Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ekwerewo M”

“Ekwerewo M”

Ṅomie Okwukwe Ha

“Ekwerewo M”

MATA ji anya nke uche ya na-ahụ ili nwanne ya nwoke, nke bụ́ ọgba e ji nkume mechie ọnụ ụzọ ya. Ọ nọ n’oké mwute. O siiri ya ike ikweta na nwanne ya nwoke ọ hụrụ n’anya, bụ́ Lazarọs, anwụọla. Kemgbe abalị anọ nwanne ya nwoke kubiri ume, ọ nọ nnọọ n’uju, ọtụtụ ndị abịakwarala ha mgbaru.

Ugbu a kwa, onye Lazarọs kacha jiri kpọrọ ihe guzo n’ihu Mata. Ịhụ Jizọs ọzọ mere ka ọ maliteghachi iru uju, n’ihi na ọ bụ naanị ya bụ onye gaara emeli ka nwanne ya nwoke ghara ịnwụ. N’agbanyeghị nke ahụ, obi rutụrụ Mata ala mgbe ahụ ya na Jizọs nọ ná mpụga Betani, bụ́ obere obodo dị n’ugwu. N’obere oge ya na Jizọs nọrọ, obiọma Jizọs na ọmịiko ya, bụ́ nke na-agba ume mgbe niile, kasiri ya obi. Jizọs jụrụ ya ajụjụ ndị mere ka o chee echiche banyere okwukwe ya na ihe ndị o kweere banyere mbilite n’ọnwụ. Mkparịta ụka ahụ mere ka Mata kwuo otu n’ime okwu ndị kacha mkpa ọ ga-ekwu ná ndụ ya, nke bụ́: “Ekwerewo m na ị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke, bụ́ Onye ahụ ga-abịa n’ụwa.”—Jọn 11:27.

Mata bụ nwaanyị nwere okwukwe pụrụ iche. Obere ihe Baịbụl kọọrọ anyị banyere ya na-akụziri anyị ihe ndị nwere ike inyere anyị aka ime ka okwukwe nke anyị sikwuo ike. Iji hụ ihe mere o ji dị otú ahụ, ka anyị tụlee ebe mbụ e kwuru banyere Mata na Baịbụl.

“Ị Na-echegbu Onwe Gị, Na-esogbukwa Onwe Gị”

Ọ bụ ọnwa ole na ole tupu Lazarọs anwụọ. Ọ dịbeghị ọkọ kọrọ Lazarọs. Nnukwute onye ọbịa, bụ́ Jizọs Kraịst, na-aga ịbịa n’obodo ya, bụ́ Betani. Ezinụlọ Lazarọs, Mata, na Meri pụrụ iche—ọ ga-abụ na ha bụ ụmụnne atọ torola eto bi n’otu ụlọ. Ụfọdụ ndị na-eme nchọpụta na-eche na ọ ga-abụ Mata tọchara na ha atọ ebe o yiri ka ọ̀ bụ ya lekọtara onye ọbịa ahụ, ebe ọ bụkwa na a na-ebu ụzọ akpọ ya aha mgbe ụfọdụ. (Jọn 11:5) Ọ dịghị otú anyị si amata ma ò nwere onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye n’ime ha atọ. Otú o sina dị, ha ghọrọ ezigbo ndị enyi Jizọs. Jizọs ji ụlọ ha mere ebe obibi n’oge ọ na-eje ozi na Judia, bụ́ ebe a kpagburu ya mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ ma buso ya iro. O doro anya na obi tọrọ ya nnọọ ụtọ inwe ebe dị otú ahụ ahụ́ na-eru ya ala na inwe ndị enyi dị otú ahụ na-akwado ya.

Mata na-agba nnọọ mbọ ịhụ na ahụ́ ruru onye ọ bụla nọ n’ụlọ ha ala nakwa na e lere onye bịara na nke ha ọbịa. Ebe ọ bụ nwaanyị dị uchu, nke na-eji ọrụ n’aka mgbe niile, o yiri ka ọ̀ na-agbakeri ala ọtụtụ mgbe. Ọ bụkwa otu ihe ahụ mere mgbe Jizọs bịara ileta ha. N’oge na-adịghị anya, o mere atụmatụ imere nnukwu onye ọbịa ya, na ndị ya na ha so, ma eleghị anya, oriri pụrụ iche. N’oge ahụ, e jighị ile ọbịa egwuri egwu. Mgbe onye ọbịa rutere, a na-esusu ya ọnụ, yipụ ya akpụkpọ ụkwụ, saa ya ụkwụ, a na-etekwa ya mmanụ na-esi ísì ụtọ n’isi. (Luk 7:44-47) A na-edoziri ya ebe ọ ga-ehi nke ọma ma siere ya ezigbo nri.

