụọ nsọ ọ̀ bụ onye ka ọ̀ bụ na ọ bụghị. O nwere ike ịbụ na ị maara amaokwu ndị a. Ọrụ 2:1-4 kwuru, sị: “Ka ụbọchị ememme Pentikọst na-aga n’ihu, ha niile zukọrọ n’otu ebe. Na mberede, a nụrụ ụzụ si n’eluigwe dị nnọọ ka oké ifufe nke na-efesi ike, o wee ju ụlọ ahụ dum bụ́ ebe ha niile nọ ala. Ha hụkwara ihe ndị dị ka ire ọkụ. E kesasịkwara ha, otu dịkwa n’isi onye nke ọ bụla n’ime ha. Ha niile wee jupụta na mmụọ nsọ, malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche, dị nnọọ ka mmụọ nsọ nọ na-enye ha ike ikwu okwu.”

Chidi: M maara akụkọ ahụ.

Ikenna: Ugbu a ka m jụọ gị, Chidi, otu onye ò nwere ike ijupụta n’onye ọzọ?

Chidi: Mbanụ.

Ikenna: Ka anyị tụletụkwuo ihe e kwuru n’otu isiakwụkwọ ahụ, n’amaokwu 17. Akụkụ mbụ nke amaokwu ahụ kwuru, sị: “‘N’oge ikpeazụ,’ ka Chineke na-ekwu, ‘m ga-awụkwasị mmụọ m n’ahụ́ ụdị anụ ahụ́ ọ bụla.’” Ka m jụọ gị, Chidi, Chineke ọ̀ ga-awụpụli Chineke ya na ya hà?

Chidi: Azịza ya bụkwa mba.

Ikenna: Jọn Onye Na-eme Baptizim si ụzọ ọzọ kọwaa mmadụ ijupụta na mmụọ nsọ. Ọ dị na Matiu 3:11. Biko, ì nwere ike ịgụ amaokwu a?

Chidi: “Mụ onwe m ji mmiri na-eme unu baptizim n’ihi nchegharị unu; ma onye ahụ nke na-abịa n’azụ m ka m ike, onye m na-erughị eru iyipụ akpụkpọ ụkwụ ya. Onye ahụ ga-eji mmụọ nsọ na ọkụ mee unu baptizim.”

Ikenna: I meela. Ị̀ hụrụ ihe Jọn Onye Na-eme Baptizim kwuru a ga-eji mmụọ nsọ mee?

Chidi: O kwuru na a ga-eji ya mee ndị mmadụ baptizim.

Ikenna: Ị zatara ya. Ị ga-ahụkwa na ebe ahụ kwukwara banyere iji ọkụ eme baptizim. O doro anya na ọkụ abụghị onye. Ì chere na amaokwu a na-ekwu na mmụọ nsọ bụ onye?

Chidi: Mba.

Ikenna: Ya mere, dị ka amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị anyị tụlerela kwuru, mmụọ nsọ abụghị onye.

Chidi: M chere otú ahụ.

Olee Otú O Si Bụrụ “Ihe Inyeaka”?

Ikenna: Ma, i kwuru ná mmalite na mmụọ nsọ ga-enyere anyị aka. Ọ bụ na Jọn 14:26 ka Jizọs kwuru na mmụọ nsọ ga-enyere ndị na-eso ụzọ ya aka. Ka anyị gụkọọ ebe ahụ ọnụ: “Ihe inyeaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ, nke Nna m ga-ezite n’aha m, ga-akụziri unu ihe niile ma chetara unu ihe niile m gwara unu.” Ụfọdụ chere na o yiri ka amaokwu a ọ̀ na-akwado na mmụọ nsọ bụ onye, onye ga-enyere anyị aka ma kụziere anyị ihe.

Chidi: Ọ bụ eziokwu, ọ bụ otú ahụ ka m si ele ya anya kemgbe.

Ikenna: Ma, ò nwere ike ịbụ na Jizọs ji akpaala okwu kwuo okwu n’ebe ahụ? Legodị ihe Jizọs kwuru banyere amamihe na Luk 7:35: “Ka o sina dị, a na-egosi na amamihe ziri ezi site n’ụmụ ya niile.” Ị̀ ga-asị na amamihe bụ onye, na o nwere ụmụ n’ezie?

Chidi: Mba. O doro anya na ihe ahụ bụ akpaala okwu.

Ikenna: M kweere ihe i kwuru. Isi ihe Jizọs na-ekwu bụ na ihe e ji amata amamihe bụ ihe ọ rụpụtara. Mgbe mgbe, Baịbụl na-ekwu okwu banyere ihe na-adịghị ndụ ka à ga-asị na ọ dị ndụ. Anyị na-ekwukarị ụdị ihe ahụ mgbe anyị na-ekwu okwu. Dị ka ihe atụ, n’ụtụtụ a anwụ na-acha, ọ gaghị eju gị anya ma mmadụ kwuo, sị, “Meghee kọtịn ka anwụ bata,” ka ọ̀ ga-eju gị anya?

Chidi: M ga-ekwukwa ya.

