Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ “Maara Obi Ụmụ Mmadụ”

Ọ “Maara Obi Ụmụ Mmadụ”

Bịaruo Chineke Nso

Ọ “Maara Obi Ụmụ Mmadụ”

2 IHE E MERE 6:29, 30

ÒNYE n’ime anyị ka nsogbu ndị a na-enwe ná ndụ na-akpabeghị aka ọjọọ? Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị anyị ka ọ̀ bụ na ọ dịghị onye nwere ike ịghọta nnọọ nsogbu ndị anyị na ha na-alụ ma ọ bụ oké mwute anyị na-enwe. Ma, ọ dị onye na-aghọta nke ọma otú obi dị anyị. Ọ bụ Jehova Chineke. Okwu Sọlọmọn nke dị na 2 Ihe E Mere 6:29, 30, nwere ike ịkasi anyị obi.

Sọlọmọn nọ na-ekpe ekpere n’oge a na-arara ụlọ nsọ dị na Jeruselem nye Chineke n’afọ 1026 T.O.A. (Tupu Oge Anyị). N’ekpere ahụ, nke were ihe dị ka nkeji iri, Sọlọmọn jara Jehova mma ma kwuo na ọ bụ Chineke nke na-eguzosi ike n’ihe, Onye na-emezu nkwa ya, na Onye na-anụ ekpere.—1 Ndị Eze 8:23-53; 2 Ihe E Mere 6:14-42.

Sọlọmọn rịọrọ Chineke ka ọ nụrụ arịrịọ nke ndị na-efe ya. (Amaokwu 29) Ọ bụ ezie na Sọlọmọn kpọtụrụ ọtụtụ nsogbu aha (amaokwu 28), o kwuru na onye nke ọ bụla na-efe Chineke maara “ihe na-egbu ya mgbu,” nweekwa “ihe na-afụ ya ụfụ.” Otu onye nwere ike inwe otu ihe na-enye ya nsogbu n’obi, onye ọzọ enwee ihe ọzọ na-ewute ya.

Nke ọ bụla ọ bụ, ndị na-atụ egwu Chineke nwere onye ga-enyere ha aka ná nsogbu ha. N’ekpere ahụ, ihe Sọlọmọn bu n’obi bụ onye ọ bụla na-efe Chineke nke obi ya kpaliri ‘ịgbasapụ ọbụ aka ya,’ jiri obi ya dum kpegara Jehova ekpere. * Ikekwe, Sọlọmọn chetara na mgbe nna ya, Devid, nọ n’oké nsogbu, o kwuru, sị: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị.”—Abụ Ọma 55:4, 22.

Olee ihe Jehova ga-eme mgbe mmadụ ji ezi obi rịọ ya ka o nyere ya aka? Sọlọmọn rịọrọ Jehova, sị: “Gị onwe gị nọrọ n’eluigwe, bụ́ ebe obibi gị, nụrụ, gbagharakwa wee kwụọ onye ọ bụla ụgwọ dị ka ụzọ ya niile si dị.” (Amaokwu 30) Sọlọmọn maara na “Onye na-anụ ekpere” na-eche banyere ìgwè ndị na-efe ya, na-echekwa banyere ha n’otu n’otu. (Abụ Ọma 65:2) Jehova na-eme ka ha nweta enyemaka ha chọrọ, tinyere ịgbaghara onye mmehie nke ji obi ya niile lọghachikwute Chineke mmehie ya.—2 Ihe E Mere 6:36-39.

Olee ihe mere Sọlọmọn ji jide n’aka na Jehova ga-aza ekpere nke onye na-efe ya chegharịrị echegharị? Sọlọmọn gara n’ihu n’ekpere ya, sị: “N’ihi na ị [Jehova] maara obi ya (n’ihi na ọ bụ naanị gị maara obi ụmụ mmadụ nke ọma).” Jehova maara ihe na-egbu onye na-efe ya kwesịrị ntụkwasị obi mgbu n’obi ma ọ bụ ihe na-afụ ya ụfụ n’obi, nsogbu ya na-emetụkwa Ya n’obi.—Abụ Ọma 37:4.

Ekpere Sọlọmọn nwere ike ịkasi anyị obi. O nwere ike ụmụ mmadụ ibe anyị agaghị aghọtacha otú obi dị anyị—‘ihe na-egbu anyị mgbu’ na ‘ihe na-afụ anyị ụfụ.’ (Ilu 14:10) Ma, Jehova maara obi anyị, ọ na-echekwa nnọọ banyere anyị. Ịgwa ya otú obi dị anyị n’ekpere nwere ike ime ka ibu anyị kara anyị mfe. Baịbụl kwuru, sị: “Na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”—1 Pita 5:7.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 N’oge Baịbụl, mmadụ ‘ịgbasapụ ọbụ aka’ ya, ịchịli ọbụ aka elu, gosiri na onye ahụ na-ekpe ekpere.—2 Ihe E Mere 6:13.