Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-aghọta Ihe Ndị Na-egosi na Chineke Na-edu Gị?

Ị̀ Na-aghọta Ihe Ndị Na-egosi na Chineke Na-edu Gị?

Ị̀ Na-aghọta Ihe Ndị Na-egosi na Chineke Na-edu Gị?

MA NDỊ Izrel ma ndị Ijipt ahụtụbeghị ihe yiri ya. Ka ụmụ Izrel si n’Ijipt na-apụ, ogidi ígwé ojii na-edu ha mgbe niile. Ọ na-aghọ ogidi ọkụ n’abalị. Nke a dị egwu n’eziokwu. Ma, ebee ka o si? Gịnị bụ ọrụ ya? Ka ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ ise gachara, olee ihe anyị ga-amụta n’otú ụmụ Izrel si were ‘ogidi ọkụ na nke ígwé ojii ahụ’?—Ọpụ. 14:24.

Okwu Chineke mere ka anyị mara ebe ogidi ahụ si na ihe bụ ọrụ ya. Ọ sịrị: “Jehova ji ogidi ígwé ojii na-ebutere ha ụzọ n’ehihie, jirikwa ogidi ọkụ na-ebutere ha ụzọ n’abalị iji duru ha na-aga, iji na-enye ha ìhè ha ga-eji na-aga n’ehihie nakwa n’abalị.” (Ọpụ. 13:21, 22) Jehova Chineke ji ogidi ọkụ na ogidi ígwé ojii ahụ dupụta ndị ya n’Ijipt, jirikwa ha duzie ha n’ala ịkpa. Ọ bụrụ na ha chọrọ iso ya, ha ga-ebulirịrị ije. Mgbe ọ fọrọ obere ka ndị agha Ijipt nwụde ụmụ Izrel, ogidi ahụ bịara dịrị n’etiti ha na ndị Ijipt wee chebe ụmụ Izrel. (Ọpụ. 14:19, 20) Ọ bụ eziokwu na ogidi ahụ esighị ụzọ ka nso duru ha gawa Ala Nkwa ahụ, naanị ihe ga-eme ka ụmụ Izrel ruo ebe ahụ bụ isoro ogidi ahụ.

Ogidi ahụ mere ka obi sie ụmụ Izrel ike na Jehova nọnyeere ha. Ọ nọchiri anya Jehova, o nwekwara mgbe Jehova na-esi na ya agwa ha okwu. (Ọnụ Ọgụ. 14:14; Ọma 99:7) Ogidi ahụ mekwara ka ha mara na ọ bụ Mozis ka Jehova họpụtara ka ọ na-edu ha. (Ọpụ. 33:9) N’otu aka ahụ, mpụta ikpeazụ ogidi ahụ pụtara bụ iji gosi na Jehova ahọpụtala Jọshụa ka ọ nọchie Mozis. (Diut. 31:14, 15) N’eziokwu, ọ bụrụ na ụmụ Izrel chọrọ ka ihe gaziere ha mgbe ha si Ijipt pụta, ha kwesịrị ịghọta ihe ahụ na-egosi na Chineke na-edu ha, na-esokwa ya.

Ha Kwụsịrị Iji Ihe ahụ Akpọrọ Ihe

Mgbe mbụ ndị Izrel hụrụ ogidi ahụ, ọ tụrụ ha n’anya. Ma, ọ dị mwute na ka oge na-aga, ha ejighịzi ya kpọrọ ihe otú ga-eme ka ha nọgide na-atụkwasị Jehova obi. Ọtụtụ mgbe, ha nupụụrụ ndị Chineke ji na-edu ha isi. Mgbe ndị agha ndị Ijipt na-achụ ha, ha gosiri na ha atụkwasịghị Jehova obi na ọ ga-azọpụtali ha. Kama ịtụkwasị Jehova obi, ha boro ohu Chineke bụ́ Mozis ebubo na o du ha na-aga ebe ha ga-anọ nwụọ. (Ọpụ. 14:10-12) Mgbe a napụtachara ha n’Osimiri Uhie, ha tamuru ntamu megide Mozis, Erọn, na Jehova n’ihi na ha sị na ha enweghị nri na mmiri. (Ọpụ. 15:22-24; 16:1-3; 17:1-3, 7) Mgbe izu ole na ole gachara, ha manyere Erọn ka ọ kpụọrọ ha nwa ehi ọlaedo. Chegodị nke ahụ! Ogidi ọkụ na nke ígwé ojii ahụ, bụ́ ihe ndị na-egosi na Onye ahụ kpọpụtara ha n’Ijipt nọnyeere ha, dị n’otu mpaghara nke ebe ụmụ Izrel mara ụlọikwuu ha, ụmụ Izrel anọrọ ná mpaghara dị nso n’ebe ahụ na-efe chi na-adịghị ndụ, nọrọkwa n’elu ya na-ekwu, sị: “Izrel, ihe a bụ Chi gị, nke dupụtara gị n’ala Ijipt.” Nke a bụ “omume nlelị dị ukwuu.”—Ọpụ. 32:4; Neh. 9:18.

