Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Achọtawo M Ọtụtụ Ihe Ọma

Achọtawo M Ọtụtụ Ihe Ọma

Achọtawo M Ọtụtụ Ihe Ọma

DỊ ka Arthur Bonno si kọọ

N’AFỌ 1951, mụ na nwunye m bụ́ Edith nọ ná mgbakọ distrikti mgbe anyị nụrụ ọkwa a mara na a ga-enwe nnọkọ nke ndị chọrọ ịga ozi ala ọzọ.

M sịrị ya, “Ka anyị gaa gere ihe ha ga-ekwu!”

Ọ sịrị m: “Ọ gbasaghị anyị!”

M sịrị ya: “Ama m, ihe anyị na-aga ime bụ naanị igere ihe ha ga-ekwu.”

Mgbe e nwechara nnọkọ ahụ, e nyere anyị fọm anyị ga-edejupụta maka ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied.

M sịrị nwunye m: “Ka anyị dejupụta ya.”

Ọ sịrị m, “Oleekwanụ banyere ndị mụrụ anyị?”

Mgbe ihe dị ka otu afọ na ọnwa isii anyị nwechara mgbakọ ahụ gara, anyị gara akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied, e zigakwara anyị ka anyị jee ozi n’Ekwedọọ, nke dị na Kọntinent Ebe Ndịda Amerịka.

Ị ga-achọpụta na ụka ahụ mụ na nwunye m kparịtara ná mgbakọ ahụ gosiri na m na-ekwesi olu ike, nakwa na m kweere na o nweghị ihe mmadụ na-agaghị emeli ma ọ chọọ. Ma, nwunye m dị obi umeala. Oge ọ na-eto eto, mgbe o bi n’otu obere obodo a na-akpọ Elizabet, nke dị na Pensụlvenịa dị n’Amerịka, o nweghị mgbe ọ pụrụ gaa ebe dị anya ma ọ bụkwanụ hụ ndị si mba ọzọ. O siiri ya ike ịhapụ ndị ezinụlọ ya. Ma, o ji obi ya niile kweta ịga jewe ozi ná mba ọzọ. N’afọ 1954, anyị rutere Ekwedọọ, ọ bụkwa ebe ahụ ka anyị na-eje ozi kemgbe ahụ. Kemgbe anyị nọ n’Ekwedọọ, anyị enwetala ọtụtụ ihe ọma. Ị̀ chọrọ ịma banyere ụfọdụ n’ime ha?

Ihe Ọma Ndị Anyị Na-agaghị Echefu Echefu

Ebe mbụ e zigara anyị bụ na Kito nke bụ́ isi obodo Ekwedọọ. Ọ dị n’elu ugwu nke dị ihe dị ka puku mita abụọ, narị asatọ na iri ise. Ọ bụrụ na anyị ejiri ụgbọ okporo ígwè ma ọ bụ gwongworo si Gwiyakil gawa ebe ahụ, ọ na-ewe anyị abalị abụọ, bụ́kwanụ ihe na-ewe ụgbọelu minit iri atọ ugbu a! Anyị jere ozi na Kito afọ anọ anyị na-agaghị echefu echefu. Ma, n’afọ 1958, ihe ọma ọzọ mere. A họpụtara m ka m bụrụ onye nlekọta sekit.

N’oge ahụ, ihe e nwere n’Ekwedọọ bụ naanị obere sekit abụọ. N’ihi ya, e wezụga ịga na-eleta ọgbakọ dị iche iche, anyị na-eji ọtụtụ izu n’afọ ekwusara ndị India bi n’obere obodo dị iche iche Ndịàmà Jehova na-anọghị ozi ọma. Ụlọ ndị dị n’obere obodo ndị ahụ na-enwe ọnụ ụlọ ndị kpara nnọọ akpa, ha anaghị enwe windo, naanị ihe ha na-aba bụ àkwà. Ihe anyị bu gaa ebe ahụ bụ igbe e ji osisi rụọ nke anyị dọnyere stovu, ite e ji eghe ihe, efere, efere e ji asa ihe, ákwà ihe ndina, nche anwụnta, uwe, akwụkwọ akụkọ ndị mere ochie, na ihe ndị ọzọ. Anyị fọnyere akwụkwọ akụkọ ndị ahụ n’ọnụ òké ndị dị n’ahụ́ ụlọ ka ha ghara ịbata n’ụlọ anyị.

