Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbakọ Distrikti Ndị e Mere n’Oge Ọkọchị na Rọshịa Eweta Ngọzi

Mgbakọ Distrikti Ndị e Mere n’Oge Ọkọchị na Rọshịa Eweta Ngọzi

Mgbakọ Distrikti Ndị e Mere n’Oge Ọkọchị na Rọshịa Eweta Ngọzi

KWA afọ, n’oge ọkọchị, ndị Rọshịa nwere mmasị n’ihe okike na-esi ná nnukwu ụlọ ha ndị dị n’obodo ndị mepere emepe enupụta gaa nọrịa n’obere ụlọ ndị a na-ebi n’oge okpomọkụ n’ime ime obodo. Ha na-eji oge ahụ ahapụtụ ndụ gbalụ gbalụ a na-ebi n’obodo ndị mepere emepe. Kemgbe afọ ole na ole ugbu a, Ndịàmà Jehova bi na Rọshịa na-apụtakwa n’ìgwè gaa n’ime ime obodo, ma, e nwere ihe dị iche mere ha ji aga.

N’ihi ikike iwu obodo nyere Ndịàmà Jehova nọ na Rọshịa ikpe okpukpe ha, ha nọgidere na-ezukọ n’ihu ọha maka ofufe ha n’agbanyeghị na a machibidoro ọrụ ikwusa ozi ọma ha iwu n’obodo ụfọdụ ná mba ahụ. Ma mgbe ụfọdụ, mmegide na nsogbu si n’aka ndị ọchịchị na-amaghị ha nke ọma ma ọ bụ n’aka ndị ụkọchukwu chọọchị Ọtọdọks Rọshịa emeela ka o siere ha ike inweta ebe ndị kwesịrị ekwesị ha ga-anọ nwee mgbakọ distrikti ha a na-enwe kwa afọ n’oge ọkọchị. N’ihi ya, Ndịàmà anọrọla n’ọhịa ma ọ bụ na mbara èzí mee mgbakọ ha. Malite n’afọ 2007 ruo 2009, ha enweela mgbakọ mbara èzí dị otú ahụ ihe dị ka ugboro iri anọ n’ebe iri abụọ na ise na Rọshịa.

Otu Onyeàmà garala mgbakọ distrikti ọtụtụ afọ na Rọshịa chetara, sị: “N’afọ ndị gara aga mgbe anyị na-enweta ámá egwuregwu na ụlọ ndị dị ná nnukwu obodo maka mgbakọ anyị, ọtụtụ ndị nwere ezi obi na ndị ọchịchị na-enwe ike iji anya ha hụ otú anyị si adị ọcha na otú anyị si eme ihe n’usoro ma kwuo ihe ha chere banyere nzukọ anyị. Ọ bụzi n’ọhịa ka anyị na-anọ enwe mgbakọ, bụ́ ebe ndị mmadụ na-anaghị ahụ anyị. Ọ dị mwute na ọhaneze enweghị ike ịhụ nnọkọ ndị a magburu onwe ha ndị dị iche iche na agbụrụ dị iche iche, na okpukpe dị iche iche na-abịa.”

Ọ bụ ezie na nnọkọ ndị ahụ bụ nnọkọ obi ụtọ, otu Onyeàmà kwuru, sị: “Ọ na-enye ọṅụ ịhụ Ndịàmà ibe anyị wepụtara onwe ha ma jiri ikwesị ntụkwasị obi nabata ọnọdụ ọ bụla ha hụrụ. Ma n’eziokwu, mgbe ndị ọchịchị mere ka o siere anyị ike inwe mgbakọ, ọ naghị adịrị anyị mfe. Ọ na-emekwa ka anyị ghara inwerecha onwe anyị ife Chineke pụrụ ime ihe niile ofufe n’ụzọ dị ùgwù.” Olee ihe Ndịàmà Jehova nọ na Rọshịa merela banyere nsogbu ahụ?

