Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-ekwe Ka Mmụọ Chineke Na-edu Gị?

Ị̀ Na-ekwe Ka Mmụọ Chineke Na-edu Gị?

Ị̀ Na-ekwe Ka Mmụọ Chineke Na-edu Gị?

“Mmụọ gị dị mma; ka ọ na-edu m n’ala ezi omume.”—ỌMA 143:10.

1, 2. (a) Kwuo oge ụfọdụ Jehova ji mmụọ nsọ nyere ndị ohu ya aka. (b) Ọ̀ bụ naanị mgbe ihe pụrụ iche mere ka mmụọ nsọ na-arụ ọrụ? Kọwaa.

GỊNỊ na-agbata gị n’obi ma i cheta otú mmụọ nsọ si arụ ọrụ? Ọ̀ bụ ọrụ ndị dị ike Gidiọn na Samsịn rụrụ? (Ikpe 6:33, 34; 15:14, 15) Ikekwe ị na-echeta otú Ndị Kraịst oge ochie si jiri obi ike kwuo okwu Chineke ma ọ bụkwanụ otú obi si kaa Stivin mgbe ọ nọ n’ihu Sanhedrin. (Ọrụ 4:31; 6:15) N’oge anyị a, oleekwanụ banyere ọṅụ na-ejụpụta anyị n’obi ma anyị gaa mgbakọ mba niile, otú ụmụnna anyị ndị a tụrụ mkpọrọ n’ihi na ha achọghị itinye aka n’ọchịchị ma ọ bụ n’ọgba aghara obodo si na-erubere Chineke isi, nakwa otú e si na-enwe ọganihu n’ozi ọma a na-ekwusa? Ihe ndị a anyị kpọrọ aha na-egosi na mmụọ nsọ na-arụ ọrụ.

2 Ọ̀ bụ naanị mgbe ihe pụrụ iche mere ma ọ bụ mgbe ihe karịrị mmadụ ike mere ka mmụọ nsọ na-arụ ọrụ? Mba. Okwu Chineke kwuru na Ndị Kraịst “na-eje ije site na mmụọ nsọ,” na ha bụ “ndị mmụọ nsọ na-edu,” nakwa na ha “na-adị ndụ site na mmụọ nsọ.” (Gal. 5:16, 18, 25) Ihe ndị a Baịbụl kwuru banyere anyị na-egosi na mmụọ nsọ na-edu anyị mgbe niile. Anyị kwesịrị ịna-arịọ Jehova kwa ụbọchị ka o nye anyị mmụọ nsọ ya ka anyị nwee ike ịna-eche echiche ziri ezi, na-ekwu okwu ọma, ma na-akpa àgwà ọma. (Gụọ Abụ Ọma 143:10.) Ọ bụrụ na anyị ekwe ka mmụọ nsọ na-edu anyị, ọ ga-eme ka anyị na-eme ihe ndị ga-eme ndị ọzọ obi ụtọ nakwa ihe ndị ga-eme ka e too Chineke.

3. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ikwe ka mmụọ nsọ na-edu anyị? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

3 Gịnị mere anyị ji kwesị ikwe ka mmụọ nsọ na-edu anyị? Ọ bụ n’ihi na e nwere ihe ọzọ nwere ike iduhie anyị, bụ́kwanụ nke na-emegide mmụọ nsọ. Akwụkwọ Nsọ kpọrọ ya “anụ ahụ́,” ya bụ, ihe ọjọọ anụ ahụ́ anyị nke na-eme mmehie na-achọ ka anyị na-eme, nke bụ́ ihe ezughị okè anyị ketara n’aka Adam kpatara. (Gụọ Ndị Galeshia 5:17.) Oleezi otú anyị si ekwe ka mmụọ Chineke na-edu anyị? È nwere ihe ndị anyị nwere ike ime ka anụ ahụ́ anyị nke na-eme mmehie ghara iduhie anyị? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a ka anyị na-atụle ihe isii ndị ọzọ so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ,” ha bụ, “ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.”—Gal. 5:22, 23.

