Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Nwa Gị Ga-ekwu?

Gịnị Ka Nwa Gị Ga-ekwu?

Gịnị Ka Nwa Gị Ga-ekwu?

NDỊ NNE NA NNA: N’Ụlọ Nche nke Jenụwarị 15, 2010, peeji nke 16-20, anyị kwuru ka unu na ụmụ unu nwee oge unu ga-eji na-amụ ihe. Isiokwu a kwuru ihe ndị ga-enyere unu aka ime ka ụmụ unu nwee ike imeri ihe isi ike ndị ha na-enwe n’ụlọ akwụkwọ. Unu nwere ike ịmụgharị ihe ndị a mgbe unu na-enwe Ofufe Ezinụlọ.

ỤMỤAKA bụ́ Ndịàmà Jehova na-enwe ọtụtụ ihe isi ike. Ụmụ akwụkwọ ibe ha na-ajụkarị ha ihe mere na ha anaghị eso eme ihe ụfọdụ, dị ka ikele ọkọlọtọ, ime ememme ụbọchị ọmụmụ, na ụfọdụ ememme ndị ọzọ e ji maka ha enye ụmụ akwụkwọ ezumike. Gịnị ka nwa gị ga-ekwu ma a jụọ ya ajụjụ banyere ihe ndị a?

Ihe ụfọdụ ụmụaka bụ́ Ndị Kraịst na-aza ndị jụrụ ha ajụjụ banyere ihe ndị a bụ: “Agaghị m eme ya. O megidere okpukpe m.” Anyị kwesịrị ikele ụdị ụmụaka a maka ịkwụsi ike n’ihe ndị ha kweere. Ihe a ha zara nwere ike ime ka a ghara ịjụkwu ha ajụjụ. Ma, Baịbụl gwara anyị ka anyị dịrị “njikere mgbe niile ịzara ọnụ [anyị] n’ihu onye ọ bụla nke na-ajụ [anyị] ihe mere [anyị] ji” kwere ihe ndị anyị kweere. (1 Pita 3:15) Otú ụmụaka ga-esi eme nke a abụghị naanị ịsị, “Agaghị m eme ya.” A sịgodị na e nwere ndị na-anaghị ekweta ihe anyị na-agwa ha, e nwere ụfọdụ ndị ga-achọ ịma ihe mere anyị ji mee ihe anyị mere.

Ọtụtụ ndị na-eto eto bụ́ Ndịàmà Jehova na-eji akwụkwọ ndị dị ka Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, akọrọ ụmụ akwụkwọ ibe ha akụkọ ụfọdụ dị na Baịbụl. Ihe ndị ahụ a kọrọ na Baịbụl nwere ike inye aka mee ka a mata ihe mere ụmụaka ndị bụ́ Ndịàmà Jehova ji eme ihe ụfọdụ ma ọ bụ ihe mere na ha anaghị eme ihe ụfọdụ. Ụfọdụ ụmụ akwụkwọ na-ege ntị nke ọma mgbe a na-akọrọ ha akụkọ ndị ahụ si na Baịbụl, e sikwala otú a malite ịmụrụ ọtụtụ n’ime ha Baịbụl. O nwere ike isiri ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ike ịnọ otu ebe gerechaa akụkọ si na Baịbụl nke a na-akọrọ ha. Ihe ụfọdụ a kọrọ na Baịbụl nwere ike isiri ụmụ akwụkwọ ike nghọta ma ọ bụrụ na a kọwaraghị ha ya nke ọma. Mgbe enyi Minhee kpọrọ ya ka ọ bịa ememme ụbọchị ọmụmụ ya, Minhee, bụ́ onye dị afọ iri na otu, gwara ya, sị: “Baịbụl agwaghị anyị ka anyị na-eme ememme ụbọchị ọmụmụ. Ọ bụ n’ụbọchị a na-eme ememme ọmụmụ ka e gburu Jọn Onye Na-eme Baptizim, bụ́ onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl.” Ma, Minhee kwuru na o yiri ka enyi ya aghọtaghị ihe a ọ zara ya.

Mgbe ụfọdụ, ihe ga-enye aka bụ mmadụ igosi nwa akwụkwọ ibe ya ihe e sere n’akwụkwọ anyị ma ọ bụ akụkọ a kọrọ na ya. Ma, gịnị ka a ga-eme ma ọ bụrụ na ndị isi ụlọ akwụkwọ ekwuo na ha achọghị ka ụmụ akwụkwọ gosi ụmụ akwụkwọ ibe ha akwụkwọ okpukpe? Ụmụ anyị hà nwere ike ikwusa ozi ọma n’ejighịdị akwụkwọ anyị ọ bụla? Olee otú i nwere ike isi nyere ụmụ gị aka ịma ihe ha ga-ekwu?

