Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kasie Ndị Na-eru Uju Obi Otú Jizọs Mere

Kasie Ndị Na-eru Uju Obi Otú Jizọs Mere

Kasie Ndị Na-eru Uju Obi Otú Jizọs Mere

LAZARỌS, bụ́ onye bi na Betani, dara ezigbo ọrịa. Ụmụnne ya nwaanyị, bụ́ Mata na Meri, zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kọọrọ ezigbo enyi ha bụ́ Jizọs. Ma ọrịa ahụ gburu Lazarọs. Mgbe e lichara ya, ndị enyi na ndị agbata obi letara Mata na Meri “ịkasi ha obi.” (Jọn 11:19) Jizọs mechara rute Betani ma gawa ịhụ ezi ndị enyi ya ahụ. Ọ bụrụ na anyị atụlee ihe o kwuru na ihe o mere, e nwere ihe anyị nwere ike ịmụta banyere otú e si akasi ndị na-eru uju obi.

Ọbịbịa Gị Gosiri na Ị Hụrụ Ha n’Anya

Iji ruo Betani, Jizọs ji ụkwụ gaa njem ga-ewe ihe dị ka abalị abụọ, gafere Osimiri Jọdan, gafeekwa Jeriko, n’ụzọ bụ́ ugwu ugwu dị rịgọ rịgọ. Mata mere ngwa ngwa gawa izute Jizọs mgbe ọ na-achọ ịbata n’obodo ahụ. Mgbe e mechara, mgbe Meri nụrụ na Jizọs abịala, o mekwara ngwa ngwa ịga hụ ya. (Jọn 10:40-42; 11:6, 17-20, 28, 29) O doro anya na ọbịbịa Jizọs kasiri ụmụnne abụọ ahụ na-eru uju obi.

Taa, anyị ịga na nke ndị mmadụ nwụnahụrụ nwekwara ike ịkasi ha obi. Scott na Lydia, bụ́ ndị nwa ha nwoke dị afọ isii, aha ya bụ Theo, nwụrụ n’ihe ọghọm, kọrọ ihe mere mgbe ahụ, sị: “Ọ dị anyị mkpa ka ndị ikwu na ibe anyị kwado anyị. Ha chọọrọ anyị nnọọ bịa n’ụlọ ọgwụ n’etiti abalị.” Olee ihe ha gwara di na nwunye ahụ nwa ha nwụrụ? “N’oge ahụ, ihe dị anyị mkpa abụghị okwu ọnụ. Ọbịbịa ha bịara kwuru ihe niile—na ha hụrụ anyị n’anya.”

Baịbụl kwuru na mgbe Jizọs hụrụ ndị na-ebe ákwá n’ihi ọnwụ Lazarọs, o ‘nyere ya nsogbu,’ ‘anya mmiri gbakwara ya.’ (Jọn 11:33-35, 38) Jizọs echeghị na anya mmiri ịgba ya n’ihu ndị ọzọ ga-eme ka a ghara ile ya anya ka nwoke. Ihe ahụ na-ewute ha wutere ya, o sokwa ha ruo uju. Olee ihe anyị na-amụta na nke a? Mgbe anyị gara ileta ndị na-eru uju, anyị ekwesịghị ime ihere iso ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá. (Ndị Rom 12:15) Echekwalanụ na i kwesịrị ime ka onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ bee ákwá. O nwere ike ịkara ụfọdụ mma ibe ákwá mgbe naanị ha nọ.

Jiri Ọmịiko Gee Ha Ntị

O nwere ike ịbụ na o nwere ihe ụfọdụ Jizọs bu n’obi ịgwa Mata na Meri iji gbaa ha ume, ma o doro anya na ọ hapụrụ ha ka ha buru ụzọ kwuo okwu. (Jọn 11:20, 21, 32) Mgbe o mechara gwa Mata okwu, ihe ọ jụrụ ya bụ ajụjụ, gezie ya ntị.—Jọn 11:25-27.

