Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kụziere Ụmụ Gị Otú Ha Ga-esi Na-asọpụrụ Ndị Mmadụ

Kụziere Ụmụ Gị Otú Ha Ga-esi Na-asọpụrụ Ndị Mmadụ

Kụziere Ụmụ Gị Otú Ha Ga-esi Na-asọpụrụ Ndị Mmadụ

“I RE ọma ka ejula ji aga n’ogwu.” Ilu Igbo a na-egosi na a na-akwanyere onye na-asọpụrụ ndị ọzọ ùgwù, ya bụ na ndị ọzọ na-egosikarị onye dị otú a obiọma, na-ahụkwa ya n’anya.

Ọ na-eme obi ụtọ dị ukwuu ma ọ bụrụ na ụmụaka na-asọpụrụ ndị ọzọ. Otu onye nlekọta sekit, onye ya na ma ụmụaka ma ndị okenye na-esokarị aga ozi ọma kwuru, sị: “Achọpụtala m na àgwà nwa a zụrụ nke ọma nke na-asọpụrụ ndị mmadụ na-eme ka obi ndị anyị na-ezi ozi ọma gbanwee karịa ka ihe nwa ahụ ji ọnụ na-agwa ha na-eme.”

N’oge a ọtụtụ ndị na-anaghị asọpụrụ ndị ọzọ, ịmara otú anyị ga-esi na-emeso ndị ọzọ ihe bara uru ma gosi na anyị nwere amamihe. Ihe ọzọ karịrị nke a nke mere anyị ga-eji na-asọpụrụ ndị ọzọ bụ na Akwụkwọ Nsọ gbara anyị ume ka anyị ‘na-akpa àgwà n’ụzọ kwesịrị ozi ọma banyere Kraịst.’ (Fil. 1:27; 2 Tim. 3:1-5) Anyị kwesịrị ịkụziri ụmụ anyị ka ha na-asọpụrụ ndị ọzọ. Olee otú e nwere ike isi kụziere ha otú ha ga-esi na-esi n’ala ala obi ha na-asọpụrụ ndị ọzọ, ọ bụghị ime ya iji mezuo iwu? *

Ezigbo Ihe Nlereanya Na-eme Ka Ha Mụta Ịsọpụrụ Ndị Ọzọ

Ụmụaka na-amụta ihe n’ihe nlereanya a na-esetịpụrụ ha. Ụzọ kacha mma ndị nne na nna nwere ike isi na-akụziri ụmụ ha otú ha ga-esi na-asọpụrụ ndị ọzọ bụ hanwa ịsọpụrụ ndị ọzọ. (Diut. 6:6, 7) Ịgwa ụmụ gị otú ha ga-esi na-asọpụrụ ndị ọzọ dị mkpa, ma, ọ bụghị naanị nke a ka i kwesịrị ịna-eme. E wezụga ichetara ha na ha kwesịrị ịna-asọpụrụ ndị ọzọ, ihe ọzọ dị nnọọ mkpa bụ ezigbo ihe nlereanya.

Tụlee ihe banyere Nnenna, * onye nne ya bụ́ Onye Kraịst zụlitere ka ọ mara Chineke. Ihe e ji mara ya bụ ịsọpụrụ mmadụ niile. Gịnị mere o ji eme nke a? Ọ zara, sị: “Mama anyị setịpụụrụ anyị ihe nlereanya, n’ihi ya, ọ naghị esiri anyị bụ́ ụmụ ya ike ịsọpụrụ ndị ọzọ.” Otu nwanna aha ya bụ Walter kụziiri ụmụ ya otú ha ga-esi na-asọpụrụ mama ha na-abụghị Onyeàmà Jehova. Ọ sịrị: “M gbara mbọ na-akụziri ụmụ m ka ha na-asọpụrụ mama ha, m na-egosikwa ha ezigbo ihe nlereanya ka ha wee nwee ike ime nke a. Anaghị m ekwu okwu ọjọọ banyere nwunye m.” Walter nọgidere na-akụziri ụmụ ya Okwu Chineke, ọ na-ekpekukwa Jehova ekpere ka o nyere ya aka. Otu n’ime ha na-arụ ọrụ ugbu a n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, onye nke ọzọ abụrụ ọsụ ụzọ. Ụmụ ya hụrụ ya na nwunye ya n’anya, na-asọpụrụkwa ha.