Mgbakọ Distrikti E Mere n’Ọhịa ná Mba ahụ Dum

Ọtụtụ mgbe, ịkagbu nkwekọrịta e nwere inye Ndịàmà ebe ha ga-anọ nwee mgbakọ mgbe oge gwụrụla agwụ na-eme ka ndị na-ahazi ya nwee naanị abalị ole na ole iji chọta ebe ọzọ ga-aba ọtụtụ puku mmadụ ga-abịa mgbakọ. Dị ka ihe atụ, na 2008, Ndịàmà nọ na Cheboksari, nke dị na Chuvash, nweziri mgbakọ distrikti ha na mbara ala nnukwu osisi gbara gburugburu nke chere ihu n’Osimiri Volga. Ọrụ chere ha ihu dị nnọọ ukwuu. N’ime otu puku mmadụ na narị itoolu na iri atọ a na-atụ anya ha ná mgbakọ ahụ, a ga-enye otu puku mmadụ na narị asaa ụlọ na mbara ala ahụ. Ebe a na-asa ahụ́ na ebe a na-akwọ aka, nke ga-enwe mmiri ọkụ na mmiri oyi, ụlọ mposi, na ọkụ eletrik ga-adị ha mkpa. A ga-enyekwa ndị niile ga-abịa ihe oriri.

Ụmụnna ahụ meriri nsogbu ahụ. E nwetara ndị ọkwá nkà, ndị ọrụ ọkụ eletrik, na ndị plọmba. Narị Ndịàmà atọ na iri ise wepụtara onwe ha inye aka n’ọrụ ahụ, mmadụ iri na anọ n’ime ha biri n’ebe ahụ abalị iri. Ha wara osisi, gbute ahịhịa ma wuo ọtụtụ ụlọikwuu, rụọ ebe ịsa ahụ́ na ụlọ mposi. Ìgwè ụmụnna ndị ọzọ gara n’obodo mepere emepe ọtụtụ ugboro ịzụ ngwá ọrụ. Ebe a na-enweghị nnukwu friji e ji echekwa nri, ụmụnna ahụ kpebiri isiri onye ọ bụla nri dị ọkụ ugboro atọ n’ụbọchị n’ala mgbakọ ahụ. Ndị na-ahazi mgbakọ ahụ goro ụfọdụ ndị ọrụ isiri ndị bịara mgbakọ ahụ nri. N’ikpeazụ, narị mmadụ ise n’ime ndị bịara mgbakọ ahụ wetara ihe ndị ha ga-eji maa ụlọikwuu, otu narị mmadụ na iri ise chọtara ụlọ n’ebe dị nso na mbara ala ahụ, mmadụ iri na ise ji obi ụtọ na-ehi n’elu ahịhịa n’otu ebe a na-azụ anụ, ndị ọzọkwa hiri n’ụlọikwuu ụmụnna mara.

Mgbe ndị bịara mgbakọ ahụ rutere, ha hụrụ ọtụtụ oche plastik nwere àgwà dị iche iche a haziri n’ahịrị n’ahịrị. A rụrụ ebe ikpo okwu abụọ e ji okooko osisi chọọ mma, otu maka ihe omume a ga-eme n’asụsụ Rọshịan, nke ọzọ abụrụ maka nke a ga-eme n’asụsụ Chuvash. Ihe omume ahụ tọrọ mmadụ niile ụtọ, ha nwekwara obi ụtọ maka otú ndị wepụtara onwe ha si rụsie ọrụ ike. Otu n’ime ndị na-esi nri ji obi ụtọ kwuo, sị, “A sị na mụ ejighị anya m hụ ya, agaraghị m ekweta na e nwere nzukọ na-arụ ọrụ nke ọma ma na-eme ihe n’usoro otú a!” Ụfọdụ ndị ji mgbakọ distrikti ahụ tụnyere Ememme Ụlọ Ndò nke mba Izrel mere n’oge Baịbụl.

N’obodo ndị ọzọ, ọ na-abụkarị otu ụbọchị ka Ndịàmà na-enwe iji chọta ma kwadebe ebe ọzọ ha ga-anọ nwee mgbakọ distrikti. Ọ bụ ihe mere na Nizni Novgorod, bụ́ ebe ụmụnna ndị wepụtara onwe ha kere onwe ha eke ma rụọ ọrụ ehihie na abalị n’ala mmadụ. Ha gbuturu osisi ma sụọ ọhịa, sụchaa ahịhịa, gbusịakwa akpịrị na ahụhụ ndị dị n’ebe ahụ. Mgbe ndị bịara mgbakọ ahụ rutere n’ụtụtụ Fraịdee, ndị ọrụ ahụ ebutela puku oche plastik abụọ, ebe mposi iri e nwere ike ibugharị ebugharị, gwunye ebe ịkwọ aka nwere mmiri, rụọ ebe ikpo okwu, gbanyekwa ígwè ọkụ ma kwụnye ígwè okwu. Otu nwanna kọrọ, sị: “Ihe kacha ịtụnanya bụ na ụmụnna ahụ, bụ́ ndị rụrụ ọrụ ehihie na abalị, achọghị ịnara otuto. Ha ji umeala n’obi nọgide na-arụrụ ndị ọzọ ọrụ mgbe mgbakọ ahụ na-aga n’ihu. Ha ji ike ha niile rụọ ọrụ iji hụ na ahụ́ ruru ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ala mgbe ha na-anụrụ okwu Chineke ná mgbakọ ahụ.”

