Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gehena ọ̀ bụ ebe e ji ọkụ ata mmadụ ahụhụ?

Gehena ọ̀ bụ ebe e ji ọkụ ata mmadụ ahụhụ?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Gehena ọ̀ bụ ebe e ji ọkụ ata mmadụ ahụhụ?

▪ Na Matiu, Mak, Luk, na Jọn, Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị ka ha ghara ikwe ka ikpe Gehena ma ha. O doro anya na Jizọs achọghị ka ha jiri ịdọ aka ná ntị ahụ gwurie egwu. Ma, ihe ọ na-ekwu ọ̀ bụ ntaramahụhụ ebighị ebi n’ọkụ ala mmụọ?—Matiu 5:22.

Ka anyị buru ụzọ tụlee okwu ahụ n’onwe ya. Okwu Grik bụ́ Geʹen·na na okwu Hibru bụ́ geh Hin·nomʹ, nke pụtara “ndagwurugwu Hinọm,” ma ọ bụ geh veneh-Hin·nomʹ, nke pụtara “ndagwurugwu ụmụ Hinọm,” bụ otu ihe. (Jọshụa 15:8; 2 Ndị Eze 23:10) Ebe a, bụ́ nke a na-akpọ Wadi er-Rababi taa, bụ ndagwurugwu dị ezigbo omimi ma dị warara nke dị n’ebe ndịda na n’ebe ndịda ebe ọdịda anyanwụ Jeruselem.

N’oge ndị eze Juda, malite na narị afọ nke asatọ Tupu Oge Anyị, a na-anọ n’ebe a efe arụsị, nke isure ụmụaka n’ọkụ so na ya. (2 Ihe E Mere 28:1-3; 33:1-6) Jeremaya onye amụma buru amụma na ndị Babịlọn ga-anọ n’otu ndagwurugwu ahụ gbuo ndị Judia mgbe Chineke ga-emezu ikpe o kpere ha n’ihi ajọ omume ha. *Jeremaya 7:30-33; 19:6, 7.

Onye Juu bụ́ ọkachamara, bụ́ David Kimhi (ihe dị ka 1160-1235 Oge Anyị), kwuru na obodo Jeruselem mechara jiri ndagwurugwu ahụ mere ebe mkpofu ahịhịa. Ebe ahụ bụ ebe a na-akpọ ihe ndị e kpofuru ekpofu ọkụ nke ọkụ ya na-anaghị anyụ anyụ. Ihe ọ bụla a tụbara n’olulu ahụ na-ebibi kpamkpam, ghọọ ntụ.

Ọtụtụ ndị nsụgharị Baịbụl ejirila aka ha kpebie ịsụgharị Geʹen·na “ọkụ ala mmụọ.” (Matiu 5:22, Bible Nsọ nke Union Version) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha chere na ozizi ahụ ndị ọgọ mmụọ na-ezi nke bụ́ na a na-ekpe ndị ajọ omume ikpe mgbe ha nwụsịrị ma tụba ha n’ọkụ na ọkụ nkịtị ahụ dị ná mpụga Jeruselem bụ otu ihe. Ma, Jizọs ekwughị ihe ọ bụla na-egosi na a na-ata mmadụ ahụhụ na Gehena.

Jizọs maara na Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova, enwetụghị mmasị n’ịkpọ ndị mmadụ ọkụ ná ndụ. Mgbe Chineke na-ekwu banyere ihe e ji Gehena mee n’oge Jeremaya onye amụma, o kwuru, sị: “Ha ewuwo ebe ndị dị elu na Tofet, nke dị na ndagwurugwu nwa Hinọm, iji suree ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom n’ọkụ, nke bụ́ ihe m na-enyeghị n’iwu, ọ bataghịkwa m n’obi.” (Jeremaya 7:31) E wezụga nke ahụ, ịta ndị nwụrụ anwụ ahụhụ na àgwà ịhụnanya Chineke nwere adabaghị, ọ dabaghịkwa n’ihe doro anya Baịbụl na-akụzi nke bụ́ na ndị nwụrụ anwụ “amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.”—Ekliziastis 9:5, 10.

Ihe Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru banyere “Gehena” bụ mbibi ebighị ebi nke ga-esite n’ikpe ọmụma Chineke. N’ihi ya, ihe “Gehena” pụtara yiri ihe “ọdọ ọkụ ahụ” e kwuru banyere ya n’akwụkwọ Mkpughe pụtara. Ha abụọ nọchiri anya mbibi ebighị ebi, nke olileanya mbilite n’ọnwụ na-adịghị na ya.—Luk 12:4, 5; Mkpughe 20:14, 15.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru banyere amụma a, sị: “Mgbe a ga-ebibi Jeruselem, a ga-egbu ọtụtụ ndị bi na ya nke na a ga-atụba ozu ha na ndagwurugwu ahụ, n’elighị ha eli, ka ha ree ma ọ bụ ka ọkụ gbaa ha.”