Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịdị Ndụ Ebighị Ebi na Paradaịs Ọ̀ Ga-agwụ Anyị Ike?

Ịdị Ndụ Ebighị Ebi na Paradaịs Ọ̀ Ga-agwụ Anyị Ike?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Ịdị Ndụ Ebighị Ebi na Paradaịs Ọ̀ Ga-agwụ Anyị Ike?

▪ Baịbụl kwuru na ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi na Paradaịs n’ụwa. (Abụ Ọma 37:29; Luk 23:43) Ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa nke ihe niile zuru okè na ya ọ̀ ga-agwụ anyị ike?

Ajụjụ a dị ezigbo mkpa. Ndị na-eme nnyocha achọpụtala na ọ bụrụ na ọrụ mmadụ na-arụ na-agwụkarị ya ike, o nwere ike ime ka onye ahụ daa mbà n’obi, mee ka ọ na-echegbu onwe ya ma ghara ịkpachapụ anya ná ndụ. Ndụ na-agbụkarị ndị chere na ndụ ha enweghị isi ma ọ bụ ndị ihe ha na-eme kwa ụbọchị na-agwụkarị ike. Ọ̀ ga-adị ndị ga-ebi na Paradaịs otú ahụ? Ihe ndị ha na-eme kwa ụbọchị ọ̀ ga-agwụ ha ike?

Nke mbụ, cheta na ọ bụ Jehova Chineke, bụ́ Onye chepụtara Baịbụl, kwere nkwa inye ụmụ mmadụ ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16; 2 Timoti 3:16) Àgwà bụ́ isi e ji mara Chineke bụ ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, ọ bụkwa ya nyere anyị ihe ọma niile anyị nwere taa.—Jems 1:17.

Onye kere anyị maara na anyị ga-enwe obi ụtọ ná ndụ ma anyị nwee ọrụ bara uru anyị na-arụ. (Abụ Ọma 139:14-16; Ekliziastis 3:12) Na Paradaịs, ụmụ mmadụ agaghị adị ka rọbọt na-arụgbu onwe ya n’ọrụ. Ọrụ ha ga-arụ ga-abara ma ha ma ndị ha hụrụ n’anya uru. (Aịzaya 65:22-24) Ọ bụrụ na i nwere ezigbo ọrụ ị na-arụ mgbe niile, nke na-esitụrụ gị ike ọrụrụ, ma ya abụrụ na ịrụ ya na-atọ gị ụtọ, ike ndụ ọ̀ ga-agwụ gị?

Chetakwa na ọ bụghị onye ọ bụla ka Jehova Chineke ga-ekwe ka ọ dịrị ndụ na Paradaịs. Ọ bụ naanị ndị na-eṅomi Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ka ọ na-enye onyinye ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ime uche Nna ya tọrọ ya ụtọ. O si n’okwu ọnụ na n’omume kụziere ndị na-eso ụzọ ya na a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe. (Ọrụ 20:35) Mgbe a ga-eme ka ụwa ghọọ Paradaịs, mmadụ niile ga-ahụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya, nke bụ́ iwu abụọ kacha ukwuu. (Matiu 22:36-40) Chegodị otú ụwa ga-adị mgbe ndị agbata obi gị niile ga-abụ ndị hụrụ gị n’anya, ndị na-adịghị achọ naanị ọdịmma onwe ha, na ndị ọrụ ha na-arụ na-atọ ụtọ! Ì chere na ndụ ga-agwụ gị ike ma gị na ndị dị otú ahụ nọrọ?

Gịnị ọzọ ka anyị ga-eme na Paradaịs? Kwa ụbọchị, anyị ga-amụta ihe ọhụrụ banyere Onye kere anyị. E nweela ọtụtụ ihe dị ịtụnanya ndị ọkà mmụta chọpụtarala banyere ihe ndị Jehova kere. (Ndị Rom 1:20) Ma, ka ọ dị ugbu a, o nwebeghịdị ebe anyị garala aga ma a bịa n’ịmata ihe ndị Chineke kere eke. Ihe dị ka puku afọ anọ gara aga, Job, bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi, kwuru ihe ọ chọpụtara banyere ihe ndị Chineke kere, ihe o kwuru ka bụkwa eziokwu. Job sịrị: “Ihe ndị a bụ ntakịrị ihe n’ọrụ [Chineke] niile, leekwa ka ihe a nụworo banyere ya si dị ntakịrị! Ma ònye pụrụ ịghọta ụzọ égbè eluigwe ya nke dị ike?”—Job 26:14.

Anyị dịgodị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, anyị agaghị enwe ike ịmatacha ihe niile banyere Jehova Chineke na ihe ndị o kere. Baịbụl kwuru na Chineke tinyere ndụ ebighị ebi n’obi anyị. Ma, Baịbụl kwukwara na anyị ‘agaghị achọpụta ọrụ ezi Chineke rụrụ site ná mmalite ruo ná ngwụsị.’ (Ekliziastis 3:10, 11) Ì chere na o nwere mgbe ike ga-agwụ gị ịmụta ihe ọhụrụ banyere Onye kere gị?

Ugbu a dị, ọ na-esi ike ịhụ ebe ndị na-arụ ọrụ na-abara ndị ọzọ uru na ọrụ na-enye Chineke otuto kwuru na ike ọrụ a agwụla ha. Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ bụrụ na anyị ana-arụ ụdị ọrụ a, o nweghị mgbe ike ya ga-agwụ anyị, ọ sọgodị ya bụrụ na anyị ga-arụ ya ruo mgbe ebighị ebi.

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 27]

Ụwa: Image Science and Analysis Laboratory, NASA-Johnson Space Center; Ụyọkọ kpakpando: The Hubble Heritage Team (AURA/STScI/NASA)