Isi ụmụ Izrel nupụrụ gosiri nnọọ na ha ledara otú Jehova si na-edu ha anya. Nsogbu ha abụghị na ha anaghị ahụ ụzọ nke ọma, kama, nsogbu ha bụ na ha aghọtaghị otú Jehova si na-edu ha, ha anaghịkwa eme ihe ọ gwara ha. Ha na-ahụ ogidi ahụ, ma ha echetaghịzi ihe ọ na-anọchi anya ya. N’agbanyeghị na ihe ha mere “wutere Onye Nsọ Izrel,” o ji obi ebere nọgide na-eji ogidi ahụ na-edu ha ruo mgbe ha banyere n’Ala Nkwa ahụ.—Ọma 78:40-42, 52-54; Neh. 9:19.

Ihe Na-egosi na Chineke Na-edu Anyị Taa

Dị ka ọ dị n’Izrel oge ochie, Jehova na-edu ndị ya taa n’ụzọ doro anya. Otú ahụ ọ na-ahapụghị ụmụ Izrel ka ha jiri aka ha na-edu onwe ha ka ọ na-ahapụghị anyị ka anyị jiri aka anyị chọrọ ụzọ ga-eduba anyị n’ụwa ọhụrụ ahụ e kwere anyị ná nkwa. Ọ họpụtara Jizọs Kraịst ka ọ bụrụ Onye Ndú nke ọgbakọ ya. (Mat. 23:10; Efe. 5:23) O nyekwala ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ikike ime ihe ụfọdụ. Ọ bụkwa Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, bụ ohu ahụ. Ohu ahụ na-ahọpụtakwa ndị okenye n’ọgbakọ Ndị Kraịst.—Mat. 24:45-47; Taị. 1:5-9.

Olee otú anyị ga-esi mata onye bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, ma ọ bụ onye ahụ na-elekọta ụlọ? Lee otú Jizọs si kọwaa ya: “Ònye n’ezie bụ onye ahụ na-elekọta ụlọ, onye kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwere uche, onye nna ya ukwu ga-eme onye na-elekọta ìgwè ndị na-ejere ya ozi, ka ọ na-enye ha ihe oriri ga-ezuru ha n’oge kwesịrị ekwesị? Obi ụtọ na-adịrị ohu ahụ, ma ọ bụrụ na nna ya ukwu erute hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ!”—Luk 12:42, 43.

Ya mere, onye ahụ na-elekọta ụlọ “kwesịrị ntụkwasị obi.” O nweghị mgbe ọ ga-ahapụ Jehova, Jizọs, eziokwu dị na Baịbụl, ma ọ bụkwanụ ndị Chineke. Na ohu ahụ “nwere uche” pụtara na o ji ezi uche na-ahụ maka ọrụ ikwusa “ozi ọma” na nke ime “ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ” Jizọs, bụ́ ọrụ ndị dị ezigbo mkpa. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Onye ahụ na-elekọta ụlọ na-erubere Jehova isi ma na-enye ndị ohu Chineke nri ime mmụọ nke na-edozi ahụ́ “n’oge kwesịrị ekwesị.” Otú Jehova si na-eme ka ọnụ ọgụgụ ndị ya na-amụba, na otú o si na-eme ka ha na-eme mkpebi ndị dị mkpa, na otú o si na-eme ka ha na-aghọta eziokwu dị na Baịbụl, na otú o si na-echebe ha ka ndị iro ha ghara ikpochapụ ha, nakwa otú o si mee ka obi na-eru ha ala na-egosi na ọ nabatara mbọ ha na-agba.—Aịza. 54:17; Fil. 4:7.

Kwere Ka Chineke Na-edu Gị

Olee otú anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ na Chineke na-edu anyị? Pọl onyeozi kwuru, sị: “Na-eruberenụ ndị na-edu ndú n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru ha.” (Hib. 13:17) Ime nke a anaghị adị mfe mgbe niile. Dị ka ihe atụ, were ya na ị bụ onye Izrel n’oge Mozis dị ndụ. Ka e were ya na mgbe unu gatụrụ obere, ogidi ahụ akwụsị. Ọ̀ ga-anọru ole mgbe? Ọ̀ bụ otu ụbọchị? Ka ọ̀ bụ otu izu? Ka ọ̀ bụ ọtụtụ ọnwa? I nwere ike ịnọ na-eche sị, ‘Èkwesịrị m ikeghasị ngwongwo m niile?’ Ikekwe ihe mbụ i nwere ike ime bụ iwepụta ihe ole na ole ndị dị gị ezigbo mkpa. Ma, mgbe ụbọchị ole na ole gara, ị na-amalite iwepụtasị ihe niile mgbe ị chọrọ ihe ụfọdụ dị gị mkpa ma ị hụghị ha. Ma, ozugbo ị na-eme nke a, gị ahụ ka ogidi ahụ biliri, gị amalitekwa ịkwakọta ngwongwo gị ọzọ! Nke a adịghị mfe. N’agbanyeghị nke a, ndị Izrel ‘ga-akwalirịrị ozugbo.’—Ọnụ Ọgụ. 9:17-22.

