Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Jikerela Maka Ụbọchị Kacha Mkpa n’Afọ?

Ì Jikerela Maka Ụbọchị Kacha Mkpa n’Afọ?

Ì Jikerela Maka Ụbọchị Kacha Mkpa n’Afọ?

MGBE ọ fọrọ naanị awa ole na ole ka Jizọs nwụọ, o gosiri ụzọ pụrụ iche a ga-esi na-echeta ọnwụ ya. E mechara kpọwa ya “nri anyasị nke Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrịnt 11:20) Iji gosi na ncheta ahụ dị mkpa, Jizọs nyere iwu, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Luk 22:19) Ị̀ chọrọ irubere Jizọs isi? Ya bụrụ otú ahụ, ị ga-elenụ ụbọchị ncheta ọnwụ Jizọs anya ka ụbọchị kacha mkpa n’afọ.

Ma, olee kpọmkwem mgbe i kwesịrị icheta ọnwụ ya? Oleekwa otú i nwere ike isi jide n’aka na ị dị nnọọ njikere ịghọta ihe ncheta a dị mkpa pụtara? Onye Kraịst nke ọ bụla kwesịrị ichebasiri ajụjụ ndị a echiche ike.

Ugboro Ole Ka A Ga Na-eme Ya?

Anyị na-echetakarị ihe ndị dị mkpa merenụ otu ugboro n’afọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na ndị ndị ha nwụrụ mgbe ndị na-eyi ọha egwu wakporo Ebe Azụmahịa Ụwa na Niu Yọk na Septemba 11, 2001, na-echeta ebelebe ahụ gburunụ mgbe niile, mgbe ọ bụla o ruru ụbọchị ahụ n’afọ, ha na-ele ya anya ka ụbọchị pụrụ iche.

N’otu aka ahụ, n’oge Baịbụl, a na-echeta ihe ndị dị mkpa merenụ otu ugboro n’afọ. (Esta 9:21, 27) Jehova nyere ndị Izrel iwu ka ha na-echeta ọrụ ebube ọ rụrụ iji napụta ha n’ịgba ohu n’Ijipt otu ugboro n’afọ. Baịbụl kpọrọ ememme ahụ Ememme Ngabiga, ndị Izrel na-echetakwa ihe ahụ merenụ otu ugboro n’afọ kpọmkwem n’ụbọchị ahụ a zọpụtara ha.—Ọpụpụ 12:24-27; 13:10.

Jizọs na ndịozi ya ka mepụrụ Ememme Ngabiga mgbe o gosiri ha otú a ga-esi na-eri nri ahụ pụrụ iche a ga-eji na-echeta ọnwụ ya. (Luk 22:7-20) E mere Ememme Ngabiga otu ugboro n’afọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịghọta na ncheta ọhụrụ a ga-anọchi anya Ememme Ngabiga ahụ kwesịkwara ịbụ otu ugboro n’afọ. Ma, olee ụbọchị a ga na-eme ya?

Olee Mgbe A Ga-eme Ya?

Iji zaa ajụjụ ahụ, ọ dị anyị mkpa ịghọta ihe abụọ. Nke mbụ bụ na n’oge Baịbụl, ụbọchị na-amalite ná mgbede, mgbe anyanwụ dara, gwụkwa mgbe anyanwụ dara ná mgbede echi ya. N’ihi ya, ụbọchị na-amalite ná mgbede ma gwụ ná mgbede.—Levitikọs 23:32.

Nke abụọ bụ na kalenda e ji agụ oge taa abụghị nke e ji gụọ oge n’oge Baịbụl. Baịbụl ekwughị okwu banyere ọnwa ndị dị ka Mach na Eprel, kama o kwuru okwu banyere ọnwa ndị dị ka Eda na Naịsan. (Esta 3:7) Ndị Juu na-agụ ọnwa ha site n’ọnwa ọhụrụ ruo ọnwa ọhụrụ. Ha na-eme Ememme Ngabiga n’abalị iri na anọ nke ọnwa mbụ na kalenda ha, ya bụ, ọnwa Naịsan. (Levitikọs 23:5; Ọnụ Ọgụgụ 28:16) Ọ bụ n’ụbọchị ahụ, bụ́ Naịsan 14, ka ndị Rom kpọgburu Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Ọ nwụrụ otu puku afọ na narị afọ ise na iri anọ na ise e mechara Ememme Ngabiga mbụ. N’ezie, Naịsan 14 bụ ụbọchị pụrụ iche!

