Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ugbu A Bụ Oge A Na-anabata Ndị Mmadụ Karịsịa”

“Ugbu A Bụ Oge A Na-anabata Ndị Mmadụ Karịsịa”

Ugbu A Bụ Oge A Na-anabata Ndị Mmadụ Karịsịa”

“Lee! Ugbu a bụ oge a na-anabata ndị mmadụ karịsịa. Lee! Ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.”—2 KỌR. 6:2.

1. Gịnị mere anyị ji kwesị ịmata ihe anyị kwesịrị ime mgbe ọ bụla?

SỌLỌMỌN dere, sị: “E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla, ihe ọ bụla a na-eme n’okpuru eluigwe nwekwara oge.” (Ekli. 3:1) Ihe a Sọlọmọn dere na-egosi na ọ dị mkpa ka mmadụ mata oge kacha mma o ga-eji mee ihe ọ bụla dị mma omume, dị ka ịkọ ugbo, ime njem, ịchụ nta ego, ma ọ bụ mmadụ na ndị ọzọ ikwurịta okwu. Anyị kwesịkwara ịmata nke kacha mkpa n’ime ọrụ niile anyị ga-arụ. Ya bụ na ihe ndị ka mkpa kwesịrị ibute ụzọ n’ihe ndị anyị na-eme.

2. Olee otú anyị si mara na mgbe Jizọs nọ n’ụwa na-ekwusa ozi ọma na ọ ma ụdị oge o bi na ya?

2 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ ma ụdị oge o bi na ya, marakwa ihe ndị o kwesịrị ime. Ebe ihe ndị o kwesịrị ibu ụzọ mee dorola ya anya, ọ ma na ọtụtụ amụma ndị metụtara Mesaya, bụ́ ndị a nọ na-atụ anya ka ha mezuo kemgbe, ga-amalite imezu n’oge na-adịghị anya. (1 Pita 1:11; Mkpu. 19:10) O nwere ọrụ ọ ga-arụ nke ga-eme ka ndị mmadụ mara na ọ bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa. Ọ ga-eji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma banyere Alaeze Chineke, chịkọtakwa ndị ya na ha ga-abụ eze n’Alaeze ahụ. Ọ ga-atọkwa ntọala maka ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ́ nke ga-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ ruo nsọtụ ụwa ma mee ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya.—Mak 1:15.

3. Gịnị ka ọmụma Jizọs ma ụdị oge o bi na ya mere ka o mee?

3 Ọmụma ahụ Jizọs ma ụdị oge o bi na ya nyeere ya aka nke ukwuu, o mere ka o jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eme uche Nna ya. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “N’ezie, ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.” (Luk 10:2; Mal. 4:5, 6) Nke a mere ka ọ họrọ mmadụ iri na abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya, mechaakwa họrọ mmadụ iri asaa ọzọ wee kụziere ha ihe ma zipụ ha ka ha na-ezi ndị mmadụ ozi a na-enye obi ụtọ, nke bụ́: “Alaeze eluigwe eruwo nso.” Baịbụl kwuru banyere Jizọs, sị: “Mgbe Jizọs nyesịrị mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya ntụziaka, o si ebe ahụ gawa izi ihe na ikwusa ozi ọma n’obodo ha dị iche iche.”—Mat. 10:5-7; 11:1; Luk 10:1.

4. Olee otú Pọl si bụrụ onye na-eṅomi Jizọs Kraịst?

4 Ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị iṅomi ma otú o si jiri ịnụ ọkụ n’obi jee ozi ya ma otú o si rubere Chineke isi. Ọ bụ nke a ka Pọl onyeozi bu n’uche mgbe ọ gwara ụmụnna ya, sị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi m, ọbụna dị ka m bụ onye na-eṅomi Kraịst.” (1 Kọr. 11:1) Olee otú Pọl si ṅomie Kraịst? Ụzọ bụ́ isi o si mee nke a bụ otú o si jiri ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma. N’akwụkwọ ozi ụfọdụ Pọl degaara ọgbakọ dị iche iche, o dere ihe ndị dị ka “unu adịla umengwụ n’ihe unu na-eme,” “bụrụnụ ndị ohu Jehova,” ‘nweenụ ọtụtụ ihe unu na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị,’ nakwa “ihe ọ bụla unu na-eme, jirinụ mkpụrụ obi dum na-eme ya dị ka ọ̀ bụ Jehova ka unu na-emere ya.” (Rom 12:11; 1 Kọr. 15:58; Kọl. 3:23) Pọl echefughị ihe Jizọs Kraịst gwara ya mgbe ọ na-aga Damaskọs. O chefughịkwa ihe Jizọs gwara Ananayas, bụ́ ihe ọ ga-abụ na Ananayas gwara Pọl. Jizọs sịrị ya: “Nwoke a bụ arịa m họọrọ ka o buru aha m gakwuru ndị mba ọzọ, gakwurukwa ndị eze na ụmụ Izrel.”—Ọrụ 9:15; Rom 1:1, 5; Gal. 1:16.

