Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Tachiri Obi n’Agbanyeghị na Ihe Agaghị Otú Ọ Tụrụ Anya Ya

Ọ Tachiri Obi n’Agbanyeghị na Ihe Agaghị Otú Ọ Tụrụ Anya Ya

Ṅomie Okwukwe Ha

Ọ Tachiri Obi n’Agbanyeghị na Ihe Agaghị Otú Ọ Tụrụ Anya Ya

SAMUEL hụrụ uju a na-eru na Shaịlo. Ọ fọrọ nke nta ka o yie ka obodo ahụ niile ọ̀ nọ n’ákwá. N’ụlọ ole ka mkpu ụmụ nwaanyị na ụmụaka si na-ada, bụ́ ndị na-eru uju maka nna ha, di ha, ụmụ ha ndị nwoke, na ụmụnne ha ndị nwoke na-agaghị alọta? Naanị ihe anyị maara bụ na ndị Filistia emeriela ndị agha Izrel ajọ mmeri ma gbuo puku mmadụ iri atọ n’ime ha n’oge na-adịghị anya ha gbuchara puku mmadụ anọ n’ime ha n’agha ọzọ ha lụrụ.—1 Samuel 4:1, 2, 10.

Nke ahụ bụ naanị otu n’ime ọtụtụ ọdachi dakwasịrị ha. Nnukwu onye nchụàjà bụ́ Ilaị nwere ajọ ụmụ abụọ aha ha bụ Họfnaị na Finihas, bụ́ ndị si na Shaịlo buru igbe ọgbụgba ndụ dị nsọ. A na-edebekarị Igbe ahụ, bụ́ ihe dị oké ọnụ ahịa na-anọchi anya ọnụnọ Chineke, n’ebe dị nsọ n’ụlọikwuu ahụ, bụ́ ụlọ nsọ nke yiri ụlọikwuu. Ndị Izrel mere iberiibe buru Igbe ahụ gaa agha, chee na ọ ga-arụ ọrụ ka ọtụmọkpọ ma mee ka ha merie. Ma, ndị Filistia buuru Igbe ahụ, gbuo Họfnaị na Finihas.—1 Samuel 4:3-11.

Ọ bụ n’ụlọikwuu ahụ dị na Shaịlo ka Igbe ahụ dị kemgbe ọtụtụ narị afọ. Ugbu a ọ dịkwaghị. Mgbe Ilaị, bụ́ onye dị iri afọ itoolu na asatọ, nụrụ ihe merenụ, ọ dalara azụ n’oche ya ma nwụọ. Nwunye nwa ya, bụ́ onye di ya nwụrụ n’ụbọchị ahụ, nwụrụ mgbe ọ na-amụ nwa. Tupu ya ekubie ume, o kwuru, sị: “Ebube esiwo n’Izrel pụọ gaa ná mba ọzọ.” N’ezie, Shaịlo emekataghị dị otú ọ dịbu.—1 Samuel 4:12-22.

Olee otú Samuel ga-esi die ihe ndị a ọ na-atụtụghị anya ha merenụ? Okwukwe ya ọ̀ ga-enyeliri ya aka inyere ndị ya Jehova gbakụtarala azụ ma kwụsị ichebe aka? Mgbe ụfọdụ, ihe isi ike na ihe ndị anyị na-atụghị anya ha na-abịara anyị niile ma maa okwukwe anyị aka, n’ihi ya, ka anyị tụlee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Samuel.

O ‘Mezuru Ezi Omume’

Akụkọ Baịbụl ahụ hapụtụgodịrị akụkọ Samuel ma kọwazie banyere Igbe nsọ ahụ, gosi anyị otú ndị Filistia si taa ahụhụ n’ihi iburu ya na otú e si manye ha ibughachi ya. Mgbe ọzọ a kọọrọ anyị banyere Samuel, ihe dị ka iri afọ abụọ agafeela. (1 Samuel 7:2) Olee ihe ndị ọ nọ na-eme n’afọ ndị ahụ? Ọ dịghị anyị mkpa ichewe ya echewe.

