Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bụkuo Jehova Abụ!

Bụkuo Jehova Abụ!

Bụkuo Jehova Abụ!

“M ga-abụku Chineke m abụ olu ụtọ ruo oge niile m dị ndụ.”—ỌMA 146:2.

1. Olee ihe ndị Devid hụrụ mgbe ọ bụ nwata, bụ́ ndị mere o ji dee ụfọdụ n’ime abụ ndị o dere?

MGBE Devid bụ nwata, ọ nọrọ ọtụtụ awa n’ọhịa ndị dị Betlehem nso na-azụ atụrụ nna ya. Ka Devid na-azụ atụrụ ndị ahụ, ọ hụrụ ihe ndị mara mma Jehova kere, dị ka eluigwe nke kpakpando jupụtara, “anụ ọhịa dị iche iche,” na “nnụnụ nke eluigwe.” Ihe ndị a ọ hụrụ masịrị ya nke ukwuu, nke mere ka ọ bụọ abụ ndị na-eru n’obi, bụ́ ndị o ji too Onye mere ihe ndị a magburu onwe ha. Ọ bụ n’akwụkwọ Abụ Ọma ka e dere ọtụtụ n’ime abụ ndị ahụ. *Gụọ Abụ Ọma 8:3, 4, 7-9.

2. (a) Olee ihe abụ nwere ike imere mmadụ? Nye ihe atụ. (b) Olee ihe anyị na-amụta n’Abụ Ọma 34:7, 8 nakwa n’Abụ Ọma 139:2-8 banyere otú Devid na Jehova si dịrị ná mma?

2 O yiri ka ọ̀ bụ mgbe ahụ Devid na-azụ atụrụ ka ọ mụtachara otú e si abụ abụ. N’eziokwu, ịbụ abụ doro ya nnọọ anya, nke mere ka a họrọ ya ka ọ na-akpọrọ Eze Sọl ụbọ akwara. (Ilu 22:29) Abụ Devid na-abụrụ eze ahụ mere ka obi na-adị ya ụtọ, otú ahụ abụ ndị dị mma na-eme ka obi na-atọ ndị mmadụ ụtọ taa. Mgbe ọ bụla Devid buliri ụbọ ya, “ahụ́ na-adajụ Sọl, ahụ́ na-adịkwa ya mma.” (1 Sam. 16:23) Abụ ndị ọbụ abụ a na-atụ egwu Chineke, bụ́ onye na-edekwa abụ dere ka bara uru taa. Chegodị banyere nke a! Taa, ka ihe karịrị puku afọ atọ gaferela kemgbe a mụrụ Devid, ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa niile, bụ́ ndị nwere nsogbu dị iche iche, ka na-agụkarị abụ ọma Devid ma ha chọọ ihe ga-akasi ha obi na ihe ga-eme ka ha nwee olileanya na ihe ga-adị mma.—2 Ihe 7:6; Gụọ Abụ Ọma 34:7, 8; 139:2-8; Emọs 6:5.

Uru Abụ Bara n’Ezi Ofufe

3, 4. Olee ndokwa e mere maka ịbụ abụ nsọ mgbe Devid bụ eze Izrel?

3 Chineke nyere Devid onyinye, o jikwa ya mee ihe kacha mma, ya bụ, ito Jehova. Mgbe Devid ghọrọ eze Izrel, o mere ndokwa ka ịbụ abụ ndị dị ụtọ soro n’ọrụ ndị a na-arụ n’ụlọikwuu. E nyere ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ iri n’ime ndị Livaị, ya bụ, ihe dị ka puku anọ, ọrụ ‘inye Jehova otuto.’ “Ndị a zụrụ azụ ịbụrụ Jehova abụ dị narị mmadụ abụọ na iri asatọ na asatọ, ha niile bụ ndị ọkà.”—1 Ihe 23:3, 5; 25:7.

4 Ọ bụ Devid dere ọtụtụ n’ime abụ ndị ahụ ndị Livaị na-abụ. O doro anya na abụ Devid na-eru nnọọ n’obi onye Izrel ọ bụla nke nọ ya mgbe a na-abụ ha. Mgbe e butere igbe ọgbụgba ndụ na Jeruselem, ‘Devid gwara ndị isi n’ime ndị Livaị ka ha mee ka ụmụnne ha bụ́ ndị ọbụ abụ jiri ngwá egwú, ụbọ akwara na une na ájà, guzoro tisiwe egwú ike ka e wee nụ mkpu ọṅụ.’—1 Ihe 15:16.

