Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Amụma nke 2. Ụkọ nri

Amụma nke 2. Ụkọ nri

Amụma nke 2. Ụkọ nri

“A ga-enwe ụkọ nri.”—MAK 13:8.

● Otu nwoke gbatara ọsọ ndụ n’obodo Kwarateji nke dị na Naịja. Ndị ikwu ya, ụmụnne ya ndị nwoke na ndị nwaanyị sikwa n’ime ime obodo ndị dị ná mba ahụ gbapụta n’ihi agụụ. Ma, nwoke ahụ gara ebe ọzọ dinara naanị ya n’ute. Gịnị mere o ji nọrọ naanị ya? Sidi, bụ́ chiif obodo ahụ, kwuru, sị: “O nweghị ike inye [ezinụlọ ya] nri, ọ chọghịkwa ịnọ na-ele ha n’anya n’anya.”

GỊNỊ KA IHE NDỊ NA-EME EME NA-EGOSI? N’ụwa niile, ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na otu onye n’ime mmadụ asaa ọ bụla anaghị eriju afọ kwa ụbọchị. Ọ ka njọ n’ebe ndịda Ọzara Afrịka, bụ́ ebe otu onye n’ime mmadụ atọ ọ bụla na-anaghị eriju afọ. Iji ghọta nke a nke ọma, ka anyị were otu ezinụlọ nke nwere nna, nne, na obere nwa maa atụ. Ọ bụrụ na nri ha nwere ga-ezuru naanị mmadụ abụọ, ònye n’ime ha ga-akwụ agụụ? Ọ̀ bụ nna ahụ, nne, ka ọ̀ bụ obere nwa ahụ? Ọ bụ otú a ka ọ na-adị ezinụlọ ndị dị otú ahụ, otu onye n’ime ha ga-akwụrịrị agụụ n’ụbọchị.

GỊNỊ KA NDỊ NA-EKWEGHỊ NÁ MMEZU AMỤMA A NA-EKWUKARỊ? Nri a na-akọpụta n’ụwa ga-ezuru onye ọ bụla. Naanị ihe dị mkpa bụ ime ka o rute onye ukwu na onye nta aka.

IHE AHỤ HA KWURU Ò RIJURU AFỌ? N’eziokwu, ndị ọrụ ugbo nwere ike ịkọpụtakwu nri ugbu a ma buga ya n’ebe dị iche iche karịa otú e metụrụla kemgbe ụwa. E mezie ihe emezie, ndị ọchịchị kwesịrị ịhụ na nri a na-akọpụta n’ụwa zuuru onye ọ bụla. Ma n’agbanyeghị na ha agbalịala ime nke a kemgbe ọtụtụ iri afọ, ha enwebeghị ike ime ya.

GỊNỊ KA I CHERE? Ihe e dere na Mak 13:8 ọ̀ na-emezu n’oge a? N’agbanyeghị na e nweela ụzọ ndị ka mma e si akọpụta nri, ụkọ nri ọ̀ ka na-akpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ n’ụwa niile?

E nwekwara nsogbu ọzọ e ji ama ụbọchị ikpeazụ bụ́ nke a na-enwekarị mgbe e nwechara ala ọma jijiji na ụkọ nri.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

“Ihe karịrị otu nwata n’ime ụmụaka atọ ndị na-anwụ n’ihi na oyi bara ha ahụ́, n’ihi afọ ọsịsa nakwa n’ihi ọrịa ndị ọzọ, agaraghị anwụ ma ọ bụrụ na ha na-eriju afọ.”—ANN M. VENEMAN, ONYE BỤ́BU ONYEISI NGALABA ÒTÙ MBA ỤWA NKE NA-AHỤ MAKA ỤMỤAKA.

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 5]

© Paul Lowe/Panos Pictures