“Oge A Na-anabata Ndị Mmadụ Karịsịa”

5. Olee ihe mere Pọl ji jiri ịnụ ọkụ n’obi jee ozi ya?

5 Ọ bụrụ na anyị agụọ akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, anyị ga-ahụ ụdị obi ike na ịnụ ọkụ n’obi Pọl ji jee ozi ọma. (Ọrụ 13:9, 10; 17:16, 17; 18:5) Pọl ghọtara na ya ekwesịghị iji oge ahụ ọ nọ n’ụwa egwuri egwu. Ọ sịrị: “Lee! Ugbu a bụ oge a na-anabata ndị mmadụ karịsịa. Lee! Ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.” (2 Kọr. 6:2) Afọ 537 T.O.A. kacha bụụrụ ụmụ Izrel a dọọrọ n’agha gaa Babịlọn oge a na-anabata ndị mmadụ n’ihi na ọ bụ oge ha ga-alọta ala ha. (Aịza. 49:8, 9) Ma, ọ̀ bụ gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe ọ na-ekwu ihe a? Ihe ndị ọzọ o kwuru ná Ndị Kọrịnt nke abụọ isi isii ga-enyere anyị aka ịmata ihe o bu n’obi.

6, 7. Olee nnukwu ihe ùgwù e nyere Ndị Kraịst e tere mmanụ n’oge a, oleekwa ndị ha na Ndị Kraịst e tere mmanụ na-arụkọ ọrụ?

6 Ná Ndị Kọrịnt nke abụọ isi ise, Pọl kwuru banyere ihe ùgwù e nyere ya na Ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 5:18-20.) O kwuru na o nwere ọrụ Chineke ji maka ya kpọọ ha, ya bụ, ije “ozi nke ime ka a dị ná mma,” bụ́ ịrịọ ndị mmadụ ‘ka ha na Chineke dị ná mma.’ Nke a pụtara ime ka ndị mmadụ na Chineke bụrụghachi enyi.

7 E kewapụrụ mmadụ niile n’ebe Jehova nọ kemgbe Adam na Iv mechara mmehie n’Iden. (Rom 3:10, 23) Nkewapụ ahụ e kewapụrụ ha n’ebe Chineke nọ mere ka ha ghara ịma Chineke na nzube ya. Nke a mere ka ụmụ mmadụ malite ịta ahụhụ na ịnwụ anwụ. Pọl dere, sị: “Anyị maara na ihe niile e kere eke na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a.” (Rom 8:22) Ma, Chineke malitere ‘ịrịọ’ ndị mmadụ ka ha na ya dị ná mma. Nke a bụ ọrụ e nyere Pọl na Ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ n’oge ahụ. Oge ahụ “a na-anabata ndị mmadụ” nwere ike ịbụrụ ndị nwere okwukwe n’ebe Jizọs nọ “ụbọchị nzọpụta.” Ndị Kraịst niile e tere mmanụ na ndị enyi ha, bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ ha na ha na-arụkọ ọrụ, na-akpọ ndị mmadụ òkù ka ‘oge a na-anabata ndị mmadụ’ baara ha uru.—Jọn 10:16.

8. Gịnị mere òkù ahụ a na-akpọ ndị mmadụ ka ha na Chineke dị ná mma ji pụọ iche?

8 Ihe mere òkù a na-akpọ ụmụ mmadụ ka ha na Chineke dị ná mma ji pụọ nnọọ iche bụ na Chineke mere ihe ya na ndị mmadụ ga-eji dị ná mma, n’agbanyeghị na ọ bụ isi mmadụ nupụụrụ ya n’Iden kpatara na ha na ya adịghị ná mma. (1 Jọn 4:10, 19) Gịnị ka o mere? Pọl zara, sị: “Chineke si n’aka Kraịst na-eme ka ya na ụwa dị ná mma, n’agụrụghị ha njehie ha, o nyefekwara n’aka anyị okwu nke ime ka a dị ná mma.”—2 Kọr. 5:19; Aịza. 55:6.

