Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-eso Eme Ka Ọmụmụ Ihe Na-ewuli Elu?

Ị̀ Na-eso Eme Ka Ọmụmụ Ihe Na-ewuli Elu?

Ị̀ Na-eso Eme Ka Ọmụmụ Ihe Na-ewuli Elu?

“Mgbe unu zukọtara, . . . ka e mee ihe niile maka iwuli mmadụ niile elu.”—1 KỌR. 14:26.

1. Dị ka e kwuru n’isi nke iri na anọ nke Ndị Kọrịnt nke mbụ, olee otu ihe dị mkpa ọmụmụ ihe na-emere anyị?

È NWEELA mgbe i si ọmụmụ ihe lọta ma kwuo, sị, ‘Ọmụmụ ihe taa gbara m ume!’? Ọ ga-abụ na e nweela. Ọmụmụ ihe ọgbakọ na-agba anyị ume n’ezie, ma, nke a ekwesịghị iju anyị anya. A sị kwuwe, otu n’ime ihe ndị dị mkpa ọmụmụ ihe ọgbakọ na-emere anyị n’oge a, dị ka o meere Ndị Kraịst n’oge ochie, bụ inyere ndị niile na-abịa ya aka ka ha na Jehova dịrị ná mma. Pọl onyeozi kwusiri okwu ike banyere nke a n’akwụkwọ ozi mbụ o degaara ndị Kọrịnt. N’isi nke iri na anọ, o kwuru ugboro ugboro na e bu otu ihe n’obi eme ihe omume ọ bụla a na-eme n’ọgbakọ. Ọ bụ “maka iwuli ọgbakọ elu.”Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 14:3, 12, 26. *

2. (a) Olee ihe na-eme ka ọmụmụ ihe na-ewuli anyị elu? (b) Olee ajụjụ anyị ga-atụle?

2 Anyị ma na ọ bụ mmụọ nsọ bụ ihe bụ́ isi na-eme ka ọmụmụ ihe na-ewuli anyị elu ma ọ bụ na-agba anyị ume. N’ihi ya, anyị na-eji ekpere si n’ala ala obi amalite ọmụmụ ihe, na-arịọ Nna anyị nke eluigwe ka o jiri mmụọ nsọ ya mee ka ọmụmụ ihe anyị gaa nke ọma. Ma, anyị ma na mmadụ niile nọ n’ọgbakọ nwere ike iso na-eme ka ọmụmụ ihe anyị na-ewuli ndị bịara ya elu. Oleezi ụfọdụ ihe onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ime iji hụ na ọmụmụ ihe ndị anyị na-enwe kwa izu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị na-ewuli anyị elu, na-agbakwa anyị ume?

3. Olee otú ọmụmụ ihe Ndị Kraịst dịruru mkpa?

3 Iji zaa ajụjụ a, ka anyị tụlee ụfọdụ ihe a na-eme n’ọmụmụ ihe anyị, bụ́ ndị ndị na-eduzi ọmụmụ ihe kwesịrị iburu n’uche. Anyị ga-atụlekwa otú mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ga-esi soro mee ka ọmụmụ ihe na-ewuli ndị niile bịara ya elu. Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị tụlee nke a n’ihi na ọmụmụ ihe anyị bụ nnọkọ dị nsọ. Ịga ọmụmụ ihe na itinye ọnụ n’ihe a na-amụ dị mkpa n’ofufe anyị na-efe Jehova.—Ọma 26:12; 111:1; Aịza. 66:22, 23.

Ọmụmụ Ihe A Na-anọ Amụ Baịbụl

4, 5. Gịnị mere anyị ji enwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche?

4 Anyị niile chọrọ irite uru n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche a na-enwe kwa izu. N’ihi ya, iji ghọta nke ọma ihe bụ́ isi mere anyị ji enwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, ka anyị tụlee ụfọdụ ihe a gbanwere n’Ụlọ Nche nakwa n’isiokwu ndị a na-amụ amụ.

