Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ala nke Mmiri Ara Ehi na Mmanụ Aṅụ Na-eru na ya”

“Ala nke Mmiri Ara Ehi na Mmanụ Aṅụ Na-eru na ya”

“Ala nke Mmiri Ara Ehi na Mmanụ Aṅụ Na-eru na ya”

MGBE Jehova Chineke kpọpụtara ụmụ Izrel n’Ijipt, o kwere ha nkwa na ọ ga-akpọga ha “n’ala dị mma, dịkwa obosara, n’ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.”—Ọpụpụ 3:8.

Mgbe ụmụ Izrel bara n’Ala Nkwa ahụ, ha kpara ehi, atụrụ, na ewu, si otú ahụ nwejuo mmiri ara ehi enwejuo. Ma, olee maka mmanụ aṅụ? Ụfọdụ ndị chere na ihe a na-ekwu n’ebe ahụ bụ mmiri na-atọ ụtọ a na-apịpụta ná mkpụrụ osisi det, fig ma ọ bụ vaịn. Ihe ka ọtụtụ n’ebe ndị Baịbụl kwuru banyere mmanụ aṅụ, ihe ọ na-ekwu bụ mmanụ e nwetara n’aṅụ ọhịa, ọ bụghị ná ndị a na-akpa n’ụlọ. (Ndị Ikpe 14:8, 9; 1 Samuel 14:27; Matiu 3:1, 4) Ọ̀ bụ eziokwu na mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi “na-eru” n’ala ahụ?

Otu ihe ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie chọpụtara n’oge na-adịbeghị anya n’Izrel nke oge a mere ka nke a dokwuo anya. Ụlọ ọrụ mgbasa ozi nke Mahadum Hibru kwuru banyere ihe ahụ a chọpụtara, sị: “Prọfesọ (Amihai) Mazar kwuru na nke a bụ ebe kacha ochie a na-akpa aṅụ ndị na-amụ ihe mgbe ochie gwupụtatụrụla n’Izrel Oge Ochie na Mba Ndị Gbara ya Gburugburu. A rụrụ ya n’ihe dị ka n’agbata narị afọ nke iri na mmalite narị afọ nke itoolu Tupu Oge Anyị.”

Ndị ahụ na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie chọpụtara ihe karịrị iri ụlọ aṅụ atọ ndị dị n’ahịrị atọ, ha kwukwara na e nwere ihe dị ka otu narị ụlọ aṅụ n’ebe ahụ dum. Mgbe e nyochara ụlọ aṅụ ndị ahụ, a hụrụ akụkụ ahụ́ aṅụ ndị nwụrụ anwụ na iberibe mgbá aṅụ n’ime ha. Ndị ọkà mmụta kwuru na “a ga na-enweta ihe ruru ọkara tọn mmanụ aṅụ kwa afọ n’ụlọ aṅụ ndị ahụ.”

N’oge ochie, ọ bụghị naanị na mmanụ aṅụ bụ ihe oriri dị ụtọ, ndị na-eji ígwè na akpụkpọ anụ emepụta ihe ji mgbá aṅụ rụọ ọrụ. Ihe ọzọ e ji mgbá aṅụ eme bụ itechi ebe batụrụ ime na bọọdụ ide ihe e ji osisi mee, e nwekwara ike ịgbaze mgbá aṅụ ahụ ma jiri ya mee ihe ọzọ. Olee ihe ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie kwubiri banyere ihe a ha chọpụtara?

Ụlọ ọrụ mgbasa ozi ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe Baịbụl kwuru banyere ịkpa aṅụ n’Izrel n’oge ahụ, ebe ịkpa aṅụ ahụ a chọpụtara na Tel Rehov gosiri na ịkpa aṅụ na iwepụta mmanụ aṅụ na mgbá aṅụ bụ ọrụ na-enye ezigbo ego n’oge Ụlọ Nsọ Mbụ ahụ [nke Sọlọmọn]. N’ihi ya, ọ ga-abụ na okwu ahụ bụ́ ‘mmanụ aṅụ’ dị na Baịbụl bụ n’ezie mmanụ e nwetara n’aṅụ.”

[Ebe e sigasị nweta foto dị na peeji nke 15]

Institute of Archaeology/Hebrew University © Ebe E Gwupụtara Ihe na Tel Rehov