Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

OLEE ihe mere otu nwa okorobịa nwere mmasị n’egwú rọk, bụ́ onye na-eze ndị mmadụ eze, ji mụta ịhụ ndị mmadụ n’anya ma malite inyere ndị ọzọ aka? Olee ihe mere otu nwoke onye Meksiko ji kwụsị ibi ndụ rụrụ arụ? Olee ihe mere otu n’ime ndị kacha eme nke ọma n’ọsọ ịnyịnya ígwè na Japan ji hapụ ya n’ihi mgbalị ọ na-eme ijere Chineke ozi? Ka anyị tụlee ihe ha kwuru.

“M dị mpako, na-akparị ndị mmadụ ma na-eme ihe ike.”—DENNIS O’BEIRNE

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1958

ABỤ M ONYE: INGLAND

DỤ M BIRI: ABỤ M ONYE EGWÚ RỌK NKE NA-EZE NDỊ MMADỤ EZE

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Papa m bụ onye Aịland, aghọkwara m onye Aịland nke na-ekpe okpukpe Katọlik. Ana m agakarị chọọchị n’onwe m, ọ bụ ezie na ọ naghị amasị m ịga. N’agbanyeghị nke ahụ, m nwere mmasị n’Okwu Chineke. Ana m ekpe ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe mgbe niile, echetakwara m otu ụbọchị m dịna n’àkwà m na-eche ihe ọ pụtara. Ana m ekebisị ya ekebisị, na-achọ ịmata ihe nke ọ bụla pụtara.

Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na ise, esonyeere m òtù ndị Rasta. Enwekwara m mmasị n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị dị ka Òtù Na-emegide Ndị Nazi. Ma, m ka na-esosi òtù ndị egwú rọk na-enupụ isi ike. M na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, karịsịa igbo, bụ́ nke m na-aṅụ kwa ụbọchị. Ebe m na-ebi ndụ “Àchọrọ m ịma?” m na-aṅụ oké mmanya, jiri ndụ m na-eti epele, anaghịkwa m echebara ndị ọzọ echiche. M na-eze ndị mmadụ eze, ọ na-esikwara m ike ịgwa onye ọ bụla okwu ọ gwụla ma m̀ hụrụ na ọ dị oké mkpa. Anadịghị m ekwe ka e see m foto. M cheta ụdị ndụ m biri mgbe ahụ, m na-ahụ na m dị mpako, na-akparị ndị mmadụ ma na-eme ihe ike. Ọ bụ naanị onye mụ na ya dị n’ezigbo mma ka m na-emeso omume obiọma ma na-emesapụrụ aka.

Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri abụọ, amalitere m inwe mmasị na Baịbụl. Otu enyi m na-ere ọgwụ ọjọọ malitere ịmụ Baịbụl mgbe ọ nọ mkpọrọ, mụ na ya kwurịtakwara okwu ruo ogologo oge banyere okpukpe, Chọọchị, na ọrụ Setan na-arụ n’ụwa. Azụrụ m Baịbụl ma malite ịmụ ya n’onwe m. Mụ na enyi m nwoke ahụ na-agụ ebe ụfọdụ na Baịbụl, zukọọ iji tụlee ihe ndị anyị mụtara na ya, kwubizie ihe ebe ahụ pụtara. Anyị mere nke a ruo ọtụtụ ọnwa.

Lekwa ụfọdụ n’ime ihe ndị anyị kwubiri mgbe anyị gụchara ebe ụfọdụ na Baịbụl: na anyị bi n’oge ikpeazụ nke ụwa a; na Ndị Kraịst kwesịrị ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke; na ha ekwesịghị ịbụ nke ụwa, nke pụtakwara na ha agaghị na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị; nakwa na Baịbụl na-enye ezi nduzi n’ihe banyere omume. Ọ bịara doo anyị anya na ihe Baịbụl na-ekwu bụ eziokwu nakwa na ọ ga-abụrịrị na e nwere otu ezi okpukpe. Ma olee nke ọ bụ? Anyị chere echiche banyere chọọchị ndị a ma ama, tụlee okomoko ha na-eme nakwa otú ha si etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, anyị hụkwara na Jizọs emetụghị ụdị ihe ahụ. Anyị maara na Chineke ejighị ha arụ ọrụ, n’ihi ya, anyị kpebiri inyocha ụfọdụ n’ime okpukpe ndị a na-amachaghị ama iji hụ ihe ha na-akụzi.