5 E nwere ihe dị mkpa na-adịzi n’ihu Ụlọ Nche a na-amụ amụ malite na nke mbụ e bipụtara, ya bụ, nke Jenụwarị 15, 2008. Ị̀ hụtụla ya? Leruo ihu Ụlọ Nche a i ji anya. Ị ga-ahụ Baịbụl a sapere asape nke dị n’ala ala ihe ahụ yiri ụlọ a na-anọ eche nche. Ihe osise ahụ gosiri ihe mere anyị ji enwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Ọ bụ ka anyị wee jiri magazin a na-amụ Baịbụl. N’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche anyị na-enwe kwa izu, a “na-akọwa” Okwu Chineke, “na-emekwa ka o doo anya” dị ka e mere n’oge Nehemaya.—Neh. 8:8; Aịza. 54:13.

6. (a) Gịnị bụ mgbanwe e mere n’otú anyị si enwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche? (b) Olee ihe anyị kwesịrị iburu n’uche banyere amaokwu ndị e dere “gụọ” n’isiokwu ndị anyị na-amụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche?

6 A gbanwetụrụ otú anyị si enwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche n’ihi na Baịbụl bụ akwụkwọ bụ́ isi e ji akụziri anyị ihe. A na-ede “gụọ” n’ụfọdụ amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu anyị na-amụ. Ọ ga-adị mma ma anyị niile na-asapeta amaokwu ndị ahụ na Baịbụl anyị mgbe a na-agụ ha. (Ọrụ 17:11) Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na iwu Chineke na-aka abami anyị n’obi ma anyị hụ ya na Baịbụl nke anyị. (Hib. 4:12) Ya mere, tupu a gụọ amaokwu ndị ahụ, onye na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche kwesịrị ichere ka mmadụ niile sapeta ebe ahụ a chọrọ ịgụ ka ha wee na-ele anya na Baịbụl ha mgbe a na-agụ ya.

Anyị Nwekwuru Oge Anyị Ga-eji Na-aza Ajụjụ

7. Olee ihe ndị anyị nwere ohere ime mgbe a na-enwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche?

7 Ihe ọzọ a gbanwere n’isiokwu ndị anyị na-amụ amụ n’Ụlọ Nche bụ otú ha na-aha. Ha anaghịzi adị ogologo. Nke a mere ka oge e ji agụ paragraf ndị dị n’isiokwu anyị na-amụ dị obere, meekwa ka e nwekwuo oge e ji aza ajụjụ. Ọtụtụ mmadụ nweziri ike ikwupụta okwukwe ha n’ihu ọha mgbe a na-amụ Ụlọ Nche n’ọgbakọ site n’ịza ajụjụ ndị ahụ a jụrụ, site n’ịkọwa amaokwu Baịbụl ndị dị n’isiokwu a na-amụ, nakwa site n’ịkọ ná nkenke ihe ụfọdụ mere eme, bụ́ ndị na-egosi na ime ihe Baịbụl kwuru bara ezigbo uru, ma ọ bụkwanụ site n’ikwu ihe ndị ọzọ. E kwesịkwara iwepụta oge a ga-eji kọwaa ihe osise ndị dị n’isiokwu a na-amụ.—Gụọ Abụ Ọma 22:22; 35:18; 40:9.

8, 9. Gịnị bụ ọrụ onye na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche?

8 Ma, ihe ga-eme ka ọtụtụ mmadụ nwee ike ịza ajụjụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche bụ ma ndị mmadụ na-aza ajụjụ ná nkenke, onye na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ agharakwa ikwu ọtụtụ okwu. Olee ihe ga-enyere onye na-eduzi ọmụmụ ihe aka ịma ihe ọ ga-etinye n’ihe ndị ọzọ zarala ka ọmụmụ ihe wee na-ewuli mmadụ niile elu?