Mata na Meri nwere ọtụtụ ihe ịrụ. O doro anya na Meri, bụ́ onye ụfọdụ ndị na-eche na ihe na-aka emetụ n’ahụ́ nakwa na ọ ka nwanne ya nwaanyị echebara ihe echiche, nyeere nwanne ya nwaanyị aka ná mmalite. Ma, mgbe Jizọs rutere, ihe gbanwere. Jizọs lere oge ahụ anya ka oge ọ ga-eji zie ihe—ọ bụkwa ihe o mere! Jizọs adịghị ka ndị ndú okpukpe e nwere n’oge ya n’ihi na ọ kwanyeere ụmụ nwaanyị ùgwù ma dị njikere ịkụziri ha banyere Alaeze Chineke, bụ́ isiokwu nke ozi ya. Ebe obi tọrọ Meri ụtọ inweta ohere ọma dị otú ahụ, ọ nọdụrụ ala n’ụkwụ Jizọs na-ege ntị n’ihe niile ọ na-ekwu.

Anyị nwere nnọọ ike iji anya nke uche anyị hụ otú iwe si na-eju Mata obi. Nri niile ọ chọrọ isiri ndị ọbịa ya na ihe niile o bu n’obi imere ha mere ka o chegbuwekwuo onwe ya, uche aghasasịakwa ya. Ka ọ nọ na-agbakeri ala ma hụ ka nwanne ya nwaanyị nọ ọdụ n’ebe ahụ n’enweghị ihe ọ na-eme iji nyere ya aka, iwe ò jidere ya, ya amaa ọsụ ma ọ bụ gbarụọ ihu? Ọ gaghị eju anyị anya ma ọ bụrụ na o mere otú ahụ. O nweghị otú naanị ya ga-esi rụlie ọrụ niile ahụ!

N’ikpeazụ, Mata ejitelighịzi onwe ya. Ọ naara Jizọs okwu n’ọnụ, jiri iwe kwuo, sị: “Onyenwe anyị, ọ́ bụghịrị gị ihe ọ bụla na nwanne m nwaanyị hapụụrụ naanị m ihe niile ka m mewe? Ya mere, gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.” (Luk 10:40) Mata ejighị ya n’egwuregwu. Ọtụtụ Baịbụl si otú a sụgharịa ajụjụ ya: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ na o metụghị gị n’obi . . . ?” Ọ gwaziri Jizọs ka ọ gbazie Meri, ka ọ gwa ya ka ọ laghachi nyewere ya aka n’ọrụ.

O nwere ike ịbụ na ihe Jizọs zara Mata juru Mata anya, dịkwa ka o jurula ọtụtụ ndị na-agụ Baịbụl. Jizọs ji obiọma kwuo, sị: “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị, na-esogbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe. Ma, ihe dị mkpa bụ ihe ole na ole ma ọ bụ naanị otu ihe. Ma Meri họọrọ òkè dị mma, a gaghịkwa anapụ ya nke ahụ.” (Luk 10:41, 42) Olee ihe okwu Jizọs pụtara? Ọ̀ pụtara na ọ na-akpọ Mata onye hụrụ ihe nke ụwa n’anya? Ọ̀ pụtara na ọ dịghị ihe o ji mbọ ahụ Mata na-agba isiri ya nri kpọrọ?

Ee e. Jizọs maara nnọọ na Mata bu ezi ihe n’obi nakwa na ọ bụ ịhụnanya mere o ji na-eme ihe ahụ ọ na-eme. Ihe ọ na-ekwu abụghịkwa na imere onye ọbịa oriri dị njọ. Jizọs ji obi ụtọ gaa “oké oriri” Matiu meere ya tupu mgbe ahụ. (Luk 5:29) Ihe bụ́ nsogbu n’ebe a abụghị nri ahụ Mata na-esi; kama nke ahụ, ọ bụ ihe o butere ụzọ. O tinyere uche ya niile n’isi ọtụtụ nri nke na o chefuru ihe kacha mkpa. Gịnị ka ọ bụ?

Jizọs, Ọkpara Jehova Chineke mụrụ naanị ya, bịara n’ụlọ Mata ịkụzi eziokwu. Ọ dịghị ihe nwere ike ịka ya mkpa, ma nri ahụ Mata ji ịhụnanya na-esi ma ihe ndị ọzọ ọ na-akwadebe. O doro anya na o wutere Jizọs na Mata kwere ka ohere pụrụ iche ọ gaara eji mee ka okwukwe ya sikwuo ike kwaa ya, ma ọ hapụrụ Mata ka ọ họrọ ihe ọ chọrọ ime. Ma, ihe Jizọs na-agaghị eme bụ ikwere ihe Mata kwuru ma manye Meri ịhapụkwa ohere ahụ pụrụ iche.