5, 6. (a) Gịnị mere na a naghị eji ịbụ abụ egwu egwu n’oge Devid na-achị? (b) Olee otú anyị si mara na ndị Izrel oge ochie weere abụ ka ihe dị mkpa n’ofufe ha na-efe Chineke?

5 Gịnị mere na a naghị eji ịbụ abụ egwu egwu n’oge Devid na-achị? Ọ̀ bụ n’ihi na Devid bụ ọbụ abụ? Mba, e nwere ihe ọzọ kpatara ya, bụ́ nke e mere ka a mata mgbe ọtụtụ narị afọ gara, bụ́ mgbe onye ezi omume bụ́ Eze Hezekaya mere ka ndị mmadụ maliteghachi ihe ndị a na-eme n’ụlọ nsọ. Ihe E Mere nke abụọ isi iri abụọ na itoolu amaokwu nke iri abụọ na ise kwuru, sị: “O [ya bụ, Hezekaya] mere ka ndị Livaị jiri ájà na ụbọ akwara na une guzoro n’ụlọ Jehova, dị ka Devid na Gad bụ́ onye ọhụụ eze nakwa Netan onye amụma nyere n’iwu, n’ihi na ọ bụ Jehova nyere iwu ahụ site n’ọnụ ndị amụma ya.”

6 N’eziokwu, Jehova si n’ọnụ ndị amụma ya gwa ndị na-efe ya ofufe ka ha jiri abụ na-eto ya. Jehova nyedịrị iwu ka ndị na-abụ abụ, bụ́ ndị si n’ezinụlọ ndị nchụàjà, ghara ịna-arụ ọrụ ndị Livaị ndị ọzọ na-arụ ka ha wee nwekwuo oge ha ga-eji na-ede abụ, ma ọ bụkwanụ na-amụ ya.—1 Ihe 9:33.

7, 8. A bịa n’ịbụ abụ Alaeze anyị, gịnị dị mkpa karịa mmadụ ịma otú e si abụ abụ nke ọma?

7 Ma, i nwere ike ikwu, sị, “A bịa n’ihe banyere ịbụ abụ, o nweghị otú a gaara esi agụnye m ná ndị ahụ bụ́ ọkà n’ịbụ abụ, bụ́ ndị na-anọ n’ụlọikwuu nzute abụ abụ!” Ma, ọ bụghị ndị Livaị niile na-abụ abụ maara abụ abụ nke ọma. Ihe E Mere nke mbụ isi iri abụọ na ise amaokwu nke asatọ gosiri na e nwekwara ndị ka “na-amụ amụ.” Anyị ekwesịghịkwa ichefu na o nwere ike ịbụ na e nwere ụfọdụ ndị bụ aka ochie n’ịbụ abụ n’ebo ndị ọzọ n’Izrel, ma, ọ bụ ndị Livaị ka Jehova họọrọ ka ha na-abụ abụ. O doro anya na ndị Livaị niile kwesịrị ntụkwasị obi, ma ‘ndị bụ́ ọkà’ n’ịbụ abụ ma ‘ndị ka na-amụ amụ,’ ji obi ha dum rụọ ọrụ ha.

8 Ịbụ abụ na-atọ Devid ụtọ, ọ bụkwa aka ochie na ya. Ma, ọ̀ bụ naanị mmadụ ịma abụ abụ nke ọma dị Chineke mkpa? Devid dere n’Abụ Ọma 33:3, sị: “Werenụ ike unu niile kpọọ ụbọ akwara, tiekwanụ mkpu ọṅụ.” Ihe e kwuru n’amaokwu a doro anya: Ihe dị Jehova mkpa bụ ka anyị ‘were ike anyị niile’ na-eto ya.