9 Iji zaa ajụjụ a, ka anyị tụlee otu ihe atụ. Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche e duziri nke ọma yiri ùkwù okooko osisi mara mma. Otú ahụ e si enwe okooko osisi dị iche iche n’otu ùkwù okooko osisi, ka e si enwe ọtụtụ mmadụ na-aza ajụjụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Otú ahụ okooko osisi niile dị n’otu ùkwù na-ahaghị nhata, ha enweghịkwa otu ụcha, ka ihe ihe ndị bịara ọmụmụ ihe na-aza na-anaghị aha otu. Otú ahụkwa ka onye ọ bụla si nwee otú o si aza ajụjụ bụ́ nke dị iche n’otú onye ọzọ si aza. Gịnị bụ ọrụ onye na-eduzi ọmụmụ ihe Ụlọ Nche? Ihe ọ na-etinye n’ihe ndị ọzọ zara mgbe ụfọdụ yiri akwụkwọ ndụ ndị dịgasị n’ùkwù okooko osisi. Akwụkwọ ndụ ndị a anaghị akarị okooko osisi ndị ahụ; kama, ha na-eme ka okooko osisi ndị ahụ makwuo mma. N’otu aka ahụ, onye na-eduzi ọmụmụ ihe Ụlọ Nche kwesịrị iburu n’uche na ọrụ ya abụghị ikwubiga okwu ókè, kama, ọ bụ itinyetụ ihe n’azịza ụmụnna ji na-eto Jehova. N’eziokwu, ọ bụrụ na e gee ntị nke ọma n’ihe dị iche iche ụmụnna zara na ihe ole na ole dabara adaba onye na-eduzi ọmụmụ ihe tinyere n’ihe ụmụnna zara, Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ga-atọ ndị niile bịara ya ụtọ.

“Ka Anyị . . . Na-achụrụ Chineke Àjà Otuto Mgbe Niile”

10. Olee otú Ndị Kraịst oge ochie si were ọmụmụ ihe?

10 Ihe Pọl kwuru banyere ọmụmụ ihe Ndị Kraịst ná 1 Ndị Kọrịnt 14:26-33 na-eme ka anyị ghọta otú e si enwe ọmụmụ ihe na narị afọ mbụ. Otu ọkà mmụta Baịbụl dere banyere 1 Ndị Kọrịnt 14:26-33, sị: “Otu ihe kacha pụta ìhè n’otú Ndị Kraịst narị afọ mbụ si amụ ihe bụ na ndị bịara ọmụmụ ihe na-ebu n’uche na itinye ọnụ n’ihe a na-amụ bụ ihe ùgwù, bụrụkwa ọrụ dịịrị ha. O nweghị onye na-aga ọmụmụ ihe ka o wee gee naanị ntị; ọ na-aga ka ya gee ntị n’ihe a na-amụ, tinyekwa ọnụ na ya.” N’eziokwu, Ndị Kraịst oge ochie weere na oge ọmụmụ ihe bụ oge ha ji ekwupụta okwukwe ha.—Rom 10:10.

11. (a) Gịnị na-eso eme ka ọmụmụ ihe na-ewuli ndị bịara ya elu, ọ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Olee ihe ụfọdụ anyị kwesịrị ime, bụ́ ndị ga-eme ka otú anyị si aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe dịkwuo mma? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)

11 Ikwupụta okwukwe anyị n’ọmụmụ ihe na-enye aka eme ka ‘e wulie ọgbakọ elu.’ O doro anya na n’agbanyeghị afọ ole anyị garala ọmụmụ ihe, ige ntị mgbe ụmụnna na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe na-eme ka ọmụmụ ihe na-atọ ezigbo ụtọ. Ọ bụrụ na nwanna merela agadi, bụ́ onye ji ikwesị ntụkwasị obi efe Jehova, azaa ajụjụ, ọ na-eru anyị n’obi; azịza okenye ọgbakọ zara iji mee ka anyị mara ebe anyị kwesịrị ịrụ ọrụ, na-ewuli anyị elu; obi na-adịkwa anyị ụtọ ma ọ bụrụ na ụmụaka azaa ajụjụ si ha n’obi, nke na-egosi na ha hụrụ Jehova n’anya. Ọ bụrụ na anyị niile na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, anyị na-eso eme ka ọmụmụ ihe na-ewuli ndị bịara ya elu. *

12. (a) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Mozis na Jeremaya? (b) Olee otú ikpe ekpere si enyere anyị aka ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe?

