Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ọ̀ tọrọ gị ụtọ ịgụ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Legodị ma ị ga-azali ajụjụ ndị na-esonụ:

• Olee ihe mere anyị nwere ike iji kwere na e nwere ebe bụ́ ogige Iden n’ezie?

Baịbụl gosiri na e nwere ebe bụ́ ogige Iden n’ezie, o kwudịrị kpọmkwem ebe ọ dị. Osimiri abụọ n’ime osimiri ndị a kpọrọ aha n’akụkọ banyere ogige Iden ka dị taa. Ọ bụghị otú a ka e si akọ akụkọ ifo. Jizọs, bụ́ Onyeàmà a kacha tụkwasị obi, kwuru ihe gosiri na e nwere Adam na Iv n’ezie.—1/1, peeji nke 5-6, 9.

• Chineke ọ̀ maara na Adam na Iv ga-emehie?

Ee e. Jehova mere ka ha nwee ọgụgụ isi, meekwa ka ha nwee ike ikpebiri onwe ha ihe ha ga-eme. Nke a ga-eme ka ha nwee ike ikpebi ma hà ga-erubere ya isi ma ọ bụ na ha agaghị eme otú ahụ. Ọ bụ eziokwu na Chineke nwere ike ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu tupu ya emee, ọ bụghị ihe niile ka ọ na-achọ ịma.—1/1, peeji nke 13-15.

• Ezigbo Ndị Kraịst, hà ji aha Chineke emere ọtụmọkpọ?

Ụfọdụ ndị na-ewere ihe ụfọdụ ka ọtụmọkpọ nke na-echebe ha, ma, ndị ohu Chineke anaghị ewere aha ya ka ọtụmọkpọ. Ha nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ ma na-agba mbọ ime uche ya, si otú a na-agbaba n’aha ya. (Zef. 3:12, 13)—1/15, peeji nke 5-6.

• N’Izrel, ole ndị ritere uru n’iwu ịtụtụkọta ihe e wefọrọ n’ubi?

Mmadụ niile ritere uru na ya. O mere ka ndị ogbenye, bụ́ ndị na-atụtụkọta ihe e wefọrọ n’ubi, dị uchu. Otú ndị ọzọ si rite uru bụ na o mere ka ha na-emesapụ aka ma dabere ná ngọzi Chineke.—2/1, peeji nke 15.

• Olee ihe mere Jehova ji jụ Eze Sọl?

Sọl kwesịrị ichere ka onye amụma Chineke bịa chụọ àjà, ma, o nupụrụ isi gaa chụọ àjà ahụ n’onwe ya. O nupụkwara isi ọzọ wee ghara ibibi ndị iro ndị Izrel otú a gwara ya.—2/15, peeji nke 22-23.

• Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị kpọrọ mmebi iwu asị?

Anyị ekwesịghị ịna-aṅụ oké mmanya. Anyị kwesịrị izere ime anwansi ma gee ntị n’ihe Jizọs kwuru banyere omume rụrụ arụ. Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị izere ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na echiche rụrụ arụ ha nwere ike ime ka onye na-ekiri ha na-enwe. (Mat. 5:27, 28) Anyị na ndị a chụrụ n’ọgbakọ ekwesịghịkwa ịna-akpakọrịta.—2/15, peeji nke 29-32.

• Olee ihe mere nchọta ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie chọtara ebe a na-akpa aṅụ n’oge ochie n’Izrel nke oge a ji pụọ iche?

Ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie chọpụtara ihe karịrị iri ụlọ aṅụ atọ ndị dị n’ahịrị atọ, bụ́ ndị ha kwuru na a ga na-enweta ihe ruru ọkara tọn mmanụ aṅụ kwa afọ n’ụlọ aṅụ ndị ahụ. Nke a na-egosi na a na-akpa aṅụ n’ala ahụ Chineke kwuru na ‘mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ ga-eru na ya.’ (Ọpụ. 3:8)—3/1, peeji nke 15.

• Olee otú Jeremaya si dị ka osisi “a kụrụ n’akụkụ mmiri, nke gbanyere mgbọrọgwụ”? (Jere. 17:7, 8)

O nweghị mgbe ọ kwụsịrị ịmị mkpụrụ, o kweghịkwa ka ndị na-akwa emo mee ka ọ daa mbà. Kama nke ahụ, o guzosiri ike n’akụkụ Isi Iyi nke mmiri na-enye ndụ, o chefughịkwa ihe Chineke gwara ya.—3/15, peeji nke 14.

• Gịnị ka Jizọs bu n’uche mgbe ọ gwara Mata na ihe dị mkpa bụ ihe ole ma ọ bụ naanị otu ihe? (Luk 10:41, 42)

Ihe Jizọs kwuru apụtaghị na Mata hụrụ ihe onwunwe n’anya n’ihi na ọ na-akwadebe nri, ọ pụtaghịkwa na mbọ ọ nọ na-agba abaghị uru. Kama, ihe o mere bụ ịgwa ya ka o bute ihe ndị ka mkpa ụzọ. Mata ejighị oge ahụ pụrụ iche mee ka okwukwe ya sikwuo ike.—4/1, peeji nke 12-13.

• Olee ihe ndị megidere iwu, bụ́ ndị e mere mgbe a na-ekpe Jizọs ikpe?

Ụlọikpe ahụ anụghị ihe ndị gosiri na aka ya dị ọcha. Ha chọtara ndị akaebe ụgha. E kpere ikpe ahụ n’abalị. E kpechara ikpe ahụ n’otu ụbọchị ahụ a malitere ya.—4/1, peeji nke 20.