Ihe E Ji Abụ Eme Mgbe Devid Na-anọghịzi Ndụ

9. Kwuo ihe ị gaara ahụ nakwa ihe ị gaara anụ ma a sị na ị nọ ya mgbe a raara ụlọ nsọ nye Jehova n’oge Sọlọmọn na-achị.

9 Mgbe Sọlọmọn na-achị, ịbụ abụ so n’ihe ndị dị oké mkpa e ji efe Chineke. Mgbe a na-arara ụlọ nsọ nye Jehova, e nwere ndị a haziri ka ha na-akpọ ngwá egwú dị iche iche. N’ebe e nwere ngwá egwú bras, e nwere otu narị opi na iri abụọ. (Gụọ 2 Ihe E Mere 5:12.) Baịbụl gwara anyị na “ndị ahụ bụ́ ndị na-afụ opi [ndị bụ́cha ndị nchụàjà] na ndị ahụ na-abụ abụ ji otu olu na-agụ egwú iji too Jehova ma kelee ya, . . . ‘n’ihi na ọ dị mma, n’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi.’” Ozugbo ha ji ọṅụ malite ịbụ abụ ahụ, “ígwé ojii jupụtara n’ụlọ ahụ,” nke gosiri na Jehova nabatara ihe ha na-eme. Chegodị ụdị obi ụtọ na ọṅụ ọ ga-abụ na e nwere ka opi ndị a na-afụ na olu ọtụtụ puku ndị ahụ na-abụ abụ na-agakọ!—2 Ihe 5:13.

10, 11. Olee ihe gosiri na Ndị Kraịst oge ochie na-abụ abụ ma ha gaa ọmụmụ ihe?

10 Ndị Kraịst oge ochie na-abụkwa abụ ma ha gaa ọmụmụ ihe. Ndị Kraịst narị afọ mbụ na-anọ n’ụlọ ndị mmadụ amụ ihe, ọ bụghị n’ụlọikwuu ma ọ bụ n’ụlọ nsọ. N’agbanyeghị na a kpagburu ha, ha enweekwa ihe isi ike ndị ọzọ, ha na-eji abụ eto Chineke.

11 Pọl onyeozi gbara ụmụnna ya bụ́ Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi ume, sị: “Jirinụ abụ ọma na otuto a na-enye Chineke na abụ ime mmụọ na amara na-ezi ibe unu ihe.” (Kọl. 3:16) Mgbe a tụrụ Pọl na Saịlas mkpọrọ, ha malitere ‘ikpe ekpere ma jiri abụ na-eto Chineke,’ n’agbanyeghị na ha ejighị akwụkwọ abụ. (Ọrụ 16:25) Abụ Alaeze anyị ole ka ị ga-abụli n’ejighị akwụkwọ abụ ma ọ bụrụ na a tụọ gị mkpọrọ?

12. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị ghọtara uru abụ Alaeze anyị bara?

12 Ebe ọ bụ na abụ bara ezigbo uru n’ofufe anyị na-efe Jehova, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-ewere ya ka ihe dị ezigbo mkpa? M̀ na-agba mbọ bịarute ọmụmụ ihe, mgbakọ sekit ma ọ bụ ụbọchị mgbakọ pụrụ iche, na mgbakọ distrikti tupu a malite, ka m wee soro ụmụnna m bụọ abụ mmeghe? M̀ na-ejikwa obi m dum abụ ya? M̀ na-agwa ụmụ m na mgbe a na-abụ abụ e ji amalite Nzukọ Ije Ozi ma e nwechaa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, abụghị mgbe ha kwesịrị isi n’oche ha pụọ, ikekwe gaa ka ha gbatịa ụkwụ, nakwa na ha ekwesịghị ime otú a ma e kwuchaa Okwu Ihu Ọha chọọ ịmalite Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche?’ Ịbụ abụ so n’ofufe anyị na-efe Jehova. Ma ànyị ‘bụ́ ọkà’ n’ịbụ abụ ma ànyị “na-amụ amụ,” anyị niile nwere ike iji otu olu na-eto Jehova, anyị kwesịkwara ime otú ahụ.—Tụlee 2 Ndị Kọrịnt 8:12.

Ka Oge Na-aga Ka Mkpa Anyị Na-agbanwe

13, 14. Olee uru iji obi anyị niile na-abụ abụ n’ọmụmụ ihe bara? Nye ihe atụ.

13 Ihe karịrị otu narị afọ gara aga, Ụlọ Nche, nke a na-akpọ Zion’s Watch Tower n’oge ahụ, kwuru otu n’ime ihe ndị na-egosi na abụ Alaeze anyị dị ezigbo mkpa. Ọ sịrị: “Iji eziokwu ndị anyị na-amụta abụ abụ bụ ụzọ magburu onwe ya ndị Chineke nwere ike isi mee ka eziokwu ahụ bamie n’uche ha nakwa n’obi ha.” Ọ bụ n’Akwụkwọ Nsọ ka e si nweta ọtụtụ n’ime ihe ndị e dere n’abụ anyị, n’ihi ya, ịmata ihe ndị e dere n’ụfọdụ n’ime abụ ndị a bụ ụzọ magburu onwe ya anyị si eme ka eziokwu Baịbụl bamie n’obi anyị. Otú ọgbakọ si eji obi ha niile abụ abụ na-agbakarị ndị ọ bụ nke mbụ ha bịara ọmụmụ ihe anyị ume.

