Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ihe Ọjọọ na Ahụhụ Dịrị?

Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ihe Ọjọọ na Ahụhụ Dịrị?

Mụta Ihe N’okwu Chineke

Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ihe Ọjọọ na Ahụhụ Dịrị?

Isiokwu a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla, ọ ga-egosikwa gị ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị ga-aza gị ajụjụ ndị ahụ. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Olee otú ihe ọjọọ si malite?

Ihe ọjọọ malitere n’ụwa mgbe Setan ghara ụgha mbụ. Setan abụghị onye ọjọọ mgbe e kere ya. Ọ bụ mmụọ ozi zuru okè, ma ọ ‘guzosighị ike n’eziokwu.’ (Jọn 8:44) Ofufe ruuru naanị Chineke gụwara ya agụụ. Setan ghaara nwaanyị mbụ, bụ́ Iv, ụgha ma mee ka o rubere ya isi kama irubere Chineke isi. Adam sooro Iv nupụrụ Chineke isi. Ihe a Adam mere kpatara ahụhụ na ọnwụ.—Gụọ Jenesis 3:1-6, 17-19.

Mgbe Setan gwara Iv ka o nupụrụ Chineke isi, ihe o mere bụ ịgba ọchịchị Chineke mgba okpuru. Ọtụtụ mmadụ esonyerela Setan, ha achọghịkwa ka Chineke chịwa ha. Setan si otú ahụ ghọọ “onye na-achị ụwa.”—Gụọ Jọn 14:30; Mkpughe 12:9.

2. Ihe ndị Chineke kere hà nwere ntụpọ?

Ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi Chineke kere nwere nnọọ ike irubere Chineke isi. (Diuterọnọmi 32:5) Chineke kere anyị otú anyị ga-enwe ike ịhọrọ ime ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. Otú ahụ Chineke si kee anyị ga-eme ka anyị nwee ike igosi na anyị hụrụ ya n’anya.—Gụọ Jems 1:13-15; 1 Jọn 5:3.

3. Gịnị mere Chineke ji kwere ka ahụhụ dịrị?

Kemgbe e nupụchaara Jehova isi n’Iden, ọ gbachiri ndị na-enupụrụ ọchịchị ya isi nkịtị. N’ihi gịnị? Ọ bụ iji gosi na mgbalị ọ bụla ụmụ mmadụ mere ịchị onwe ha agaghị abara ha uru. (Jeremaya 10:23) Ugbu a ọ gaferela puku afọ isii ụmụ mmadụ dịwara ndụ, okwu a edoola anya. Ndị ọchịchị enwebeghị ike iwepụ agha, mpụ, ikpe na-ezighị ezi, na ọrịa.—Gụọ Ekliziastis 7:29; 8:9; Ndị Rom 9:17.

Ma ndị kwere ka Chineke chịwa ha na-erite uru. (Aịzaya 48:17, 18) N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ. Ọ bụ naanị ndị kwere ka Chineke chịwa ha ga-eketa ụwa.—Aịzaya 2:3, 4; 11:9; gụọ Daniel 2:44.

4. Olee uru ndidi Chineke baara ụmụ mmadụ?

Setan turu ọnụ na ụmụ mmadụ agaghị erubere Jehova isi ma kwesị ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ. Ndidi Chineke na-enye anyị niile ohere igosi ma ànyị họọrọ ọchịchị Chineke ka ọ̀ bụ ọchịchị mmadụ. Ọ bụ otú anyị si ebi ndụ ga-egosi nke anyị họọrọ.—Gụọ Job 1:8-11; Ilu 27:11.

5. Olee otú anyị si egosi na anyị chọrọ ka Chineke chịwa anyị?

Anyị ga-egosi na anyị chọrọ ka Chineke chịwa anyị ma ọ bụrụ na anyị ejiri Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, chọpụta otú ọ chọrọ ka anyị si na-efe ya ma na-efe ya otú ahụ. (Jọn 4:23) Anyị agaghịkwa etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na agha, dị ka Jizọs na-etinyeghị.—Gụọ Jọn 17:14.

Setan na-eji ike ya eme ka ụmụ mmadụ na-eme omume rụrụ arụ ndị na-akpatara ha nsogbu. Ọ bụrụ na anyị ajụ ime omume ndị ahụ, ụfọdụ ndị enyi na ndị ikwu anyị nwere ike ịchị anyị ọchị ma ọ bụ megidewe anyị. (1 Pita 4:3, 4) N’ihi ya, anyị ga-ekpebirịrị ihe anyị ga-eme. Ọ̀ bụ ndị hụrụ Chineke n’anya ka anyị na ha ga na-akpa? Ànyị ga-erube isi n’iwu ndị o nyere anyị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya? Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị ga-egosi na Setan ghara ụgha mgbe o kwuru na o nweghị onye ga-eme uche Chineke.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10; 15:33.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ihe a kọrọ n’isiokwu a, gụọ GỊnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? isi nke 11 nke akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 16]

Adam họọrọ ime ihe ọjọọ

[Foto dị na peeji nke 17]

Ihe ndị anyị na-eme ga-egosi ma ànyị chọrọ ka Chineke chịwa anyị