N’agbanyeghị na ọnụ ụlọ ndị ahụ gbara itiri, ruokwa unyi, anyị ka na-echeta oge ndị anyị nọrọ n’elu àkwà anyị kparịta ụka n’abalị, nakwa oge ndị anyị riri nri anyị ji stovu anyị sie. Ebe ọ bụ na m na-ebu ụzọ eme ihe tupu mụ echebara ihe m mere echiche, mgbe ụfọdụ, nwunye m na-eji oge ndị ahụ anyị na-akparịta ụka n’abalị agwa m ụzọ ndị ka mma m nwere ike isi gwa ụmụnna ndị anyị gara ileta okwu. M na-ege ya ntị, nke a mekwara ka m na-ekwu ihe ndị na-agba ume ma m gaa ileta ọgbakọ. Ọ bụrụkwa na mụ akatọwa ndị ọzọ, ọ naghị eso m akatọ ha. Nke a mere ka m ghọta na m kwesịrị ịna-ekwu okwu ọma banyere ụmụnna m. Ma, ihe anyị na-ekwukarị n’abalị bụ ihe ndị anyị gụtara n’Ụlọ Nche ma ọ bụkwanụ otú ozi anyị si gaa n’ụbọchị. N’eziokwu, akụkọ ndị ahụ tọrọ anyị ụtọ.

Otú Anyị Si Chọta Carlos

Na Hipihapa, nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ Ekwedọọ, a gwara anyị aha otu nwoke nwere mmasị n’ozi anyị onye aha ya bụ Carlos Mejía, ma, a gwaghị anyị ebe o bi. N’otu ụtụtụ, anyị hapụrụ ụlọ anyị gaa ka anyị chọọ ya, ma anyị amaghị ebe anyị ga-ebido ebido, n’ihi ya, anyị tinyere isi otu ebe. Ebe ọ bụ na ezigbo mmiri zoro n’abalị bọtara ụbọchị ahụ, anyị nọ na-eze apịtị dị n’okporo ụzọ ahụ nke ruru unyi. M nọ nwunye m n’ihu. Na mberede, m nụrụ ka e tiri aha m ná mkpu n’azụ m. M tụgharịrị ma hụ na nwunye m tọrọ n’apịtị nke ruru ya n’ikpere. Ihe a merenụ tọrọ m ọchị, m gaara achị ọchị ma a sị na ahụghị m na ọ na-ebe ákwá.

M dọpụtara ya n’apịtị ahụ, ma, akpụkpọ ụkwụ ya tọrọ n’ime ya. E nwere otu nwatakịrị nwoke na nwatakịrị nwaanyị hụrụ anyị, m gwara ha, sị, “Aga m enye unu ego ma unu wepụta akpụkpọ ụkwụ ndị ahụ n’apịtị.” Ha wepụtara ha n’otu ntabi anya, ma, nwunye m chọrọ ebe ọ ga-asa ụkwụ ya na akpụkpọ ụkwụ ya. Mama ụmụaka ahụ hụrụ ihe merenụ, gwakwa anyị ka anyị bata ụlọ. O nyeere nwunye m aka ya asachaa ụkwụ ya, ebe ụmụ ya nyere aka sachaa akpụkpọ ụkwụ ya. Ma, e nwere ihe ọma merenụ tupu anyị apụọ ebe ahụ. M jụrụ nwaanyị ahụ ma ọ̀ ma ebe anyị nwere ike inweta otu nwoke aha ya bụ Carlos Mejía. O juru ya anya, ya ekwuo, sị, “Ọ bụ di m.” Ka oge na-aga, a malitere ịmụrụ ha Baịbụl, e mechakwara mee mmadụ niile nọ n’ezinụlọ ahụ baptizim. Mgbe afọ ụfọdụ gara, Carlos, nwunye ya, na mmadụ abụọ n’ime ụmụ ya ghọrọ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche.