N’ihi ya, o ji obiọma gbazie echiche Mata, jiri olu dị nro kpọghachi aha ya iji mee ka obi lọtuo ya, meekwa ka o doo Mata anya na o kwesịghị ‘ichegbu onwe ya, na-esogbukwa onwe ya banyere ọtụtụ ihe.’ Otu nri ma ọ bụ nri abụọ na-agaghị egbu oge isi ezuola, karịsịa ebe ọ bụ na e nwere oriri ime mmụọ. N’ihi ya, ọ dịghị otú Jizọs ga-esi napụ Meri “òkè dị mma” ọ họọrọ, nke bụ́ ịmụta ihe n’ọnụ Jizọs.

E nwere ọtụtụ ihe ndị na-eso ụzọ Kraịst taa ga-amụta n’obere ihe a mere n’ezinụlọ Mata ha. Anyị ekwesịtụghị ikwe ka ihe ọ bụla gbochie anyị igbo “mkpa ime mmụọ” anyị. (Matiu 5:3) Ọ bụ ezie na anyị kwesịrị iṅomi mmesapụ aka Mata na ịdị uchu ya, anyị ekwesịtụghị ‘ichegbu onwe anyị, na-esogbukwa onwe anyị’ banyere ihe ndị na-adịchaghị mkpa metụtara ile ọbịa nke na ihe ndị kacha mkpa ga-akwa anyị. Isi ihe mere anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị ji anọkọ abụghị iji nye ma ọ bụ rie nri a kwọrọ aka sie, kama nke ahụ, ọ bụ iji gbarịta ibe anyị ume ma nyerịta ibe anyị onyinye ime mmụọ. (Ndị Rom 1:11, 12) Obere nri nwedịrị ike inye anyị ohere ịgbarịta ibe anyị ume otú ahụ.

Nwanne Ha Nwoke Ha Hụrụ n’Anya Nwụrụ, A Kpọlite Ya

Mata ọ̀ nabatara mgbazi ahụ Jizọs ji obiọma gbazie ya ma mụta ihe na ya? Anyị ekwesịghị ichewe ya echewe. Mgbe Jọn onyeozi na-amalite otu akụkọ dị ụtọ banyere nwanne Mata, o chetaara anyị, sị: “Jizọs hụrụ Mata na nwanne ya nwaanyị na Lazarọs n’anya.” (Jọn 11:5) Ọnwa ole na ole agafeela kemgbe Jizọs gara Betani, bụ́ nke anyị kọrọ n’elu. O doro anya na Mata ewesoweghị Jizọs iwe; o burughị ya ihe ọjọọ n’obi n’ihi ọdụ ahụ o ji ịhụnanya dụọ ya. Ọ nabatara ya. Na nke a kwa, Mata gosiri anyị ihe nlereanya magburu onwe ya n’inwe okwukwe n’ihi na o nweghị onye n’ime anyị obere mgbazi na-anaghị adị mkpa site n’oge ruo n’oge.

Mgbe nwanne Mata dara ọrịa, Mata nọ na-agbakeri ala ilekọta ya. O mere ihe niile o nwere ike ime iji mee ka o nwetaghachi onwe ya ma gbakee. N’agbanyeghị nke ahụ, ọrịa Lazarọs nọ na-akawanye njọ. Ụmụnne ya nwaanyị nọ ya n’akụkụ ehihie na abalị na-elekọta ya. Ònye ma ugboro ole Mata lere nwanne ya nwoke ahụ ọrịa ji aka ọjọọ anya n’ihu, cheta ọtụtụ afọ ha bikọrọla ọnụ na oge ndị ha nwerela ọṅụ na nsogbu ndị ha gabigarala?

Mgbe o yiri ka ọrịa Lazarọs ọ̀ karịala Mata na Meri, ha zigaara Jizọs ozi. Ọ ga-ewe mmadụ abalị abụọ isi n’ebe Jizọs nọ na-ekwusa ozi ọma n’oge ahụ gawa na nke Mata ha. Ozi ha ziri ya dị mkpirikpi: “Onyenwe anyị, lee! onye ahụ ị hụrụ n’anya nke ukwuu na-arịa ọrịa.” (Jọn 11:1, 3) Ha maara na Jizọs hụrụ nwanne ha nwoke n’anya, obi sikwara ha ike na ọ ga-eme ihe niile o nwere ike ime iji nyere enyi ya nwoke aka. Hà chekwubere na Jizọs nwere ike irute tupu Lazarọs anwụọ? Ya bụrụ otú ahụ, olileanya ha kụrụ afọ n’ala. Lazarọs nwụrụ.