Gị na Ha Mụgharịa Ihe Ha Ga-ekwu

Ọ na-aba ezigbo uru ma ọ bụrụ na gị na nwa gị amụgharịa ihe ọ ga-ekwu. I nwere ike ime ka ọ̀ bụ gị bụ nwa akwụkwọ ibe ya. Ka ụmụaka na-agba mbọ ime ka ndị ọzọ mata ihe ndị ha kweere, ndị nne na nna kwesịrị ịna-aja ha mma ma na-egosi ha otú ha ga-esi mekwuo ka ndị ọzọ na-aghọta ihe ha na-ekwu nke ọma, nakwa ihe mere ha ji kwesị ime otú ahụ. Dị ka ihe atụ, gwa ha ka ha na-agwa ndị ọgbọ ha okwu otú ha ga-enwe ike ịghọta ya. Joshua, bụ́ nwatakịrị nwoke dị afọ itoolu, kwuru na ụmụ akwụkwọ ibe ya anaghị aghọta okwu ndị dị ka “akọnuche” na “iguzosi ike n’ihe.” N’ihi ya, ọ na-eji okwu ndị ha ga-aghọta agwa ha okwu.—1 Kọr. 14:9.

Obi ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ndị jụrụ ajụjụ na-apụ n’ihe a na-aza ha ma ọ bụrụ na azịza ajụjụ ahụ etoo ogologo. Ndị na-eto eto bụ́ Ndịàmà Jehova nwere ike ime ka uche ụmụ akwụkwọ ibe ha dịgide n’ihe ha na-ekwu ma ọ bụrụ na ha ekwere ka ha na-etinye ọnụ, na-ajụkwa ha ajụjụ. Haneul, bụ́ nwatakịrị nwaanyị dị afọ iri, kwuru, sị, “Ụmụ akwụkwọ anyị na-achọ ka ha na mmadụ na-akparịta ụka, ọ bụghị ka ọ na-akọwara ha ihe.” Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na mmadụ na-akparịta ụka, na-ajụ ya ajụjụ, na-egekwa ntị nke ọma mgbe ọ na-ekwu uche ya.

Ihe ndị na-esonụ e dere n’okpuru na-egosi otú ụmụaka bụ́ Ndịàmà Jehova na ụmụ akwụkwọ ibe ha nwere ike isi na-akparịta ụka. Ọ dịghị mkpa ka e buru ihe ndị e kwuru n’igbe dị n’isiokwu a n’isi n’ihi na nwatakịrị nke ọ bụla dị iche n’ibe ya, ihe ha na-ezutekwa ga-ekpebi ihe ha ga-eme. N’ihi ya, onye na-eto eto ọ bụla bụ́ Onyeàmà Jehova kwesịrị ịghọta ihe a na-ekwu, kwuo ya otú o si ekwu okwu nakwa otú kwekọrọ n’ihe o zutere nakwa ụdị ụmụ akwụkwọ ọ na-agwa okwu. Ọ bụrụ na i nwere ụmụaka ka na-aga akwụkwọ, gbaa mbọ ka ha gosi gị otú ha ga-esi eme ihe ndị a.

Ịzụ ụmụaka chọrọ oge, e kwesịkwara ịgbasi mbọ ike iji mee nke a. Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịkụnye iwu Chineke n’obi ụmụ ha, meekwa ka ha na-eme ya.—Diut. 6:7; 2 Tim. 3:14.

Oge ọzọ unu ga-enwe Ofufe Ezinụlọ, gwa ụmụ gị ka ha gosi gị otú ha ga-esi eme ihe ndị e kwuru n’igbe dị n’isiokwu a. Ị ga-ahụ na nke a ga-aba ezigbo uru. Cheta na ihe mere e ji depụta ihe ndị ahụ abụghị ka e buru ha n’isi. N’eziokwu, unu nwere ike imegharị ya ihe karịrị otu ugboro. I nwere ike ịza ihe dị iche na nke ọ bụla ka i wee mara ihe ụmụ gị ga-eme. Ka ha na-agba mbọ ịkọwa ihe mere ha ji kwere ihe ndị ha kweere, nyere ha aka ka ha jiri ezi uche na akọ na-ekwu okwu. Ka oge na-aga, ị ga-akụziri ha otú ha ga-esi kọwaara ụmụ klas ha, ndị agbata obi unu, na ndị nkụzi ha ihe ndị ha kweere ma ọ bụrụ na ha ajụọ ha banyere ha.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 4]

EMEMME NCHETA ỌMỤMỤ

Meri: Jọn ndaa? M chọrọ ka ị bịa ememme ncheta ọmụmụ m.

Jọn: I meela, nke a gosiri na ị na-echeta m. Ma, gịnị mere i ji chọọ ime ememme ncheta ọmụmụ gị?

Meri: Ọ bụ ka m cheta ụbọchị a mụrụ m. Ị́ naghị eme ememme ncheta ọmụmụ gị?

Jọn: Ee, anaghị m eme ya.

Meri: Maka gịnị? Obi tọrọ ndị ezinụlọ m ụtọ mgbe a mụrụ m.

Jọn: Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ndị ezinụlọ m. Obi tọrọ ha ụtọ mgbe a mụrụ m. Ma, echeghị m na ọ bụ nke a mere m ga-eji na-eme ememme ncheta ọmụmụ m kwa afọ. Mgbe ọtụtụ ndị na-eme ememme ncheta ọmụmụ ha, ọ na-adị ha ka o nweghị onye ha ka ha. Ma, ọ́ bụghị Chineke ka ha?