Ige mmadụ ntị nke ọma na-egosi na anyị na-eche banyere onye ahụ. Iji kasie ndị na-eru uju obi, ọ dị mkpa ka anyị gee ha ntị nke ọma. Anyị nwere ike igosi na anyị bụ ezigbo ndị na-ege ntị site n’ịjụ ajụjụ ndị ga-eme ka ndị ahụ na-eru uju kwukwuo ihe dị ha n’obi. Ma, kpachara anya ka ị ghara ịmanye ha ikwu okwu mgbe ha na-achọghị ikwu okwu. O nwere nnọọ ike ịbụ na ike gwụrụ ha, ya adịkwa mkpa ka ha zuo ike.

Ndị na-eru uju nwere ike ịnọ duu, mgbe ụfọdụkwa, na-ekwughachi ihe ha kwurula ekwu. Ụfọdụ na-ekwu ihe otú ọ dị ha n’obi. Ma Meri ma Mata gwara Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.” (Jọn 11:21, 32) Olee ihe Jizọs mere? O ji ndidi na ọmịiko gee ha ntị. Ọ gwawaghị ha otú obi kwesịrị ịdị ha. O doro anya na ọ ghọtara na o nwere ike ịbụ na obi jọrọ ha ezigbo njọ.

Ọ bụrụ na i jighị n’aka ihe i kwesịrị ikwu mgbe i letara onye mmadụ nwụnahụrụ, ihe i nwere ike iji malite okwu gị bụ ịjụ ya, sị, “Ị̀ ga-achọ ikwu banyere ya?” Gezie ntị nke ọma n’ihe ọ ga-aza. Tinye uche gị n’ihe ị na-anụ. Legide onye ahụ anya ma gbalịa ịghọta otú obi dị ya.

Ọ dịghị mfe ịghọta otú obi dị onye mmadụ nwụnahụrụ. Lydia kọwara, sị: “Mkpa anyị gbanwere. Mgbe ụfọdụ, anyị anaghị ejiteli onwe anyị, ezigbo ákwá apụọ anyị n’ọnụ n’ihu ndị ọbịa. Anyị chọrọ nnọọ ka ndị ọzọ ghọta anyị. Ndị enyi anyị gbalịrị ike ha niile ịghọta otú obi dị anyị.”

Jizọs mere nke a nke ọma. Ọ maara na onye ọ bụla nwere “ihe na-egbu ya mgbu na ihe na-afụ ya ụfụ.” (2 Ihe E Mere 6:29) Ihe Jizọs zara ụmụnne abụọ ahụ mgbe ha kelere ya dị iche iche. Mata nọgidere na-ekwu okwu mgbe o kelechara Jizọs, n’ihi ya, Jizọs gwawara ya okwu. Ebe ọ bụ na Meri na-ebe ákwá, Jizọs agwateghị ya okwu aka. (Jọn 11:20-28, 32-35) Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe nlereanya ya? O nwere ike ịka mma ikwe ka onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ kpebie otú nkwurịta okwu unu ga-esi gaa. Mmasị i nwere ige ntị ka ha na-ekwu otú obi si jọọ ha njọ nwere ike ịkasi ha nnọọ obi.

Okwu Ndị Na-akasi Obi

Mgbe Meri na Mata gwara Jizọs, sị: “A sị na ị nọ n’ebe a,” ọ tawaghị ha ụta ma ọ bụ gbaghawa ihe ha kwuru. Ọ zara Mata ihe a na-emesi obi ike: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.” (Jọn 11:23) Jizọs ji okwu ole na ole ahụ nyere ya aka ilepụ anya n’ihu ma jiri obiọma chetara ya na olileanya dị.