Anyị na-agakwuru ndị na-ekpe okpukpe ndị ahụ ma jụọ ha ọtụtụ ajụjụ. Anyị maara ihe Baịbụl kwuru banyere nke ọ bụla n’ime ajụjụ ndị ahụ, n’ihi ya, anyị na-amata ozugbo ma ihe ha zara ọ̀ dabara n’ihe Okwu Chineke kwuru. Mgbe ọ bụla anyị na ha nọkọchara otú ahụ, m na-ekpegara Chineke ekpere, sị, ‘Ọ bụrụ na okpukpe nke ndị ahụ bụ ezi okpukpe, biko, mee ka m chọọ ịgakwuru ha ọzọ.’ Ma, mgbe anyị na ndị okpukpe dị iche iche nọkọchara otú ahụ ruo ọtụtụ ọnwa, ahụghị m okpukpe nke ji Baịbụl zaa ajụjụ anyị; ọ dịkwaghị nke ọ bụla n’ime ha m chọrọ ka mụ na ha nọkọọ ọzọ.

Mụ na enyi m nwoke mechara zute Ndịàmà Jehova. Anyị jụrụ ha otu ajụjụ ndị ahụ anyị na-ajụ, ma ha ji Baịbụl zaa ha. Ihe ha kwuru dabara nnọọ n’ihe anyị mụtarala. N’ihi ya, anyị jụziri ha ajụjụ ndị anyị na-achọtabeghị azịza ha na Baịbụl—dị ka ihe atụ, anyị jụrụ ha banyere otú Chineke si ele ise sịga na ịṅụ ọgwụ ọjọọ anya. Ha jikwa Okwu Chineke zaa ha. Anyị kwetara ịga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Ịga ọmụmụ ihe siiri m ike. M na-eze ndị mmadụ eze nke na achọghị m ka ndị ahụ na-eji ejiji nke ọma ma nwee ihu ọchị bịakwutewe m. Echere m na ụfọdụ n’ihe ha bu ihe ọjọọ n’obi, achọkwaghị m ịga ọmụmụ ihe ọzọ. Ma dị ka m na-eme mgbe niile, ekpegaara m Chineke ekpere ka o mee ka m nwee mmasị ịga ọmụmụ ihe ha ọzọ ma ọ bụrụ na ha bụ ezi okpukpe, agụụ iso Ndịàmà Jehova amụ Baịbụl gụsikwara m ike.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Amaara m na ọ dị mkpa ka m kwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ, akwụsịlikwara m ya. Nke siiri m ezigbo ike bụ ịkwụsị ise sịga. Anwara m ịkwụsị ya ọtụtụ ugboro, ma akwụsịlighị m ya. Mgbe m nụrụ banyere ndị tụfuru nnọọ sịga ha, gharakwa ịṅụ ya ọzọ, agwara m Jehova okwu banyere ya. Mgbe e mechara, akwụsịrị m ise sịga site n’enyemaka Jehova. Amụtara m uru ọ bara ịgwa Jehova otú obi dị m n’ekpere.

Nnukwu mgbanwe ọzọ m mere bụ n’uwe m na n’ejiji m. Mgbe mbụ m gara ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ntutu m guzocha ọtọ, etejikwara m ebe ụfọdụ ka ọ na-acha anụnụ anụnụ. Mgbe e mechara, etejiri m ya ka ọ chatụwa odo odo. Eyi m traụza jiins na jaket akpụkpọ anụ e dere ihe na ya. Ahụghị m mkpa ọ dị ime mgbanwe, n’agbanyeghị na Ndịàmà ji obiọma na-agwa m ka m mee otú ahụ. Ma, n’ikpeazụ, echere m echiche banyere 1 Jọn 2:15-17, nke kwuru, sị: “Unu ahụla ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya maka Nna anyị adịghị n’ime ya.” Aghọtara m na ọdịdị m gosiri na m hụrụ ụwa a n’anya nakwa na ọ bụrụ na m chọrọ igosi na m hụrụ Chineke n’anya, m ga-agbanwerịrị. Emere m otú ahụ.

