Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ahapụla Ụmụnna Gị

Ahapụla Ụmụnna Gị

Ahapụla Ụmụnna Gị

JAROSŁAW na nwunye ya bụ́ Beata * kwuru, sị: “Ịchụ ego megharịrị anyị anya ruo afọ iri, anyị kpatakwara ego. N’agbanyeghị na a kụziiri anyị eziokwu dị na Baịbụl malite mgbe anyị bụ ụmụaka, anyị hapụrụ Jehova, cheekwa na o nweghị otú anyị ga-esi lọghachikwute ya.”

Nwanna nwoke ọzọ aha ya bụ Marek kwuru, sị: “Otú ọchịchị na ihe ndị ọzọ si dị na Pọland mere ka a chụọ m n’ọrụ ugboro ugboro. Nke a mere ka obi jọọ m njọ. O nweghị mgbe ọ bụ obi m inwe ụlọ ọrụ nke m n’ihi na ịchụ nta ego edoghị m anya. Ka oge na-aga, m malitere ụlọ ọrụ nke m. M bu n’obi na nke a ga-enyere m aka igbo mkpa ezinụlọ m n’akpaghị otú m si efe Chineke aka. Ma, ọ dịghị anya, mụ achọpụta na nke a abụghị eziokwu.”

N’ihi otú ihe si ada oké ọnụ, nakwa n’ihi ọrụ ọtụtụ mmadụ na-enweghị, ndị ụfọdụ na-eji maka na ha amaghị ihe ha ga-eme eme kpebie ime ihe ga-emecha wetara ha nsogbu. Ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị na-arụkwu ọrụ ma ọrụ gbasaa, na-enwe ihe karịrị otu ọrụ, ma ọ bụkwanụ mepee ụlọ ọrụ nke ha n’agbanyeghị na ha amaghị otú e si ahazi ụdị ụlọ ọrụ ahụ. Uche ha bụ na ego ha ga na-enwetakwu ga-enyere ezinụlọ ha aka nakwa na ọ gaghị emetụta adịm ná mma ha na Jehova. Ma, ihe mmadụ na-atụghị anya ya na ọnọdụ akụnụba nwere ike ime ka ihe onye ahụ hazichara nke ọma gbochie ya ife Jehova otú ọ chọrọ. Nke a emeela ka ụfọdụ ndị malite inwe anyaukwu wee na-achụ ihe onwunwe ka a na-anwụ anwụ ma kwụsị iji ịnụ ọkụ n’obi na-efe Jehova.—Ekli. 9:11, 12.

Ụmụnna ụfọdụ na-achụ ihe ụwa ka a na-anwụ anwụ nke na ha anaghịzi enwe ohere maka inwe ọmụmụ ihe onwe onye, ịga ọmụmụ ihe ọgbakọ, ma ọ bụ ịga ozi ọma. O doro anya na nke a na-eme ka ha ghara ịna-efe Jehova otú kwesịrị, na-emekwa ka ha na ya ghara ịdị ná mma. Ha nwekwara ike ileghara ndị ọzọ ha na ha dị ná mma anya, ya bụ, ‘ndị ezinụlọ ha n’okwukwe.’ (Gal. 6:10) Ụfọdụ na-eji nke nta nke nta adapụ n’ọgbakọ. Chebara okwu a echiche nke ọma.

Ihe Ndị Anyị Kwesịrị Imere Ụmụnna Anyị

E nwere ọtụtụ ihe anyị ga-eme iji gosi ụmụnna anyị ịhụnanya. (Rom 13:8) N’ọgbakọ unu, i nwere ike ịna-ahụ ‘ndị nọ n’ahụhụ na-eti mkpu enyemaka.’ (Job 29:12) Ụfọdụ n’ime ha enweghị ihe ndị dị mkpa e ji ebi ndụ. Jọn onyeozi chetaara anyị ihe anyị kwesịrị ime ma ụmụnna anyị nọrọ n’ụdị ọnọdụ a. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke nwere ihe ụwa a nke e ji ebi ndụ ma hụ nwanna ya ka ọ nọ ná mkpa, ma o nweghị ọmịiko n’ebe ọ nọ, olee otú ịhụnanya maka Chineke si dịrị n’ime ya?”—1 Jọn 3:17.