14 N’otu uhuruchi n’afọ 1869 ka C. T. Russell na-alọta ọrụ, ọ nụrụ olu ndị nọ n’otu ụlọ na-abụ abụ. N’oge ahụ, obi ya niile bụ na ya agaghị amatali eziokwu banyere Chineke. N’ihi ya, o kpebiri iji oge ya niile na-achụ ego. O chere na ọ bụrụ na ya enwetatụ ego na ya ga-egboro ndị mmadụ mkpa ha, a sịgodị na ya enweghị ike inyere ha aka ịmata eziokwu banyere Chineke. Nwanna Russell banyere n’ụlọ ahụ gbara itiri nke na-adịghị ọcha ma chọpụta na a nọ ebe ahụ amụ Baịbụl. Ọ nọdụrụ ala wee gewe ntị. O mechara dee na ‘ihe Chineke mere ka ya nụ n’abalị ahụ mere ka ya maliteghachi inwe okwukwe na Baịbụl bụ Okwu Chineke.’ Cheta na ọ bụ abụ a nọ na-abụ mere Nwanna Russell ji gaa ọmụmụ ihe ahụ.

15. Olee nghọta ọhụrụ ndị e nwere nke mere ka ọ dị mkpa ka anyị nwee akwụkwọ abụ ọhụrụ?

15 Ka oge na-aga, anyị na-aghọtakwu amaokwu dị iche iche dị na Baịbụl nke ọma. Ilu 4:18 kwuru, sị: “Ụzọ ndị ezi omume yiri ìhè nke na-enwupụ enwupụ ka chi na-abọwanye ruo mgbe chi bọchara.” Ìhè nke na-enwupụ enwupụ emeela ka e metụ mgbanwe n’otú anyị si ‘abụ eziokwu ndị ahụ.’ Kemgbe iri afọ abụọ na ise, Ndịàmà Jehova na-eji akwụkwọ abụ bụ́ Sing Praises to Jehovah abụ abụ n’ọtụtụ mba. * Kemgbe e wepụtara akwụkwọ abụ ahụ, ìhè enwukwuola, anyị aghọtakwuola ihe ụfọdụ, a gbanwekwaala otú anyị si ekwu okwu ụfọdụ dị n’akwụkwọ abụ ahụ. Dị ka ihe atụ, anyị anaghịzi ekwu “usoro ọhụrụ,” ihe anyị na-ekwuzi bụ “ụwa ọhụrụ.” Anyị na-ekwuzi na a ‘ga-edo aha Jehova nsọ,’ ọ bụghị na a ‘ga-ewepụ ya n’ụta.’ O doro anya na e kwesịrị iwepụta akwụkwọ abụ ọhụrụ n’ihi ihe ndị a anyị na-akụzi.

16. Olee otú akwụkwọ abụ ọhụrụ anyị ga-esi nyere anyị aka ime ihe Pọl kwuru ná Ndị Efesọs 5:19?

16 N’ihi ihe ndị a na ihe ndị ọzọ, Òtù Na-achị Isi kwadoro ka e wepụta akwụkwọ abụ ọhụrụ bụ́ Bụkuo Jehova Abụ. Abụ niile dị n’akwụkwọ abụ ọhụrụ a dị otu narị na iri atọ na ise. Ebe ọ bụ na abụ ndị anyị ga-amụ dị ole na ole, anyị ga-enwezi ike iburu ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ụfọdụ n’ime ha n’isi. Nke a kwekọrọ na ndụmọdụ Pọl nyere ná Ndị Efesọs 5:19.—Gụọ.

I Nwere Ike Igosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Abụ Ndị Ahụ

17. Olee ihe ndị nwere ike inyere anyị aka ka ihere iso na-abụ abụ n’ọmụmụ ihe ghara ime anyị?

17 Ànyị kwesịrị ikwe ka ihere mee ka anyị ghara ịbụ abụ n’ọmụmụ ihe? Weregodị okwu anyị na-ekwu ekwu dị ka ihe atụ, ọ́ bụghị eziokwu na “anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro”? (Jems 3:2) Ma, anyị anaghị ekwe ka ngọngọ anyị na-asụ n’okwu mee ka anyị ghara ito Jehova site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Gịnịzi ga-eme ka anyị jiri maka na anyị amaghị abụ abụ nke ọma ghara ibuku Chineke abụ otuto? Jehova, bụ́ onye “nyere mmadụ ọnụ,” na-enwe obi ụtọ ka ọ na-ege ntị mgbe anyị na-abụku ya abụ otuto.—Ọpụ. 4:11.