Njem Ndị Tara Akpụ Anyị Mere na Otú E Si Lekọta Anyị nke Ọma

Isi n’otu ọgbakọ gaa leta ọgbakọ ọzọ adịghịrị anyị mfe. Anyị na-agba bọs, ụgbọ okporo ígwè, gwongworo, ụgbọ epeepe e ji osisi rụọ, na obere ụgbọelu ma anyị gaa ileta ọgbakọ. E nwere otu oge onye nlekọta distrikti aha ya bụ John McLenachan, na nwunye ya bụ́ Dorothy, so anyị gaa ikwusa ozi ọma n’obodo ndị dị n’ebe a na-egbu azụ̀, bụ́ ndị dị nso n’ókè Ekwedọọ na Kolumbia. Ihe anyị ji gaa ebe ahụ bụ ụgbọ epeepe e ji osisi rụọ nke nwere njin. Azụ̀ shak ndị hacha ka ụgbọ mmiri ahụ nọ na-egwugharị n’akụkụ ụgbọ anyị. N’agbanyeghị na onye na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ bụ aka ochie, otú azụ̀ ndị ahụ hacha mere ka ụjọ bịa ya, nke mere ka ọ kwọrọ ụgbọ ahụ ọsọ ọsọ gawa n’ikpere mmiri.

Ihe isi ike ndị anyị nwere n’ọrụ sekit baara anyị uru. Anyị bịara mata ụfọdụ ụmụnna anyị ndị na-ele ọbịa nke ọma. Ọtụtụ mgbe, ụmụnna ndị anyị bi n’ụlọ ha na-esi ọnwụ ka anyị rie ugboro nri atọ n’ụbọchị, ma, ha na-eri naanị otu ugboro. Ha na-agwakwa anyị ka anyị hie n’àkwà ha, hanwa ehie n’ala. Nwunye m na-ekwukarị, sị, “Ụmụnna ndị a mere ka m ghọta na ọ bụ naanị ihe ole na ole dị anyị mkpa.”

“Anyị Achọghị Ịjụ”

Ihe ọma ọzọ meere anyị n’afọ 1960. A gwara anyị ka anyị bịa jewe ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Gụayakil. Eso m ná ndị na-elekọta ọrụ anyị ná mba ahụ, ma, nwunye m na-eso ọgbakọ dị nso n’alaka ụlọ ọrụ aga ozi ọma. Echere m na agaghị m arụli ọrụ ọfịs n’ihi na arụtụbeghị m ya mbụ, ma, dị ka Ndị Hibru 13:21 gosiri, Chineke na-eji ‘ihe ọma niile akwadebe anyị ime uche ya.’ Mgbe afọ abụọ gara, a gwara m ka m bịa na Betel dị na Bruklin, Niu Yọk nara ọzụzụ ga-ewe ọnwa iri n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. N’oge ahụ, ụmụ nwaanyị anaghị eso di ha, ha na-anọ arụ ọrụ e nyere ha. E si Bruklin zitere nwunye m akwụkwọ ozi. N’akwụkwọ ozi ahụ, a gwara ya tụlee nke ọma ma ọ̀ ga-ekwe anọ naanị ya ọnwa iri.

Ihe nwunye m zara ha bụ: “N’eziokwu, nke a ga-esiri m ezigbo ike, ma, anyị ma na Jehova ga-enyere anyị aka imeri ihe isi ike ọ bụla anyị ga-enwe. . . . Anyị achọghị ịjụ ihe ùgwù ọ bụla e nyere anyị ma ọ bụkwanụ ihe ọ bụla ga-eme ka anyị ruo eruo ịrụ ọrụ anyị nke ọma.” Mgbe ahụ m nọ na Bruklin, nwunye m na-edetara m akwụkwọ ozi kwa izu.