Anyị mụtara na tupu oge a amalite, “okwu Samuel . . . na-eru Izrel dum ntị.” (1 Samuel 4:1) Akụkọ ahụ kwuru na mgbe oge ahụ gachara, Samuel na-aga eleta obodo atọ n’Izrel, na-agazu ha n’afọ ọ bụla, na-edozi esemokwu ma na-aza ndị mmadụ ajụjụ ha. Ọ na-alọtazi n’obodo ya na Rema. (1 Samuel 7:15-17) O doro anya na o nweghị mgbe Samuel na-anọ nkịtị, n’afọ iri abụọ ahụkwa, o nwere ọtụtụ ọrụ ọ rụrụ.

Omume rụrụ arụ na nrụrụ aka nke ụmụ Ilaị mere ka okwukwe ndị mmadụ daa mbà. O yiri ka nke ahụ ò mere ka ọtụtụ ndị fewe arụsị. Ma, mgbe Samuel rụsichara ọrụ ike afọ iri abụọ, o ziri ndị Izrel ozi, sị: “Ọ bụrụ na unu ji obi unu niile na-alọghachikwute Jehova, wepụnụ chi ndị mba ọzọ ndị dị n’etiti unu nakwa ihe oyiyi Ashtọret, meekwanụ ka obi unu dum dịrị n’ebe Jehova nọ, jeekwaranụ naanị ya ozi, ọ ga-anapụtakwa unu n’aka ndị Filistia.”—1 Samuel 7:3.

‘Aka ndị Filistia’ adịla arọ n’ahụ́ ndị Izrel. Ebe ndị Filistia meririla ndị agha Izrel, ha na-emegbu ndị Chineke otú ọ sọrọ ha. Ma Samuel mesiri ndị Izrel obi ike na ihe ga-agbanwe ma ọ bụrụ naanị na ha alaghachikwute Jehova. Hà dị njikere ime otú ahụ? Obi tọrọ Samuel ụtọ na ha wepụsịrị arụsị ha ma “malite ijere naanị Jehova ozi.” Samuel kpọkọtara ndị Izrel na Mizpa, bụ́ obodo bụ́ ugwu ugwu dị n’ebe ugwu Jeruselem. Ha zukọtara, buo ọnụ, ma si n’ọtụtụ mmehie ikpere arụsị ha mere chegharịa.—1 Samuel 7:4-6.

Ma, ndị Filistia nụrụ banyere nnukwu nzukọ ahụ, chee na ha enwetala ohere ha ga-eji mee ihe. Ha zigara ndị agha ha na Mizpa ka ha bibie ndị ahụ na-efe Jehova. Ndị Izrel nụrụ banyere ọdachi ahụ na-akụrụ ha aka n’ụzọ. Ha ji ụjọ rịọ Samuel ka o kpeere ha ekpere. O mere otú ahụ, chụọkwa àjà. Ka nnọkọ ahụ dị nsọ na-aga n’ihu, ndị agha Filistia wakporo Mizpa. Jehova zaziri ekpere Samuel. E nwere ike ikwu na Jehova ji égbé eluigwe gosi iwe ya. O “wee mee ka égbè eluigwe nke dara oké ụda gbaa n’ụbọchị ahụ, o wee tinye ndị Filistia n’ọgba aghara.”—1 Samuel 7:7-10.

Ànyị kwesịrị iche na ndị Filistia dị ka ụmụaka na-agbara aga ezo n’azụ nne ha n’ihi ụjọ mgbe obere égbè eluigwe gbara? Mbanụ, ha bụ ndị dike ma nke a na-akọ n’agha. Ya mere, ọ ga-abụrịrị na égbè eluigwe a dị iche na nke ọ bụla ha nụtụrụla. Ọ̀ bụ n’ihi otú o si daa “oké ụda”? Ò si n’eluigwe mmiri na-erughị daa, ka ò si n’ugwu daa na mberede? N’agbanyeghị ebe o si daa, ọ tụrụ ndị Filistia ahụ ụjọ. Mgbe ha nọ ná mgbagwoju anya, ndị ha na-achụ chụwaziri ha. Ndị ikom Izrel si na Mizpa nupụta, merie ha, chụrụ ha ruo ọtụtụ kilomita, ruo na ndịda ebe ọdịda anyanwụ Jeruselem.—1 Samuel 7:11.