Ka oge na-aga, aghọtara m na ọ bụghị naanị Ndịàmà chọrọ ka m na-abịa ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Ndị Hibru 10:24, 25 gosiri m na ọ bụ ihe Chineke chọrọ ka m mee. Mgbe m malitere ịga ọmụmụ ihe niile ma na-amata nnọọ ndị mmadụ, ekpebiri m ka e mee m baptizim iji gosi na m nyefeela Jehova onwe m.

URU NDỊ M RITERELA: Otú Jehova si ekwe ka anyị na ya na-enwe mmekọrịta chiri anya na-emetụ m n’ahụ́. Ọmịiko ya na otú o si elekọta m kpaliri m iṅomi ya na iso Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, bụ́ onye nlereanya m. (1 Pita 2:21) Amụtala m na n’agbanyeghị na m na-agbalị inwe àgwà e ji mara Ndị Kraịst, m ka nwere ike inwe ihe ndị ga-eme ka m dị iche ná ndị ọzọ. Agbaala m mbọ ịhụ ndị mmadụ n’anya na ichebara ha echiche. M na-agbalị iṅomi Kraịst n’otú m si emeso nwunye m na nwa m nwoke ihe. M na-echebara nnọọ ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwaanyị echiche. Iso Kraịst emeela ka m nwee ùgwù, obi ike, nweekwa ike ịhụ ndị ọzọ n’anya.

“Ha kwanyeere m ùgwù.”—GUADALUPE VILLARREAL

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1964

ABỤ M ONYE: MEKSIKO

NDỤ M BIRI: EBIRI M NDỤ RỤRỤ ARỤ

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Abụ m otu n’ime ụmụ asaa a zụlitere na Hamosilo, na Sonora, Meksiko, bụ́ obodo ndị ogbenye ọnụ ntụ. Nna m nwụrụ mgbe m ka dị obere, n’ihi ya, nne m rụrụ ọrụ iji lekọta anyị. M na-agbakarị ụkwụ ọtọ n’ihi na anyị enweghị ego iji zụọ akpụkpọ ụkwụ. Mgbe m ka dị obere, amalitere m ịrụ ọrụ iji nye aka na-egbo mkpa ezinụlọ anyị. Dị ka ọ dị n’ọtụtụ ezinụlọ, anyị dị ọtụtụ biri n’otu ọnụ ụlọ.

Ọtụtụ mgbe, nne anyị anaghị anọ ya iji chebe anyị bụ́ ụmụaka. Mgbe m dị afọ isii, otu onye dị afọ iri na ise malitere imetọ m. O metọrọ m ruo ọtụtụ afọ. Nke ahụ mere ka m nọrọ ná mgbagwoju anya n’ihe banyere mmekọahụ. Echere m na ọ dịghị ihe dị njọ n’inwe mmasị ka mụ na ndị nwoke na-enwe mmekọahụ. Mgbe m gakwuuru ndị dọkịta ma ọ bụ ndị ụkọchukwu ka ha nyere m aka, ha gwara m na enweghị m nsogbu, nakwa na mmasị m na-enwe n’ahụ́ ụmụ nwoke ibe m adịghị njọ.

Mgbe m dị afọ iri na anọ, ekpebiri m ime ka ụwa mara na m bụ nwoke na-edina nwoke ibe ya. Otú ahụ ka m mere ruo afọ iri na otu sochirinụ, mụ na ọtụtụ ndị nwoke bidiri n’oge ahụ. M mechara gaa mụọ otú e si eme isi ma mepee ebe a na-eme isi. Ma, obi adịghị m mma. Ebiri m ndụ ahụhụ, o nweghịkwa onye m tụkwasịrị obi. Obi m gwara m na ihe m na-eme adịghị mma. Amalitere m ịju onwe m, sị, ‘È nwere ndị bụ́ ezigbo mmadụ n’ụwa a?’

Echetara m nwanne m nwaanyị. Ya na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, e meechakwa mee ya baptizim. Ọ nọ na-akọrọ m ihe ọ na-amụta, ma egeghị m ya ntị. N’agbanyeghị nke ahụ, otú o si ebi ndụ na alụmdi na nwunye ya masịrị m. Ahụrụ m na ya na di ya hụrụ nnọọ ibe ha n’anya ma na-akwanyere ibe ha ùgwù. Ha na-eji obiọma emeso ibe ha ihe. Ka oge na-aga, mụ na otu Onyeàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Ná mmalite, mụ na ya na-amụ ihe, ma obi m adịghị na ya. Ma, ihe gbanwere.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Ndịàmà gwara m ka m bịa otu n’ime ọmụmụ ihe ha, m gakwara. Ahụtụbeghị m ihe dị ka ya. Ndị mmadụ na-achị m ọchị, ma Ndịàmà emeghị otú ahụ. Ha ji obiọma kelee m ma kwanyere m ùgwù. Nke ahụ metụrụ m n’ahụ́.