Otú Anyị na Ndịàmà Ibe Anyị Si Jekọọ Ozi

N’afọ 1966, mụ na nwunye m laghachiri Kito n’ihi ọrịa. Anyị maliteghachiri ọrụ ozi ala ọzọ anyị n’ebe ahụ, anyị na ụmụnna ndị ebe ahụ na-ejekọkwa ozi. N’eziokwu, ụmụnna ndị a kwụsiri ike n’ọgbakọ.

E nwere otu nwanna nwaanyị kwesịrị ntụkwasị obi di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova. Di ya ahụ na-akụkarị ya ihe. Otu ụbọchị, n’elekere anya isii nke ụtụtụ, otu onye kpọrọ anyị ma gwa anyị na a kụọla nwaanyị ahụ ihe ọzọ. M gbaara gawa n’ụlọ nwanna nwaanyị ahụ. Ihe m hụrụ mgbe m ruru riri m ọnụ. O dina n’àkwà, ahụ́ ya azachaa azaa, ọnyá ejukwa ya ahụ́. Di ya tigidere ya ihe ruo mgbe ihe o ji na-eti ya ihe gbajiri. Mgbe e mechara n’ụbọchị ahụ, m hụrụ nwoke ahụ mgbe m gara n’ụlọ ya ma gwa ya na ọ kpaala àgwà nzuzu. O bidoro rịọwa arịrịọ.

N’agbata afọ 1970 na 1975, m gbaketụrụ, anyị maliteghachikwara ọrụ ilekọta sekit. Obodo Aịbera dị na sekit anyị. Mgbe anyị letara obodo ahụ n’agbata afọ 1956 na 1959, ihe e nwere ebe ahụ bụ naanị Ndịàmà Jehova abụọ, otu onye ozi ala ọzọ na otu nwanna bụ́ onye obodo ahụ. N’ihi ya, anyị chọsiri ike ịhụ ndị ọhụrụ batara n’ọgbakọ.

N’ọmụmụ ihe mbụ anyị gara ebe ahụ, Nwanna Rodrigo Vaca mere ihe omume nke ndị na-ege ntị tinyere ọnụ. Mgbe ọ bụla ọ jụrụ ajụjụ, kama ndị na-ege ntị ga-eweli aka elu, ihe ha na-ekwu bụ,“Yo, yo!” ( ya bụ, “Mụnwa, mụnwa!”) Mụ na nwunye m na-elerịta ibe anyị anya. M nọ na-eche, sị, ‘Ọ̀ bụ gịnị na-eme ebe a?’ Anyị mechara ghọta na Nwanna Vaca kpuru ìsì ma ọ ma olu nwanna ọ bụla nke kwuru okwu. Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ nke ma atụrụ ya nke ọma! Nke a na-echetara anyị ihe Jizọs kwuru na Jọn 10:3, 4, 14 banyere Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma nke ya na ìgwè atụrụ ya ma ibe ha nke ọma. Taa, e nwere ọgbakọ isii ndị na-amụ ihe n’asụsụ Spanish n’obodo Aịbera, e nwekwara otu ọgbakọ nke na-amụ ihe n’asụsụ Kichuwa, nakwa otu ọgbakọ nke na-amụ ihe n’asụsụ ndị ogbi. Nwanna Vaca ka bụ okenye nke kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa ọsụ ụzọ pụrụ iche. *

Obi Dị M Ụtọ Maka Ihe Ọma Jehova Meere M

N’afọ 1974, Jehova meere anyị ihe ọma ọzọ. A gwara anyị ka anyị lọghachi na Betel, bụ́ ebe a gwara m ọzọ ka m soro ná ndị na-elekọta ọrụ anyị, mechaakwa họpụta m ka m soro na Kọmitii Alaka. Ebe mbụ nwunye m rụrụ bụ ebe a na-esi nri, o mechakwara rụwa n’ọfịs, bụ́ ebe ọ nọ kemgbe ahụ na-ahụ maka akwụkwọ ozi ndị batara n’alaka ụlọ ọrụ nakwa ndị nke a na-ezipụ ezipụ.