Agha ahụ gbanwere ihe niile. Ndị Filistia nọ na-agbara ndị Izrel ọsọ n’oge niile Samuel bụ onyeikpe. Ndị Chineke nọgidere na-enwetaghachi obodo ndị a naara ha.—1 Samuel 7:13, 14.

Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, Pọl onyeozi kpọrọ Samuel aha mgbe ọ na-ekwu banyere ndị ikpe kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị ‘mezuru ezi omume.’ (Ndị Hibru 11:32, 33) N’ezie, Samuel nyere aka mee ka e mee ihe dị mma na ihe ziri ezi n’anya Chineke. Ọ nọgidere na-eme ihe ziri ezi n’ihi na o ji ndidi chere Jehova, jiri ikwesị ntụkwasị obi nọgide n’ọrụ ya n’agbanyeghị ihe ndị ọ na-atụghị anya ha merenụ. O kelekwara Chineke maka ihe ndị o meere ha. Mgbe ha merichara ndị iro ha na Mizpa, Samuel mere ka e guzobe otu nkume a ga-eji na-echeta aka Jehova nyeere ndị ya.—1 Samuel 7:12.

Ị̀ chọrọ ‘imezu ezi omume’? Ya bụrụ otú ahụ, ọ ga-adị mma ka ị mụta ihe na ndidi na obi umeala Samuel, ma mụta ikele Chineke ka ya. Ònye n’ime anyị ka àgwà ndị ahụ na-adịghị mkpa? Ọ dị mma na Samuel mụtara àgwà ndị dị otú ahụ ma na-akpa ha mgbe ọ ka bụ nwata, n’ihi na ihe ndị ka njọ ọ na-atụghị anya ha bịaara ya mgbe o mere agadi.

“Ụmụ Gị Adịghị Eje Ije n’Ụzọ I Jere”

Oge ọzọ a kọrọ banyere Samuel, ‘o meela agadi.’ Samuel enweela ụmụ nwoke abụọ torola eto n’oge a, bụ́ Joel na Abaịja, o nyekwara ha ọrụ inyere ya aka n’ikpe ikpe. Ma, ọ dị mwute na ha mechuru ya ihu. N’agbanyeghị na Samuel na-akwụwa aka ọtọ ma bụrụ onye ezi omume, ụmụ ya ji ọkwá ha na-achọ ọdịmma onwe ha, na-ekpe ikpe na-ezighị ezi ma na-eri ngarị.—1 Samuel 8:1-3.

Otu ụbọchị, ndị okenye Izrel bịakwutere onye amụma ahụ merela agadi ma mee mkpesa. Ha kwuru, sị: “Ụmụ gị adịghị eje ije n’ụzọ i jere.” (1 Samuel 8:4, 5) Samuel ọ̀ maara banyere nsogbu ahụ? Akụkọ ahụ ekwughị. Ma Samuel adịghị ka Ilaị. O doro anya na ọ bụ nna na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta. Jehova baara Ilaị mba ma taa ya ahụhụ n’ihi ịhapụ ụmụ ya ka ha mewe ihe ọjọọ, n’ihi ịsọpụrụ ha karịa Chineke. (1 Samuel 2:27-29) Ọ dịghị mgbe Jehova hụrụ ụdị ihe ahụ n’ebe Samuel nọ.

