Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jiri Ozi Ị Na-ejere Jehova Kpọrọ Ihe

Jiri Ozi Ị Na-ejere Jehova Kpọrọ Ihe

Jiri Ozi Ị Na-ejere Jehova Kpọrọ Ihe

“Ihe ọ bụla nke dị mkpa, . . . na-echebaranụ ihe ndị a echiche.”—FIL. 4:8.

1, 2. Olee ihe merela ka ọtụtụ ndị na-ele ndụ anya ka ihe na-enweghị isi, oleekwa ajụjụ nke a na-akpata?

OGE A anyị bi na ya n’ụwa bụ oge a kacha enwe nsogbu ndị tara akpụ. O nwere ike isiri ndị ha na Chineke na-adịghị ná mma ezigbo ike idi ihe ha na-ahụ ‘n’oge a dị oké egwu, nke tara akpụ.’ (2 Tim. 3:1-5) Ọ bụ hanwa na-enyere onwe ha aka otú ha nwere ike. Ọtụtụ ndị na-eji oge ha niile na-achọ ihe ntụrụndụ ebe ha na-agba mbọ ime ka ọ ghara ịdị ka ụwa ọ̀ ka ha njọ.

2 Ndị mmadụ na-ebutekarị ihe ụtọ ụzọ ebe ha na-agbalị ka ha die nsogbu ndị na-abịara ha. Ma, ọ bụrụ na Ndị Kraịst akpacharaghị anya, ha nwere ike ịna-ebi ụdị ndụ a. Olee otú anyị ga-esi ghara ibi ụdị ndụ a? Nke a ọ̀ pụtara na o nweghị mgbe anyị ga-atụrụ ndụ? Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị anaghị ekwe ka ịtụrụ ndụ gbochie anyị ịrụ ọrụ e nyere anyị? Olee ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru nke kwesịrị iduzi anyị, ka ọ ga-abụ, n’agbanyeghị na ihe adịghịrị anyị mfe, anyị agaghị na-eme ka ụwa ọ̀ ka anyị njọ?

Iji Ihe Ndị Dị Mkpa Akpọrọ Ihe n’Ụwa nke Hụrụ Ihe Ụtọ n’Anya

3, 4. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si eme ka anyị ghọta ihe mere anyị ji kwesị iji ihe ndị dị mkpa kpọrọ ihe?

3 O doro anya na ụwa a ‘hụrụ ihe ụtọ n’anya.’ (2 Tim. 3:4) Ọ bụrụ na anyị esoro ndị mmadụ na-achụ ihe ụtọ ka a na-anwụ anwụ, o nwere ike ime ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma. (Ilu 21:17) N’eziokwu, e nwere ezigbo ihe mere Pọl onyeozi ji nye anyị ndụmọdụ n’akwụkwọ ozi o degaara ma Timoti ma Taịtọs ka anyị jiri ihe ndị dị mkpa kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na anyị emee ihe o kwuru, anyị agaghị na-ele ndụ anya ka ihe na-enweghị isi otú ụwa si ele ya.—Gụọ 1 Timoti 2:1, 2; Taịtọs 2:2-8.

4 Ọtụtụ narị afọ tupu Pọl enye ndụmọdụ a, Sọlọmọn dere banyere uru ọ bara ịhapụ ihe ụtọ mgbe ụfọdụ iji nwee ike ime ihe ndị dị mkpa ná ndụ. (Ekli. 3:4; 7:2-4) N’eziokwu, anyị kwesịrị ‘ịgbalịsi ike’ ka anyị wee nweta nzọpụta n’ihi na ndụ dị mkpụmkpụ. (Luk 13:24) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime nke a, anyị kwesịrị ịna-echebara ‘ihe ndị dị mkpa’ echiche. (Fil. 4:8, 9) Nke a pụtara na anyị kwesịrị iji ọrụ ndị na-egosi na anyị bụ Ndị Kraịst kpọrọ ihe.

