Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ga-adị mma N’oge Na-adịghị Anya!

Ihe Ga-adị mma N’oge Na-adịghị Anya!

Ihe Ga-adị mma N’oge Na-adịghị Anya!

“N’oge na-adịghị anya, onye ajọomume agakwaghị anọ . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—ABỤ ỌMA 37:10, 11.

Ị̀ GA-ACHỌ ịhụ mgbe amụma a ga-emezu? O doro anya na ị ga-achọ. E nwere ezigbo ihe ndị mere ị ga-eji kwere na ọ ga-emezu n’oge na-adịghị anya.

Isiokwu ndị bú nke a ụzọ lebara anya n’ụfọdụ amụma Baịbụl ndị na-egosi nnọọ na anyị bi “n’oge ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5) Chineke ji mmụọ ya mee ka ụfọdụ ndị so dee Baịbụl buo ihe ndị ahụ n’amụma ka anyị wee nwee ike inwe olileanya. (Ndị Rom 15:4) Mmezu amụma ndị ahụ na-egosi na nsogbu ndị anyị na-enwe ugbu a ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya.

Gịnịzi ga-eme ma oge ikpeazụ a gwụ? Alaeze Chineke ga-amalite ịchị mmadụ niile. (Matiu 6:9) Ka anyị tụlee otú Baịbụl kwuru ụwa ga-adị n’oge ahụ:

Agụụ agaghị adịkwa. “Ọka ga-ejupụta n’elu ụwa; ọ ga-ejubiga ókè n’elu ugwu dị iche iche.”—Abụ Ọma 72:16.

Ọrịa agaghị adịkwa. “Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”—Aịzaya 33:24.

A ga-eme ka ụwa dị ọhụrụ. “Ala ịkpa na ógbè mmiri na-adịghị ga-enwe aṅụrị, mbara ọzara ga-aṅụrị ọṅụ, waakwa okooko dị ka okooko safrọn.”—Aịzaya 35:1.

Ihe ndị a bụ naanị amụma Baịbụl ole na ole na-agba ume bụ́ ndị ga-emezu n’oge na-adịghị anya. Ọ́ gaghị adị mma ka ị gwa Ndịàmà Jehova ka ha kọọrọ gị ihe mere obi ji sie ha ike na ihe ga-adị mma n’oge na-adịghị anya?