Ma olee ụbọchị bụ́ Naịsan 14 na kalenda anyị taa? Ime obere mgbakọ ga-enyere anyị aka ịmata kpọmkwem ụbọchị ọ bụ. Abalị mbụ nke ọnwa Naịsan na-amalite mgbe ọnwa ọhụrụ pụtara n’anyasị na Jeruselem n’ihe dị ka mgbe ehihie na abalị na-aha nhata n’oge opupu ihe ubi (mmalite nke oge opupu ihe ubi n’Ebe Ugwu Ụwa). Ọ bụrụ na anyị agụọ abalị iri na anọ malite n’ụbọchị ahụ, ọ ga-edute anyị na Naịsan 14. Ọnwa na-agbazukarị agbazu n’ụbọchị ahụ. Ọ bụrụ na anyị ejiri otú e si gụọ oge na Baịbụl gụọ ya, Naịsan 14 nke afọ a ga-amalite mgbe anyanwụ dara na Sọnde, Eprel 17, 2011. *

N’ihi ya, n’afọ a, Ndịàmà Jehova na-ejikere izukọta ọnụ, ha na ndị niile chọrọ icheta ọnwụ Jizọs. Ha ji obi ụtọ na-akpọ gị ka i soro ha zukọọ. Biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova bi n’ebe i bi iji mata oge na ebe a ga-anọ nwee nnọkọ a. Ha ga-echeta ọnwụ Jizọs, ọ bụghị n’ụtụtụ ma ọ bụ n’ehihie, kama n’anyasị, mgbe anyanwụ dasịrị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Baịbụl kwuru na ọ bụ “nri anyasị.” (1 Ndị Kọrịnt 11:25) Anyasị Sọnde, Eprel 17, 2011, bụ ụbọchị ncheta nke anyasị ahụ Jizọs malitere ncheta a pụrụ iche otu puku afọ na narị itoolu na iri asaa na asatọ gara aga. Ọ bụkwa mmalite nke otu ụbọchị ahụ, bụ́ Naịsan 14, Jizọs nwụrụ. Ò nwere ụbọchị ka mma iji cheta ọnwụ ya karịa ụbọchị ahụ?

Otú Ị Ga-esi Jikere

Olee ihe i nwere ike ime iji jikere maka ihe a a na-eme otu ugboro n’afọ? Otu ihe bụ ịtụgharị uche banyere ihe Jizọs meerela anyị. Akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? * enyerela ọtụtụ nde mmadụ aka ịghọtakwu ihe ọnwụ Jizọs pụtara.—Matiu 20:28.

Otú ọzọ anyị nwere ike isi kwadebe obi anyị maka ụbọchị a pụrụ iche bụ ịgụ ihe ndị mere tupu ụbọchị ikpeazụ ahụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa. Na peeji ndị na-eso nke a, ị ga-ahụ otu chaatị. Kọlụm aka nri ya gosiri ebe ndị Baịbụl kọrọ ihe ndị merenụ tupu Jizọs anwụọ. Ihe ọzọ ị ga-ahụ na ya bụ isiakwụkwọ ndị dị n’akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ * bụ́ ndị kọwara ihe ndị ahụ merenụ.

Kọlụm aka ekpe nke chaatị ahụ ji ụbọchị ihe ndị ahụ mere tụnyere ụbọchị ndị ha dabara n’afọ a. Ọ́ gaghị adị mma ka i wepụta oge gụọ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ ụfọdụ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị kwuru banyere ihe ndị mere kwa ụbọchị tupu ụbọchị Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị? Ọ ga-enyere gị aka ijikere maka ụbọchị kacha mkpa n’afọ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Ụbọchị a nwere ike ịdị iche n’ụbọchị ndị Juu nke oge a ji eme Ememme Ngabiga ha. Maka gịnị? Ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu nke oge a na-eme Ememme Ngabiga na Naịsan 15, n’ihi na ha chere na iwu ahụ e nyere n’Ọpụpụ 12:6 na-ekwu ka e mee ya n’ụbọchị ahụ. (Gụọ Ụlọ Nche February 15, 1990, peeji nke 14.) Ma, Jizọs mere ememme ahụ na Naịsan 14 dị ka e kwuru n’Iwu Mozis. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere otú e si agbakọta ụbọchị a, gụọ Ụlọ Nche December 15, 1977, peeji nke 767.

^ par. 14 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Gụọ peeji nke 47-56, na peeji nke 206-208. I nwere ike inweta akwụkwọ a n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet na www.watchtower.org.

^ par. 15 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]

Cheta ọnwụ Jizọs Sọnde, Eprel 17, 2011

[Chaatị/Foto ndị dị na peeji nke 23, 24]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

IZU IKPEAZỤ

2011 Tuz. Eprel 12 ▪ Ụbọchị Izu Ike Matiu

2012 ․․․․․ Mak

2013 ․․․․․ Luk

Jọn 11:55–12:1

gt 101, para. 2-4 *

NAỊSAN 9 (ga-amalite mgbe anyanwụ dara)

N’oge Baịbụl, ụbọchị ▪ O riri nrin’ụlọ □ Matiu 26:6-13

na-amalite ná mgbede, Saịmọn onye ekpenta

mgbe anyanwụ dasịrị, ▪ Meri tere ya □ Mak 14:3-9

ma gwụ n’echi ya mmanụ nad

mgbe anyanwụ dara ▪ Ndị Juu bịara Luk

ileta Jizọs □ Jọn 12:2-11

na Lazarọs □ gt 101, para. 5-9

2011 Wen. Eprel 13 ▪ Ọ bara Jeruselem □ Matiu 21:1-11, 14-17

2012 ․․․․․ dị ka onye

nwere mmeri

2013 ․․․․․ ▪ Ọ kụziri ihe □ Mak 11:1-11

n’ụlọ nsọ □ Luk 19:29-44

Jọn 12:12-19

gt 102

NAỊSAN 10 (ga-amalite mgbe anyanwụ dara)