5. Olee otu n’ime ihe ndị anyị kwesịrị iji kpọrọ ihe ná ndụ?

5 Dị ka ihe atụ, Ndị Kraịst na-agba mbọ ịrụsi ọrụ ike ka Jehova na Jizọs. (Jọn 5:17) Nke a na-eme ka a na-aja ha mma maka otú ha si adị uchu n’ọrụ ha nakwa maka otú ha si na-eme ihe n’eziokwu. Ọ dị mkpa karịchaa ka ndị isi ezinụlọ na-arụsị ọrụ ike ka ha wee nwee ike inye ezinụlọ ha ihe ndị na-akpa ha. A sị ka e kwuwe, onye na-anaghị enye ezinụlọ ya ihe ndị na-akpa ha ‘ajụwo’ okwukwe anyị, nke pụtakwara na ọ jụwo Jehova.—1 Tim. 5:8.

Jiri Ofufe Chineke Kpọrọ Ihe, Na-enwekwa Ọṅụ

6. Gịnị gosiri na anyị kwesịrị iji ofufe Jehova kpọrọ ihe?

6 Jehova chọrọ ka anyị jiri ife ya kpọrọ ihe mgbe niile. Dị ka ihe atụ, n’oge ahụ e nyere ụmụ Izrel Iwu Mozis, ha tara ahụhụ dị ukwuu mgbe ha kwụsịrị ife Jehova. (Jọsh. 23:12, 13) Na narị afọ mbụ Oge Anyị, ndị na-eso ụzọ Kraịst gbasiri mbọ ike ka a ghara iji ozizi ụgha na omume rụrụ arụ merụọ ofufe Chineke. (2 Jọn 7-11; Mkpu. 2:14-16) Taakwa, ezigbo Ndị Kraịst anaghị eji ofufe Chineke egwu egwu.—1 Tim. 6:20.

7. Olee otú Pọl si kwadebe ozi ọma o kwusara?

7 Ozi ọma anyị na-ekwusa na-enye anyị ọṅụ. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ọ ka na-enye anyị ọṅụ, anyị kwesịrị iji ya kpọrọ ihe, na-akwadebekwa nke ọma. Pọl kwuru otú o si echebara ndị ọ na-ezi ozi ọma echiche. O dere, sị: “Aghọwo m ihe niile n’ebe ụdị mmadụ niile nọ, ka m wee si n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ ndị. Ma ana m eme ihe niile n’ihi ozi ọma, ka m wee bụrụ onye na-ezisara ya ndị ọzọ.” (1 Kọr. 9:22, 23) Pọl nwere mmasị inyere ndị mmadụ aka ka ha na Chineke dịrị ná mma, o chebakwaara otú ọ ga-esi enyere onye ọ bụla n’ime ha aka echiche. Ọ bụ ya mere o ji gbaa ha ume, meekwa ka ha nwee mmasị ife Jehova.

8. (a) Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị anyị na-ekwusara ozi ọma anya? (b) Olee otú ịmụrụ ndị ọzọ Baịbụl si eme ka ozi ọma na-enye anyị ọṅụ?

8 Olee otú Pọl jiruru ozi ya kpọrọ ihe? Ọ dị njikere ịgbara Jehova na ndị ga-ege ntị n’ozi ọma ọ na-ekwusa ohu. (Rom 12:11; 1 Kọr. 9:19) Ọ bụrụ na anyị ekweta ịkụziri ndị mmadụ Okwu Chineke, ma ànyị na-eme nke a mgbe anyị na-amụrụ ha Baịbụl n’ụlọ ha, mgbe anyị gara ọmụmụ ihe, ma ọ bụkwanụ mgbe anyị na-enwe Ofufe Ezinụlọ, ànyị na-aghọta na o nwere ụgwọ anyị ji ndị anyị na-akụziri ihe? Anyị nwere ike ịna-eche na ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl mgbe niile bụ ibu arọ. Ọ bụ eziokwu na anyị kwesịrị iwepụta oge ka anyị wee nwee ike inyere ndị ọzọ aka, ma, nke a ọ́ bụghị ihe Jizọs bu n’uche mgbe ọ sịrị na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe”? (Ọrụ 20:35) Ọ bụrụ na anyị akụziere ndị ọzọ ihe ha ga-eme ka a zọpụta ha, anyị ga-enwe ọṅụ na-enweghị atụ.