M nwekwuru mmasị n’ebe Ndịàmà nọ mgbe m gara mgbakọ ha. M hụrụ na ọbụna mgbe ha zukọrọ n’ìgwè, ha dị ka nwanne m nwaanyị. Ha nwere ezi obi ma na-akwụwa aka ọtọ. Ajụrụ m onwe m ma ọ̀ ga-abụ ndị a bụ ndị ezi mmadụ m nọ na-achọ kemgbe. Ịhụnanya ha, ịdị n’otu ha na otú ha si jiri Baịbụl zaa ajụjụ niile m jụrụ ha tụrụ m n’anya. Aghọtara m na ọ bụ Baịbụl mere ha ji ebi ezi ndụ. Aghọtakwara m na m ga-agbanwerịrị ndụ m ma ọ bụrụ na m chọrọ ịghọ otu n’ime ha.

N’ezie, m gbanwere ndụ m kpamkpam, n’ihi na m nọ na-ebi ndụ ka nwaanyị. Ọ dịkwa m mkpa ịgbanwe otú m si ekwu okwu, àgwà m, uwe m, otú m si edozi isi m, na ụdị ndị enyi mụ na ha na-akpa. Ndị enyi mbụ m malitere ịchị m ọchị, na-asị m: “Gịnị mere i ji na-eme ihe a? Otú ị dịbu dị mma. Amụla Baịbụl. I nwere ihe niile ị chọrọ.” Ma, ihe kacha siere m ike ịgbanwe bụ ndụ rụrụ arụ m na-ebi.

Ma, m maara na m nwere ike ime nnukwu mgbanwe, n’ihi na ihe Baịbụl kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 6:9-11 ruru m n’obi. O kwuru, sị: “Gịnị? Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị ajọ omume agaghị eketa alaeze Chineke? Unu ekwela ka e duhie unu. Ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ma ọ bụ ndị ikom ndị na-ekwe ka ndị ikom dinaa ha, ma ọ bụ ndị ikom na-edina ndị ikom . . . agaghị eketa alaeze Chineke. Ma nke ahụ bụkwa ihe ụfọdụ n’ime unu bụbu. Ma a sachawo unu.” Jehova nyeere ndị mmadụ n’oge ahụ aka ime mgbanwe, o nyekwaara m aka. O were m ọtụtụ afọ na nnukwu mgbalị, ma nduzi Ndịàmà nyere m na otú ha si hụ m n’anya nyeere m ezigbo aka.

URU NDỊ M RITERELA: Taa, ana m ebi ezigbo ndụ. Alụọla m nwaanyị, mụ na nwunye m na-akụziri nwa anyị nwoke otú ọ ga-esi na-eme ihe Baịbụl kwuru. Anaghịzi m ebi ụdị ndụ m biri na mbụ, ana m erite ọtụtụ uru n’ọgbakọ, nweekwa ọtụtụ ihe ùgwù. Abụ m okenye n’ọgbakọ, enyerela m ndị ọzọ aka ịmụ eziokwu nke Okwu Chineke. Mgbanwe ndị m mere ná ndụ m mere nne m ezigbo obi ụtọ nke na o kwetara ịmụ Baịbụl, ọ ghọọkwala Onye Kraịst e mere baptizim kemgbe. Otu nwanne m nwaanyị nke biri ndụ rụrụ arụ ghọkwara Onyeàmà Jehova.

Ọbụna ụfọdụ ndị maara m mgbe m ka na-ebi ndụ ọjọọ kwetara ugbu a na ndụ m akala mma. Amaara m ihe ndị kpatara mgbanwe ndị ahụ. N’oge gara aga, agakwuuru m ndị dọkịta ka ha nyere m aka, ma naanị ndụmọdụ ọjọọ ka ha nyere m. Ma, Jehova nyeere m ezigbo aka. O nwere mmasị n’ebe m nọ ma jiri ịhụnanya na ndidi meso m ihe, n’agbanyeghị na erughị m eru ka o meso m otú ahụ. Ihe mere ndụ m ji gbanwee bụ na Chineke ịhụnanya, onye dị ebube, ma nwee ọgụgụ isi nwere mmasị n’ebe m nọ ma chọọ ka m bie ndụ ka mma.