Ịdị Nwayọọ na Ogologo Ntachi Obi Na-eme Ka Udo Dịrị n’Ọgbakọ

4. Olee otú ịdị nwayọọ na inwe ogologo ntachi obi si eme ka udo dịrị n’ọgbakọ?

4 Gụọ Ndị Kọlọsi 3:12, 13. Ọ bụrụ na ndị nọ n’ọgbakọ adịrị nwayọọ, na-enwekwa ogologo ntachi obi, ọgbakọ ga-adị n’udo. Ihe abụọ a na-eme ka anyị jiri amara na-emeso ndị ọzọ ihe, jide onwe anyị mgbe a kpasuru anyị iwe, na-emekwa ka anyị ghara imegwara ndị mere anyị ihe ọjọọ ihe ha mere anyị ma ọ bụkwanụ gwagwara ha okwu ọjọọ ha gwara anyị. Ọ bụrụ na anyị na nwanna enwee nghọtahie, ogologo ntachi obi, ma ọ bụ ndidi, ga-eme ka anyị gbalịa ike anyị niile dozie nsogbu ahụ kama ịna-eze nwanna anyị ahụ eze. Ndị nọ n’ọgbakọ hà kwesịrị ịdị nwayọọ, nweekwa ogologo ntachi obi? Eenụ, n’ihi na anyị niile bụ ndị na-ezughị okè.

5. Olee ihe mere n’etiti Pọl na Banabas, gịnịkwa ka ọ na-egosi?

5 Were ihe mere n’etiti Pọl na Banabas dị ka ihe atụ. Ha abụọ jekọrọ ozi ọma ọtụtụ afọ. Onye ọ bụla n’ime ha nwere àgwà ọma e ji mara ya. Ma, e nwere otu oge ha abụọ ‘sere ezigbo okwu, nke mere na ha kewara.’ (Ọrụ 15:36-39) Ihe a ha mere gosiri na ndị jidị obi ha dum na-efe Chineke nwere ike ise okwu mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na Onye Kraịst na ibe ya enwee nghọtahie, gịnị ka o nwere ike ime ka nghọtahie ahụ ghara ime ka ha gwa ibe ha okwu ọjọọ nke ga-eme ka ha na-erosa ibe ha iro?

6, 7. (a) Olee ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru nke anyị kwesịrị ime tupu mkparịta ụka anyị na nwanna anyị adawa ike ike? (b) Olee uru dị na mmadụ “ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa”?

6 Ụfọdụ nsụgharị Baịbụl gosiri na nghọtahie ahụ Pọl na Banabas nwere dapụtara na mberede, nakwa na ọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Ọ bụrụ na Onye Kraịst achọpụta na iwe abịala ya mgbe ya na nwanna ya na-ekwurịta okwu, o kwesịrị ime ihe e kwuru na Jems 1:19, 20, bụ́ ebe sịrị: “Onye ọ bụla aghaghị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa; n’ihi na iwe mmadụ adịghị arụpụta ezi omume Chineke.” Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, o nwere ike ịgbanwe ihe ha na-ekwu, dowe okwu ahụ ruo oge ọzọ, ma ọ bụkwanụ si ebe ahụ pụọ tupu olu ha alawa elu.—Ilu 12:16; 17:14; 29:11.