Akụkọ ahụ ekwughị banyere oké ihere, nchegbu, ma ọ bụ mwute Samuel nwere ozugbo ọ nụrụ banyere omume ọjọọ ụmụ ya. Ma, ọtụtụ ndị nne na nna nwere ike ịghọta otú obi dị ya mgbe ahụ. N’oge ọjọọ anyị bi na ya taa, ọtụtụ ụmụaka anaghị anabata ịbụisi na ịdọ aka ná ntị nke ndị mụrụ ha. (2 Timoti 3:1-5) Ihe nlereanya Samuel nwere ike ịkasi ndị nne na nna ụdị ihe mwute a bịaara obi ma duzie ha. Ọ dịtụghị mgbe Samuel kwere ka enweghị okwukwe nke ụmụ ya metụta ofufe ya. Cheta na ọ bụrụgodị na okwu na ịdọ aka ná ntị emeghị ka ụmụaka gbanwee ndụ ha, ezi ihe nlereanya ndị mụrụ ha ka nwere ike inyere ha nnọọ aka. Ndị mụrụ ụmụ nwekwara ohere mgbe niile ime ka obi na-atọ Nna nke ha, bụ́ Jehova Chineke, ụtọ—otú ahụ Samuel mere.

“Họpụtara Anyị Eze”

Ụmụ Samuel echetụdịghị echiche otú anyaukwu ha na ịchọ ọdịmma onwe ha ga-emetụtaru ndị ọzọ. Ndị okenye Izrel gara n’ihu ịgwa Samuel, sị: “Họpụtara anyị eze ga na-ekpe anyị ikpe dị ka mba niile ọzọ.” Arịrịọ a ò mere ka Samuel chee na ha ajụla ya? A sị ka e kwuwe, o kpeela ndị Izrel ikpe n’aha Jehova ruo ọtụtụ iri afọ. Ugbu a, ha chọrọ eze ga na-ekpe ha ikpe, ọ bụghị onye amụma nkịtị dị ka Samuel. Mba ndị gbara ha gburugburu nwere ndị eze, ndị Izrel chọkwara eze nke ha! Olee ihe Samuel mere? Akụkọ ahụ kwuru na “ihe ahụ dị njọ” n’anya ya.—1 Samuel 8:5, 6.

Lee ihe Jehova gwara Samuel mgbe Samuel gwara ya okwu ahụ n’ekpere: “Gee ntị n’olu ha n’ihe niile ha na-agwa gị; n’ihi na ọ bụghị gị ka ha jụrụ, kama ọ bụ m ka ha jụrụ ịbụ eze ha.” Okwu ahụ kasiri nnọọ Samuel obi ma gosi otú ndị Izrel ledaruru Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile anya! Jehova gwara onye amụma ya ka ọ dọọ ndị Izrel aka ná ntị banyere ihe inwe eze bụ́ mmadụ ga-efu ha. Mgbe Samuel gwara ha ihe Chineke kwuru, ha siri ọnwụ, sị: “Ee e, kama ọ bụ eze ga-achị anyị.” Ebe Samuel na-erubere Chineke isi mgbe niile, ọ gara tee eze Jehova họpụtara mmanụ.—1 Samuel 8:7-19.

Ma, olee otú Samuel si rube isi? Ò ji iwe rube isi iji mezuo iwu? Ò kwere ka ihe ndị ahụ ọ na-atụghị anya ha merenụ mebie ya obi, kwe ka obi na-ajọ ya njọ? Ọtụtụ ndị nwere ike ime otú ahụ, ma ọ bụghị Samuel. O tere Sọl mmanụ ma kweta na ọ bụ ya ka Jehova họọrọ. O susuru Sọl ọnụ, bụ́ ihe na-egosi na ọ nabatara eze ọhụrụ ahụ ma doo onwe ya n’okpuru ya. Ọ gwakwara ndị ya, sị: “Ùnu ahụwo onye Jehova họọrọ, na ọ dịghị onye dị ka ya n’etiti mmadụ niile?”—1 Samuel 10:1, 24.