Meri: Ihe ị na-ekwu ọ̀ bụ na ekwesịghị m ime ememme ncheta ọmụmụ m?

Jọn: Meri, ọ bụ gị ga-ekpebi. Ma, chegodị banyere nke a. Ọtụtụ ndị na-achọ ka a na-enye ha onyinye mgbe ha na-eme ememme ncheta ọmụmụ ha, ma, Baịbụl kwuru na a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe. Kama ime ememme ncheta ọmụmụ nke ga-eme ka anyị na-eche naanị banyere onwe anyị, í cheghị na ọ ga-adị mma ka anyị na-ekele Chineke kwa ụbọchị, na-eche banyere ndị ọzọ, ma na-emere ha ihe ọma?

Meri: Nke a agbatatụbeghịdị m n’uche. Ihe ị na-ekwu ọ̀ bụ na papa gị na mama gị anaghị enye gị onyinye ọ bụla?

Jọn: Ha na-enye m. Ha anaghị echere ka o ruo ụbọchị a mụrụ m tupu ha enye m onyinye. Ha na-enye m onyinye mgbe ọ bụla ha chọrọ. Meri, ka m jụọdị gị, ị̀ ga-achọ ịma otú ememme ncheta ọmụmụ si malite?

Meri: Ee. Gwa m!

Jọn: Ọ dị mma, echi, m ga-akọrọ gị banyere otu ememme ncheta ọmụmụ e mere n’oge ochie.

IGBUCHAPỤRỤ ỌKỌLỌTỌ

Obi: Ngọzi, gịnị mere na ị naghị egbuchapụrụ ọkọlọtọ?

Ngọzi: Obi, ị jụrụ ajụjụ dị mma. Ka m jụgodị gị, gịnị mere i ji egbuchapụrụ ya?

Obi: Ọ bụ n’ihi na ahụrụ m obodo m n’anya.

Ngọzi: Ama m na ị hụrụ mama gị n’anya. Ma, ị̀ na-egbuchapụrụ ya?

Obi: Ihe mere m ji egbuchapụrụ ọkọlọtọ bụ na m na-akwanyere ya ùgwù. Ị́ naghị akwanyere ọkọlọtọ ùgwù?

Ngọzi: M na-akwanyere ya ùgwù. Ma, ọ pụtaghị na anyị ga na-egbuchapụrụ ndị niile ma ọ bụ ihe niile anyị na-akwanyere ùgwù, ọ́ bụghị ya?

Obi: Ọ bụ eziokwu, m na-akwanyere onye nkụzi anyị ùgwù, ma, anaghị m egbuchapụrụ ya. Amaghịdị m ihe mere m ji egbuchapụrụ ọkọlọtọ.

Ngọzi: Ọtụtụ ndị chere na ọkọlọtọ na-anọchite anya mba ha. Ha chere na igbuchapụrụ ya na-egosi na ha ga-emere mba ha ihe ọ bụla. Ma, echeghị m otú ahụ. Enweghị m ike inye mba m ndụ m n’ihi na ọ bụ Chineke nyere m ndụ. Ekpebiela m inye Chineke ndụ m. N’agbanyeghị na m na-akwanyere ọkọlọtọ ùgwù, anaghị m egbuchapụrụ ya.

Obi: Aghọtala m.

Ngọzi: Obi dị m ụtọ na i kwulitere ihe a. Ị chọọ ịma ihe mere m ji eme ihe ụfọdụ ma ọ bụ ihe mere na anaghị m eme ihe ụfọdụ, biko jụọ m. Ị̀ ma na Baịbụl kọrọ na n’oge ochie, otu eze Babịlọn nyere ndị mmadụ iwu ka ha kpọọrọ ihe oyiyi isiala. Ndị ụfọdụ ekweghị, n’agbanyeghị na ha ma na a ga-egbu ha.

Obi: Eziokwu! Gịnị mere ha?

Ngọzi: M ga-agwa gị banyere ha ma anyị pụọ brek.

ỊDỌ ỌCHỊCHỊ N’ỤLỌ AKWỤKWỌ

Ụzọ: Emeka, ònye ka i chere ga-abụ mọnịtọ klas anyị?

Emeka: Achọghị m ịma onye ọ ga-abụ.

Ụzọ: Ọ̀ bụ maka gịnị?

Emeka: M nwere onye ndú kacha mma. Ekwela m nkwa na m ga na-eso Jizọs n’ihi na abụ m Onye Kraịst. Ọ dịghị onye ọzọ m ga-enwe mmasị ka ọ bụrụ onye ndú m. Ka m jụọdị gị, ị̀ ma ihe mere m ji kwuo na Jizọs bụ onye ndú kacha mma?

Ụzọ: Mba, achọghị m ịma.

Emeka: Ị chọọ ịma, obi ga-adị m ụtọ ịgwa gị.

[Foto dị na peeji nke 4]

“Jọn ndaa? M chọrọ ka ị bịa ememme ụbọchị ọmụmụ m”

[Foto dị na peeji nke 3]

“Gịnị mere na unu anaghị ekele ọkọlọtọ?”