9. Olee ihe Pọl mere iji gosi na obi dị ya ụtọ maka ebere Chineke meere ụmụ mmadụ?

9 Àjà mgbapụta ahụ Jehova ji Jizọs chụọ mere ka ọ na-agbaghara ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ mmehie ha, nke a mekwara ka ha na ya dị ná mma. Ihe ọzọ bụ na o zipụrụ ndị ohu ya ka ha gaa ebe niile na-arịọ ndị mmadụ ka ha na ya mee udo mgbe ha ka nwere ike ime nke a. (Gụọ 1 Timoti 2:3-6.) Mgbe Pọl nọ n’ụwa, ọ matara uche Chineke, matakwa ụdị oge o bi na ya, nke a mere ka o jiri ike ya niile jee “ozi nke ime ka a dị ná mma.” Uche Jehova agbanwebeghị. Ọ ka bụ uche ya ka ya na ndị e kewapụrụ n’ebe ọ nọ dị ná mma. Ihe ahụ Pọl kwuru, ya bụ, “ugbu a bụ oge a na-anabata ndị mmadụ karịsịa” nakwa na “ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta,” gbasara anyị. N’eziokwu, Jehova bụ Chineke nwere ọmịiko na obi ebere.—Ọpụ. 34:6, 7.

Ekwela Ka ‘Nzube Ya Funahụ’ Gị

10. Olee otú Ndị Kraịst e tere mmanụ n’oge ochie si lee “ụbọchị nzọpụta” anya, oleekwa otú ndị nke oge a si ele ya anya?

10 Ndị mbụ obiọma a na-erughịrị mmadụ rutere aka bụ ndị ha na “Kraịst dị n’otu.” (2 Kọr. 5:17, 18) “Ụbọchị nzọpụta” nke ha malitere na Pentikọst afọ 33 O.A. Malite n’oge ahụ gawa, e nyere ha ọrụ ka ha na-ekwu “okwu nke ime ka a dị ná mma.” Taa, ndị fọdụrụ ná Ndị Kraịst e tere mmanụ ka na-ezi ndị mmadụ “ozi nke ime ka a dị ná mma.” Ha ma na ndị mmụọ ozi anọ ahụ Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ na-ejidesi “ifufe anọ nke ụwa ike, ka ifufe ọ bụla wee ghara ifekwasị ụwa.” Ya mere, ugbu a ka bụ “ụbọchị nzọpụta” nakwa “oge a na-anabata ndị mmadụ karịsịa.” (Mkpu. 7:1-3) Ọ bụ nke a mere ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ ji jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eje “ozi nke ime ka a dị ná mma” n’ebe niile n’ụwa kemgbe ihe dị ka otu narị afọ.

11, 12. N’ihe dị ka otu narị afọ gara aga, olee otú Ndị Kraịst e tere mmanụ si gosi na ha ma ụdị oge ha bi na ya? (Lee foto dị na peeji nke iri na ise.)

11 Dị ka ihe atụ, e kwuru n’akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom na n’ihe dị ka otu narị afọ gara aga, “C. T. Russell na ndị enyi ya kwenyesiri ike na ha nọ n’oge owuwe ihe ubi nakwa na ndị mmadụ kwesịrị ịnụ eziokwu nke ga-eme ka ha nwere onwe ha.” Gịnị ka ha mere banyere nke a? Ụmụnna ndị a agaghị chewe na naanị ihe ha ga-eme bụ ịkpọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa nụ okwu Chineke. Ihe ha ejighị chee otú a bụ na ha ma na ha nọ n’oge owuwe ihe ubi, bụ́ “oge a na-anabata ndị mmadụ karịsịa.” Kemgbe ọtụtụ afọ, naanị ihe ndị ụkọchukwu Krisendọm na-eme bụ ịkpọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa nụrụ okwuchukwu n’ụlọ ụka ha. Kama ime ka ha, Ndị Kraịst ndị a e tere mmanụ malitere ịchọpụta ụzọ dị iche iche ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma. Otu n’ime ụzọ ha chọpụtara bụ iji nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ na-arụ ọrụ ndị metụtara ikwusa ozi ọma.