Nwanna ọzọ dere, sị: “Ụmụnna rụkọrọ nnọọ ọrụ ọnụ. Ọ bụ ezie na ọ bụ nke mbụ ụmụnna na-ahazi mgbakọ mbara èzí, oge ha nwere adịkwa obere, ha chebaara ihe niile echiche nke ga-eme ka a ghara inwecha ihe ndị ga-adọpụ ndị mmadụ uche mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Mgbe anyị rụchara ọrụ a, ike agwụghị anyị. O yiri ka a ga-asị na Jehova nyere onye ọ bụla n’ime anyị ume!”

Mmụọ Chineke Rụrụ Ọrụ

Mbọ Ndịàmà gbara iji merie nsogbu ndị e nwere mgbe a na-achọ inwe mgbakọ nwere ọtụtụ ụzọ o si mee ka ha dịkwuo n’otu ma gosi na mmụọ Chineke na-akpa ike. Na Smolenski, ọtụtụ ndị nwe ụlọ e nwetaara ndị ga-abịa mgbakọ kwuru n’ụbọchị bọtara ụbọchị mgbakọ ahụ na ha agaghịzi enye ụlọ ha. Otu okenye kọrọ, sị: “Mgbe ọtụtụ ụgbọala bu ndị bịara mgbakọ ahụ rutere n’elekere mbụ nke ụtụtụ, e nweghị ụlọ ebe ha ga-anọ. M malitere ibe ákwá maka na o nweghị ihe m nwere ike ime iji nyere ha aka. M kpekuru Jehova ekpere ma rịọ ya ka o mee ihe banyere nsogbu ahụ. Obi tọrọ m nnọọ ụtọ na mgbe otu awa gafere, anyị achọtarala mmadụ niile ụlọ n’ebe ọzọ! Ọ tụrụ m nnọọ n’anya, o gosikwara na Jehova agaghị ahapụ onye ezi omume!” Ná mgbakọ ọzọ e nwere n’ọhịa, ụmụnna gakwuuru ndị bi n’obodo nta dị ebe ahụ ma rịọ ha ka ha nye ụmụnna anyị ụlọ, ndị obodo ahụ jikwa obi ụtọ nye puku mmadụ abụọ n’ime ndị bịara mgbakọ ahụ ụlọ n’oge mgbakọ ahụ n’ihi aha ọma Ndịàmà meere onwe ha n’ebe ahụ.

Otu Onyeàmà kwuru, sị: “Na e mechara nwee mgbakọ ahụ gosiri nnọọ na ọ dị anyị mkpa ịtụkwasị Jehova obi n’ọnọdụ ọ bụla.” Ihe kacha gosi nke a bụ mgbe ndị okwu na ụka bịara itisa mgbakọ ahụ. Na Novoshaktinski, ndị ụkọchukwu chọọchị Ọtọdọks Rọshịa na ndị ngagharị iwe bịara ma jiri maịkrofon na-abụ abụ ma na-eti mkpu iji mee ka ndị na-ege ntị ghara ịnụ ihe ọkà okwu na-ekwu. Ma, ndị uwe ojii gbochiri ha itisa mgbakọ ahụ. Mgbe otu nwaanyị bụ́ onye chọọchị Ọtọdọks nke so ná ndị ngagharị iwe ahụ tụbọrọ n’ihi okpomọkụ, ụmụnna kpọgara ya ná Ngalaba Ebe Ịnara Ọgwụ ma nye ya ọgwụ. Ihe ahụ enyeghị nwaanyị ahụ ọnụ okwu.