Ugbu a, olee ihe anyị na-eme mgbe Chineke gwara anyị ihe anyị kwesịrị ime? Ànyị na-eme ihe ahụ “ozugbo”? Ka ànyị na-agba nkịtị na-eme ihe ndị anyị na-eme? Ànyị ma otú a chọrọ ka anyị si na-eme ihe ugbu a, dị ka n’ihe banyere iduzi ọmụmụ Baịbụl, ikwusara ndị na-asụ asụsụ mba ọzọ ozi ọma, inwe ofufe ezinụlọ, anyị na Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ ịrụkọ ọrụ, na n’ihe banyere otú anyị kwesịrị isi na-eme mgbe anyị gara mgbakọ? Anyị na-egosikwa na obi dị anyị ụtọ na Chineke na-edu anyị ma ọ bụrụ na anyị na-anabata ndụmọdụ ọ na-enye anyị. Mgbe anyị nwere mkpebi ndị tara akpụ anyị kwesịrị ime, ka anyị ghara ịtụkwasị onwe anyị obi kama ka anyị kwe ka Jehova na nzukọ ya na-edu anyị. Dịkwa nnọọ ka nwatakịrị na-achọ ka nne na nna ya chebe ya mgbe oké ifufe na-efe, otú ahụ ka anyị na-achọ ka ọgbakọ Jehova na-echebe anyị mgbe nsogbu ndị juru n’ụwa a bịakwasịwara anyị ka oké ifufe.

N’eziokwu, ndị na-edu ndú n’ọgbakọ Chineke taa ezughị okè, dịkwa ka Mozis na-ezughị. N’agbanyeghị nke ahụ, ogidi ahụ gosiri na ọ bụ Chineke họpụtara Mozis nakwa na ọ nọnyeere ya. Chetakwa na ọ bụghị onye Izrel ọ bụla chọrọnụ ga-ekpebi mgbe ọ ga-ebuli ije. Kama nke ahụ, ha mere ihe “Jehova nyere iwu site n’ọnụ Mozis.” (Ọnụ Ọgụ. 9:23) Nke a na-egosi na ma eleghị anya, ọ bụ Mozis, bụ́ onye Chineke si n’aka ya na-edu ndị Izrel, na-ekwu mgbe a ga-ebuli ije.

Taa, onye ahụ Jehova họpụtara ka ọ na-elekọta ụlọ na-agwa anyị n’ụzọ doro anya mgbe anyị ga-ebuli ije. Olee otú onye ahụ na-elekọta ụlọ si eme nke a? Ọ na-eji isiokwu ndị dị n’Ụlọ Nche na Ozi Alaeze Anyị, akwụkwọ ndị e bipụtara ọhụrụ, na ihe omume ndị a na-eme ná mgbakọ dị iche iche eme nke a. A na-esikwa n’aka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị agwa ọgbakọ ihe ha ga-eme, na-ejikwa akwụkwọ ozi eme nke a. A na-esikwa n’ụlọ akwụkwọ dị iche iche ụmụnna nwoke ndị nwere ọrụ dị iche iche ha na-arụ n’ọgbakọ na-aga eme nke a.

Ị̀ na-aghọta ihe ndị na-egosi na Chineke na-edu ndị ya? N’oge ikpeazụ a, Jehova ji ọgbakọ ya edu anyị bụ́ ndị ohu ya ka anyị wee gafee ajọ ụwa Setan a yiri “ala ịkpa” jọgburu onwe ya. Nke a na-eme ka anyị dịrị n’otu, hụrịta ibe anyị n’anya, ahụ́ eruokwa anyị ala.

Mgbe ndị Izrel bara n’Ala Nkwa ahụ, Jọshụa kwuru, sị: “Unu jikwa obi unu dum na mkpụrụ obi unu dum mara nke ọma na ọ dịghị otu ihe n’ime ihe ọma niile Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu nke na-emezughị. Ha niile emezuworo unu.” (Jọsh. 23:14) Ndị ohu Chineke taa ga-erukwa n’ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ha ná nkwa. Ma, ihe ga-ekpebi ma ànyị ga-abanye ma ọ bụ na anyị agaghị abanye bụ otú anyị si jiri obi umeala na-eme ihe Chineke gwara anyị. N’ihi ya, ka anyị niile na-aghọta ihe ndị na-egosi na Jehova na-edu anyị!

[Foto dị na peeji nke 5]

Ọgbakọ Jehova na-edu anyị taa

Akwụkwọ ndị a na-ewepụta ná mgbakọ

Ụlọ akwụkwọ ndị e nwere n’ọgbakọ Jehova

Ọzụzụ a na-enweta ná nzukọ ije ozi ubi