Ọ ga-abụ na o nweela mgbe ị gbataara ndị nọ n’ụdị mkpa a ọsọ enyemaka. Ma, ọ bụghị naanị mkpa anụ ahụ́ ka anyị na-egboro ụmụnna anyị. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịna-arịọ ka e nyere ha aka n’ihi na owu na-ama ha ma ọ bụkwanụ n’ihi na ha nwere nkụda mmụọ. Ha nwere ike ịna-eche na ha erughị eru ife Jehova, o nwekwara ike ịbụ na ha na-arịasi ọrịa ike, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na onye ha hụrụ n’anya nwụrụ. Otu n’ime ụzọ ndị anyị ga-esi agba ha ume bụ ige ha ntị mgbe ha na-agwa anyị otú ọ dị ha n’obi nakwa iwepụta ohere ka anyị na ha kwurịta okwu. Anyị ga-esi otú a nyere ha aka idi ihe ọ bụla na-enye ha nsogbu n’obi ma mee ka ha na Jehova nọgide na-adị ná mma. (1 Tesa. 5:14) Nke a na-emekarịkwa ka anyị na ụmụnna anyị dịkwuo ná mma.

Ndị okenye ọgbakọ, karịchaa, kwesịrị ige ụmụnna ndị nwere nsogbu ntị, metere ha ebere, gosi ha obiọma ma jiri Akwụkwọ Nsọ gbaa ha ume. (Ọrụ 20:28) Ọ bụrụ na ndị okenye na-eme ihe ndị a, ha na-egosi na ha na-eṅomi Pọl onyeozi, bụ́ onye nwere “ịhụnanya dị ukwuu” n’ebe ụmụnna ya nọ.—1 Tesa. 2:7, 8.

Ma, ọ bụrụ na Onye Kraịst akwụsị ijere Jehova ozi, oleekwanụ otú ọ ga-esi enwe ike inyere ụmụnna ya aka? Ndị okenye nwedịrị ike itinye aka n’ịchụ ego ọnwụ ọnwụ. Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na Onye Kraịst ana-achụ ego otú a?

Ndị Nchegbu nke Ndụ Na-anyịgbu

Dị ka e kwuru na mbụ, mmadụ ịdọgbu onwe ya n’ọrụ ka o wee nweta ihe ọ ga-eji gboo mkpa ezinụlọ ya na-ewetakarị nchegbu ma na-eme ka onye ahụ ghara iji ife Chineke kpọrọ ihe. (Mat. 13:22) Marek, bụ́ onye anyị kwuru banyere ya na mbụ, kwuru, sị: “Mgbe ihe m ji akpata ego kụrụ afọ n’ala, ekpebiri m ịga mba ọzọ chọta ọrụ a ga na-akwụ m ezigbo ụgwọ. M gara ebe ahụ nọọ ọnwa atọ, lọta, gaghachi nọọ ọnwa atọ ọzọ. Otú ahụ ka m si na-aga na-alọta na-anọ abalị ole na ole ná mba anyị. Nke a nyere nwunye m na-abụghị Onyeàmà Jehova nsogbu.”

Ọ bụghị naanị otú ihe si na-aga n’ezinụlọ Marek bụ nsogbu nke a wetaara ya. Ọ sịkwara: “E wezụga ọrụ m na-anọ n’oké okpomọkụ arụ ọtụtụ awa kwa ụbọchị, ndị mụ na ha na-arụ ọrụ bụ ndị ajọ mmadụ nakwa ndị na-erigbu ndị ọzọ. Ha na-eme ka ndị omekome. Obi na-ajọ m njọ n’ihi na ọ na-adị m ka m̀ na-agbara ndị ọzọ ohu. Ebe m na-enweghị ohere ilebara onwe m anya, m malitere inwe obi abụọ ma m̀ ga-enweli ike inyere ndị ọzọ aka.”

Nsogbu ndị si ná mkpebi ahụ Marek mere pụta kwesịrị ime ka anyị chebara onwe ha echiche. Ọ bụrụgodị na ọ dị anyị ka ịga biri ná mba ọzọ na-arụ ọrụ ga-eme ka ego dịrị anyị n’akpa, ọ̀ bụ na ọ́ gaghị akpata nsogbu ndị ọzọ? Dị ka ihe atụ, olee otú adịm ná mma ezinụlọ anyị na Jehova ga-adị? Obi ọ̀ ga na-adị ha mma? Ụkwụ ọ̀ ka ga-esi anyị ike n’ọgbakọ ma anyị kwaga ebe ahụ anyị chọrọ ịkwaga? Ọ́ gaghị eme ka anyị ghara inwekwa ihe ùgwù ijere ụmụnna anyị ozi?—1 Tim. 3:2-5.