Kemgbe ahụ, anyị enweela obi ụtọ ịhụ ọtụtụ narị ndị ozi ala ọzọ gụrụ akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied, bụ́ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi n’ọgbakọ ha so amụ ihe. Ọtụtụ puku ụmụnna ndị si ihe karịrị mba iri atọ bịa ije ozi ná mba a na-agbakwa anyị ume. Obi dị anyị ụtọ otú ụmụnna ndị a si wepụta onwe ha na-eje ozi. Ụfọdụ rere ụlọ ha na ihe ha ji akpata eto n’ihi na ha chọrọ ịbịa jee ozi n’ebe a a chọsiri ndị nkwusa Alaeze ike. Ha zụụrụ ụgbọala ndị ha ga-eji na-ekwusa ozi ọma n’ime ime obodo, ha na-ehiwe ọgbakọ ọhụrụ dị iche iche, na-esokwa arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. E nweela ọtụtụ ụmụnna nwaanyị ndị na-alụghị di, bụ́ ndị si mba ọzọ bịa ịsụ ụzọ ebe a, ha ji ịnụ ọkụ n’obi eje ozi, marakwa ezi ozi ọma nke ọma!

N’eziokwu, achọtawo m ọtụtụ ihe ọma kemgbe m jeweere Chineke ozi. Ihe ọma kachanụ m chọtara bụ na mụ na Jehova dị n’ezigbo mma. Obi dịkwa m ụtọ na Jehova nyere m “onye inyeaka.” (Jen. 2:18) Mgbe ọ bụla m chetara na mụ na ya abụrụla di na nwunye iri afọ isii na itoolu, m na-echeta Ilu 18:22, bụ́ ebe sịrị: “Mmadụ ọ̀ chọtawo ezi nwunye? Onye ahụ achọtawo ihe ọma.” (Ilu 18:22) Obi na-adị m ụtọ ma mụ na nwunye m nọrọ. O nyerela m aka n’ọtụtụ ụzọ. Ọ hụkwara mama ya n’anya. Nwunye m na-edegara mama ya akwụkwọ ozi kwa izu, malite mgbe anyị bịara Ekwedọọ ruo n’afọ 1990, bụ́ mgbe mama ya nwụrụ mgbe ọ dị iri afọ itoolu na asaa.

Adị m iri afọ itoolu ugbu a, nwunye m dịkwa iri afọ asatọ na itoolu. Obi dị anyị nnọọ ụtọ na anyị enyerela ihe dị ka iri mmadụ asaa aka ka ha bịa mara Jehova. Obi dị anyị ụtọ n’eziokwu na anyị dejupụtara fọm ndị ahụ afọ iri isii gara aga maka ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Mkpebi ahụ anyị mere mere ka anyị nwee ọtụtụ ihe ọma ná ndụ anyị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 29 A kọrọ akụkọ ndụ Nwanna Vaca na Teta! (Bekee) nke September 8, 1985.

[Foto dị na peeji nke 29]

Ebe anyị na ndị ozi ala ọzọ ndị ọzọ anyị na ha gakọrọ akwụkwọ na Gilied n’afọ 1958 nọ n’Ámá Egwuregwu Yankii dị na Niu Yọk

[Foto dị na peeji nke 31]

Ebe anyị gara ileta otu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà mgbe anyị na-arụ ọrụ ilekọta sekit n’afọ 1959

[Foto dị na peeji nke 32]

Ebe anyị nọ n’alaka ụlọ ọrụ dị n’Ekwedọọ n’afọ 2002