Baịbụl kwuru, sị: “Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama nke udo.” (1 Kọr. 14:33) Jehova na-eme ihe niile n’usoro. Ndị Kraịst kwesịrị iṅomi Chineke na nke a site n’idebe ihe dị n’ụlọ ha n’usoro. Ụfọdụ ndị nne na nna akụzierela ụmụ ha otú ha ga-esi na-edozi àkwà ha kwa ụbọchị tupu ha agaa ụlọ akwụkwọ, otú ha ga-esi na-achịsa ákwà ha ebe ha kwesịrị ịdị, nakwa otú ha ga-esi na-eje ozi ndị dị n’ụlọ. Ọ bụrụ na ụmụaka na-ahụ na ihe niile dị n’ụlọ ha na-adị ọcha ma na-adị n’usoro, ọ ga-adịrị ha mfe idebe ọnụ ụlọ nke ha na ihe ha ọcha.

Olee otú ụmụ gị si ele ihe ha na-amụ n’ụlọ akwụkwọ anya? Hà na-enwe obi ụtọ n’ihi ihe ndị nkụzi ha na-emere ha? Gịnwa bụ́ nne ma ọ bụ nna ị̀ na-enwe obi ụtọ maka ihe ndị a? Ụmụ gị ga-eṅomi otú i si ele ihe ha na-amụ n’ụlọ akwụkwọ anya nakwa otú i si ele ndị nkụzi ha anya. Ọ́ gaghị adị mma ma ị kụziere ha ka ha na-ekele ndị nkụzi ha? Ikele onye nkụzi, dọkịta, onye resịrị anyị ihe, ma ọ bụkwanụ onye ọ bụla ọzọ meere anyị ihe bụ otu n’ime ụzọ ndị magburu onwe ha anyị si asọpụrụ ndị ọzọ. (Luk 17:15, 16) Anyị kwesịrị ịja Ndị Kraịst bụ́ ndị na-eto eto mma, bụ́ ndị na-adịghị ka ụmụ akwụkwọ ibe ha kama ha na-asọpụrụ ndị ọzọ ma na-akpa ezigbo àgwà.

Ndị Kraịst kwesịrị isetịpụ ezigbo ihe nlereanya ma a bịa n’ịsọpụrụ ndị ọzọ. Ọ na-amagbu onwe ya ịhụ ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst ndị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù site n’ịsị ha “biko” ma ọ bụkwanụ “i meela.” Ọ bụrụ na ndị torola eto na-asọpụrụ Jehova site n’ige ntị n’ọmụmụ ihe, ndị na-eto eto ga-eṅomi ha. Ụmụaka na-amụta otú ha ga-esi na-asọpụrụ ndị agbata obi ha site n’iṅomi ezigbo ihe nlereanya ndị torola eto na-esetịpụ mgbe ha na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Dị ka ihe atụ, Andrew, onye dị afọ anọ, amụtala ịgwa onye tọrọ ya, “Cheretụ ka m gafee,” mgbe ọ bụla ọ chọrọ ịgafe ebe ọ nọ.

Gịnị ọzọ ka ndị nne na nna nwere ike ime iji kụziere ụmụ ha otú ha ga-esi na-akpa ezigbo àgwà? Ndị nne na nna nwere ike iwepụta oge ha ga-eji na-eme ka ụmụ ha mara ihe e nwere ike ịmụta n’ọtụtụ akụkọ a kọrọ na Baịbụl. N’eziokwu, nke a bụ ihe ndị nne na nna kwesịrị ime.—Rom 15:4.

Jiri Akụkọ A Kọrọ na Baịbụl Na-akụziri Ha Ihe

Ọ ga-abụrịrị na nne Samuel kụziiri ya otú ọ ga-esi na-ehulata ala n’ihu Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Ilaị. Ikekwe, Samuel dị naanị afọ atọ ma ọ bụ afọ anọ mgbe ọ kpọgara ya n’ụlọikwuu ahụ. (1 Sam. 1:28) Ì nwere ike ịgwa obere nwa gị otú ọ ga-esi na-ekele ndị mmadụ “ị̀ bọọla chi?,” “nnọọ,” “gaa nke ọma,” ma ọ bụkwanụ ekele ọzọ unu na-ekele n’obodo unu? Dị ka ọ dị Samuel mgbe ọ bụ nwata, ‘ihe ụmụ gị nwere ike ịna-adịwanye ma Jehova ma mmadụ mma.’—1 Sam. 2:26.

Ọ́ gaghị adị mma ma i jiri akụkọ a kọrọ na Baịbụl na-akụziri ụmụ gị otú o si ka mma ịsọpụrụ ndị ọzọ karịa ịna-eleda ha anya? Dị ka ihe atụ, mgbe Eze Ehazaya, bụ́ eze ọjọọ na-achị Izrel, chọrọ ịhụ Ịlaịja onye amụma, o zipụrụ “onyeisi ndị agha iri ise na ndị agha iri ise ya” ka ha gaa kpọta ya. Onyeisi ndị agha ahụ nyere Ịlaịja iwu ka o soro ha. Ọ bụghị otú ahụ ka o kwesịrị isi gwa onye na-anọchite anya Chineke okwu. Gịnị ka Ịlaịja gwara ya? Ọ sịrị ya: “Ọ bụrụ na m bụ onye nke Chineke, ka ọkụ si n’eluigwe daa rechapụ gị na ndị agha iri ise gị.” Ihe ahụ o kwuru mere. “Ọkụ wee si n’eluigwe daa rechapụ ya na ndị agha iri ise ya.”—2 Eze 1:9, 10.

