Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee ihe mere Setan ji jiri agwọ gwa Iv okwu?

Olee ihe mere Setan ji jiri agwọ gwa Iv okwu?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Olee ihe mere Setan ji jiri agwọ gwa Iv okwu?

▪ O nwere ike ịbụ na i kweere ihe ahụ a kọwara na peeji nke 8 nke bụ́ na ọ bụ Setan ji agwọ ahụ gwa Iv okwu. Nke a bụ nnọọ ihe Baịbụl na-akụzi. Ma, o nwere ike ịbụ na ị na-eche, sị, ‘Olee ihe mere mmụọ dị ike ga-eji jiri agwọ rụọ ọrụ otú ahụ ndị na-eme ihe egwuregwu nwere ike ime ka o yie ka ihe na-adịghị ndụ ọ̀ na-ekwu okwu?’

Baịbụl kpọrọ otú Setan si enweta ndị mmadụ “atụmatụ aghụghọ.” Ihe a mere n’Iden nyekwaara anyị aka ịghọta na nke ahụ bụ eziokwu. (Ndị Efesọs 6:11) Ihe ahụ mere n’Iden abụghị akụkọ ifo banyere anụmanụ na-ekwu okwu; ọ bụ ihe na-awụ akpata oyi n’ahụ́ nke na-egosi otú e nwere ike isi jiri akọ kpaa nkata iji mee ka ụmụ mmadụ gbakụta Chineke azụ. Olee otú o si dị otú ahụ?

Setan ji nlezianya họrọ onye ọ ga-aghọgbu. Ọ bụ Iv kacha bụrụ nwata n’ihe niile nwere ọgụgụ isi Chineke kere n’eluigwe na ụwa. Ebe ọ na-enwebeghị amamihe buru ibu, Setan họọrọ iduhie ya. Setan ji akọ zochie ịka anya na oké ọchịchọ ya site n’izo n’azụ agwọ, bụ́ anụ dị nnọọ akọ. (Jenesis 3:1) Tụleekwa uru ọ baara ya ime ka o yie ka agwọ ọ̀ na-ekwu okwu.

Nke mbụ, Setan dọtara mmasị Iv ma mee ka o gewe ya ntị. Ọ maara na agwọ anaghị ekwu okwu; ọ bụ di ya gụrụ ụmụ anụmanụ niile aha, ọ bụkwa ya gụrụ anụmanụ a aha ya, ikekwe mgbe ọ mụtachara nnọọ otú anụmanụ a si akpa àgwà. (Jenesis 2:19) O doro anya na Iv ahụla anụmanụ a dị akọ. N’ihi ya, ihe a Setan mere kpaliri mmasị Iv; o mere ka o lekwasị anya n’otu ihe a machibidoro iwu n’ihe niile dị n’ogige ahụ. Nke abụọ, ọ bụrụ na agwọ ahụ nọ n’alaka osisi ahụ a machibidoro iwu, olee ihe Iv nwere ike iche? Ó nweghị ike ichewe na ọ ga-abụ na anụmanụ a dị ala, nke na-anaghị ekwu okwu, eriela mkpụrụ osisi ahụ nwezie ike ikwu okwu? Ọ bụrụ na mkpụrụ osisi ahụ ga-emere agwọ ahụ ihe há otú ahụ, ọ́ gaghị emere nwaanyị ahụ ihe karịrị nnọọ nke ahụ? Anyị ejighị n’aka ihe Iv chere ma ọ bụ ma agwọ ahụ ọ̀ tatụrụ mkpụrụ osisi ahụ, ma anyị maara na mgbe agwọ ahụ gwara Iv na mkpụrụ osisi ahụ ga-eme ka ọ dị “ka Chineke,” ọ dịla njikere ikwere ụgha ahụ.

Ihe Setan họọrọ ịgwa Iv nwekwara ọtụtụ ihe o gosiri. O mere ka Iv nwewe obi abụọ, mee ka o chee na Chineke na-ezoro ya ezi ihe nakwa na ọ ma ụma na-akpachi ya akpachi. Ihe ga-eme ka atụmatụ Setan gaziere ya bụ na ọ tụrụ anya na Iv ga-achọwa ọdịmma onwe ya karịa igosi Chineke nke nyere ya ihe niile o nwere na ọ hụrụ ya n’anya. (Jenesis 3:4, 5) Ọ dị mwute na ihe ahụ Setan tụrụ anya ya mere; ma Adam ma Iv adịghị nke hụrụ Jehova n’anya ma nwee mmasị n’ebe ọ nọ otú ha kwesịrị. Setan ọ́ naghị eme taa ka ndị mmadụ chọwa ọdịmma onwe ha ma chewe na echiche ha ziri ezi?

Oleekwanụ ihe bụ́ ebumnobi Setan? Olee ihe ọ chọrọ inweta? N’Iden, ọ nwara izochi ụdị onye ọ bụ na ebumnobi ya. Ma, ka oge na-aga, o gosiri ụdị onye ọ bụ n’ezie. Mgbe ọ nwara Jizọs ọnwụnwa, ọ maara nnọọ na ọ gaghị ezochiliri Jizọs ụdị onye ọ bụ. N’ihi ya, ọ gwara Jizọs hoo haa, sị: “Daa n’ala fee m ofufe.” (Matiu 4:9) O doro anya na ọ dịla anya ọ gụwara Setan iweghara ofufe a na-efe Jehova Chineke. O nweghị ihe ọ na-agaghị eme iji mee ka ndị mmadụ ghara ife Chineke ma ọ bụ merụọ ofufe ha. Ọ na-atọ ya ụtọ imebi ikwesị ntụkwasị obi nke ndị na-efe Chineke.

N’ezie, Baịbụl gosiri na Setan nwere nnọọ nkà n’iji aghụghọ emezu ebumnobi ya. Obi dị anyị ụtọ na ọ gaghị adịrị ya mfe ịghọgbu anyị otú ọ ghọgburu Iv, “n’ihi na anyị abụghị ndị na-amaghị atụmatụ ya.”—2 Ndị Kọrịnt 2:11.