7 Olee uru ime otú a ga-aba? Ọ bụrụ na ọ hapụ okwu ahụ ruo mgbe obi ya jụụrụ, kpee ekpere banyere ya, ma chebara otú ka mma ọ ga-esi aza okwu echiche, ọ na-ekwe ka mmụọ Chineke na-edu ya. (Ilu 15:1, 28) Ọ bụrụ na o kwe ka mmụọ nsọ na-edu ya, ọ ga-adị nwayọọ, nweekwa ogologo ntachi obi. Nke a ga-enyere ya aka ime ihe Pọl kwuru ná Ndị Efesọs 4:26, 29. Ebe ahụ sịrị: “Weenụ iwe, ma unu emehiela . . . Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta, kama nke ahụ, ka ọ bụrụ okwu dị mma maka iwuli elu dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa, ka o wee mee ka ndị na-anụ ya nweta ihe dị mma.” N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị eyiri ịdị nwayọọ na ogologo ntachi obi dị ka uwe, anyị ga-eme ka ọgbakọ dịrị n’udo, dịrịkwa n’otu.

Gosi Ezinụlọ Gị Obiọma na Ịdị Mma

8, 9. Gịnị bụ obiọma na ịdị mma, oleekwa otú ha si eme ka ezinụlọ dịrị n’otu?

8 Gụọ Ndị Efesọs 4:31, 32; 5:8, 9. Obiọma na ịdị mma na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Ha dị ka ikuku nke na-eku nwayọọ nwayọọ na mmiri jụrụ ezigbo oyi nke a ṅụrụ mgbe anwụ na-achasi ike. Ha na-eme ka ezinụlọ dịrị n’otu. Obiọma bụ àgwà magburu onwe ya. Ọ bụ ezigbo mmasị mmadụ nwere n’ebe ndị ọzọ nọ na-eme ka o gosi ha obiọma, nke a na-emekwa ka o nyere ha aka ma gwa ha okwu ọma. Ịdị mma bụkwa àgwà mara mma. Otú e si egosikwa ya bụ imere ndị ọzọ ihe ọma. Onye nwere àgwà a na-emesapụ aka. (Ọrụ 9:36, 39; 16:14, 15) Ma, e nwere ihe ọzọ e ji ama onye nwere àgwà a bụ́ ịdị mma.

9 Ịdị mma bụ ime omume ọma. Ọ pụtaghị naanị ihe anyị na-eme, kama ọ pụtara karịchaa ụdị ndị anyị bụ. Chegodị banyere nwaanyị nke na-akwadebere ezinụlọ ya mkpụrụ osisi. Ka ọ na-ebewa mkpụrụ osisi nke ọ bụla, ọ na-ele ya anya nke ọma ka o wee mara ma ọ̀ chara nke ọma, nakwa ma ọ̀ ga-adị ụtọ. Ọ na-enyochakwa ma ime ya ma ahụ́ ya ka o wee mara ma ò mebiri emebi. N’otu aka ahụ, ịdị mma, nke bụ́ àgwà mmụọ nsọ na-eme ka anyị nwee, na-emetụta ụzọ niile Onye Kraịst si ebi ndụ.

10. Gịnị ka e nwere ike ime iji nyere onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ aka inwe mkpụrụ nke mmụọ nsọ?

10 Gịnị ga-enyere onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ Ndị Kraịst aka igosi ibe ya obiọma na ịdị mma? Ezi ihe ọmụma nke dị n’Okwu Chineke na-enye ezigbo aka. (Kọl. 3:9, 10) Ndị isi ezinụlọ ụfọdụ na-ekwe ka mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke soro n’ihe ezinụlọ ha ga-amụ n’Ofufe Ezinụlọ ha na-enwe kwa izu. Ịmụ banyere mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke abụghị nnukwu ọrụ. Jiri ihe ndị e ji eme nchọnchọ unu nwere n’asụsụ unu chọọ akwụkwọ ndị a kọwara nke ọ bụla n’ihe ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Unu nwere ike ịtụle paragraf ole na ole kwa izu, nke a ga-eme ka unu jiri izu ole na ole tụlee ihe nke ọ bụla so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Mgbe unu na-amụ akwụkwọ ahụ, gụọnụ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị e depụtara, tụleekwanụ ha. Kwurịtanụ otú unu ga-esi eme ihe unu mụtara, kpeekwanụ ekpere ka Jehova nyere unu aka ime ya eme. (1 Tim. 4:15; 1 Jọn 5:14, 15) Ịmụ banyere mkpụrụ nke mmụọ nsọ ò nwere ike ime ka ndị nọ n’ezinụlọ na-akpaso ibe ha àgwà ọma?

11, 12. Olee otú ịmụ banyere obiọma si baara ezinụlọ abụọ bụ́ ezinụlọ Ndị Kraịst uru?

11 Otu di na nwunye ka gbara akwụkwọ ọhụrụ, bụ́ ndị chọrọ ibi n’udo, kpebiri na ha ga-amụkwu banyere àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Olee otú o si baara ha uru? Nwunye nwanna ahụ kwuru, sị: “Ịmụta na onye nwere obiọma ekwesịghị ịna-agba n’èzí emeela ka anyị na-emeso ibe anyị ihe otú dị mma ruo taa. Ọ kụzierela anyị ka anyị ghara ịna-esi ọnwụ, meekwa ka anyị na-agbaghara ibe anyị. O nyekwarala anyị aka ịna-asị ibe anyị ‘i meela’ na ‘ndo’ mgbe ọ bụla ọ dị mkpa.”

12 Di na nwunye ọzọ bụ́ Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-esekarị okwu, chọpụtara na ha anaghị egosi ibe ha obiọma. Ha kpebiri na ha abụọ ga-amụ akwụkwọ ndị kwuru banyere obiọma. Gịnị si na ya pụta? Di nwanna nwaanyị a kwuru, sị: “Ọmụmụ anyị mụrụ banyere obiọma nyeere anyị aka ịna-atụkwasị ibe anyị obi, kama ịna-enyo ihe ọ bụla ibe anyị kwuru enyo. O mekwara ka anyị na-ahụ ebe ibe anyị na-emete. Anyị malitere na-agba mbọ na-amata ihe na-akpa ibe anyị. Iji gosi na m nwere obiọma, m na-agwa nwunye m ka o kwuo obi ya, m naghịkwa ewe iwe n’ihe o kwuru. Ọ pụtara na mụ ekwesịghị ịna-ebuli onwe m elu. Mgbe mụ na nwunye m malitere igosi ibe anyị obiọma, anyị ji nwayọọ nwayọọ na-akwụsị ịna-azọ isi anyị mgbe anyị mehiere ihe. N’eziokwu, o nyeere anyị aka.” Ịmụ banyere mkpụrụ nke mmụọ nsọ ọ̀ ga-abara ezinụlọ gị uru?

Mgbe Naanị Gị Nọ, Gosi na I Nwere Okwukwe

13. Olee ihe nwere ike ime ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma bụ́ nke anyị ga-ezere?

13 Ndị Kraịst kwesịrị ikwe ka mmụọ Chineke na-edu ha ma mgbe ha na ndị ọzọ nọ ma mgbe naanị ha nọ. N’ụwa Setan taa, foto ndị gba ọtọ na ihe nkiri ndị a na-egosi omume rụrụ arụ na ha juru ebe niile. Nke a nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. Gịnị ka Onye Kraịst kwesịrị ime? Okwu Chineke dụrụ anyị ọdụ, sị: “Wepụnụ iru unyi niile na ihe ahụ na-abaghị uru, nke bụ́ ihe ọjọọ, jirikwanụ nwayọọ nabata okwu Chineke nke a kụrụ n’ime unu dị ka mkpụrụ, nke nwere ike ịzọpụta mkpụrụ obi unu.” (Jems 1:21) Ka anyị tụlee otú okwukwe, bụ́ ihe ọzọ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, nwere ike isi nyere anyị aka ịna-adị ọcha n’anya Jehova.

14. Olee otú enweghị okwukwe nwere ike isi mee ka mmadụ na-akpa àgwà ọjọọ?

14 Okwukwe pụtara mmadụ inwe obi ike na Jehova Chineke dị. Ọ bụrụ na anyị echee na Chineke adịghị, ọ gaghị esi ike anyị emee ihe ọjọọ. Ka anyị tụlee ihe mere ụfọdụ ndị Chineke n’oge ochie. Jehova kpugheere Ezikiel onye amụma na ndị obodo ya na-eme ihe ọjọọ na nzuzo. Ọ sịrị: “Ị̀ hụla ihe ndị okenye ụlọ Izrel na-eme n’ọchịchịrị, onye ọ bụla n’ime ime ụlọ ya o debere ihe oyiyi a pịrị apị? N’ihi na ha na-asị, ‘Jehova anaghị ahụ anyị. Jehova ahapụwo ala a.’” (Ezik. 8:12. 8:12) Ị̀ ghọtara ihe mere ha ji mee ihe ha mere? Ha ekweghị na Jehova na-ahụ ihe ha na-eme. Ha weere na Jehova adịghị.

15. Olee otú okwukwe siri ike anyị nwere na Jehova si echebe anyị?

15 Ma, tụlee ihe banyere Josef. N’agbanyeghị na ọ bụghị Josef na ndị ezinụlọ ya na ndị obodo ya bi, o kweghị ka ya na nwunye Pọtịfa nwee mmekọahụ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ sịrị: “Olee otú m ga-esi mee oké ihe ọjọọ a wee mehie Chineke?” (Jen. 39:7-9) N’eziokwu, ọ ma na Jehova dị. Ọ bụrụ na anyị aghọta na Chineke dị, anyị agaghị ekiri ihe ndị na-adịghị ọcha ma ọ bụ na-eme ihe ọ bụla anyị ma na ọ dịghị mma n’anya Chineke na nzuzo. Anyị ga-eme mkpebi yiri nke otu ọbụ abụ, bụ́ onye bụrụ abụ, sị: “M ga-ejegharị n’iguzosi ike n’ezi ihe nke obi m n’ime ụlọ m. Agaghị m edebe ihe ọ bụla na-abaghị uru n’ihu m.”—Ọma 101:2, 3.

Chebe Obi Gị Site n’Inwe Njide Onwe Onye

16, 17. (a) Olee otú e si rata ‘nwa okorobịa ahụ na-enweghị uche’ nke a kọrọ akụkọ ya n’akwụkwọ Ilu? (b) Dị ka foto dị na peeji nke 26 na-egosi, olee otú ụdị ihe ahụ nwere ike isi mee taa n’agbanyeghị afọ ole mmadụ dị?

16 Njide onwe onye, nke bụ́ ihe ikpeazụ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, na-eme ka anyị ghara ime ihe Chineke kpọrọ asị. O nwere ike ime ka anyị chebe obi anyị. (Ilu 4:23) Ka anyị tụlee ihe e kwuru n’Ilu 7:6-23 banyere otú otu akwụna si rata otu “nwa okorobịa nke na-enweghị uche.” Ọ bụ mgbe nwa okorobịa ahụ “na-agafe n’okporo ámá n’akụkụ ụlọ nwaanyị ahụ” ka ọ ratara ya. Ikekwe, ihe mere o ji gawa ebe nwaanyị ahụ bi bụ ka ọ mara ihe na-eme ebe ahụ. Ma, ọ maghị na ihe ọ na-aga ime bụ omume nzuzu nke “metụtara mkpụrụ obi ya.”