18. Kwuo otú mmadụ nwere ike isi mụta abụ ọhụrụ anyị.

18 E wepụtala Siidii bụ́ Bụkuo Jehova Abụ—Nke E Ji Ọnụ Bụọ n’asụsụ ụfọdụ. E ji ụda egwú ndị mara mma bụọ abụ ọhụrụ ndị ahụ. Otú e si bụọ abụ ndị ahụ dị nnọọ ụtọ. Na-akpọ ha mgbe niile; nke a ga-eme ka ị mata okwu ụfọdụ e ji bụọ abụ ụfọdụ dị n’abụ ọhụrụ anyị. N’ihi otú e si dee abụ ndị ahụ, ọ bụrụ na ị bụọ otu ahịrị, i nwere ike ịma ihe ọzọ ga-eso ya. N’ihi ya, mgbe ị na-akpọ abụ ndị ahụ na Siidi, gbalịa soro na-abụ ha? Ọ bụrụ na ị mụta abụ ndị ahụ n’ụlọ, o doro anya na ị ga-ejikwu obi ike na-abụ abụ n’ọmụmụ ihe.

19. Olee otú e si ewepụtara anyị abụ Alaeze ndị e tinyere ụda egwú dị iche iche?

19 O nwere ike ịdị mfe ka mmadụ ghara iji abụ ndị a na-akpọ n’ụbọchị mgbakọ pụrụ iche, mgbakọ sekit, na mgbakọ distrikti akpọrọ ihe. Ọ bụghị obere ihe ka ọ na-ewe iji hazie ha. Ọ bụrụ na a họrọ abụ ndị a ga-abụ, a na-elezi anya depụta ha ka iri mmadụ isii na anọ na-abụrụ Nzukọ Jehova abụ wee bụọ ha. Ndị a na-abụ abụ na-eji ọtụtụ awa amụgharị abụ ndị ha ga-abụ ma mechaa gaa tinye ha na teepụ n’ụlọ egwú anyị dị na Patasịn, Niu Yọk. Mmadụ iri n’ime ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ndị a ebighị n’Amerịka. Ma, ha weere na ọ bụ ihe ùgwù iso rụọ ọrụ n’abụ ndị mara mma anyị na-abụ. Anyị kwesịrị igosi na obi dị anyị ụtọ n’ọrụ a niile ha na-arụ. Ọ bụrụ na onyeisi oche nnọkọ agwa anyị mgbe ọ bụla anyị bịara mgbakọ ka anyị bịa nọrọ ọdụ, anyị kwesịrị ịnọrọ ọdụ ozugbo ma nọrọ nwayọọ mgbe anyị na-egere abụ olu ụtọ ndị a na-akpọrọ anyị.

20. Gịnị ka i kpebiri ime?

20 Jehova na-ege ntị mgbe anyị na-abụku ya abụ otuto. Ọ chọrọ ka anyị na-abụku ya abụ otuto. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-abụ abụ mgbe ọ bụla anyị zukọrọ ife Jehova ofufe, anyị ga-eme ka obi ya ṅụrịa. Ma ànyị bụ́ ọkà n’ịbụ abụ ma ànyị na-amụ amụ, ka anyị niile ‘bụkuo Jehova abụ’!—Ọma 104:33.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 1 Ọ dị mma ịmara na otu puku afọ ka Devid nwụchara, ìgwè ndị mmụọ ozi gwara ndị ọzụzụ atụrụ, bụ́ ndị na-elekọta atụrụ ha n’ọhịa ndị dị nso na Betlehem, na a mụọla Mesaya.—Luk 2:4, 8, 13, 14.

^ par. 15 E nwere abụ ahụ nke dị narị abụ abụọ na iri abụọ na ise n’ihe karịrị otu narị asụsụ.

Gịnị Ka I Chere?

• N’oge ochie, olee ihe ndị gosiri na abụ bara uru n’ofufe a na-efe Chineke?

• Olee ihe ị chọpụtara jikọrọ ime ihe Jizọs kwuru na Matiu 22:37 na anyị iji obi anyị niile na-abụ abụ Alaeze?

• Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ maka abụ Alaeze anyị?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Ị̀ na-agwa ụmụ gị ka ha ghara isi n’oche ha pụọ n’ihi ihe na-enweghị isi mgbe a na-abụ abụ?

[Foto dị na peeji nke 24]

Ị̀ na-amụ abụ ọhụrụ anyị n’ụlọ?