“Obi adịghị m ụtọ, owu na-ama m, ndụ m tọgbọkwa chakoo.”—KAZUHIRO KUNIMOCHI

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1951

ABỤ M ONYE: JAPAN

NDỤ M BIRI: ANA M ASỌ MPI EGWUREGWU ỊNYỊNYA ÍGWÈ

NDỤ M BIRI NA MBỤ: M tolitere n’otu obodo dị jụụ nwere ọdụ ụgbọ mmiri nke dị na Shizuoka Prifekchọ, Japan, bụ́ ebe ezinụlọ anyị dị mmadụ asatọ bi n’otu obere ụlọ. Nna m na-ere ịnyịnya ígwè. Malite mgbe m dị obere, ọ na-akpọ m aga ebe a na-agba ọsọ ịnyịnya ígwè ma mee ka m nwee mmasị n’egwuregwu ahụ. Nna m maliteziri ime atụmatụ ka m ghọọ onye ji ịgba ịnyịnya ígwè mere aka ọru. Mgbe m ka nọ n’agbata klas nke mbụ na nke atọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ọ malitere kụzisiwere m egwuregwu ahụ ike. Mgbe m nọ n’agbata klas nke anọ na nke isii n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, agbara m onye mbụ n’asọmpi a na-enwe kwa afọ ná mba anyị. E nyere m ohere ịga mahadum n’efu, ma ekpebiri m ịgawa nnọọ ụlọ akwụkwọ ebe a na-amụ ịgba ịnyịnya ígwè. Mgbe m dị afọ iri na itoolu, eji m ịgba ịnyịnya ígwè mere aka ọrụ.

N’oge ahụ, ebu m n’obi ịghọ azụ eru ala n’ịgba ịnyịnya ígwè na Japan. Emere m atụmatụ inwe nnukwu ego ka m nwee ike inye ezinụlọ m ihe niile ha chọrọ ma mee ka ahụ́ ruo ha ala. Ejighị m ọzụzụ m egwuri egwu. Mgbe ọ bụla ọzụzụ ahụ tara akpụ a na-enye m ma ọ bụ asọmpi siri ike anyị nwere mere ka m chọọ ịkwụsị, m na-agwa onwe m ugboro ugboro na a mụrụ m ịgba ọsọ ịnyịnya ígwè, na m ga-atachi obi! Ọ bụkwa nnọọ ihe m mere. Ntachi obi m malitere rụpụtawara m ezigbo ihe. N’afọ nke mbụ m, m gbara onye mbụ ná ndị malitere ọhụrụ. N’afọ nke abụọ, eruru m eru iso sọọ mpi a ga-eji mata onye bụ́ ọkaibe na Japan. Agbara m onye nke abụọ ugboro isii n’asọmpi ahụ.

Ka m nọgidere na-eso ná ndị mbụ n’ọsọ ndị a na-erite ihe na ha, a malitere ịkpọ m ọkàibe Tokai, bụ́ ógbè dị na Japan. Ana m achọ ịgba onye mbụ mgbe niile. Ka oge na-aga, a malitere ịsọ m asọ n’ihi na anaghị m eme ebere n’asọmpi. Ego m na-enweta bukwuru ibu, achọpụtakwara m na m nwere ike ịzụ ihe ọ bụla masịrị m. Azụrụ m ụlọ nwere ebe mmega ahụ́ nke ihe ọgbara ọhụrụ ndị kacha mma juru. Azụrụ m ụgbọala a rụrụ ná mba ọzọ, bụ́ nke ego ya ruru ego e ji azụ ụlọ. M malitere iji ego m azụ ala na ụlọ nakwa aka òkè maka ọdịnihu.