Ihe Ha Hụrụ Juru Ha Anya

N’ihi oké ụjọ a na-atụzi maka ndị na-eyi ọha egwu, ndị uwe ojii na ndị obodo na-achọkarịzi ịma ihe na-eme ná nnọkọ ọ bụla buru ibu a na-enwe na Rọshịa. Dị ka ihe atụ, ndị nnọchianya òtù ndị uwe ojii na-egbochi ịkpa aghara bịara ịhụ ihe na-eme n’otu mgbakọ e nwere n’ọhịa na Volzski. Ekwe ntị otu n’ime ha furu mgbe ihe omume ahụ na-aga n’ihu, ụmụnna achọtara ya ya ná Ngalaba Ebe Ndebe Ihe Furu Efu. Obere oge nke ahụ mechara, nna ya ukwu kpọrọ ya na fon ma chọọ ịma ma è nwere ime ihe ike ma ọ bụ ịkpa aghara ná mgbakọ ahụ. Onye uwe ojii ahụ zara ya, sị: “Ihe niile na-aga nke ọma; puku mmadụ ise nọ ebe a, ma ọ dịghị onye na-ada iwu. Ị̀ sị ịkpa aghara? Ihe na-eme ebe a mere ka m chee echiche. Ekwe ntị m funahụrụ m, ha achọta ya ma nyeghachi m ya!”

Otú ebe ahụ a nọ nwee mgbakọ ahụ si dị ọcha masịrị nnọọ otu onye nche, o jukwara ya anya na n’agbanyeghị ọtụtụ ụmụaka bịaranụ, ọ hụghịdị otu akwụkwọ swiit n’ala. Otu onye nwe ala ebe a nọ nwee mgbakọ ọzọ gakwuuru ndị uwe ojii, bụ́ ndị bịara ebe ahụ mgbe e ziri ha ozi na e nwere nnukwu nnọkọ okpukpe. O du onyeisi ndị uwe ojii ahụ gaa n’okpukpu nke atọ nke ụlọ elu chere ala mgbakọ ahụ ihu ma kwuo, sị: “Legodị ha! Jiri anya gị hụrụ. Ị̀ hụkwara otú ihe niile si aga n’usoro?” O juru onye ahụ nwe ala ahụ anya na Ndịàmà aṅụghị mmanya na-aba n’anya ma ọ bụ see sịga n’ebe ahụ, mgbe ha lara, o yighịdị ka ò nwere ihe e mere ebe ahụ, ha budịịrị unyi ha mepụtara laa. O tiri mkpu, sị: “Ebe ahụ dị ka paradaịs!”

A Hụrụ Ịdị n’Otu n’Etiti Ndị Chineke

Mgbe e nwechara otu mgbakọ n’ọhịa, onyeisi otu obodo dị nso n’ebe ahụ kwuru, sị: “Ama m na unu enwechaghị ego, ma n’ezie, unu na-akpa ike. Onye ọ bụla n’ime anyị na-agara onwe ya, ma unu na-eme ka ndị mmadụ dịrị n’otu!” Site na Kaliningrad ruo Kamchatka, ịdị n’otu ndị Chineke na-egosipụta ná mgbakọ ha nọgidere na-amasị ụmụ amaala nnukwu mba a. N’agbanyeghị ugboro ole e nwere ike ịgbanwe atụmatụ ha mgbe oge gwụrụla agwụ, ọ dị otu ihe na-agaghị agbanwe agbanwe, ya bụ, ùgwù ha na-akwanyere ndị ọchịchị na mmadụ ibe ha.

N’agbanyeghị otú ihe ka nwere ike ịdịrị Ndịàmà Jehova na Rọshịa, ha ga-eji ọṅụ na-ezukọ maka ịmụ okwu Chineke. Ha na-ekpe ekpere “maka ndị eze na ndị niile nọ n’ọkwá dị elu; ka anyị wee na-ebi ndụ dị nwayọọ na nke dị jụụ ná nsọpụrụ Chineke zuru ezu na iji ihe kpọrọ ihe.”—1 Timoti 2:2.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]

Otu Onyeàmà nke wepụtara onwe ya rụọ ọrụ mgbe a na-akwadebe otu mgbakọ èzí

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]

Ndịàmà Jehova na Rọshịa nọgidere na-ebi “ndụ dị nwayọọ na nke dị jụụ ná nsọpụrụ Chineke zuru ezu”

[Foto ndị dị na peeji nke 28]

Ndị wepụtara onwe ha ịrụ ọrụ rụkọrọ ọrụ ọnụ iji debe ebe a ga-anọ nwee mgbakọ ọcha tupu mgbakọ amalite nakwa iji siere ọtụtụ puku ndị bịara mgbakọ distrikti nri

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Ihe omume ahụ tọrọ mmadụ niile ụtọ, ha nwekwara obi ụtọ maka otú ndị wepụtara onwe ha si rụsie ọrụ ike