Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Aha ndị e ji stampụ ndị mgbe ochie suo n’ụrọ na aha ndị dị na Baịbụl hà bụ otu?

N’oge ochie, ndị na-edere ndị ọchịchị akwụkwọ na-apịakọta akwụkwọ ha dere, kee ha eriri, werezie ụrọ na-akpọbeghị akpọ kọkwasị n’ebe ahụ e kekọtara eriri ahụ ma jiri stampụ ndị mgbe ochie suo ya n’elu. Akara hiri n’ụrọ ahụ na-egosi na ha abịanyela aka n’akwụkwọ, na ha agbaala akaebe, nakwa na ihe ha dere n’akwụkwọ bụ eziokwu.

Mgbe ụfọdụ, a na-arụnye akara ndị ahụ na-adị na stampụ na mgbaaka, a na-ewerekwa mgbaaka dị otú ahụ ka ihe dị oké ọnụ ahịa. (Jenesis 38:18; Esta 8:8; Jeremaya 32:44) Ọtụtụ mgbe, stampụ ndị mgbe ochie ahụ na-ebu aha onye nwe ya, ọkwá ya, na aha nna ya.

Ndị na-eme nchọpụta ahụla ọtụtụ ihe ndị e suru stampụ ndị mgbe ochie. Ụfọdụ n’ime ha bu aha ndị dị na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie ahụla akara ndị e ji stampụ ndị e weere na ha bụ nke ndị eze abụọ chịrị Juda suo. Ihe e dere n’otu n’ime ha bụ: “Nke Ehaz [nwa] Yehotam [Jotam], Eze Juda.” Ihe e dere ná ndị ọzọ bụ: “Nke Hezekaya [nwa] Ehaz, Eze Juda.” (2 Ndị Eze 16:1, 20) Ehaz na Hezekaya chịrị na narị afọ nke asatọ Tupu Oge Anyị.

Ndị ọkà mmụta enyochaala ọtụtụ akara ndị ọzọ bụ́ ndị e chere na ndị nwe stampụ ndị e ji suo ha bụ ndị aha ha dị na Baịbụl. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị aha ha dị n’akwụkwọ ndị Jeremaya dere, dị ka Barọk (odeakwụkwọ Jeremaya), Gemaraya (“nwa Shefan”), Jeramiel (“nwa eze”), Jukal (“nwa Shelemaya”), na Seraya (nwanne Barọk).—Jeremaya 32:12; 36:4, 10, 26; 38:1; 51:59.

Olee otú ndị oge Baịbụl si ekwu oge dị iche iche n’ụbọchị?

▪ E nwere okwu ndị dị ka “ụtụtụ,” “ehihie,” “etiti ehihie,” na “mgbede” n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. (Jenesis 24:11; Diuterọnọmi 28:29; 1 Ndị Eze 18:26) Ndị Hibru kere abalị ụzọ atọ, ya bụ, oge nche atọ ndị na-adị ihe dị ka awa anọ anọ. Ma, ha mechara sowe oge nche anọ bụ́ otú ndị Gris na ndị Rom si kee nke ha. O doro anya na ọ bụ oge nche anọ ndị Gris na ndị Rom ka Jizọs kwuru okwu ya mgbe ọ sịrị: “Na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị mgbe nna nwe ụlọ ga-abịa, ma ọ̀ bụ n’uhuruchi ka ọ̀ bụ n’etiti abalị ka ọ̀ bụ mgbe oké ọkpa ji akwa ka ọ̀ bụ n’isi ụtụtụ.” (Mak 13:35) Oge nche nke “uhuruchi” na-amalite mgbe anyanwụ dara ruo n’elekere itoolu nke abalị. Nke na-eso ya na-akwụsị n’etiti abalị, nke atọ, ya bụ, “mgbe oké ọkpa ji akwa,” na-akwụsị n’ihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ. Nke ikpeazụ, bụ́ isi ụtụtụ, na-akwụsị mgbe anyanwụ wara. Ọ bụ “n’oge nche nke anọ nke abalị” ka Jizọs jere ije n’elu Osimiri Galili.​—⁠Matiu 14:​23-​26.

N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, okwu bụ́ “awa” bụ otu ụzọ n’ime ụzọ iri na abụọ nke oge a na-enwe ìhè n’ụbọchị, nke na-amalite n’ọwụwa anyanwụ ruo n’ọdịda anyanwụ. (Jọn 11:⁠9) Ebe ọ bụ na oge anwụ na-awa na oge anwụ na-ada na-agbanwe agbanwe n’afọ, ọ naghị abụkarị kpọmkwem awa ihe mere ka a na-asị na o mere, dị ka ihe atụ, a na-ekwu na ihe mere “n’ihe dị ka awa nke isii.”​—⁠Ọrụ 10:⁠9.

[Foto dị na peeji nke 15]

Ụrọ ndị e suru stampụ ndị mgbe ochie. nke dị n’ihu bu aha Hezekaya na Ehaz. aha dị na nke dị n’azụ nwere ike ịbụ aha Barọk

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Nke dị n’azụ: A natara ikike n’aka Israel Museum, Jerusalem

Nke dị n’ihu: www.BibleLandPictures.com/Alamy

[Foto dị na peeji nke 15]

Ihe e ji agụ oge n’ehihie, n’oge alaeze ukwu Rom na-achị (27 T.O.A.–476 O.A.)

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Gerard Degeorge/The Bridgeman Art Library International