12 Ma, ịza ajụjụ nwere ike ịna-esiri ndị ihere ike. Ọ bụrụ na ị bụ onye ihere, ihe nwere ike inyere gị aka bụ icheta na ọ bụghị naanị gị bụ onye ihere. Ụfọdụ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi jeere Chineke ozi, dị ka Mozis na Jeremaya, nwere mgbe obi na-akaghị ha ịga zie ozi Chineke n’ihu ọha. (Ọpụ. 4:10; Jere. 1:6) Ma, Jehova nyeere ha aka ito ya n’ihu ọha, ọ ga-enyekwara gị aka ịchụrụ ya àjà otuto. (Gụọ Ndị Hibru 13:15.) Olee ihe ị ga-eme ka Jehova wee mee ka obi kaa gị ịna-aza ajụjụ? Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịkwadebe ọmụmụ ihe nke ọma. Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ikpeku Jehova ekpere tupu ị gaa ọmụmụ ihe, gwa ya ka o mee ka obi kaa gị ịza ajụjụ. (Fil. 4:6) Ka obi sie gị ike na Jehova ga-aza ekpere gị n’ihi na ihe ị na-arịọ ya bụ “dị ka uche ya si dị.”—1 Jọn 5:14; Ilu 15:29.

Ọmụmụ Ihe nke ‘Na-ewuli Elu, Na-agba Ume, ma Na-agụgụ Obi’

13. (a) Olee otú obi kwesịrị ịdị ndị bịara ọmụmụ ihe ma ha na-ala? (b) Olee ajụjụ dị ezigbo mkpa ndị okenye kwesịrị ịjụ onwe ha?

13 Pọl kwuru na ihe dị mkpa mere anyị ji aga ọmụmụ ihe bụ ka anyị ‘wulie ndị bịara ya elu, gbaakwa ha ume ma gụgụọ ha obi.’ * (1 Kọr. 14:3) Taa, olee otú ndị okenye ga-esi na-eme ihe omume ha otú ga-ewuli ụmụnna ha elu, gụgụọkwa ha obi? Iji zaa ajụjụ a, ka anyị tụlee banyere nnọkọ Jizọs duziri obere oge ka a kpọlitechara ya n’ọnwụ.

14. (a) Olee ihe ndị mere tupu Jizọs na ndịozi ya enwee nnọkọ? (b) Gịnị mere ọ ga-eji bụrụ na obi ruru ndịozi Jizọs ala mgbe ‘ọ bịakwutere ha gwa ha okwu’?

14 Ihe mbụ anyị kwesịrị ịtụle bụ ihe ndị mere tupu ha enwee nnọkọ ahụ. Tupu e gbuo Jizọs, ndịozi ya ‘hapụrụ ya gbaa ọsọ,’ ‘a chụsasịkwara ha, onye ọ bụla alaa n’ụlọ ya,’ dị ka e buru n’amụma. (Mak 14:50; Jọn 16:32) Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ọ kpọrọ ndịozi ya dara mbà n’obi òkù ka ha bịa nnọkọ pụrụ iche. * “Mmadụ iri na otu ahụ bụ́ ndị na-eso ụzọ ya banyere Galili gaa n’ugwu, bụ́ ebe Jizọs mere ndokwa ka ha gaa.” Mgbe ha rutere, ‘Jizọs bịakwutere ha, gwa ha okwu.’ (Mat. 28:10, 16, 18) Chegodị otú obi si ruo ndịozi ahụ ala mgbe Jizọs gakwuuru ha wee gwa ha okwu! Gịnị ka ọ gwara ha?

15. (a) Gịnị ka Jizọs gwara ndịozi ya, gịnịkwa ka ọ na-agwaghị ha? (b) Olee otú obi dị ndịozi ya mgbe ha na ya nwechara nnọkọ ahụ?

15 Jizọs malitere nnọkọ ahụ site n’ikwu, sị: “E nyewo m ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.” Mgbe o kwuchara nke a, o nyere ha ọrụ ha ga-arụ, sị: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” N’ikpeazụ, o mesiri ha obi ike, sị: “M nọnyeere unu ụbọchị niile.” (Mat. 28:18-20) Ma, ị̀ chọpụtara ihe Jizọs na-emeghị? Ọ baghịrị ndịozi ya mba; o jighịkwa nnọkọ ahụ kwuo ihe na-egosi na ya na-enyo ha enyo ma ọ bụkwanụ chetara ha na ha gbara ọsọ mgbe e jidere ya, ka obi wee jọọ ha njọ. Kama nke ahụ, Jizọs mere ka obi sie ha ike na ya na Nna ya hụrụ ha n’anya site n’inye ha nnukwu ọrụ. Olee otú obi dị ndịozi ya n’ihi otú a o si gwa ha okwu? O wuliri ha elu, gbaa ha ume, ma gụgụọ ha obi nke na n’oge na-adịghị anya mgbe ha na ya nwechara nnọkọ ahụ, ha maliteghachiri ‘na-akụzi ihe, na-ezisakwa ozi ọma.’—Ọrụ 5:42.