9, 10. (a) Iji ihe ndị metụtara ofufe Chineke kpọrọ ihe ọ̀ pụtara na anyị agaghị atụsara ahụ́ ma soro ndị ọzọ tụrụ ndụ? Kọwaa. (b) Gịnị ga-eme ka okenye bụrụ onye na-agba ndị ọzọ ume na onye e nwere ike ịbịaru nso?

9 Iji ihe ndị metụtara ife Chineke akpọrọ ihe apụtaghị na anyị agaghị atụsara ahụ́ ma soro ndị ọzọ tụrụ ndụ. Jizọs setịpụrụ ezigbo ihe nlereanya na nke a. E wezụga iwepụta oge kụziere ndị mmadụ ihe, o wepụtakwara oge ya na ndị ọzọ ji nọrịa tụrụ ndụ. (Luk 5:27-29; Jọn 12:1, 2) Iji ihe ndị metụtara ife Chineke kpọrọ ihe apụtaghịkwa na anyị ga na-amachi ihu mgbe niile. A sị na Jizọs na-amachi ihu mgbe niile, ndị mmadụ agaaraghị abịa ya nso. Ahụ́ na-erudị ụmụaka ala ma ha na ya nọrọ. (Mak 10:13-16) Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Jizọs na nke a?

10 Otu nwanna nwoke kwuru banyere otu okenye, sị, “Ọ na-atụ anya ihe dị ukwuu n’aka onwe ya, ma ọ naghị atụ anya ihe dị ukwuu n’aka ndị ọzọ.” Ọ̀ bụ otú a ka i si eme? Ịtụ anya ihe ụfọdụ n’aka ndị ọzọ adịghị njọ. Dị ka ihe atụ, ụmụaka na-aka eme nke ọma ma ọ bụrụ na ndị mụrụ ha agwa ha ihe ụfọdụ ha tụrụ anya ka ha mee ma nyere ha aka ime ha. N’otu aka ahụ, ndị okenye nwere ike ịgba ndị nọ n’ọgbakọ ha ume ka ha na-eme nke ọma n’ọgbakọ ma tụọrọ ha aro otú ha nwere ike isi mee nke a. Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na okenye anaghị ebukọrọ ihe niile n’isi naanị ya, obi ga-eru ya ala, ọ ga-adịkwara ndị ọzọ mfe ịbịa ya nso. (Rom 12:3) Otu nwanna nwaanyị kwuru, sị: “Ọ gaghị amasị m ma ọ bụrụ na okenye ewere ihe niile ka ihe egwuregwu. Ma, ọ bụrụ na ọ na-amachi ihu mgbe niile, ọ ga-esi ike ịbịa ya nso.” Nwanna nwaanyị ọzọ sịrị na ọ na-adị ya ka ọ̀ na-esiri ndị mmadụ ike ịgaru ndị okenye ụfọdụ nso n’ihi na ha na-amachikarị ihu. Ndị okenye ekwesịghị ime ihe ga-eme ka ụmụnna ha ghara iji ọṅụ na-efe Jehova, bụ́ ‘Chineke onye obi ụtọ.’—1 Tim. 1:11.