12 Iji kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke, mmadụ ole na ole ahụ na-anụ ọkụ n’obi ji traktị, akwụkwọ nta dị iche iche, magazin, na akwụkwọ ukwu dị iche iche jee ozi ha. Ha dekwara ozi ọma nakwa isiokwu dị iche iche ma nye ha ọtụtụ ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ ka ha bipụta ha. Ha jikwa ụlọ ọrụ redio zie ndị ala ha nakwa ndị nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa ozi ọma. Ha mepụtara ma gosi ndị mmadụ foto ndị ndị mmadụ na-emegharị ahụ́ na ha, ahụ́ ha na-emegharị ana-adabakwa n’ihe a na-ekwu. Ha mere nke a mgbe a na-amalitebeghị imepụta sinima ndị nọ na ya na-emegharị ahụ́, na-ekwukwa okwu. Olee ihe ha rụpụtara n’otú ahụ ha si jiri ịnụ ọkụ n’obi jee ozi? Taa, ihe dị ka nde mmadụ asaa azala òkù ahụ ma soro na-agwa ndị ọzọ, sị: “Meenụ ka unu na Chineke dị ná mma.” N’eziokwu, ndị fere Jehova n’oge ochie ji ezigbo ịnụ ọkụ n’obi jeere ya ozi n’agbanyeghị na ha nwere ọtụtụ ihe isi ike.

13. Olee nzube Chineke nke anyị kwesịrị ichebara echiche?

13 Ihe ahụ Pọl kwuru na “ugbu a bụ oge a na-anabata ndị mmadụ karịsịa” ka gbasara anyị taa. Anyị, bụ́ ndị Jehova gosiri obiọma ya nke na-erughịrị mmadụ, nwere obi ụtọ na e mere ka anyị nụ ozi nke ime ka a dị ná mma ma nabata ya. Kama iche na ọ dịghịzi ihe ọzọ anyị ga-eme, anyị kwesịrị ichebara ihe ọzọ Pọl kwuru echiche. Ọ sịrị: “Anyị na-arịọsikwa unu ike ka unu ghara ịnara obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ ma nzube ya efunahụ unu.” (2 Kọr. 6:1) Ihe Chineke ji gosi anyị obiọma na-erughịrị mmadụ bụ ka o wee si n’aka Kraịst mee “ka ya na ụwa dị ná mma.”—2 Kọr. 5:19.

14. Gịnị na-eme n’ọtụtụ ala?

14 A ka kewapụrụ ọtụtụ mmadụ, bụ́ ndị Setan mere ka ha kpuo ìsì, n’ebe Chineke nọ, ha amaghịkwa ihe mere Chineke ji gosi anyị obiọma na-erughịrị mmadụ. (2 Kọr. 4:3, 4; 1 Jọn 5:19) Ma, ọnọdụ ụwa nke na-ajọwanye njọ emeela ka ọtụtụ mmadụ nata eziokwu Baịbụl mgbe a gwara ha na ọ bụ nkewapụ e kewapụrụ ụmụ mmadụ n’ebe Chineke nọ mere anyị ji ata ahụhụ. Ọtụtụ ndị na-ege ntị n’ozi ọma anyị ugbu a ma na-eme ka ha na Chineke dị ná mma n’ala ebe ọtụtụ ndị na-anaghị enwe mmasị n’ozi ọma anyị. Ọ̀ bụ na nke a ekwesịghị ime ka anyị mara na anyị ga-eji ịnụ ọkụ n’obi na-arịọ ndị mmadụ, sị: “Meenụ ka unu na Chineke dị ná mma”?

15. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-agwa ndị niile nọ n’ụwa, kama ịgwa ha na nsogbu ha niile ga-agwụ ma ọ bụrụ na ha amalite ife Chineke?

15 Ọrụ anyị abụghị ịna-agwa ndị mmadụ na ọ bụrụ na ha amalite ife Chineke na ọ ga-eme ka nsogbu ha kwụsị, ihe adịkwara ha mma. Nke a ka ọtụtụ ndị na-ebu n’uche aga chọọchị, chọọchị dị iche iche na-agwakwa ha nke a. (2 Tim. 4:3, 4) Ọ bụghị nke a mere anyị ji aga ozi ọma. Ihe anyị na-ezi ndị mmadụ n’ozi ọma bụ na Jehova dị njikere isi n’aka Kraịst gbaghara ha mmehie ha n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. Nke a pụtara na ndị mmadụ nwere ike ịbịa ka ha na Chineke dị ná mma, ka ha wee bụrụ ndị a na-ekewapụghị n’ebe ọ nọ. (Rom 5:10; 8:32) Ma, “oge a na-anabata ndị mmadụ karịsịa” ga-agwụ n’oge na-adịghị anya.