Ma, ị manụ na ọ bụghị naanị onye gara ịrụ ọrụ ná mba ọzọ na-achụ ego ọnwụ ọnwụ. Tụlee ihe banyere Jarosław na Beata. Jarosław kwuru, sị: “Ịchụ ego ji nwayọọ nwayọọ rie anyị ahụ́. Mgbe anyị lụrụ ọhụrụ, anyị malitere ire bred n’ebe ahịa na-agara anyị. Ka ego na-abata, anyị kpebiri ime ka ngwá ahịa anyị hikwuo nne. Ma, anyị anaghịzi agachi ọmụmụ ihe anya n’ihi na anyị anaghị enwe ohere. N’oge na-adịghị anya, akwụsịrị m ọrụ ịsụ ụzọ, kwụsịkwa ịbụ ohu na-eje ozi. Uru nke na-abịara anyị mere anyị obi ụtọ nke mere ka anyị mepee ụlọ ahịa buru ibu, bụ́ nke onye na-abụghị Onyeàmà Jehova so anyị nwere. N’oge na-adịghị anya, amalitere m na-aga mba ndị ọzọ na-enweta ọrụ ga na-enye anyị ọtụtụ nde dọla. Anaghịzi m anọkarị n’ụlọ. Nke a mere ka mụ na nwunye m na nwa m nwaanyị ghara ịna-emekọrịta ihe nke ọma. Ka oge na-aga, ahịa a na-agara anyị mere ka anyị kwụsị ife Jehova. Ebe ọ bụ na o nweghịzi ihe jikọrọ anyị na ụmụnna anyị, anyị chefuru ha.”

Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe a? Onye Kraịst nwere ike ịma n’ọnyà ma ọ bụrụ na ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ ka ihe dịrị ya mma. Ọnyà a nwere ike ime ka ọ ghara iji ife Chineke akpọrọ ihe ma ọ bụkwanụ mee ka ọ chịfuo “uwe elu ya,” ya bụ, ihe e jiri mara na ọ bụ Onye Kraịst. (Mkpu. 16:15) Nke a nwere ike ime ka anyị na ụmụnna anyị, bụ́ ndị anyị na-enyere aka n’oge gara aga, ghara ịna-emekọ ihe.

Gwa Onwe Gị Eziokwu

Mmadụ nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ụdị ihe a agaghị eme m.’ Ma, anyị kwesịrị ichemi echiche ime ka anyị wee mata ihe ndị dị anyị mkpa. Pọl dere, sị: “Ọ dịghị ihe anyị ji bịa n’ụwa, ọ dịghịkwa ihe anyị pụrụ iwere si n’ime ya pụọ. Ya mere, ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.” (1 Tim. 6:7, 8) N’eziokwu, otu mba nwere ike inwe ego ma mba ọzọ adaa ogbenye. Ihe na-enweghị ihe ọ bụ ná mba nwere ego nwere ike bụrụ oké ihe ná mba na-abaghị ọgaranya.

Ma mba unu ọ̀ bara ọgaranya ma ọ bụ na ọ baghị, tụlee ihe ọzọ Pọl kwuru. Ọ sịrị: “Ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ ndị amamihe na-adịghị na ha, ndị na-emerụkwa ahụ́, ndị na-emekwa ka mmadụ mikpuo ná mbibi na ịla n’iyi.” (1 Tim. 6:9) Ihe a chọrọ ịmata n’ọnyà anaghị ama na a gbaara ya ọnyà. A na-eme ọnyà ahụ otú ọ ga-esi mata ihe ahụ na mberede. Olee ihe anyị nwere ike ime ka “ọchịchọ ndị amamihe na-adịghị na ha” ghara ịmata anyị n’ọnyà?

Ọ bụrụ na anyị ebute ihe ndị ka mkpa ụzọ, anyị ga-enwe ike iwepụtakwu oge anyị ga-eji na-eme ihe ndị metụtara ife Jehova, bụ́ nke gụnyere ọmụmụ ihe onwe onye. Ọ bụrụ na Onye Kraịst esi otú a na-amụ ihe ma na-ekpe ekpere, ọ ga-eru “eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu” inyere ndị ọzọ aka.—2 Tim. 2:15; 3:17.

N’ime afọ ole na ole, ndị okenye ji ịhụnanya gbaa Jarosław ume ma mee ka ọ lọghachi n’ọgbakọ. Nke a mere ka o mee mgbanwe dị ukwuu ná ndụ ya. Ọ sịrị: “N’otu mkparịta ụka dị mkpa mụ na ndị okenye nwere, ha kọọrọ m banyere nwa okorobịa ahụ Jizọs kwuru banyere ya n’Akwụkwọ Nsọ, bụ́ onye chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi, ma, ọ chọghị ịhapụ ihe onwunwe ya. Ha ji akọ jụọ m ma m̀ chere na o nwere ihe m ga-amụta n’akụkọ ahụ. Nke a nyeere m aka ịmata ihe m ga-eme!”—Ilu 11:28; Mak 10:17-22.