Ịnara Ọrụ n’Ọgbakọ

11. Gịnị ka mmadụ ‘ịgbalị ka o ruo eru’ n’ọgbakọ pụtara?

11 Mgbe Pọl gbara ụmụnna nwoke ume ka ha gbaa mbọ ruo eruo ka e nyekwuo ha ihe ùgwù n’ọgbakọ, ihe o bu n’obi abụghị ka ha meere onwe ha aha. Kama nke ahụ, o dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbalị ka o ruo eru ịbụ onye nlekọta, agụụ ezi ọrụ na-agụ ya.” (1 Tim. 3:1, 4) Ụmụnna nwoke ndị ‘na-agbalị ka ha ruo eru’ kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-akpa àgwà ọma ndị ga-eme ka ha nwee ike ijere ụmụnna ha ozi. Ọ bụrụ na o ruola ihe dị ka otu afọ e mere nwanna nwoke baptizim, ọ bụrụkwa na ọ na-agba mbọ na-eme ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ n’aka ndị ohu na-eje ozi, bụ́ nke e dere na 1 Timoti 3:8-13, e nwere ike ịtụ aro ka a họpụta ya. Cheta na amaokwu nke asatọ kapịrị okwu ọnụ, sị: “Ndị ohu na-eje ozi kwesịrị ịbụ ndị na-eji ihe akpọrọ ihe.”

12, 13. Kwuo otú ụmụnna nwoke ndị na-eto eto nwere ike isi ruo eru inweta ihe ùgwù n’ọgbakọ.

12 Ị̀ bụ nwanna nwoke e mere baptizim nke na-erubeghị afọ iri abụọ? E nwere ọtụtụ ihe ị ga-eme ka i ruo eru. Otu n’ime ha bụ ịgachikwu ozi ọma anya. Ị̀ na-ekwe ka gị na ụmụnna niile, ma ndị agadi ma ụmụaka, na-arụ n’ozi ọma? Ị̀ na-agba mbọ ka i nweta ndị ị ga-amụrụ Baịbụl? Mgbe ị na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl, ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị a tụrụ n’aro n’ọmụmụ ihe, ị ga na-akụzikwu ihe nke ọma. Ihe ọzọ bụ na ị ga-enwe ike igosikwu onye ị na-amụrụ Baịbụl ọmịiko. Ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ Baịbụl achọpụta na ya kwesịrị ime mgbanwe, ị ga-ama otú ị ga-esi jiri ndidi na akọ nyere ya aka ime ihe Baịbụl kwuru.

13 Unu ụmụnna nwoke ndị na-eto eto nwekwara ike iwepụta onwe unu nyere ndị agadi nọ n’ọgbakọ unu aka. Unu nwekwara ike inye aka na-edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha. Ọ bụrụ na i wepụta onwe gị na-enye aka otú i nwere ike, nke a na-egosi na i ji ozi gị kpọrọ ihe. Mkpa ndị e nwere n’ọgbakọ ga-enwe ike ịna-emetụ gị n’obi otú ahụ o metụrụ Timoti.—Gụọ Ndị Filipaị 2:19-22.

14. Olee otú e nwere ike isi ‘nwalee ụmụnna nwoke ndị na-eto eto iji mata ma hà ruru eru’ ije ozi n’ọgbakọ?

14 Ndị okenye, hụnụ na unu na-enye ụmụnna nwoke ndị na-agba mbọ ‘ịgbara ọchịchọ a na-enwe n’oge ntorobịa ọsọ’ ọrụ nakwa ndị ‘na-achụso ezi omume, okwukwe, ịhụnanya, udo’ na omume ọma ndị ọzọ. (2 Tim. 2:22) Ọ bụrụ na unu na-enye ha ihe ụfọdụ ha ga na-eme n’ọgbakọ, unu ga-esi otú a ‘nwalee ha iji mata ma hà ruru eru’ ịrụ ọrụ ndị dịkwu mkpa n’ọgbakọ, ka ‘ọganihu ha wee pụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ.’—1 Tim. 3:10; 4:15.