16. Olee otú ndị okenye kwesịrị isi na-eme ka Jizọs site n’iduzi ọmụmụ ihe otú ọ ga-ewuli ụmụnna ha elu?

16 Dị ka Jizọs mere, taa, ndị okenye na-eji oge ọmụmụ ihe anyị eme ka obi sikwuo ụmụnna ha ike na Jehova hụrụ ha n’anya nke ukwuu. (Rom 8:38, 39) Ya mere, mgbe ndị okenye na-eme ihe omume n’ọmụmụ ihe, ha na-ekwukarị okwu banyere ebe ụmụnna ha na-eme nke ọma ọ bụghị ebe ha na-anaghị eme nke ọma. Ha ekwesịghị ikwu ihe na-egosi na ha na-enyo ụmụnna ha enyo. Kama, ha kwesịrị ịna-ekwu ihe na-egosi na ha kwere na ụmụnna ha hụrụ Jehova n’anya ma chọọ ịna-eme ihe ziri ezi. (1 Tesa. 4:1, 9-12) O nwekwara mgbe ọ na-adị mkpa ka ndị okenye nye ọgbakọ dum ndụmọdụ. Ma, ọ bụrụ na ọ bụ mmadụ ole na ole ka ha kwesịrị inye ndụmọdụ, ha kwesịrị inye ha ya mgbe naanị ha na ha nọ. (Gal. 6:1; 2 Tim. 2:24-26) Mgbe ndị okenye na-agwa ọgbakọ dum okwu, ha kwesịrị ịja ha mma n’ebe ndị ha na-eme nke ọma. (Aịza. 32:2) Ha ga-agbalị na-ekwu ihe ọ ga-abụ ụmụnna na-ala ọmụmụ ihe, obi adị ha mma, okwukwe ha esikwuokwa ike.—Mat. 11:28; Ọrụ 15:32.

Ebe A Na-akasi Anyị Obi

17. (a) Gịnị mere ọmụmụ ihe anyị ji kwesị ịkasi ndị mmadụ obi ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ? (b) Gịnị ka ị ga-eme ka ọmụmụ ihe wee na-ewuli ndị bịara ya elu? (Gụọ igbe bụ́ “Ihe Iri Ị Ga-eme Ka Ọmụmụ Ihe Na-ewuli Gị na Ndị Ọzọ Elu.”)

17 Ka ụwa Setan na-ajọkwu njọ, anyị kwesịrị ịhụ na ọmụmụ ihe anyị bụ ebe mmadụ niile na-enweta agbamume na nkasi obi. (1 Tesa. 5:11) Otu nwanna nwaanyị ya na di ya diri ihe isi ike afọ ole na ole gara aga, kwuru, sị: “Anyị nọrọ n’ọmụmụ ihe, ọ na-adị anyị ka anyị nọ n’aka Jehova. Oge ahụ anyị na ụmụnna anyị nọ ebe ahụ, anyị na-atụkwasị Jehova ibu arọ anyị, obi na-alọkwa anyị.” (Ọma 55:22) Ekpere anyị bụ ka ọmụmụ ihe na-agba ndị niile na-abịa ya ume ma na-agụgụ ha obi, dị ka o mere nwanna nwaanyị a na di ya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka nke a na-eme, anyị ga-agbalị soro na-eme ka ọmụmụ ihe na-ewuli elu.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 1 E buru amụma na ihe ụfọdụ a na-eme n’ọmụmụ ihe na narị afọ mbụ ga-akwụsị. Dị ka ihe atụ, anyị anaghịzi ‘ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche’ ma ọ bụ “na-ebu amụma.” (1 Kọr. 13:8; 14:5) N’agbanyeghị na anyị anaghịzi eme ihe ndị a, ihe ndị ahụ Pọl kwuru na-enyere anyị aka ịma otú e kwesịrị isi na-eduzi ọmụmụ ihe taa.