Mata na Meri nọ na-eruru nwanne ha nwoke uju, na-ahazi olili ya ma na-ele ndị si na Betani na obodo ndị gbara ya gburugburu bịara ha mgbaru ọbịa. Ma, ọ dịbeghị ihe ha nụrụ banyere Jizọs. O doro anya na ihe na-emenụ gbagwojukwuru Mata anya ka oge na-agakwu. N’ikpeazụ, abalị anọ Lazarọs nwụchara, Mata nụrụ na Jizọs erutewela obodo ha. Ebe Mata bụ nwaanyị na-anaghị egbu oge n’ime ihe, n’agbanyeghị na ọ nọ n’uju, o biliri n’agwaghị Meri, gbara gawa izute Jizọs.—Jọn 11:20.

Mgbe ọ hụrụ Nna ya ukwu, o kwupụtara ihe nọ na-echegbu ya na Meri kemgbe, nke bụ́: “Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.” N’agbanyeghị nke ahụ, Mata ka nwere olileanya na okwukwe. O kwukwara, sị: “Ma amaara m ugbu a na ihe niile ị ga-arịọ Chineke, Chineke ga-enye gị ha.” Jizọs kwuru okwu ozugbo iji mee ka o nwekwuo olileanya, sị: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.”—Jọn 11:21-23.

Mata chere na Jizọs na-ekwu banyere mbilite n’ọnwụ a ga-enwe n’ọdịnihu, n’ihi ya, ọ gwara ya, sị: “Amaara m na ọ ga-ebili n’oge mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” (Jọn 11:24) Okwukwe ya siri nnọọ ike n’ozizi ahụ. Ụfọdụ ndị ndú okpukpe ndị Juu, bụ́ ndị a na-akpọ ndị Sadusii, ekweghị na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ, n’agbanyeghị na ọ bụ ozizi doro anya nke dị n’Akwụkwọ Nsọ e ji ike mmụọ nsọ dee. (Daniel 12:13; Mak 12:18) Ma, Mata maara na Jizọs kụziri banyere mbilite n’ọnwụ nakwa na o meedịla ka ndị mmadụ si n’ọnwụ bilie—ọ bụ ezie na ọ dịghị onye n’ime ha nọruru ka Lazarọs tupu a kpọlite ya. Mata amaghị ihe na-aga imenụ.

Jizọs kwuziri okwu a anyị na-agaghị echefu echefu: “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ.” N’ezie, Jehova Chineke enyela Ọkpara ya ikike ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ n’ụwa niile n’ọdịnihu. Jizọs jụrụ Mata, sị: “Ì kwere nke a?” Mata zaziri ihe ahụ e kwuru ná mmalite isiokwu a. O kweere na Jizọs bụ Kraịst, ma ọ bụ Mesaya ahụ, na ọ bụ Ọkpara Jehova Chineke nakwa na ndị amụma eburula ụzọ kwuo na ọ ga-abịa n’ụwa.—Jọn 5:28, 29; 11:25-27.

Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, hà ji ụdị okwukwe ahụ kpọrọ ihe? Ihe ndị mezirinụ n’ihu Mata zara ajụjụ ahụ nke ọma. Mata gbaara ọsọ gawa ịkpọ nwanne ya nwaanyị. Mgbe nke ahụ gasịrị, Mata hụrụ mwute Jizọs nwere mgbe ọ na-agwa Meri na ọtụtụ ndị na-eru uju so ya okwu. Ọ hụrụ ka anya mmiri gbara Jizọs ka ọ na-egosi oké mwute o nwere maka ihe mgbu ọnwụ na-akpata. Ọ nụrụ mgbe Jizọs nyere iwu ka a kwapụ nkume e ji dọchie ọnụ ili nwanne ya nwoke.—Jọn 11:28-39.