Iji Ihe Ndị Dị Mkpa Akpọrọ Ihe n’Ọgbakọ Nakwa n’Ezinụlọ

15. Dị ka 1 Timoti 5:1, 2 kwuru, olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị ji ndị ọzọ kpọrọ ihe?

15 Otú ọzọ anyị si egosi na anyị ji ihe ndị dị mkpa akpọrọ ihe bụ ịkwanyere ụmụnna anyị ùgwù. Mgbe Pọl na-enye Timoti ndụmọdụ, o gosiri na anyị kwesịrị ịna-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. (Gụọ 1 Timoti 5:1, 2.) Nke a dị mkpa karịchaa mgbe anyị na ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe anyị na-emekọ ihe. Anyị kwesịrị iṅomi otú Job si kwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù, karịchaa nwunye ya. Ọ gbasiri mbọ ike ka ọ ghara ile nwaanyị ọzọ anya otú ga-eme ka o nwee mmasị n’ebe ọ nọ. (Job 31:1) Ọ bụrụ na anyị ji ụmụnna anyị kpọrọ ihe, anyị agaghị eji ha na-egwu egwu ma ọ bụ na-eme ihe ga-eme ka ahụ́ ghara iru ha ala ma anyị na ha nọrọ. Ndị ọ dị mkpa karịchaa ka ha na-akwanyere ibe ha ùgwù bụ mmadụ abụọ chọrọ ịlụ ibe ha. Onye Kraịst ji ihe ndị dị mkpa kpọrọ ihe agaghị eji obi nwanna ya nwoke ma ọ bụ nwanna ya nwaanyị egwuri egwu.—Ilu 12:22.

16. Kwuo ihe dị iche n’otú ụfọdụ ndị nọ n’ụwa si ele ọrụ onye bụ́ di ma ọ bụ nna anya na ihe Baịbụl kwuru na ọ bụ ọrụ ya.

16 Anyị kwesịkwara ịkpachara anya n’otú anyị si ele ọrụ Chineke nyere onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ anya. Ụwa Setan na-eme ka ndị mmadụ na-eleda ọrụ onye bụ́ di ma ọ bụ onye bụ́ nna anya. Ihe ndị a na-eme na fim na-akụziri ndị mmadụ ka ha ghara ịna-akwanyere ndị isi ezinụlọ ùgwù kwesịrị ha, nakwa ka ha were ha na-eme akaje. Ma, Akwụkwọ Nsọ nyere onye bụ́ dị ọrụ dị ukwuu, o kwuru na ọ bụ di bụ “isi nke nwunye” ya.—Efe. 5:23; 1 Kọr. 11:3.

17. Kwuo otú iso ezinụlọ na-enwe ofufe ezinụlọ si egosi na anyị ji ọrụ anyị kpọrọ ihe.

17 Onye bụ́ di nwere ike ịna-enye ezinụlọ ya ihe ndị na-akpa ha. Ma, ọ bụrụ na ọ naghị akụziri ha otú ha na Chineke ga-esi dị ná mma, ọ na-egosi na ya adịghị akọ nakwa na ya enweghị amamihe. (Diut. 6:6, 7) Ọ bụ ya mere 1 Timoti 3:4 ji kwuo na ọ bụrụ na ị bụ onyeisi ezinụlọ ma chọọ inwekwu ihe ùgwù n’ọgbakọ, i kwesịrị ịbụ nwoke nke “na-elekọta ezinụlọ ya nke ọma, onye nwere ụmụ na-edo onwe ha n’okpuru ya, ndị na-eji ihe akpọrọ ihe.” N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ na-ewepụta oge mgbe niile ka mụ na ezinụlọ m na-enwe ofufe ezinụlọ?’ Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ụfọdụ ụmụnna nwaanyị na-arịọ di ha arịrịọ ka ọ na-ebute ụzọ n’ihe ndị metụtara ofufe Jehova. Onye ọ bụla bụ́ di kwesịrị iji ọrụ ya kpọrọ ihe. Nwaanyị bụ́ Onye Kraịst kwesịkwara ịkwado ndokwa e mere ka a na-enwe Ofufe Ezinụlọ, kwesịkwa ịkwado di ya ka ha na-eme nke a.