N’agbanyeghị nke ahụ, obi adịghị m ụtọ, owu na-ama m, ndụ m tọgbọkwa chakoo. N’oge ahụ, alụọla m nwaanyị ma mụta ụmụ, ma ọtụtụ mgbe ana m eweso ndị ezinụlọ m iwe. Obere ihe na-eme ka m weso nwunye m na ụmụ m iwe. Ha malitere iji ụjọ na-ele m anya n’ihu iji mara ma iwe ò jidekwala m.

Ma, ka oge na-aga, nwunye m na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Nke ahụ kpatara ọtụtụ mgbanwe. O kwuru na ya chọrọ ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà, n’ihi ya, m kpebiri na ezinụlọ anyị niile ga-aga ya. M ka na-echeta ụbọchị otu okenye bịara n’ụlọ anyị n’abalị ma malite ịmụrụ m Baịbụl. Ihe m mụtara ruru m n’obi.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Agaghị m echefu otú obi dị m mgbe m gụchara Ndị Efesọs 5:5. O kwuru, sị: “Ọ dịghị onye na-akwa iko ma ọ bụ onye na-adịghị ọcha ma ọ bụ onye anyaukwu—nke pụtara ịbụ onye na-ekpere arụsị—nwere ihe nketa ọ bụla n’alaeze nke Kraịst na nke Chineke.” Achọpụtara m na ọsọ ịnyịnya ígwè na ịgba chaa chaa na-aga ụkwụ na ụkwụ, nakwa na ọsọ ịnyịnya ígwè na-eme ka mmadụ nwee anyaukwu. Akọnuche m nyewere m nsogbu. Echere m na ọ bụrụ na m chọrọ ime uche Jehova Chineke, m kwesịrị ịkwụsị ọsọ ịnyịnya ígwè. Ma, o siiri m ike ime mkpebi ahụ.

N’afọ ahụ, m ka sọchara mpi m kacha tọọ m ụtọ, ọ gụkwara m agụụ ịsọkwu. Ma, achọpụtara m na ịmụ Baịbụl na-eme ka ahụ́ na obi ruo m ala, bụ́ nke dị nnọọ iche n’ụdị mmụọ ga-eme ka m merie n’asọmpi! Asọrọ m mpi naanị ugboro atọ mgbe m malitechara ịmụ Baịbụl, ma n’obi m, echefuchabeghị m ọsọ ịnyịnya ígwè. Amaghịkwa m otú m ga-esi na-akpa afọ ezinụlọ m. Amaghị m ihe m ga-eme eme, gaa ihu adịghị mma, gaa azụ adịghị mma, ndị ikwu m malitekwara inye m nsogbu n’ihi okpukpe ọhụrụ m. O wutere nna m nke ukwuu. Ebe m na-amaghị ihe m ga-eme eme, amalitere m ichekasị onwe  m, bụ́ nke kpataara m ọnyá afọ.

Ihe nyeere m aka ịtachi obi n’oge ahụ ihe siri ike bụ na m nọgidere na-amụ Baịbụl ma na-aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Nwayọọ nwayọọ, okwukwe m sikwuru ike. Arịọrọ m Jehova ka ọ nụ ekpere m ma nyere m aka ịhụ na ọ na-anụ ya. Obi rukwuru m ala mgbe nwunye m mesiri m obi ike na ya nwere ike inwe obi ụtọ ma ọ bụrụgodị na ya ebighi ná nnukwu ụlọ. Eji m nwayọọ nwayọọ nwewe ọganihu.

URU NDỊ M RITERELA: Amụtara m na ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:33 bụ nnọọ eziokwu. O kwuru, sị: “Burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile.” “Ihe ndị ọzọ a” Jizọs kwuru okwu ha, ya bụ, ihe ndị dị mkpa ná ndụ, akọtụbeghị anyị. Ọ bụ ezie na ego m na-akpata ugbu a ji obere ihe gafee otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ihe m na-enweta mgbe m na-agba ọsọ ịnyịnya ígwè, ọ dịbeghị ihe kọrọ mụ na ezinụlọ m kemgbe iri afọ abụọ.

Nke kadị eme m obi ụtọ bụ na mgbe mụ na ndị kwere ekwe ibe m na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ na-efekọ ofufe, m na-enwe ụdị ọṅụ na obi ụtọ m na-enwetụbeghị. Anaghị m ama mgbe oge ji aga. Ezinụlọ m akakwala nnọọ mma. Ụmụ m ndị nwoke atọ na ndị nwunye ha aghọchaala ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi.