Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Amụma nke 1. Ala Ọma Jijiji

Amụma nke 1. Ala Ọma Jijiji

Amụma nke 1. Ala Ọma Jijiji

“A ga-enwekwa oké ala ọma jijiji.”—LUK 21:11.

● Mgbe e nwere ala ọma jijiji na Heiti, e si n’ụlọ ndị dakasịrị adakasị kupụta Winnie, bụ́ nwata dị otu afọ na ọnwa anọ. Ndị nta akụkọ otu ụlọ ọrụ tiivi, bụ́ ndị nọ na-egosi ọdachi ahụ, nụrụ ude ọ na-asụ. Nwata ahụ anwụghị, ma ndị mụrụ ya nwụrụ.

GỊNỊ KA IHE NDỊ NA-EME EME NA-EGOSI? Mgbe ala ọma jijiji ahụ dị oké njọ mere na Heiti na Jenụwarị 2010, o gburu ihe karịrị narị puku mmadụ atọ. N’otu ntabi anya, o mere ka ihe karịrị otu nde mmadụ ghara inwekwa ebe obibi. Ọ bụ eziokwu na ala ọma jijiji ahụ mere na Heiti kpara ike dị egwu, ọ bụghị naanị ebe ahụ ka ala ọma jijiji metụrụla. N’agbata ọnwa Eprel afọ 2009 na ọnwa Eprel afọ 2010, ọ dịkarịa ala, ala ọma jijiji iri na asatọ kpara ike ọjọọ n’ebe dị iche iche n’ụwa.

GỊNỊ KA NDỊ NA-EKWEGHỊ NÁ MMEZU AMỤMA A NA-EKWUKARỊ? Ala ọma jijiji ole na-eme taa akarịghị ndị mere n’oge gara aga. Ihe mere o ji dị ka ọ karịrị bụ na nkà na ụzụ e nwere ugbu a na-eme ka anyị mara banyere ha karịa otú ndị dịrị ndụ n’oge gara aga si mara banyere ha.

IHE AHỤ HA KWURU Ò RIJURU AFỌ? Chebara ihe a echiche: Baịbụl ekwughị ala ọma jijiji ole ga-eme n’oge ikpeazụ. Kama, o kwuru na a ga-enwe “oké ala ọma jijiji” “n’ebe dị iche iche,” nke na-eme ka ọ bụrụ otu n’ime ihe ndị na-egosi na oge anyị a bụ oge pụrụ iche.—Mak 13:8; Luk 21:11.

GỊNỊ KA I CHERE? Ànyị na-ahụ oké ala ọma jijiji otú ahụ Baịbụl kwuru?

Mmadụ nwere ike ịsị na ala ọma jijiji ndị na-emenụ erughị ihe mmadụ ga-eji kwuo na anyị bi n’oge ikpeazụ. Ma, e nwekwara amụma ndị ọzọ na-emezu n’oge a. Ka anyị hụ nke abụọ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

“Anyịnwa [bụ́ ndị ọkachamara na-amụ banyere ala] na-akpọ ya oké ala ọma jijiji. Ndị ọzọ na-akpọ ya ọdachi jọgburu onwe ya.”—KEN HUDNUT, ONYE NA-ARỤ N’ỤLỌ ỌRỤ AMERỊKA NKE NA-AMỤ BANYERE ALA.

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 4]

© William Daniels/Panos Pictures