“Ka Mmụọ Chineke Mee Ka Unu Na-anụ Ọkụ n’Obi”

16. Gịnị nyeere Pọl aka iji obi ike na ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi?

16 Olee otú anyị nwere ike isi malite ịnụ ọkụ n’obi n’ozi Jehova ma nọgide na-eme nke a? O nwere ike ịna-esiri ndị ụfọdụ ike ha na ndị ọzọ ịkpakọrịta n’ihi na ha bụ ndị ihere ma ọ bụ ndị ikwu okwu na-ara ahụ́. Ma, ọ dị mma icheta na ihe e ji ama onye na-anụ ọkụ n’obi abụghị mmadụ na ndị ọzọ ikwu okwu mgbe niile; ọ bụghịkwa ụdị onye mmadụ bụ na-eme ka onye ahụ bụrụ onye na-anụ ọkụ n’obi. Mgbe Pọl degaara ụmụnna ya akwụkwọ, o kwuru otú mmadụ ga-esi malite ịnụ ọkụ n’obi n’ọrụ Jehova nakwa otú o ga-esi nọgide na-eme nke a. Ọ gbara ha ume ka ha kwe ‘ka mmụọ Chineke mee ka ha na-anụ ọkụ n’obi.’ (Rom 12:11) Mmụọ Jehova nyeere Pọl onyeozi aka nke ukwuu ka o wee nwee ike iji obi ike na ntachi obi jee ozi ya. Pọl ji ịnụ ọkụ n’obi jee ozi n’oge o jere ozi ihe karịrị iri afọ atọ, malite n’oge Jizọs kpọrọ ya ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ ya ruo mgbe a tụrụ ya mkpọrọ ikpeazụ na Rom ma mechaa gbuo ya. Ọ tụkwasịrị Chineke obi mgbe niile, bụ́ onye ji mmụọ ya mee ka o nwee ike na-eje ozi ya. Ọ sịrị: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.” (Fil. 4:13) Iṅomi Pọl ga-abara anyị nnukwu uru.

17. Olee otú anyị ga-esi mee “ka mmụọ Chineke mee ka [anyị] na-anụ ọkụ n’obi”?

17 Okwu Grik e si sụgharịta “na-anụ ọkụ n’obi” pụtara ‘mmiri ịgbọ agbọ.’ Anyị kwesịrị ịkwanyesi nkụ ike n’ọkụ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka mmiri anyị sikwasịrị n’ọkụ gbọọ. N’otu aka ahụ, mmụọ nsọ dị anyị mkpa mgbe niile ma ọ bụrụ na anyị chọrọ “ka mmụọ Chineke mee ka [anyị] na-anụ ọkụ n’obi.” Anyị ga-enweta mmụọ nsọ ma ọ bụrụ na anyị ekwere ka ndokwa niile Jehova mere ka okwukwe anyị sie ike baara anyị uru. Nke a pụtara na anyị ga-eji ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị na nke ọgbakọ kpọrọ ihe, ya bụ na anyị kwesịrị ịna-enwechi ọmụmụ ihe onwe onye na nke ezinụlọ anya, na-ekpechi ekpere anya, na-agachikwa ọmụmụ ihe anya. Nke a ga-enyere anyị aka inweta “ọkụ” ga-eme “ka mmụọ Chineke mee ka [anyị] na-anụ ọkụ n’obi.”—Gụọ Ọrụ Ndịozi 4:20; 18:25.

18. Olee ọrụ anyị bụ́ Ndị Kraịst raara onwe ha nye Chineke kwesịrị itinye uche na ya?

18 Onye ji obi ya dum na-achụ ihe anaghị ekwe ka ihe ọ bụla megharịa ya anya. Nzube anyị, bụ́ Ndị Kraịst raara onwe ha nye Chineke, bụ ime ihe ọ bụla Jehova chọrọ ka anyị na-eme, dị ka Jizọs mere. (Hib. 10:7) Taa, uche Jehova bụ ka ya na ọtụtụ ndị dị ná mma, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee. Ya mere, dị ka Jizọs na Pọl mere, ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ a dị ezigbo mkpa nke e kwesịrị ịrụ ngwa ngwa n’oge a.

Ì Chetara?

• Olee ihe bụ “ozi nke ime ka a dị ná mma” nke e nyere Pọl na Ndị Kraịst ndị ọzọ e tere mmanụ?

• Olee otú ndị fọdụrụ ná Ndị Kraịst e tere mmanụ sirila jiri “oge a na-anabata ndị mmadụ karịsịa” mee ihe bara uru?

• Olee otú Ndị Kraịst nwere ike isi bụrụ ndị ‘mmụọ Chineke mere ka ha na-anụ ọkụ n’obi’?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 12]

Pọl echefughị ihe Onyenwe anyị bụ́ Jizọs Kraịst gwara ya mgbe ọ na-aga Damaskọs