Ebe Mata bụ onye na-ekwu ihe otú ọ dị, o kwuru na ọ ga-abụrịrị na ozu nwanne ya esiwela ísì n’ihi na o meela ụbọchị anọ ọ nwụrụ. Jizọs chetaara ya, sị: “Ọ̀ kwa m gwara gị na ọ bụrụ na i kwere, ị ga-ahụ ebube Chineke?” Mata kweere, ọ hụkwara ebube Jehova Chineke. Ozugbo ahụ, Jehova nyere Ọkpara ya ikike ịkpọlite Lazarọs n’ọnwụ! Chegodị ihe ndị mere n’ụbọchị ahụ, bụ́ ndị Mata na-agaghị echefu echefu: Oké olu Jizọs ji kpọọ òkù, sị, “Lazarọs, pụta!”; obere mkpọtụ a nụrụ n’ọgba ahụ e liri Lazarọs ka o biliri ma buru ákwà ndị e ji kee ya jiri nwayọọ nwayọọ na-apụta; iwu Jizọs nyere, nke bụ́, “Tọpụnụ ya ákwà ma hapụ ya ka ọ laa”; nakwa oké obi ụtọ Mata na Meri ji nnọọ gaa makụọ nwanne ha nwoke. (Jọn 11:40-44) Uju niile Mata na-eru kwụsịrị!

Akụkọ a gosiri na mbilite n’ọnwụ abụghị nrọ; ọ bụ ozizi Baịbụl nke na-eme anyị obi ụtọ na ihe metụrụla eme. Ọ na-atọ Jehova na Ọkpara ya ụtọ ịgọzi ndị nwere okwukwe, dị nnọọ ka ha gọziri Mata, Meri, na Lazarọs. Ha ga-agọzikwa gị otú ahụ ma ọ bụrụ na i nwee okwukwe siri ike ka nke Mata. *

“Mata Nọkwa Na-eje Ozi”

Ọ bụ naanị otu ugboro ọzọ ka Baịbụl kpọrọ Mata aha. Ọ bụ ná mmalite nke izu ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa. Ebe Jizọs maara nke ọma nsogbu ndị na-eche ya, o kpebiri ọzọ ibi na Betani, bụ́ ebe ahụ́ na-eru ya ala. Ọ ga na-esi n’ebe ahụ eme njem dị kilomita atọ ịga Jeruselem. Jizọs na Lazarọs nọ na-eri nri n’ụlọ Saịmọn onye ekpenta, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka e kwuru ihe ikpeazụ a gwara anyị banyere onye anyị na-ekwu okwu ya, nke bụ́: “Mata nọkwa na-eje ozi.”—Jọn 12:2.

Nke ahụ bụ nnọọ ihe e ji mara nwaanyị ahụ dị uchu! Mgbe mbụ a kọọrọ anyị banyere ya na Baịbụl, ọ nọ na-arụ ọrụ; mgbe ikpeazụ a kọọrọ anyị banyere ya, ọ ka nọ na-arụ ọrụ, na-eme ihe niile o nwere ike ime iji lekọta ndị ya na ha nọ. Ọgbakọ Ndị Kraịst taa nwere ụmụ nwaanyị ndị dị ka Mata, bụ́ ndị nwere obi ike ma na-emesapụ aka, ndị na-egosi okwukwe ha mgbe niile site n’iwepụta onwe ha ịrụrụ ndị ọzọ ọrụ. O yiri ka Mata ọ̀ nọgidere na-eme nnọọ otú ahụ. Ya bụrụ otú ahụ, ọ kpara àgwà onye maara ihe, n’ihi na nsogbu ka ga-abịara ya.

N’ime abalị ole na ole, Mata diri ogbugbu ọjọọ e gburu Nna ya ukwu, bụ́ Jizọs. E wezụga nke ahụ, ndị ihu abụọ ahụ obi fere azụ gburu ya kpebisiri ike igbukwa Lazarọs, ebe ọ bụ na mbilite n’ọnwụ ya na-eme ka okwukwe ọtụtụ ndị nwere na Jizọs na-esikwu ike. (Jọn 12:9-11) O dokwara anya na ọnwụ mechara tọsaa Mata na ụmụnne ya ọ hụrụ n’anya. Anyị amaghị otú o si mee ma ọ bụ mgbe o mere, ma anyị ji otu ihe n’aka: Okwukwe siri ike Mata nwere nyeere ya aka ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ. Ọ bụ ya mere Ndị Kraịst taa ji kwesị iṅomi okwukwe Mata.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 27 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe Baịbụl na-akụzi banyere mbilite n’ọnwụ, gụọ isi nke 7 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 11]

Ọbụna mgbe Mata na-eru uju, o kwere ka Jizọs nyere ya aka ilekwasị anya n’ihe ndị ga-eme ka okwukwe ya sie ike

[Foto dị na peeji nke 12]

Ọ bụ ezie na Mata ‘na-echegbu onwe ya, na-esogbukwa onwe ya,’ o ji obi umeala nabata mgbazi

[Foto dị na peeji nke 15]

A gọziri Mata maka okwukwe o nwere na Jizọs mgbe a kpọlitere nwanne ya nwoke n’ọnwụ