Samuel elekwasịghị anya n’ebe onye ahụ Jehova họọrọ na-anaghị emezi emezi, kama o lekwasịrị anya n’ebe ọ na-emezi emezi. A bịa n’ebe ya onwe ya nọ, o lekwasịrị anya n’ozi o ji ikwesị ntụkwasị obi jeere Chineke, ọ bụghị n’ime ihe ga-atọ ndị ahụ na-anaghị akwụ otu ebe ụtọ. (1 Samuel 12:1-4) O jikwa ikwesị ntụkwasị obi rụọ ọrụ nke ya, na-adụ ndị Chineke ọdụ banyere ihe ndị nwere ike imebi ofufe ha ma gbaa ha ume ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ. Ndụmọdụ Samuel ruru ha n’obi, ha arịọkwa ya ka o kpeere ha ekpere. Lee ihe magburu onwe ya ọ zara ha: “Tụfịakwa! Mụ onwe m agaghị emehie Jehova site n’ịkwụsị ikpe ekpere maka unu; m ga-ezikwa unu ụzọ dị mma, nke ziri ezi.”—1 Samuel 12:21-24.

Ọ̀ dịla mgbe obi jọrọ gị njọ n’ihi na e nyere onye ọzọ ihe ùgwù ije ozi kama inye gị ya? Ihe nlereanya Samuel na-echetara anyị nnọọ na anyị ekwesịtụghị ikwe ka ekworo na obi ọjọọ gbanye mgbọrọgwụ n’obi anyị. Chineke nwere ọtụtụ ọrụ obi ụtọ na ọrụ bara uru onye nke ọ bụla n’ime ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi ga-arụrụ ya.

“Ruo Ole Mgbe Ka Ị Ga Na-eruru Sọl Uju?”

Samuel mere nke ọma ịhụ ebe Sọl na-emezi emezi; Sọl bụ nwoke pụrụ iche. O toro ogologo ma gbaa dimkpa, nweekwa obi ike ma dị nkọ n’ichepụta ihe, ma n’agbanyeghị nke ahụ, ọ dị umeala n’obi ná mmalite ma na-eweda onwe ya ala. (1 Samuel 10:22, 23, 27) E wezụga onyinye ndị ahụ o nwere, o nwere otu nke ọzọ magburu onwe ya—ikike ikpebiri onwe ya ihe ọ ga-eme, ikpebiri onwe ya ụdị ndụ ọ ga-ebi. (Diuterọnọmi 30:19) Ò ji onyinye ahụ mee ihe bara uru?

Ọ dị mwute ikwu na mgbe e nyere mmadụ ikike ọhụrụ, ya egbuwe ya ka mmanya, obi umeala bụ àgwà mbụ ọ na-ahapụkarị. N’oge na-adịghị anya, Sọl malitere ịdị mpako. Ọ họọrọ inupụrụ iwu Jehova ndị Samuel nyere ya isi. N’otu mgbe, Sọl enweghị ndidi ichere Samuel, n’ihi ya, ọ chụrụ àjà naanị Samuel kwesịrị ịchụ. Samuel baara ya ezigbo mba ma gwa ya na alaeze Izrel agaghị adịgide n’ezinụlọ ya. Kama ndụmọdụ ahụ ga-eme ka Sọl chegharịa, o nupụdịrị isi karịa.—1 Samuel 13:8, 9, 13, 14.

Jehova si n’ọnụ Samuel gwa Sọl ka o buso ndị Amalek agha. Otu n’ime iwu ndị Jehova nyere ya bụ ka o gbuo eze ọjọọ ha, bụ́ Egag. Ma, Sọl hapụrụ Egag na anụmanụ ndị kacha mma ha kwatara n’obodo ahụ ndụ. Mgbe Samuel bịara ịgbazi Sọl, Sọl gosiri otú àgwà ya gbanwerurula. Kama iji obi umeala nabata mgbazi ahụ, ọ malitere ikwu na ihe ahụ ya mere adịchaghị njọ, gbụrụwa isi ya, kwuwe ihe mere ihe o mere ji dị mma, hapụ ilekwasị anya n’ebe o mejọrọ ma nwaa ibulara ndị obodo ya ụta maka ihe ahụ merenụ. Mgbe Sọl nwara ileghara ịdọ aka ná ntị ahụ anya site n’ikwu na a chọrọ iji ụfọdụ ihe ndị ahụ a kwatara n’agha achụrụ Jehova àjà, Samuel kwuru okwu a a ma ama: “Lee! Irube isi dị mma karịa àjà.” Samuel ji obi ike baara nwoke a mba ma gwa ya mkpebi Jehova: A ga-adọkapụ ọchịchị Izrel n’aka Sọl ma nye ya onye ọzọ—onye ka ya mma.—1 Samuel 15:1-33.

