Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-ekele Chineke Maka Ihe Ndị I Nwere

Na-ekele Chineke Maka Ihe Ndị I Nwere

Nke 3

Na-ekele Chineke Maka Ihe Ndị I Nwere

GỊNỊ KA BAỊBỤL NA-AKỤZI? “Na-ekelenụ Chineke banyere ihe ọ bụla.”—1 Ndị Tesalonaịka 5:18.

OLEE IHE MERE O JI ESI IKE? Ndị mpako na ndị na-anaghị ekele ekele gbara anyị gburugburu, anyị nwekwara nnọọ ike ịmụta àgwà ndị ahụ. (2 Timoti 3:1, 2) E wezụga nke ahụ, anyị nwere ike iche na ọ dị anyị mkpa itinyekwu aka n’ihe ndị ọzọ n’agbanyeghị na anyị nwere ọtụtụ ihe ndị anyị na-eme ná ndụ. Nsogbu nwere ike izu anyị ahụ́, ma ọ bụ anyị etinye nnọọ isi n’ịchụ ihe ndị ga-abara naanị anyị uru nke na anyị agaghị enwe oge ịnụ ụtọ ihe ndị anyị nwerela enwe ma ọ bụ ikele ndị ọzọ maka ihe ndị ha na-emere anyị.

OLEE IHE I NWERE IKE IME? Na-ewepụta oge ịtụgharị uche n’ezi ihe ndị i nwere ugbu a. N’ezie, i nwere ike iche na nsogbu ndị i nwere karịrị gị akarị. Ma tụlee ihe nlereanya Eze Devid. Obi tiwara ya mgbe ụfọdụ, nsogbu emeekwa ka obi daa ya mbà. N’agbanyeghị nke ahụ, o kpegaara Chineke ekpere, sị: “Atụgharịwo m uche n’ọrụ gị dum; eji m obi m dum na-echebara ọrụ aka gị echiche.” (Abụ Ọma 143:3-5) N’agbanyeghị nsogbu ndị Devid nwere, ọ nọgidere na-ekele Chineke ma na-enwe afọ ojuju.

Chee echiche banyere ihe ndị ọzọ merela iji nyere gị aka, kelee ha maka mbọ ha. Jizọs gosiri anyị ihe nlereanya pụrụ iche na nke a. Dị ka ihe atụ, mgbe enyi ya bụ́ Meri wụsara ya mmanụ dị oké ọnụ ahịa n’isi na n’ụkwụ, ụfọdụ ndị jụrụ, sị: “Gịnị mere e ji laa mmanụ a na-esi ísì ụtọ n’iyi otú a?” * Ndị nkatọ ahụ chere na a gaara ere mmanụ ahụ ma nye ndị ogbenye ego ya. Jizọs zara ha, sị: “Hapụnụ ya. Gịnị mere unu ji na-enye ya nsogbu?” O kwuziri, sị: “O mere ihe o nwere ike ime.” (Mak 14:3-8; Jọn 12:3) Jizọs elekwasịghị anya n’ihe Meri na-emeghị, kama nke ahụ, o kelere ya maka ihe o mere.

Ụfọdụ anaghị ama uru ndị ezinụlọ ha, ndị enyi ha, ma ọ bụ ngọzi ndị ọzọ ha nwere bara ruo mgbe ha chọrọ ha achọ. I nwere ike izere ụdị ihe ọjọọ ahụ ime gị site n’ịtụgharị uche n’ihe ọma ndị i nwere ugbu a! Ọ́ gaghị adị mma ka i chee echiche banyere ihe ndị ị na-ekele Chineke maka ha ma ọ bụ depụta ha edepụta?

Ebe ọ bụ na “ezi onyinye ọ bụla” si n’aka Chineke, anyị kwesịrị ịna-ekele ya n’ekpere anyị. (Jems 1:17) Ime otú ahụ mgbe niile ga-enyere anyị aka ịnọgide na-enwe obi ụtọ maka ihe ndị anyị nwere ma na-enwe afọ ojuju.—Ndị Filipaị 4:6, 7.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Na narị afọ mbụ, ịwụsa onye ọbịa mmanụ n’isi bụ ụzọ e si ele ya ọbịa; ịwụsa mmadụ mmanụ n’ụkwụ na-egosi na onye wụsara mmanụ ahụ dị umeala n’obi.

[Foto dị na peeji nke 6]

Ị̀ na-ekele ndị ọzọ maka ihe ndị ha na-emere gị?