Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ “Ga-agụsi Gị Ike”

Ọ “Ga-agụsi Gị Ike”

Bịaruo Chineke Nso

Ọ “Ga-agụsi Gị Ike”

Ọ NA-EWUTE EWUTE ịhụ ebe onye ị hụrụ n’anya tagidere ahụhụ nwụọ. Ụdị ọnwụ ahụ na-ewute anyị nke ukwuu. Ma, ọ bụ ihe na-akasi obi ịmara na Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, na-aghọta uju anyị na-eru. Nke ka nke bụ na ọ na-agụ ya agụụ iji ikike ya na-enweghị atụ kpọlite ndị nwụrụ anwụ. Legodị otú okwu Job, nke dị na Job 14:13-15, si mee ka anyị nwee olileanya.

Tụlegodị mgbe o kwuru ya. Job, bụ́ nwoke nwere okwukwe pụrụ iche, dabara ná nnukwu ọnwụnwa—nke gụnyere ihe onwunwe ya ifunahụ ya, ụmụ ya niile ọ hụrụ n’anya ịnwụnahụ ya, na ịda ajọ ọrịa. Mgbe ahụ ọ nọ n’ahụhụ, ọ rịọrọ Chineke, sị: “A sị nnọọ na ị ga-ezobe m na Shiol [ili nke ihe niile bụ́ mmadụ]!” (Amaokwu 13) Job lere Shiol anya ka ihe ga-akwụsị ahụhụ ya. N’ebe ahụ, bụ́ ebe ọ ga-adị ka akụ̀ Chineke zoro ezo, ihe isi ike ya na ihe mgbu ya ga-akwụsị. *

Shiol ọ̀ ga-aghọ ụlọ Job ruo mgbe ebighị ebi? Ọ bụghị ihe Job kweere. Ọ gara n’ihu n’ekpere ya, sị: “A sị nnọọ . . . na ị ga-ekpebi oge m ga-anọru, i wee cheta m!” Obi siri Job ike na ọnụnọ ya na Shiol ga-abụ nwa oge nakwa na Jehova agaghị echefu ya. Job ji oge ọ ga-anọ na Shiol tụnyere oge a manyere ya ichere. Ruo ole mgbe? O kwuru, sị: “Ruo mgbe a ga-eme ka m nwere onwe m.” (Amaokwu 14) Nnwere onwe ahụ pụtara ịkpọpụta ya na Shiol, ya bụ, ịkpọlite ya n’ọnwụ!

Olee ihe mere obi ji sie Job ike na ya ga-enwere onwe ya? Ọ bụ n’ihi na ọ maara otú obi dị Onye Okike anyị hụrụ anyị n’anya banyere ndị nwụrụ anwụ ji ikwesị ntụkwasị obi fee ya. Job kwuru, sị: “Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa gị. N’ihi na agụụ ọrụ aka gị ga-agụsi gị ike.” (Amaokwu 15) Job kwetara na ya bụ ọrụ aka Chineke. Onye Na-enye Ndụ, bụ́ onye kpụrụ Job n’afọ nne ya, nwere nnọọ ike ime ka ọ dịghachi ndụ mgbe ọ nwụchara.—Job 10:8, 9; 31:15.

Okwu Job na-akụziri anyị banyere ọmịiko Jehova: Ọ hụrụ ndị tụkwasịrị ya obi, dị ka Job, bụ́ ndị na-ekwe ka ọ kpụzie ha ịghọ ndị dị mma n’anya ya n’anya. (Aịzaya 64:8) Jehova ji ndị ji ikwesị ntụkwasị obi efe ya kpọrọ ihe. Agụụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi nwụrụ anwụ ‘na-agụsi ya ike.’ Otu onye ọkà mmụta kwuru na okwu Hibru e si na ya sụgharịa okwu ahụ bụ “otu n’ime okwu ndị kasị sie ike na-egosi na ihe gụrụ mmadụ agụụ.” Ọ bụghị naanị na Jehova na-echeta ndị na-efe ya ofufe kama ọ na-agụsikwa ya agụụ ike ịkpọlite ha n’ọnwụ.

Obi dị anyị ụtọ na Jehova ji akwụkwọ Job, bụ́ otu n’ime akwụkwọ Baịbụl ndị mbụ e dere, mee ka anyị mata nzube ya ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. * Ọ chọrọ ka ị hụ ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ. Icheta nke ahụ nwere ike ime ka uju ị na-eru belata. Ọ́ gaghị adị mma ka ị mụtakwuo banyere Chineke a hụrụ anyị n’anya na otú i nwere ike isi kwe ka ọ kpụzie gị ịghọ ụdị onye ga-ahụ mgbe ọ ga-emezu nzube Ya?

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl na Mach:

Esta 1Job 15

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru na okwu Job, bụ́, ‘zobe m,’ nwere ike ịpụta “idobe [m] n’ebe ọ na-adịghị ihe ga-eme m dị ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa e chekwara echekwa.” Akwụkwọ ọzọ kwuru na okwu ndị ahụ pụtara “zobe m dị ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa.”

^ par. 8 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nkwa Chineke kwere na Baịbụl ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ ịdị ndụ n’ụwa ọhụrụ nke ezi omume ya, gụọ isi nke 7 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.