Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs Olee Otú O Si Bie Ndụ?

Jizọs Olee Otú O Si Bie Ndụ?

Jizọs Olee Otú O Si Bie Ndụ?

“Ihe oriri m bụ ka m mee uche onye zitere m, ka m rụchaa ọrụ ya.”—JỌN 4:34.

ỊMATA mgbe Jizọs kwuru ihe ahụ dị n’elu ga-eme ka anyị mata ọtụtụ ihe banyere ihe o lekwasịrị anya ná ndụ ya. Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ji ụtụtụ ahụ dum mee njem gafee obodo Sameria bụ́ ugwu ugwu. (Jọn 4:6) Ebe ndị na-eso ụzọ Jizọs chere na agụụ ji ya, ha nyere ya nri ka o rie. (Jọn 4:31-33) Jizọs ji ihe ọ zara ha gosi ihe kacha ya mkpa ná ndụ. Ime uche Chineke dị ya mkpa karịa nri ọnụ. Ma n’okwu ọnụ ma n’omume, Jizọs gosiri na ihe kacha ya mkpa ná ndụ bụ imezu ihe bụ́ uche Chineke maka ya. Olee ihe ndị so na ya?

Ikwusa na ịkụzi banyere Alaeze Chineke Baịbụl kọwara ọrụ bụ́ isi Jizọs ji ndụ ya rụọ, sị: “O wee gazuo Galili dum, na-ezi ihe . . . na-ekwusakwa ozi ọma alaeze ahụ.” (Matiu 4:23) Naanị ihe Jizọs mere abụghị ikwusara, ma ọ bụ ịkpọsara ndị ọzọ, Alaeze Chineke. Ọ kụzikwaara ndị mmadụ ihe, ya bụ, o nyere ha ntụziaka, kọwaara ha ihe ma mee ka ha kwenye ihe ọ kụziiri ha site n’ime ka ha chee echiche nke ọma. Alaeze ahụ bụ isiokwu nke ozi Jizọs.

N’oge niile Jizọs jere ozi ya, ọ kụziiri ndị gere ya ntị ihe Alaeze Chineke bụ na ihe Alaeze ahụ ga-eme. Tụlee eziokwu ndị a banyere Alaeze ahụ, tinyere amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị gosiri ihe Jizọs kwuru banyere ya.

▪ Alaeze Chineke bụ ọchịchị eluigwe, ọ bụkwa Jizọs ka Jehova họpụtara ịbụ Eze ya.—MATIU 4:17; JỌN 18:36.

▪ Alaeze ahụ ga-edo aha Chineke nsọ ma mee ka e mee uche ya n’ụwa dị ka a na-eme ya n’eluigwe.—MATIU 6:9, 10.

▪ Mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa, a ga-agbanwe ụwa niile ịghọ paradaịs.—LUK 23:42, 43.

▪ N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-abịa imezu uche Chineke maka ụwa. *MATIU 24:3, 7-12.

Ịrụ ọrụ dị ike Isi ihe e ji mara Jizọs bụ na ọ bụ “Onye Ozizi.” (Jọn 13:13) Ma, n’ime afọ atọ na ọkara o ji jee ozi ya, ọ rụkwara ọtụtụ ọrụ dị ike. Ọrụ ndị ahụ dị ike rụzuru ihe abụọ ma ọ dịkarịa ala. Nke mbụ, ha mere ka o doo anya na ọ bụ Chineke zitere ya n’ezie. (Matiu 11:2-6) Nke abụọ, ha gosiri ihe ndị ka ukwuu ọ ga-eme n’ọdịnihu mgbe ọ ghọrọ Eze Alaeze Chineke. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ọrụ ebube ndị ọ rụrụ.

▪ O mere ka oké osimiri nke ebili mmiri na-enugharị daa jụụ ma mee ka oké ifufe kwụsị.—MAK 4:39-41.