Jarosław lebaara ọnọdụ ya anya nke ọma wee kpebie na ya agaghịzi eji oge ya niile na-achụ ego. N’ime afọ abụọ, ya na ezinụlọ ya maliteghachiri ijere Jehova ozi. Ugbu a, ọ bụ okenye nke na-ejere ụmụnna ya ozi. Jarosław sịrị: “Ọ bụrụ na ụmụnna ejiri oge ha niile na-achụ ego wee leghara ife Chineke anya, m na-agwa ha ihe mere m iji gosi ha na ọ baghị uru ka anyị na ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova na-emekọ ihe ọnụ. Mmadụ ikpebi na ya ga na-akwụwa aka ọtọ nakwa na ya agaghị eme ihe ga na-enyehi ya ego nne, bụ́kwanụ nke na-agaghị enyecha ya ohere ife Chineke otú ọ chọrọ, adịghị mfe.”—2 Kọr. 6:14.

Ọkụ hụrụ Marek mere ka ọ mụrụ akọ. N’agbanyeghị na ọrụ ọ na-arụ ná mba ọzọ, nke a na-akwụ ya ezigbo ụgwọ, mere ka ihe dịrị ezinụlọ ya mma, ọ kwụsịrị ijere Jehova ozi, ya na ụmụnna ya akwụsịkwa imekọrịta ihe. Ka oge na-aga, ọ maliteghachiri ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ. Marek kwukwara, sị: “Ruo ọtụtụ afọ, m kpara àgwà ka Barọk nke dịrị ndụ n’oge ochie, bụ́ onye ‘chọọrọ onwe ya ihe ukwu.’ N’ikpeazụ, agwara m Jehova ihe niile na-egbu m mgbu n’obi, obi m na-agwakwa m ugbu a na mụ na ya dị ná mma.” (Jere. 45:1-5) Ugbu a, Marek na-agbalị ka o ruo eru ịrụ “ezi ọrụ” nke okenye ọgbakọ na-arụ.—1 Tim. 3:1.

Marek dọrọ ndị ọ na-agụ agụụ ịga mba ọzọ nweta ọrụ a ga na-akwụ ha ezigbo ụgwọ aka ná ntị. Ọ sịrị: “Mgbe mmadụ nọ ná mba ọzọ, ọ na-adịrị onye ahụ mfe ịdaba n’ọnyà ụwa Ekwensu siri ebe niile. Ebe ọ bụ na ndị bi na mba ọzọ anaghị anụ asụsụ ndị ebe ahụ ha bi, ịgwa ha okwu na-esiri ha ike. I nwere ike ịkpata ego n’ebe ahụ ị gara, ma, ihe i metere ebe ahụ nwere ike ime ka ị ghara iji ihe ndị metụtara ofufe Chineke kpọrọ ihe ọtụtụ afọ.”

Anyị ga na-eme ihe dị Jehova mma ma ọ bụrụ na anyị aghọta na ma ịkpata ego ma inyere ụmụnna anyị aka dịcha mkpa. Otú anyị si ebi ndụ nwekwara ike ime ka ndị ọzọ na-eme mkpebi dị mma. Ụmụnna kwesịrị inyere ndị ihe na-anyịgbu aka, gosi ha ọmịiko, na ezigbo ihe nlereanya. Ndị okenye ọgbakọ na ndị ọzọ ji ọgbakọ kpọrọ ihe nwere ike ịna-enyere ụmụnna ha aka ka okwukwe ha sie ike ka nchegbu nke ndụ ghara ịkpa ha aka ọjọọ.—Hib. 13:7.

Ekwela ka ịchụ ego ọnwụ onwụ mee ka ị hapụ ụmụnna gị. (Fil. 1:10) Kama nke ahụ, ka anyị baa “ọgaranya n’ebe Chineke nọ” ka anyị na-ebute ime ihe ndị metụtara Alaeze ya ụzọ ná ndụ anyị.—Luk 12:21.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Aha a a kpọrọ ha abụghị ezigbo aha ha.

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Ọrụ i ji akpata ego ọ̀ na-egbochi gị ịga ọmụmụ ihe?

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ọ̀ na-amasị gị ijere ụmụnna gị ozi?