Mgbe ị na-agwa ndị na-eru uju okwu, cheta na okwu na-agba ume si gị n’obi nwere nnọọ ike ịkasi ha obi, ya dịgodị ole na ole. E nwere ike ikwu okwu nkasi obi ekwu ma ọ bụ dee ya edee. Ebe ọ bụ na e nwere ike ịgụgharị akwụkwọ ozi ugboro ugboro, o nwere ike ịkasi mmadụ obi ruo ogologo oge. Ọnwa itoolu di Kath, bụ́ Bob, nwụchara, Kath gụghachiri kaadị niile e ziteere ya. O kwuru, sị: “M chọpụtara na ha nyedịịrị m aka n’oge ahụ karị. Ọ bụ mgbe ahụ ka ha kasiri m obi.”

Olee ihe i nwere ike idenye n’okwu ole na ole ị na-edegara onye mmadụ nwụnahụrụ iji kasie ya obi? I nwere ike ide banyere onye ahụ nwụrụ anwụ—ihe mekọrọ gị na ya ma ọ bụ àgwà ya masịrị gị. Kath kwuru, sị: “Ihe ndị dị mma e dere banyere Bob na àgwà ya tọrọ m ọchị, gụọkwa m ákwá. Akụkọ na-atọ ọchị ndị e dere banyere ya mere ka m chịa ọchị ma cheta alụmdi na nwunye obi ụtọ anyị. Ọtụtụ kaadị m nwetara bụ́ ndị m na-anaghị eji egwuri egwu ugbu a nwere amaokwu Baịbụl dị iche iche.”

Mee Ihe A Hụrụ Anya Iji Nyere Ha Aka

Iji nyere ezinụlọ Lazarọs aka, Jizọs mere ihe anyị na-agaghị emeli. Ọ kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ. (Jọn 11:43, 44) Ma, anyị nwere ike ime ihe ndị a hụrụ anya anyị ga-emeli, dị ka isiri ha nri, inyere ha ndị ọbịa ụlọ, ịsara ha ákwà, ilekọtara ha ụmụaka, ịgara ha ozi, ma ọ bụ ibuga ha ebe ha chọrọ ịga. O doro anya na ndị mmadụ nwụnahụrụ ga-enwe obi ụtọ maka obere ihe ndị i mere iji gosi na ị hụrụ ha n’anya n’ezie.

N’ezie, ndị na-eru uju nwere ike ịchọ ịnọ naanị ha mgbe ụfọdụ. N’agbanyeghị nke ahụ, i nwere ike ime ihe ụfọdụ dabara adaba n’onwe gị iji nọrọ ha nso. Otu nwaanyị nwa ya nwụrụ kwuru, sị: “E nweghị abalị ole a ga-eruru uju, ma ọ bụ mgbe mmadụ kwesịrị ịkwụsị iru uju.” Ụfọdụ na-agba mbọ icheta onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ n’ụbọchị ndị pụrụ iche n’afọ, dị ka ụbọchị ncheta agbamakwụkwọ, ma ọ bụ n’ụbọchị onye ahụ nwụnahụrụ ya. Ọ bụrụ na ị na-ewepụta onwe gị ịnọnyere ha n’oge ndị ahụ, i nwere ike ịghọ ezigbo enyi ha n’oge ihe siri ike.—Ilu 17:17.

Okwu a na-enye olileanya Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya so ná nkasi obi o nyere: “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma m na-eje ebe ahụ ịkpọte ya.” (Jọn 11:11) Jizọs mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ọ jụrụ Mata, sị: “Ì kwere nke a?” Mata zara ya, sị: “Ee, Onyenwe anyị.”—Jọn 11:24-27.

Ì kweere na Jizọs ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ? Ya bụrụ na i kwere, gwa ndị mmadụ nwụnahụrụ banyere olileanya a magburu onwe ya i nwere. Nyere ha aka n’ebe ndị i nwere ike. I mee otú ahụ, okwu gị na ihe ndị i mere ga-akasitụ ha obi.—1 Jọn 3:18.

[Map dị na peeji nke 9]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

PERIA

Osimiri Jọdan

Jeriko

Betani

Oké Osimiri Nnu

Jeruselem

SAMERIA