18. Olee otú ụmụaka ga-esi mụta iji ihe ndị dị mkpa akpọrọ ihe?

18 A gbakwara ndị bụ́ ụmụ ume ka ha jiri ihe ndị dị mkpa kpọrọ ihe. (Ekli. 12:1) Ọ bụghị ihe ọjọọ ma ụmụaka mụta ịrụsi ọrụ ike, ya bụ, ka ha na-arụ ọrụ ndị ha toruru ịrụ nakwa ọrụ ndị ha ga-arụli n’ezinụlọ. (Ákwá 3:27) Ọ bụ mgbe Eze Devid bụ nwatakịrị ka ọ mụtara otú ọ ga-esi bụrụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Ọ mụtakwara otú e si akpọ egwu na otú e si ede ya, bụ́ ihe ndị mere ka o nwee ike ijere onye na-achị Izrel mgbe ahụ ozi. (1 Sam. 16:11, 12, 18-21) Ọ bụ eziokwu na Devid gwuru egwu mgbe ọ bụ nwata, ọ mụtakwara ihe ndị baara ya uru, bụ́ ndị o mechara jiri too Jehova. Onye ọzụzụ atụrụ ọ bụ nyeere ya aka iji ndidi duo mba Izrel. Ndị na-eto eto, olee ihe ndị unu na-amụ ugbu a, bụ́ ndị ga-enyere unu aka ife Onye kere unu, nyekwara unu aka ịrụ ọrụ ndị a ga-enye unu n’ọdịnihu?

Imeru Ihe n’Ókè

19, 20. Olee ihe i kpebiri ime banyere ndụ gị nakwa banyere ofufe ị na-efe Jehova?

19 Anyị kwesịrị ịna-emeru ihe n’ókè. Anyị ekwesịghị ịna-eme ka à ga-asị na ọ bụ anyị kacha eji ihe akpọrọ ihe. Anyị ekwesịghị ime ka anyị “maara ihe gabiga ókè.” (Ekli. 7:16) Ọ bụrụ na anyị ana-emesapụ ihu mgbe anyị nọ n’ụlọ, n’ebe anyị na-arụ ọrụ, ma ọ bụ mgbe anyị na ụmụnna anyị na-emekọ ihe, o nwere ike ime ka ahụ́ ruo ndị anyị na ha nọ ala. Ndị ezinụlọ ekwesịghị ịna-akatọgharị ibe ha n’ihi na ime otú a nwere ike ime ka udo ghara ịdị n’ezinụlọ. Ndị niile nọ n’ọgbakọ kwesịkwara ịna-emesapụ ihu, ha na ndị ọzọ ana-emekọkwa ihe. Otú anyị si ekwu okwu na otú anyị si ezi ihe kwesịkwara ịna-agba ndị ọzọ ume, ọ bụghị ịkụda ha mmụọ.—2 Kọr. 13:10; Efe. 4:29.

20 Anyị bi n’ụwa ebe ndị mmadụ na-ejighị Jehova na iwu ya kpọrọ ihe. Ma, Ndịàmà Jehova anaghị ekwe ka ihe ọ bụla gbochie ha irubere Chineke isi. Obi dị anyị nnọọ ụtọ na anyị so n’ìgwè ụmụnna ndị ‘ji ofufe Jehova akpọrọ ihe.’ Ka anyị kpebisie ike na anyị ga-eji ndụ anyị na ofufe anyị na-efe Jehova akpọrọ ihe.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Olee ihe mere anyị ekwesịghị ịna-ele ndụ anya ka ihe na-enweghị isi otú ụwa si ele ya?

• Olee otú anyị nwere ike isi na-enwe ọṅụ n’ozi anyị n’agbanyeghị na anyị ji ya kpọrọ ihe?

• Olee otú otú anyị si ele ọrụ ọgbakọ anya si egosi ma ànyị ji ihe akpọrọ ihe ma ọ bụ na anyị ejighị?

• Kwuo ihe mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị na-akwanyere ụmụnna anyị na ndị ezinụlọ anyị ùgwù.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Onye bụ́ di kwesịrị inye ezinụlọ ya ihe ndị na-akpa ha, kwesịkwa inyere ha aka ka ha na Jehova dị ná mma