Eze zipụkwara onyeisi ndị agha iri ise ọzọ ka ọ gaa kpọta Ịlaịja. Ọ gbalịkwara ịmanye Ịlaịja ka o soro ya. Ọkụ esikwa n’eluigwe gbadata rechapụ ya na ndị agha ya. Ma, mgbe onyeisi ndị agha iri ise nke atọ bịakwutere Ịlaịja, ọ kwanyeere ya ùgwù. Kama inye Ịlaịja iwu ka o soro ya, o gburu ikpere n’ala wee rịọ Ịlaịja, sị: “Onye nke ezi Chineke, biko, ka mkpụrụ obi m na mkpụrụ obi ndị ohu gị iri ise a dịrị oké ọnụ ahịa n’anya gị. Lee, ọkụ si n’eluigwe daa rechapụ ndị isi ndị agha iri ise nke mbụ na nke abụọ, tinyere ndị agha iri ise ha, ma ugbu a, ka mkpụrụ obi m dị oké ọnụ ahịa n’anya gị.” Onye amụma Chineke ọ̀ ga-ekwu ka ọkụ si n’eluigwe rechapụ onye a egwu na-atụ, bụ́ onye gwara ya okwu otú gosiri na ọ na-asọpụrụ ya? Mbanụ! Kama nke ahụ, mmụọ ozi Jehova gwara Ịlaịja ka o soro onyeisi ndị agha ahụ. (2 Eze 1:11-15) Ọ̀ bụ na nke a anaghị egosi na anyị kwesịrị ịna-asọpụrụ ndị ọzọ?

Mgbe ndị agha Rom kpụụrụ Pọl onyeozi n’ụlọ nsọ, ọ gaghị gosịwa ha na ya nwere ikike ikwu okwu. Ọ kwanyeere ọchịagha ha ùgwù wee jụọ ya, sị: “M̀ nwere ike ịgwatụ gị okwu?” Nke a mere ka e nye Pọl ohere ikpere ọnụ ya.—Ọrụ 21:37-40.

O nwere onye mara Jizọs ụra ụbọchị a na-ekpe ya ikpe. Ma, Jizọs ma otú ka mma ọ ga-esi eme ka a mara na ihe e mere ya adịghị mma. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na o nwere ihe ọjọọ m kwuru, gbaa akaebe na o nwere ihe ọjọọ m kwuru; ma ọ bụrụ na ihe m kwuru ziri ezi, gịnị mere i ji tie m ihe?” O nweghị onye kwuru na otú Jizọs si kwuo ihe ahụ adịghị mma.—Jọn 18:22, 23.

Okwu Chineke kọkwara ihe ndị mere n’oge ochie, bụ́ ndị na-egosi ihe anyị kwesịrị ime mgbe a dọrọ anyị aka ná ntị nakwa otú anyị ga-esi jiri obi umeala kweta ebe anyị mejọrọ. (Jen. 41:9-13; Ọrụ 8:20-24) Dị ka ihe atụ, Abigel rịọrọ Devid arịọrọ ka ọ gbaghara di ya bụ́ Nebal ná mkparị ọ kparịrị ya. E wezụga arịrịọ ahụ Abigel rịọrọ Devid, o bunyekwara ya ihe oriri buru ibu. Ihe ahụ Abigel mere masịrị nnọọ Devid nke mere ka ọ gaa lụrụ ya mgbe Nebal nwụrụ.—1 Sam. 25:23-41.

Ọ dị mkpa ka ị na-akụziri ụmụ gị ka ha na-asọpụrụ ndị ọzọ ma mgbe ihe na-adịghị mfe ma mgbe ihe dị mma. Ọ bụrụ na anyị esi otú a ‘na-eme ka ìhè anyị na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ha ga na-enye Nna anyị nọ n’eluigwe otuto.’—Mat. 5:16.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ndị nne na nna kwesịrị ime ka ụmụ ha mata ihe dị iche n’ịsọpụrụ ndị okenye na ime ihe onye bu ihe ọjọọ n’obi chọrọ ka ha mee. Gụọ Teta! nke October 2007, peeji nke 3-11.

^ par. 7 Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.