Mmehie Sọl wutere Samuel nke ukwuu. O ji abalị ahụ dum besara Jehova ákwá banyere okwu ahụ. Ọ malitedịrị iruru Sọl uju. Samuel lere Sọl anya dị ka onye ga-aba ezigbo uru, onye nwere ọtụtụ àgwà ọma, ma ugbu a, olileanya ya akụọla afọ n’ala. Nwoke ahụ ọ mabu agbanweela—ọ hapụla àgwà ọma ndị o nwere ma na-emegidezi Jehova. Samuel jụrụ ịhụ Sọl anya ọzọ. Ma, ka oge ụfọdụ gasịrị, Jehova nyere Samuel obere ndụmọdụ a: “Ruo ole mgbe ka ị ga na-eruru Sọl uju, ebe ọ bụ na mụ onwe m ajụwo ya ka ọ ghara ịbụkwa eze Izrel? Gbajuo mpi gị mmanụ gawa. M ga-edunye gị ka ị gakwuru Jesi onye Betlehem, n’ihi na esiwo m n’etiti ụmụ ya ndị ikom họtara onwe m eze.”—1 Samuel 15:34, 35; 16:1.

Ekwesịghị ntụkwasị obi nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè anaghị egbochi nzube Jehova imezu. Ọ bụrụ na otu onye akwụsị ikwesị ntụkwasị obi, Jehova ga-ahọrọ onye ọzọ iji mezuo uche Ya. N’ihi ya, agadi nwoke ahụ bụ́ Samuel kwụsịrị iruru Sọl uju. Jehova gwara ya ka ọ gaa n’ụlọ Jesi na Betlehem, bụ́ ebe Samuel hụrụ ụmụ ya ndị mara nnọọ mma ile anya. Ma, malite n’onye nke mbụ, Jehova chetaara Samuel, sị: “Elela anya n’ọdịdị ya na ogo ya . . . N’ihi na ọ bụghị otú mmadụ si ahụ ihe ka Chineke si ahụ, n’ihi na mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ; ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.” (1 Samuel 16:7) N’ikpeazụ, Samuel hụrụ nwa ya nke ikpeazụ, ọ bụkwa onye a—bụ́ Devid—ka Jehova họọrọ!

Mgbe ọnwụ Samuel ruwere, ọ ghọtakwuru ihe mere mkpebi ahụ Jehova mere iji Devid dochie Sọl ji bụrụ ihe amamihe. Sọl malitere ikwo ajọ ekworo ma dapụ n’ezi ofufe. Ma, Devid gosipụtara àgwà ndị magburu onwe ha—obi ike, ikwesị ntụkwasị obi, okwukwe, na iguzosi ike n’ihe. Ka ọnwụ Samuel na-erukwu nso, okwukwe ya sikwuru ike. Ọ hụrụ na ọ dịghị ihe ọ bụla mmadụ na-atụghị anya ya nke bịaara ya ga-akarị Jehova idozi, ma ọ bụdị ịgbanwe ka ọ ghọọ ngọzi. N’ikpeazụ, Samuel nwụrụ, mgbe o bisịrị ndụ ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị afọ. Izrel dum ruuru nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi uju—nke ahụ ejughịkwa anyị anya! Ọbụna taa, ndị ohu Jehova ka kwesịrị ịjụ onwe ha n’otu n’otu, sị, ‘Àga m eṅomi okwukwe Samuel?’

[Foto dị na peeji nke 25]

Olee otú Samuel ga-esi nyere ndị ya aka idi ihe ọjọọ ndị mere ha na ọdachi ha na-atụghị anya ya dakwasịrị ha?

[Foto dị na peeji nke 26]

Olee otú Samuel si die mwute o nwere maka inwe ụmụ ọjọọ?