^ par. 11 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụ ebe e kwuru otú anyị ga-esi mee ka otú anyị si aza ajụjụ dịkwuo mma, gaa n’Ụlọ Nche nke Septemba 1, 2003, peeji nke 19-22.

^ par. 13 Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru ihe dị iche ‘n’ịgba ume’ na ‘ịgụgụ obi.’ O kwuru na okwu Grik e si sụgharịta “ịgụgụ obi” na-egosi na mmadụ nwere ike ‘ịgba onye ọ bụla ume, ma, onye mmadụ na-agụgụ obi bụ onye ọ hụrụ n’anya.’—Tụlee Jọn 11:19.

^ par. 14 Ọ ga-abụ nnọkọ a ka Pọl bu n’obi mgbe o kwuru na Jizọs “pụtara n’ihu ihe karịrị narị ụmụnna ise.”—1 Kọr. 15:6.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Olee otú ọmụmụ ihe dịruru mkpa?

• Olee otú ajụjụ anyị zara n’ọmụmụ ihe si ‘ewuli ọgbakọ elu’?

• Olee ihe anyị nwere ike ịmụta ná nnọkọ ahụ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nwere, bụ́ nke o duziri?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 22, 23]

IHE IRI Ị GA-EME KA ỌMỤMỤ IHE NA-EWULI GỊ NA NDỊ ỌZỌ ELU

Kwadebe nke ọma tupu ị gaa ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ na i buru ụzọ kwadebe ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe, ọmụmụ ihe ga-atọkwu gị ụtọ, ị gaghịkwa echefu ihe a mụrụ echefu.

Na-agachi ọmụmụ ihe anya. Ebe ọ bụ na ụmụnna na-enweta agbamume ma a bịahie ọmụmụ ihe nne, jisie ike na-agachi ọmụmụ ihe anya.

Na-aga n’oge. Ọ bụrụ na i rute n’Ụlọ Nzukọ Alaeze tupu ọmụmụ ihe amalite, ị ga-eso bụọ abụ mmeghe, nọrọkwa mgbe a ga-ekpe ekpere mmeghe, bụ́ ihe ndị so n’ofufe anyị na-efe Jehova.

Jiri akwụkwọ ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe gaa. Mgbe ị na-aga ọmụmụ ihe, were Baịbụl gị na akwụkwọ ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe ka i wee na-ele anya n’akwụkwọ nke gị mgbe a na-amụ ihe. Nke a ga-eme ka ị ghọta ihe a na-amụ nke ọma.

Ekwela ka ihe ọ bụla dọpụ uche gị. Ọ bụrụ na mmadụ ezitere gị ozi n’ekwe ntị, gụọ ya mgbe a gbasara ọmụmụ ihe, ọ bụghị mgbe ọmụmụ ihe na-aga n’ihu. Nke a na-egosi na ị naghị ekwe ka ihe ndị gbasara gị dọpụ gị uche.

Na-aza ajụjụ. Ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ azaa ajụjụ, ihe dị iche iche ha kwuru, nke na-egosi na ha nwere okwukwe, na-agbakwu ụmụnna ume, na-ewulikwa ha elu.

Mee ka azịza gị dị nkenke. Nke a ga-eme ka ọtụtụ ndị nwee ohere ịza ajụjụ.

Na-eme ihe omume e nyere gị. Ọ bụrụ na e nyere gị ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ma ọ bụ ná Nzukọ Ije Ozi, kwadebe ya nke ọma, mụgharịa ya tupu oge eruo, ahapụkwala ime ya.

Jaa ndị mere ihe omume ma ọ bụ ndị zara ajụjụ mma. Kelee ndị mere ihe omume ma ọ bụ ndị zara ajụjụ.

Kelee ụmụnna tupu a malite ọmụmụ ihe nakwa mgbe a gbasara. Ikele ndị ọzọ tupu amalite ọmụmụ ihe na mgbe a gbasara, nakwa gị na ha ịkparịta ụka, na-eme ka ọmụmụ ihe na-agbakwu ndị bịara ya ume.