Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iden—Ọ̀ Bụ Ebe Mbụ Ụmụ Mmadụ Biri?

Iden—Ọ̀ Bụ Ebe Mbụ Ụmụ Mmadụ Biri?

Iden—Ọ̀ Bụ Ebe Mbụ Ụmụ Mmadụ Biri?

WEREGODỊ ya na ị nọ n’otu ubi a gbara ogige. O nweghị ihe na-adọpụ uche gị, ị naghị anụ ụzụ a na-anụkarị n’obodo ndị mepere emepe. Ubi a buru ibu, udo dịkwa na ya. Nke kadị nke bụ na i nweghị nchegbu ọ bụla, o nweghị ọrịa ma ọ bụ ihe mgbu na-enye gị nsogbu, o nweghịkwa ihe ahụ́ gị na-asọ. Ihe niile dị gị n’ahụ́ na-arụ ọrụ nke ọma nke mere ahụ́ ji ruo gị ala n’ebe a.

Ebe mbụ anya gị gara bụ n’okooko osisi ndị tụrụ àgwà mara mma, ebe ọzọ abụrụ n’osimiri ndị na-enwu gbaa, nakwa n’ọtụtụ akwụkwọ osisi na ahịhịa ndị na-acha nnọọ ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ ka anwụ na-acha ha. Ikuku ndụ na-ekusa gị n’ahụ́, gị ana-anụkwa ísì ụtọ ọ na-ebusa. Ị na-anụ ụda akwụkwọ osisi ndị ikuku na-ebugharị, ụda mmiri osimiri nke na-akụ n’okwute, ubé na abụ nnụnụ, nakwa ubé ụmụ ahụhụ ndị nọ n’ọrụ. Ka i ji anya nke uche gị na-ahụ ebe ahụ, ọ́ naghị agụ gị agụụ ịnọ na ya?

Ndị bi ebe dị iche iche n’ụwa kweere na ọ bụ n’ebe dị otú ahụ ka ụmụ mmadụ malitere ndụ. Kemgbe ọtụtụ narị afọ, a kụzierela ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu, ndị Krisendọm, na ndị Alakụba banyere ogige Iden, bụ́ ebe Chineke tinyere Adam na Iv ka ha biri. Baịbụl kwuru na ha biri n’udo ma nwee obi ụtọ n’ebe ahụ. Ha na ụmụ anụmanụ dị n’udo, ha na Chineke, bụ́ onye ji obiọma nye ha olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ebe obibi ahụ mara mma, dịkwa n’udo.—Jenesis 2:15-24.

Ndị Hindu kwekwaara na paradaịs oge ochie n’ụdị nke ha. Ndị na-ekpe okpukpe Budha kweere na ndị ndú ha a ma ama, bụ́ ndị a na-akpọkwa Budha, malitere ịdị ndụ n’oge ochie mgbe ụwa dị ka paradaịs. Ọtụtụ okpukpe dị n’Afrịka na-akọ akụkọ ndị yiri nnọọ akụkọ Adam na Iv.

N’eziokwu, a na-akọ banyere paradaịs nke oge gboo n’ọtụtụ okpukpe na n’omenala dị iche iche. Otu onye edemede kwuru, sị: “Ọtụtụ obodo kweere na n’oge ochie, e nwere paradaịs nke zuru okè, bụ́ ebe e nwere nnwere onwe, udo, obi ụtọ, ụba ihe oriri, ebe a na-enweghịkwa nchekasị, esemokwu, nakwa ebe a na-anaghị amanye mmadụ ime ihe ọ na-achọghị ime. . . . Nkwenkwe a emeela ka ma onye ukwu ma onye nta nwee mmasị na paradaịs ahụ furu efu ha na-echefubeghị, nke na-agụsikwa ha agụụ ike inwetaghachi.”

Ọ̀ ga-abụ na akụkọ niile ahụ si n’otu ebe? Ò nwere ike ịbụ na ‘ihe ahụ ma onye ukwu ma onye nta nwere mmasị na ya’ bụ ihe mere eme ha na-echeta echeta? Ọ̀ bụ eziokwu na e nwere ebe bụ́ ogige Iden n’oge ochie nakwa na Adam na Iv dịrị adị n’ezie?

Ndị na-arụ Baịbụl ụka na-akatọ ozizi ahụ. N’oge a ụwa meperela anya, ọtụtụ ndị na-eche na akụkọ ndị dị otú ahụ bụ naanị akụkọ ifo. Ọ bụ ihe ijuanya na ọ bụghị naanị ndị na-ekweghị na Chineke na-arụ Baịbụl ụka. Ọtụtụ ndị ndú okpukpe na-eme ka ndị mmadụ ghara ikwere na e nwere mgbe e nwere ogige Iden. Ha na-ekwu na ọ dịghị mgbe e nwere ebe dị otú ahụ. Ha na-ekwu na akụkọ Iden bụ ihe atụ, akụkọ ifo, ma ọ bụ ilu.

N’ezie, e nwere ilu na Baịbụl. Ọ bụ Jizọs tụrụ ilu ndị a kacha mara amara na ya. Ma, Baịbụl kọrọ akụkọ Iden dị ka akụkọ mere eme doro anya, ọ bụghị dị ka ilu. Ma, ọ bụrụ na ihe ahụ Baịbụl kọrọ banyere Iden emeghị eme, oleezi otú a ga-esi tụkwasị ihe ndị ọzọ ọ kọrọ obi? Ka anyị tụlee ihe mere ụfọdụ ndị ji agba akụkọ ogige Iden ụkwụ ma hụ ma ihe ha na-ekwu ò rijuru afọ. Anyị ga-atụlekwa ihe mere akụkọ ahụ ji kwesị ịgbasa onye ọ bụla n’ime anyị.