17 Olee otú nwa okorobịa ahụ gaara esi zere ihe ọjọọ ahụ nke kpataara ya mbibi? Ọ gaara eme otú a ma a sị na ọ ṅara ntị na ndụmọdụ bụ́: “Akpafula wee banye n’okporo ụzọ ya.” (Ilu 7:25) Akụkọ a na-akụziri anyị na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka mmụọ Chineke na-edu anyị, anyị ekwesịghị ime ihe ndị nwere ike iduba anyị n’ọnwụnwa. Otu n’ime ụzọ mmadụ nwere ike isi mee ụdị omume nzuzu ‘nwa okorobịa ahụ na-enweghị uche’ mere bụ ịpịgharị tiivi ma ọ bụ ịwagharị n’Ịntanet. Ma onye ahụ ọ̀ ma ama ma ọ bụ na ọ maghị, o nwere ike ịhụ ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. O nwere ike iji nwayọọ nwayọọ malite ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, nke bụ́ omume na-adịghị ọcha nke ga-emerụ akọnuche ya, meekwa ka ya na Chineke ghara ịdị ná mma. O nwekwara ike ịkpatara ya ọnwụ.—Gụọ Ndị Rom 8:5-8.

18. Olee ihe Onye Kraịst nwere ike ime ka o wee chebe obi ya, oleekwa ihe jikọrọ nke a na inwe njide onwe onye?

18 N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị ahụ ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, anyị ga-egosi na anyị nwere njide onwe onye ma ọ bụrụ na anyị emechie ha ozugbo, anyị kwesịkwara ime otú ahụ. Ma, ọ kacha mma ka anyị ghara ime ihe nwere ike ime ka anyị hụpere ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. (Ilu 22:3) Anyị ga-egosi na anyị nwere njide onwe onye ma ọ bụrụ na anyị ekpebie ime ihe ndị ga-eme ka anyị ghara ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, meekwa ihe ndị ahụ anyị kpebiri. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị adọwa kọmputa anyị ebe ndị ọzọ ga na-ahụ ya, o nwere ike ime ka anyị ghara ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Ụfọdụ ndị na-achọ ihe n’Ịntanet ma ọ bụ na-ele tiivi naanị mgbe ndị ọzọ nọ ya. Ndị ọzọ ekpebiela na o nweghị ihe ga-ejikọ ha na Ịntanet. (Gụọ Matiu 5:27-30.) Ka anyị mee ike anyị niile iji chebe onwe anyị na ezinụlọ anyị ka anyị wee “si n’obi dị ọcha, n’ezi akọ na uche nakwa n’okwukwe nke na-abụghị nke ihu abụọ” na-efe Jehova.—1 Tim. 1:5.

19. Olee uru ndị anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka mmụọ nsọ na-edu anyị?

19 Mkpụrụ dị iche iche mmụọ nsọ na-eme ka anyị mịa bara ọtụtụ uru. Ịdị nwayọọ na ogologo ntachi obi na-eme ka ọgbakọ dịrị n’udo. Obiọma na ịdị mma na-eme ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ. Okwukwe na njide onwe onye na-eme ka anyị nọrọ Jehova nso ma dịrị ọcha n’anya ya. Ihe ọzọ bụ na Ndị Galeshia 6:8 gwara anyị, sị: “Onye na-agha mkpụrụ maka mmụọ nsọ ga-aghọrọ ndụ ebighị ebi site na mmụọ nsọ.” N’eziokwu, n’ihi àjà mgbapụta e ji Kraịst chụọ, Jehova ga-eji mmụọ nsọ ya nye ndị niile kwere ka mmụọ nsọ na-edu ha ndụ ebighị ebi.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Olee otú ịdị nwayọọ na inwe ogologo ntachi obi si eme ka udo dịrị n’ọgbakọ?

• Gịnị nwere ike inyere Ndị Kraịst aka ka ha gosi obiọma na ịdị mma n’ụlọ ha?

• Olee otú okwukwe na njide onwe onye si enyere Onye Kraịst aka ka o chebe obi ya?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 24]

Gịnị ka ị ga-eme ka mkparịta ụka gị na mmadụ ghara ịdawa ike ike?

[Foto dị na peeji nke 25]

Ezinụlọ gị ga-erite uru ma ọ bụrụ na ha na-amụ banyere mkpụrụ nke mmụọ

[Foto dị na peeji nke 26]

Olee nsogbu anyị ga-ezere ma ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe na njide onwe onye?