▪ O hiri na Betanị

2011 Tọz. Eprel 14 Ọ gara Jeruselem □ Matiu 21:12, 13,

2012 ․․․․․ n’isi ụtụtụ 18, 19

2013 ․․․․․ ▪ O mere ka ụlọ nsọ □ Mak 11:12-19

ahụ dị ọcha

▪ Jehova si □ Luk 19:45-48

n’eluigwe kwuo okwu □ Jọn 12:20-50

gt 103, 104

NAỊSAN 11 (ga-amalite mgbe anyanwụ dara)

2011 Fraị. Eprel 15 ▪ O ji ihe atụ kụzie □ Matiu 21:19–25:46

ihe n’ụlọ nsọ

2012 ․․․․․ ▪ Ọ katọrọ ndị Farisii □ Mak 11:20–13:37

2013 ․․․․․ ▪ Ọ hụrụ onyinye □ Luk 20:1–21:38

nwaanyị di ya nwụrụ

▪ O buru amụma ọdịda Jọn

Jeruselem

▪ O kwuru ihe ịrịba □ gt 105 ruo 112, para. 1

ama ọnụnọ ya n’ọdịnihu

NAỊSAN 12 (ga-amalite mgbe anyanwụ dara)

2011 Sat. Eprel 16 ▪ Naanị ya na ndị □ Matiu 26:1-5, 14-16

2012 ․․․․․ na-eso ụzọ ya

2013 ․․․․․ nọrọ na Betani

▪ Judas mere ndokwa □ Mak 14:1, 2, 10, 11

ịrara ya nye

Luk 22:1-6

Jọn

gt 112, para. 2-4

NAỊSAN 13 (ga-amalite mgbe anyanwụ dara)

2011 Sọn. Eprel 17 Pita na Jọn □ Matiu 26:17-19

2012 ․․․․․ kwadebere Ememme

2013 ․․․․․ Ngabiga

▪ Jizọs na ndịozi iri □ Luk 22:7-13

ndị nke ọzọ gakwara Jọn

ebe ahụ n’uhuruchi □ gt 112, para. 5 ruo 113,

para. 1

NAỊSAN 14 (ga-amalite mgbe anyanwụ dara)

▪ Ha mere Ememme □ Matiu 26:20-35

Ngabiga

▪ Ọ sara ụkwụ □ Mak 14:17-31

ndịozi ya

▪ Ọ gwara Judas ka □ Luk 22:14-38

ọ pụọ

▪ Ọ malitere Ncheta □ gt 113, para. 2 ruo

ná ngwụcha 116 ọnwụ ya

etiti abalị A raara ya nye ma □ Matiu 26:36-75

2011 Mọn. Eprel 18 jide ya n’ogige

2012 ․․․․․ Getsemeni

2013 ․․․․․ ▪ Ndịozi ya gbara ọsọ □ Mak 14:32-72

▪ Ndị Sanhedrin kpere □ Luk 22:39-62

ya ikpe

▪ Pita gọnahụrụ Jizọs □ gt 117 ruo ná

ngwụcha 120

▪ Ọ pụtara n’ihu ndị □ Matiu 27:1-61

Sanhedrin ọzọ

▪ A kpọgaara ya □ Mak 15:1-47

Paịlet, kpọgaziere

ya Herọd,

kpọghachikwa ya na

nke Paịlet

▪ A mara ya ikpe ọnwụ □ Luk 22:63–23:56

ma kpọgbuo ya

▪ Ọ nwụrụ n’ihe dị ka □ Jọn 18:28-40

elekere atọ nke ehihie

▪ E buturu ozu ya ma □ gt 121 ruo 127, para. 7

lie ya

NAỊSAN 15 (ga-amalite mgbe anyanwụ dara)

▪ Ụbọchị Izu Ike

2011 Tuz. Eprel 19 ▪ Paịlet kwetara ka □ Matiu 27:62-66

2012 ․․․․․ ndị agha chee ili Mak

2013 ․․․․․ Jizọs nche Luk

Jọn

gt 127, para. 8-9

NAỊSAN 16 (ga-amalite mgbe anyanwụ dara)

2011 Wen. Eprel 20 ▪ A kpọlitere ya n’ọnwụ □ Matiu 28:1-15

2012 ․․․․․ ▪ Ọ pụtara n’ihu ndị □ Mak 16:1-8

2013 ․․․․․ na-eso ụzọ ya □ Luk 24:1-49

Jọn 20:1-25

gt 127, para. 10

ruo 129, para. 10

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 30 Nọmba ndị e dere ebe a bụ isiakwụkwọ ndị dị n’akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ (gt). Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ chaatị gosiri ebe niile Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ozi ikpeazụ Jizọs, gụọ akwụkwọ bụ́ “All Scripture Is Inspired of God and Beneficial,” peeji nke 290, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.