Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs Gịnị Mere O Ji Nwụọ?

Jizọs Gịnị Mere O Ji Nwụọ?

Jizọs Gịnị Mere O Ji Nwụọ?

“Nwa nke mmadụ bịara . . . ka o nyekwa mkpụrụ obi [ma ọ bụ, ndụ] ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”—MAK 10:45.

JIZỌS maara ihe nwere ike ime ya. Ọ maara na a ga-akpagbu ya. Kama nke ahụ, ọ maara na ya ga-anwụchu ọnwụ mgbe ọ ka dị iri afọ atọ na ụma, ọ dịkwa nnọọ njikere ịnwụ.

Baịbụl gosiri na ọnwụ Jizọs dị ezigbo mkpa. Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru na Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ma ọ bụ Agba Ọhụrụ, kwuru kpọmkwem banyere ọnwụ Jizọs ihe dị ka ugboro otu narị na iri asaa na ise. Ma, olee ihe mere Jizọs ji taa ahụhụ ma nwụọ? Ọ dị mkpa ka anyị mata, n’ihi na ọnwụ Jizọs nwere nnọọ ike ịbara anyị uru ná ndụ.

Ihe Jizọs tụrụ anya ya N’afọ ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ugboro banyere ahụhụ ọ ga-ata na ọnwụ ya. Mgbe ya na ndịozi iri na abụọ ya na-aga Jeruselem maka Ememme Ngabiga ikpeazụ ya na ha ga-eme, ọ gwara ha, sị: “A ga-enyefekwa Nwa nke mmadụ n’aka ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ, ha ga-amakwa ya ikpe ọnwụ, ha ga-enyefekwa ya n’aka ndị mba ọzọ, ha ga-ejikwa ya mee ihe ọchị, gbụọ ya ọnụ mmiri, pịakwa ya ihe ma gbuo ya.” * (Mak 10:33, 34) Olee ihe mere ihe ndị ga-eme ya ji doo ya anya otú ahụ?

Jizọs maara ọtụtụ amụma ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, bụ́ ndị kwuru otú ọ ga-esi nwụọ. (Luk 18:31-33) Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime amụma ndị ahụ na amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị kọwara otú ha si mezuo.

Ihe a ga-eme Mesaya ahụ

▪ A ga-eji mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ rara ya nye.—ZEKARAYA 11:12; MATIU 26:14-16.

▪ A ga-eti ya ihe ma gbụọ ya ọnụ mmiri.—AỊZAYA 50:6; MATIU 26:67; 27:26, 30.

▪ A ga-akpọgide ya n’osisi.—ABỤ ỌMA 22:16; MAK 15:24, 25.

▪ A ga-akwa ya emo mgbe ọ nọ n’elu osisi ịta ahụhụ.—ABỤ ỌMA 22:7, 8; MATIU 27:39-43.

▪ A gaghị agbaji ọkpụkpụ ya mgbe a na-akpọgbu ya.—ABỤ ỌMA 34:20; JỌN 19:33, 36.

Jizọs mezuru amụma ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ. Ọ dịghị otú ọ gaara esi mee nke ahụ n’onwe ya. Na amụma niile a mezuru n’isi Jizọs gosiri na ọ bụ Chineke zitere ya n’ezie. *

Ma, olee ihe mere o ji dị mkpa ka Jizọs taa ahụhụ ma nwụọ?

Jizọs nwụrụ iji mee ka okwu ụfọdụ dị mkpa doo anya Jizọs maara esemokwu ndị e welitere n’ogige Iden bụ́ ndị metụtara eluigwe na ụwa. Otu mmụọ ozi nke nupụrụ isi mere ka Adam na Iv kpebie inupụrụ Chineke isi. Nnupụisi di na nwunye ahụ mere ka e nyowezie ọbụbụeze Chineke ma ọ bụ otú o si achị enyowe. Mmehie ha mekwara ka e nwewezie obi abụọ ma è nwekwara mmadụ ga-ekwesị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ mgbe a na-anwa ya ọnwụnwa.—Jenesis 3:1-6; Job 2:1-5.

Jizọs mere ka okwu abụọ ahụ doo nnọọ anya, ya bụ, okwu banyere ọbụbụeze Jehova na ikwesị ntụkwasị obi ụmụ mmadụ. Site n’irube nnọọ isi “ruo ọnwụ . . . n’osisi ịta ahụhụ,” Jizọs kwadoro ọbụbụeze Chineke. (Ndị Filipaị 2:8) Jizọs gosikwara na mmadụ zuru okè nwere ike ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ ọbụna mgbe ọnwụnwa tara akpụ bịaara ya.

Jizọs nwụrụ iji gbapụta ụmụ mmadụ Aịzaya onye amụma buru amụma na ahụhụ na ọnwụ Mesaya ahụ ga-ekpuchi mmehie ụmụ mmadụ. (Aịzaya 53:5, 10) Jizọs ghọtara nke a nke ọma, o jikwa obi ya niile nye “mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) Àjà o ji ndụ ya chụọ megheere ụmụ mmadụ na-ezughị okè ụzọ ịghọ ndị enyi Jehova, meekwa ka e nwee ike ịnapụta ha ná mmehie na ọnwụ. Ọnwụ Jizọs mere ka anyị nwee ohere inwetaghachi ihe ahụ Adam na Iv tụfuru, nke bụ́ olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ihe niile ga-ezu okè. *Mkpughe 21:3, 4.

Ihe i nwere ike ime N’isiokwu ndị a, anyị atụleela ihe Baịbụl kwuru banyere Jizọs—ebe o si bịa, otú o si bie ndụ, na ihe mere o ji nwụọ. Ịmata eziokwu ndị ahụ banyere Jizọs ga-eme nnọọ ka ihe ndị na-abụghị eziokwu e kwurula banyere ya doo anya. Ime ihe kwekọrọ na ha nwere ike iwetara anyị ngọzi, bụ́ ndụ ka mma ugbu a na ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. Baịbụl gwara anyị ihe ndị ọ dị mkpa ka anyị mee iji nweta ngọzi ahụ.

▪ Mụtakwuo ihe banyere Jizọs Kraịst na ọrụ ọ na-arụ n’imezu nzube Jehova.—JỌN 17:3.

▪ Nwee okwukwe na Jizọs, si n’otú i si ebi ndụ gị gosi na ị nabatara ya ka Onye Nzọpụta gị.—JỌN 3:36; ỌRỤ 5:31.

Obi ga-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ịmụtakwu banyere Jizọs Kraịst, bụ́ “Ọkpara [Chineke] mụrụ naanị ya,” bụ́ onye anyị nwere ike isi n’aka ya nweta onyinye “ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Jizọs kpọrọ onwe ya ugboro ugboro “Nwa nke mmadụ.” (Matiu 8:20) Ọ bụghị naanị na aha a gosiri na ọ bụ nnọọ mmadụ kamakwa na ọ bụ ya bụ “nwa nke mmadụ” ahụ amụma Baịbụl kwuru banyere ya.—Daniel 7:13, 14.

^ par. 13 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu amụma ndị mezuru n’isi Jizọs, gụọ isiokwu bụ́ “Jizọs Kraịst—Mezaịa ahụ E Kwere ná Nkwa” nke dị n’ihe odide ntụkwasị nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 17 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere uru àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ bara, gụọ isi nke 5, bụ́ “Ihe Mgbapụta Ahụ—Onyinye Kasịnụ Chineke Nyere,” nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?