Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Jenesis isi isii amaokwu atọ kwuru, sị: “Mmụọ m agaghị enwere mmadụ ndidi ruo mgbe a na-akaghị aka n’ihi na ya onwe ya bụ anụ ahụ́. N’ihi ya, ụbọchị ya ga-adị otu narị afọ na iri abụọ.” Ihe Jehova na-ekwu ọ̀ bụ na afọ ndụ ụmụ mmadụ ga-abụzi otu narị afọ na iri abụọ? Ọ̀ bụ otu narị afọ na iri abụọ ka Noa ji kwusaa banyere Iju Mmiri ahụ?

Azịza nke ajụjụ abụọ a bụ mba.

Tupu e nwee Iju Mmiri ahụ, e nwere ọtụtụ mmadụ ndị biri ndụ ọtụtụ narị afọ. Noa dị narị afọ isii mgbe e nwere Iju Mmiri ahụ, ọ nwụrụ mgbe ọ dị narị afọ itoolu na iri ise. (Jen. 7:6; 9:29) Ụfọdụ n’ime ndị a mụrụ mgbe e nwechara Iju Mmiri ahụ nọfere otu narị afọ na iri abụọ. Apakshad nwụrụ mgbe ọ dị narị afọ anọ na iri atọ na asatọ, Shila anwụọkwa mgbe ọ dị narị afọ anọ na iri atọ na atọ. (Jen. 11:10-15) Ma, ka ọ na-erule mgbe Mozis nọ ndụ, afọ ndụ ụmụ mmadụ bụzi iri afọ asaa ma ọ bụ iri afọ asatọ. (Ọma 90:10) N’ihi ya, Jenesis 6:3 anaghị ekwu afọ ole ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ma ọ bụkwanụ na afọ ndụ ha ga-abụ otu narị na iri abụọ.

Amaokwu ahụ ọ̀ na-ekwu banyere aka ná ntị Chineke gwara Noa ka ọ dọọ ndị mmadụ banyere mbibi ga-abịa ma otu narị afọ na iri abụọ gafee? Mba. Chineke gwara Noa okwu ọtụtụ mgbe. Amaokwu nke iri na atọ kwuru, sị: “Chineke sịrị Noa: ‘Ahụla m na ọgwụgwụ nke anụ ahụ́ niile eruwo, n’ihi na ụwa jupụtara n’ime ihe ike n’ihi ha.’” Noa ji afọ ndị sochirinụ rụchaa ụgbọ ahụ, nke bụ́ nnukwu ọrụ. N’oge ahụ, “Jehova sịrị Noa: ‘Banye n’ụgbọ ahụ, gị na ezinụlọ gị dum.’” (Jen. 6:13; 7:1) E nwekwara oge ndị ọzọ Jehova gwara Noa ihe ndị ọ ga-eme.—Jen. 8:15; 9:1, 8, 17.

Ma, ihe e kwuru na Jenesis 6:3 dị iche; ọ kpọghị Noa aha ma ọ bụkwanụ kwuo na ọ bụ ya ka Chineke na-agwa okwu. E nwere ike ikwu na ihe Chineke kwuru bụ nzube ya ma ọ bụ ihe ọ chọrọ ime. (Tụlee Jenesis 8:21.) Anyị ekwesịghị ichefu na mgbe Akwụkwọ Nsọ na-akọ ihe ndị mere ogologo oge tupu e kee Adam, o kwuru ihe ndị dị ka: “Chineke wee sị.” (Jen. 1:6, 9, 14, 20, 24) O doro anya na ọ bụghị mmadụ nọ n’ụwa ka Chineke na-agwa okwu, n’ihi na e kebeghị mmadụ mgbe ahụ.

N’ihi ya, o ziri ezi ikwu na Jenesis 6:3 na-ekwu ihe Chineke kpebiri ime iji kwụsị ihe ọjọọ a na-eme n’ụwa n’oge ahụ. Jehova kpebiri na ya ga-eme nke a ma otu narị afọ na iri abụọ gafee, n’agbanyeghị na Noa amabeghị banyere ya. Ma, gịnị mere Chineke ji nye ogologo oge hà otú ahụ? Gịnị mere ọ ga-eji chere ogologo oge hà otú ahụ?

Pita onyeozi gwara anyị ihe kpatara ya. Ọ sịrị: “Chineke ji ndidi na-echere n’ụbọchị Noa, mgbe a nọ na-ewu ụgbọ ahụ nke e ji buru mmadụ ole na ole, ya bụ, mkpụrụ obi asatọ, gafee mmiri ahụ n’enweghị ihe mere ha.” (1 Pita 3:20) N’eziokwu, mgbe Chineke kpebiri ihe ọ ga-eme ma otu narị afọ na iri abụọ gafee, a ka nwere ọrụ ndị a ga-arụ. Mgbe ihe dị ka iri afọ abụọ gafere, Noa na nwunye ya malitere ịmụ ụmụ. (Jen. 5:32; 7:6) Ụmụ atọ ha mụrụ tolitere wee lụọ nwaanyị, nke mere ka ezinụlọ ha ruo “mkpụrụ obi asatọ.” Ha ga-emecha wuo nnukwu ụgbọ, nke bụ́ nnukwu ọrụ ma anyị cheta na ọ bụ mmadụ ole na ole nọ n’ezinụlọ Noa. N’eziokwu, ndidi Chineke nwere otu narị afọ na iri abụọ mere ka e nwee ike imecha ihe a niile, meekwa ka e nwee ike ịzọpụta ndụ, ya bụ, o mere ka mmadụ asatọ kwesịrị ntụkwasị obi “gafee mmiri ahụ n’enweghị ihe mere ha.”

Baịbụl ekwughị kpọmkwem afọ Jehova nọ gwa Noa mgbe a ga-enwe Iju Mmiri ahụ. Ebe ọ bụ na Noa amụọla ụmụ, ha etookwa lụọ nwaanyị, ọ ga-abụ na ọ fọrọ iri afọ anọ ma ọ bụ iri afọ ise ka e nwee Iju Mmiri ahụ. Jehova gwaziri Noa sị: “Ahụla m na ọgwụgwụ nke anụ ahụ́ niile eruwo.” Ọ gwakwara Noa ka o wuo nnukwu ụgbọ ma kpọrọ ezinụlọ ya banye na ya. (Jen. 6:13-18) Ihe Noa ji ọtụtụ iri afọ ndị ọzọ mee abụghị naanị ibi ndụ dị mma. Ọ bụ “onye na-ekwusa ezi omume,” bụ́ onye nwere ozi doro anya ọ ga-ezi ndị mmadụ, ya bụ, mkpebi Chineke mere ibibi ndị na-anaghị erubere ya isi n’ụwa n’oge ahụ. Noa amaghị afọ Chineke ga-eme nke a, ma, ọ ma na ọ ga-emerịrị ya. Ị makwanụ na o mere ya.—2 Pita 2:5.