Ikenna: Ọ̀ pụtara na ị na-ekwu na anyanwụ bụ onye nke ga-abata n’ụlọ gị dị ka ọbịa?

Chidi: Mba, o doro anya na ọ bụghị ihe m na-ekwu. Ọ bụ akpaala okwu.

Ikenna: Ya mere, mgbe Jizọs kwuru na mmụọ nsọ ga-enyere ndị na-eso ụzọ ya aka, ma ọ bụ kụziere ha ihe, ọ̀ ga-abụ na okwu ya bụ akpaala okwu?

Chidi: M chere otú ahụ. Nke ahụ ga-ekwekọ n’amaokwu ndị ahụ ị gụrụ kwuru banyere ịwụpụ mmụọ nsọ na iji ya mee ndị mmadụ baptizim. Ma, ọ bụrụ na mmụọ nsọ abụghị onye, gịnị ka ọ bụ?

Gịnị Bụ Mmụọ Nsọ?

Ikenna: N’Ọrụ 1:8, Jizọs gwara anyị ihe mmụọ nsọ bụ. Ọ̀ ga-amasị gị ịgụ ya?

Chidi: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-abụkwa ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia dum nakwa na Sameria, ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.”

Ikenna: Ị̀ hụrụ na Jizọs kwuru na mmụọ nsọ ga-eme ka ndị na-eso ụzọ ya nweta ike? Olee ebe i chere na amaokwu ndị anyị gụburu na-egosi na ike ahụ si abịa?

Chidi: O si n’aka Chineke Nna.

Ikenna: Ị zatara ya. Mmụọ nsọ bụ otu ike ahụ Chineke ji kee eluigwe na ụwa. Jenesis 1:2 kwuru banyere ya. O kwuru, sị: “Ike Chineke nke nọ n’ọrụ nọkwa na-erugharị n’elu mmiri ahụ.” A sụgharịkwara okwu Hibru a sụgharịrị “ike nọ n’ọrụ” “mmụọ.” Ọ bụ ike nọ n’ọrụ a na-anaghị ahụ anya nke Chineke ji emezu nzube ya ma na-eme ka a mata uche ya. Ka m gosi gị naanị otu ebe ọzọ ị ga-atụle. Ọ bụ Luk 11:13. Biko, ì nwere ike ịgụ amaokwu a?

Chidi: “Ọ bụrụ na unu maara otú e si enye ụmụ unu ezi onyinye, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!”

Ikenna: Ọ bụrụ na Nna anyị nke nọ n’eluigwe ji mmụọ nsọ arụ ọrụ, na-enye ya ndị rịọrọ ya, è nwere ike ikwu na mmụọ nsọ na Nna anyị hà?

Chidi: Mba. Aghọtala m ihe ị na-ekwu.

Ikenna: Chidi, achọghị m igbu gị oge. I kwuru na i nwere naanị nkeji ole na ole. Ma, ka m jụọ gị otu ajụjụ iji chịkọta okwu anyị. Site n’ebe ndị anyị gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ, olee ihe ị ga-asị na mmụọ nsọ bụ?

Chidi: Ọ bụ ike Chineke nọ n’ọrụ.

Ikenna: Ị zatara ya. Mgbe Jizọs kwukwara na Jọn 14:26, na mmụọ nsọ ga-enyere ndị na-eso ụzọ ya aka, ma ọ bụ kụziere ha ihe, ihe ahụ o kwuru bụ akpaala okwu, ya bụ, ime ka ihe na-adịghị ndụ yie ihe dị ndụ.

Chidi: Amabughị m nke ahụ.

Ikenna: Ọ dị ihe ga-emesi anyị nnọọ obi ike anyị ga-amụta n’okwu Jizọs.

Chidi: Olee ihe ọ bụ?

Ikenna: Anyị nwere ike ịrịọ Chineke ka o nye anyị mmụọ nsọ ya inyere anyị aka mgbe anyị nọ n’ihe isi ike. Anyị nwekwara ike ịrịọ ya ka mmụọ ya nyere anyị aka ịmụta eziokwu banyere Ya.

Chidi: Nke ahụ amaka. M ga-echebara ya echiche.

Ikenna: Tupu mụ alawa, ka m gwa gị ihe ọzọ ị ga-echebara echiche. Ebe mmụọ nsọ bụ ike Chineke nọ n’ọrụ, anyị ga-ekweta na Chineke nwere ike iji ya rụzuo ihe ọ bụla ọ chọrọ.

Chidi: Ọ bụ eziokwu.

Ikenna: Ya bụrụ otú ahụ, gịnị mere o jibeghị ike ya karịrị ike niile kwụsị ahụhụ na ajọ omume niile anyị na-ahụ gburugburu anyị n’ụwa? Ì chetụla echiche banyere nke ahụ? *

Chidi: N’ezie, echebarala m ya echiche.

Ikenna: Oleekwanụ ma m bịaghachi n’izu ọzọ n’otu oge a ka anyị kwurịta ya?

Chidi: Ọ ga-amasị m nke ukwuu. Ka ọ dịnụ mgbe ahụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 59 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ isi 11 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.