▪ Ọ gwọrọ ndị ọrịa, tinyere ndị ìsì, ndị ogbi, na ndị ngwọrọ.—LUK 7:21, 22.

▪ O mere ka nri mụbaa, si otú ahụ nye ìgwè mmadụ nri.—MATIU 14:17-21; 15:34-38.

▪ Ya dịkarịa ala, ugboro atọ, ọ kpọlitere ndị nwụrụ anwụ.LUK 7:11-15; 8:41-55; JỌN 11:38-44.

Cheedị otú ndụ ga-adị n’ụwa mgbe Eze dị ike otú ahụ chịwara!

Ime ka a mara ụdị onye Jehova Chineke bụ A bịa n’ịkụziri ndị ọzọ banyere Jehova, ọ dịghị onye ruru eru karịa Ọkpara Chineke, bụ́ onye e mechara mara ka Jizọs Kraịst. Ebe Jizọs bụ “onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke,” ya na Jehova biri n’eluigwe ogologo oge karịa otú Jehova na mmụọ ọzọ biri. (Ndị Kọlọsi 1:15) Chee echiche otú nke ahụ si nye ya ohere ịmụta iche echiche ka Nna ya, na ịmata uche, ụkpụrụ, na ụzọ Ya.

Jizọs nwere nnọọ ike ikwu, sị: “Ọ dịghịkwa onye maara onye Ọkpara ahụ bụ ma e wezụga Nna ya; ọ dịghịkwa onye maara onye Nna ahụ bụ ma e wezụga Ọkpara ya nakwa onye Ọkpara ya chọrọ ikpughere ya.” (Luk 10:22) Mgbe Jizọs bụ mmadụ n’ụwa, ọ dị njikere ịkọwa ụdị onye Nna ya bụ, n’ezie, o nwere mmasị ime otú ahụ. Okwu na ozizi Jizọs dị nnọọ iche na nke mmadụ ọ bụla ọzọ; ha si n’ihe ndị ọ mụtara mgbe ọ nọ n’eluigwe n’akụkụ Chineke Kasị Ihe Niile Elu.—Jọn 8:28.

E nwere ike iji otú Jizọs si mee ka a mara Nna ya tụnyere otú nne ọkụkọ si enye ụmụ ya nri. Nne ọkụkọ na-atụrisiri ụmụ ya nri otú ga-ekwe ha nlofe. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ kụziri ihe ọ mụtara banyere Nna ya mgbe ọ nọ n’eluigwe otú ọ ga-adịrị ndị mmadụ nọ n’ụwa mfe ịghọta ya na ime ya eme.

Ka anyị tụlee ụzọ abụọ Jizọs si mee ka a mara Nna ya.

▪ Jizọs ji ozizi ya kọwaa ihe bụ́ eziokwu banyere Jehova—aha Ya, nzube ya, na ụzọ ya.—JỌN 3:16; 17:6, 26.

▪ Àgwà Jizọs kpara mere ka anyị mara ọtụtụ àgwà ndị magburu onwe ha Jehova nwere. Jizọs kpara nnọọ àgwà ka Nna ya nke na e nwere ike ịsị na o kwuru, sị: ‘Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ụdị onye Nna m bụ, lee m anya.’—JỌN 5:19; 14:9.

Otú Jizọs si bie ndụ ya na-atụ anyị n’anya. Anyị ga-erite ọtụtụ uru ma ọ bụrụ na anyị atụlee ihe mere o ji nwụọ ma mee ihe kwekọrọ n’ihe anyị mụtara.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Ị chọọ ịmatakwu banyere Alaeze Chineke na otú anyị si mara na ọ ga-abịa n’oge na-adịghị anya, gụọ isi nke 8, bụ́ “Gịnị Bụ Alaeze Chineke?,” na isi nke 9, bụ́ “Ànyị Na-ebi ‘n’Ụbọchị Ikpeazụ’?,” nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.